Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Egwuregwu Ụmụaka—Ntiwapụ Ọhụrụ nke Ime Ihe Ike

Egwuregwu Ụmụaka—Ntiwapụ Ọhụrụ nke Ime Ihe Ike

Egwuregwu Ụmụaka—Ntiwapụ Ọhụrụ nke Ime Ihe Ike

▪ Otu ìgwè ụmụ akwụkwọ sekọndrị abịakọta ọnụ maka egwuregwu bọl. E jiri ọgụ mechie egwuregwu ahụ, ihe karịrị 100 ndị nne na nna, ndị na-enye ndị egwuregwu ọzụzụ, na ndị na-eme egwuregwu ana-aba mba ma na-esurịta ọkpọ mgbe otu akụkụ meriri n’egwuregwu ahụ n’oge a tụkwasịrị atụkwasị.

▪ Otu ìgwè ụmụaka ndị ikom na ndị inyom nọ n’agbata afọ 9 ruo 12 nọ na-atụ bọl. Mgbe otu onye dị afọ iri tọgbọrọ bọl a tụụrụ ya, onye na-enye ha ọzụzụ buuru ya tụọ n’ala, kụjie ya aka abụọ.

▪ Otu onye na-enye otu òtù egwuregwu baseball ụmụaka ọzụzụ agbanwee otu n’ime ndị egwuregwu ya. Nna nwata nwoke ahụ eyie onye ahụ na-enye ọzụzụ egwu na ya ga-egbu ya, e wee maa nna ahụ ikpe ịga nga ụbọchị 45.

▪ N’oge ụmụaka na-amụgharị egwuregwu hockey a na-eme n’elu ice, ndị nna abụọ malitere arụmụka banyere otú a ga-esi hụ na a gbasoro ụkpụrụ na-achịkwa egwuregwu ahụ. Otu n’ime ndị nna ahụ kụgburu onye nke ọzọ n’ihu ụmụ atọ nke onye ahụ a kụgburu.

AKỤKỌ ndị na-awụ akpata oyi dị ka ndị a ejupụtawo ebe nile n’ụzọ dị egwu. O yiri ka ime ihe ike ọ̀ na-amụba n’ọgbọ egwuregwu dị iche iche. Ọ bụ ime ihe ike nke ndị nne na nna na ndị na-enye ndị egwuregwu ọzụzụ bụ́ ndị na-ahọrọ ịlụ ọgụ kama ha na-agaghị emeri. Jeffrey Leslie, bụ́ onyeisi oche nke Òtù Egwuregwu Jupiter-Tequesta (Florida) kwuru, sị: “Ahụwo m ka ndị nne na nna na-abara ụmụ ha mba, na-arụgidesi ha ike imeri; ka ụmụaka na-alụ ọgụ n’egwuregwu, n’ihi ịbụ ndị nne na nna ha kpaliri; ka ụmụaka guzo n’ọgbọ egwuregwu baseball na-ebe ákwá n’ihi ịbụ ndị nne na nna ha mechuru ihu.” Ọ gbakwụnyere, sị: “N’ezie, egwuregwu ndị ntorobịa na-eme ka ndị nne na nna na-akpa àgwà n’ụzọ jọgburu onwe ya.” Iji chebe ụmụaka pụọ n’ime ihe ike dị otú ahụ, ógbè ụfọdụ emewo ihe siri ike n’ịmachibido ndị nne na nna ụfọdụ ịga ebe ụmụ ha na-eme egwuregwu.

Gịnị siworo ná ntiwapụ nke ọnụma a pụta? “Akparamàgwà a dị ihere nke ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị toworo eto,” ka Fred Engh, bụ́ onyeisi oche na onye guzobere Òtù Mba nke Na-ahụ Maka Egwuregwu Ndị Ntorobịa bụ́ nke dị na Florida, na-ekwu, “na-enwe mmetụta dị njọ n’egwuregwu ndị ntorobịa, na-emebi ụtọ ya, na-emekwa ka ọtụtụ nde ụmụaka nwee echiche na-adịghị mma.”

