Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 31. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Mgbe Eze Jehoshafat guzobesịrị usoro iwu e mere ka ọ ka mma, olee iwu o nyere ndị ikpe, ebe ọ bụ na ha na-ekpere Jehova ikpe ọ bụghị mmadụ? (2 Ihe E Mere 19:7)

2. Ebe ọ bụ na Ọchịchị Narị Afọ Iri Kraịst gụnyere ya inwe ndị eze bụ́kwa ndị nchụàjà n’eluigwe, bụ́ ndị ga-anọ n’okpuru ya, ole ndị ga-anọchite anya ya ma na-eme ihe ọ tụziri n’ụwa? (Abụ Ọma 45:16)

3. Olee ógbè ndịozi 11 nile nke Jizọs bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi sitere na ya? (Luk 4:14)

4. Gịnị ka Jọshụa rịọrọ maka ndị Gibeọn ahụ ndị agha nọchibidoro ka ha wee nwee ike imeri ndị Amọraịt? (Joshua 10:12, 13)

5. Aha ndị dị aṅaa ka a kpọrọ Osimiri Nwụrụ Anwụ n’ime Bible? (Deuterọnọmi 3:17)

6. N’ihi gịnị ka Heman ji kpaa nkata ibibi ndị Juu nile nọ n’Alaeze Ukwu Peasia? (Esta 3:5, 6, 10)

7. Olee ihe ọnụ na-ekwuchitere Senakerib, bụ́ Rabshake, kwuru iji gbaa Hezekaịa ume ịchịli aka elu? (2 Ndị Eze 18:33-35)

8. Olee ndị amụma abụọ a ma ama n’oge ịchịisi Devid? (2 Samuel 12:1; 24:11)

9. Gịnị ka Chineke kere n’ụbọchị ike ihe nke abụọ ahụ? (Jenesis 1:7)

10. Olee ebe ụmụ Izrel nọ mgbe Jọshụa zigara ndị nledo abụọ ahụ Jeriko? (Joshua 2:1)

11. Olee ihe ndị e ji mee ‘mmanụ otite dị nsọ’ ahụ? (Ọpụpụ 30:23-25)

12. Onyinye ndị dị aṅaa ka Belshaza kwuru na ya ga-enye onye pụrụ ịkọwa ihe ahụ e dere ná mgbidi? (Daniel 5:7)

13. Olee ahụhụ a ma ama na Bible maka ịdị uchu ya na amamihe ebumpụta ụwa ya? (Ilu 6:6)

14. Olee eze Juda nke lụsoro usuu ndị agha Etiopia nwere otu nde ndị agha agha? (2 Ihe E Mere 14:9, 10)

15. Olee anụ nke na-alaghachi n’ihe ọ gbọrọ bụ́ nke e ji tụnyere onye nzuzu nke na-emeghachi ihe nzuzu ya? (Ilu 26:11)

16. Olee osimiri abụọ nke Damaskọs nke Neaman lere anya na ha dị mma karịa “mmiri [Izrel] nile”? (2 Ndị Eze 5:12)

17. Olee ebubo e boro Jizọs n’ihi na ọ sịrị na ya ga-anọ n’ụlọ Zakịọs, onye ọnaụtụ? (Luk 19:7)

18. Ndị Asiria ole ka otu mmụọ ozi gburu n’otu abalị? (2 Ndị Eze 19:35)

19. Dị ka Pita kwuru, olee otú Chineke si nye “ndị mmụọ ozi ahụ mehierenụ” ahụhụ? (2 Pita 2:4)

Azịza Nye Ajụjụ

1. “Lezienụ anya, mee ya: n’ihi na ọ dịghị ajọ omume, ma ọ bụ ịhụ mmadụ ihu ọma, ma ọ bụ ịnara ihe iri ngo, dị n’ime Jehova, bụ́ Chineke anyị”

2. Ndị isi

3. Galili

4. Ka anyanwụ na ọnwa kwụrụ otu ebe

5. ‘Oké osimiri Araba, Oké Osimiri Nnu’

6. N’ịbụ onye a kpọrọ “onye Egag,” o yikarịrị ka Heman ò sitere n’eriri ndị Amalek—bụ́ ndị a mara ikpe mkpochapụ n’ihi asị ha kpọrọ ndị Juu

7. O kwuru na Jehova apụghị ịnapụta Jeruselem, dị nnọọ ka chi nile nke obodo ndị ha dọtaworo n’agha na-apụghị ịnapụta ha

8. Netan na Gad

9. “Mbara ahụ”

10. Na Shitim, bụ́ ala dị larịị nke ọzara Moab

11. Myrrh, ụda cinnamon, ụda calamus, cassia, na mmanụ oliv

12. Uwe odo odo, ịyagba olu ọlaedo, ọkwá nke onye nke atọ na-achị achị n’alaeze ahụ

13. Ndanda

14. Eze Esa

15. Nkịta

16. “Abana na Fapa”

17. “Nwoke bụ́ onye mmehie ka ọ gara nọrọ na nke ya”

18. 185,000

19. Site n’ịtụba ha n’ime Tatarọs