Mmeri n’Agbanyeghị Ihe Ọ Ga-efu

O yiri ka ihe bụ́ isi na-akpata nsogbu a ọ̀ bụ ọchịchọ nke ụfọdụ ndị nne na nna na-enwe ịhụ ka ụmụ ha mekarịrị ndị ọzọ ma merie n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-efu. Otu onye nnọchiteanya nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mgbochi nke Imeso Ụmụaka Ihe Ike, bụ́ nke dị na Canada kwuru, sị: “Mgbe mmeri bụ ihe kasị mkpa, mgbe ịka ndị ọzọ ike bụ ihe kasị mkpa, nke a na-eme ka e nwee ọnọdụ ebe ndị na-adịghị ike na-ahụju anya. N’egwuregwu ndị a, ọ bụ ụmụaka ka ọ na-adịkarị mfe imerụ ahụ́.” Onyeisi ọrụ nke Òtù Mmụta Mmega Ahụ́ na nke Ahụ́ Ike dị n’Ontario (Canada) kwuru na ụmụaka ndị a na-arụgide otú ahụ “pụrụ ịmalite inwe nsogbu akparamàgwà na nwata. Mgbe ha tokwara, ha [pụrụ] ịdị na-enwe ihe isi ike n’ịnagide ọdịda.”

Ọ bụghị ihe ijuanya na ọnụma nke ndị nne na nna na oké ịnụ ọkụ n’obi nke ndị na-enye ndị na-eme egwuregwu ọzụzụ na-abụkarị nke ndị ahụ na-eto eto na-eme egwuregwu na-amụrụ. N’otu oge ụmụ agbọghọ nọ na-akụ bọl aka a na-akpọ volleyball, ndị egwuregwu ahụ wakporo ndị na-egbu pịọm ugboro asaa. Otu nwa agbọghọ a chụpụrụ n’otu egwuregwu tennis megwaara site n’imebi ụgbọala nke otu n’ime ndị na-ahazi egwuregwu ahụ. Mgbe e gburu opi maka iwu ọ dara, otu onye mgba nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị biri onye na-egbu pịọm isi, onye ahụ na-egbu pịọm atụbọọ. “Egwuregwu ndị ntorobịa bụbu egwuregwu a na-eji àgwà kwesịrị ekwesị eme,” ka Darrell Burnett, bụ́ ọkà n’akparamàgwà ụmụaka nakwa ọkà n’inyocha akparamàgwà ndị ntorobịa mgbe ha na-eme egwuregwu kwuru. “Ọ dịghịzi otú ahụ. Ọ bụghịzi egwuregwu.”

Ihe Ndị Nne na Nna Pụrụ Ime

Ndị nne na nna ga-eme nke ọma icheta na ihe mere ụmụaka ji ekere òkè n’egwuregwu bụ iji kporie ndụ nakwa iji megaa ahụ́. Ime ka egwuregwu ụmụaka ghọọ ihe na-akpata oké nrụgide nakwa ịgwakasị ha okwu ahụ́ adịghị arụpụta ezi ihe—ọ dịghịkwa egosipụta ịhụnanya. Bible na-ekwu, sị: “Ndị nne na nna, unu akpalila ụmụ unu inwe ọnụma.”—Ndị Efesọs 6:4, The Jerusalem Bible.

Gịnị pụrụ inyere nne ma ọ bụ nna aka ime ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’akụkụ a? Nke mbụ, ọ pụrụ inye aka ma ọ bụrụ na ị gbalịa iburu n’uche otú ọ dị gị mgbe ị dị obere. Ị̀ nọ na-emeta egwuregwu n’ezie n’ụzọ fọrọ nke nta ka i yie ọkachamara? Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya ka nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị na-emeta ya otú ahụ? E kwuwerị, ‘ụmụaka adịghị ike.’ (Jenesis 33:13) Ọzọkwa, gbalịa inwe echiche dị mma banyere mmeri na ọdịda. Bible na-akpọ asọmpi a na-achịkwaghị achịkwa “ihe efu na ịchọ ijide ifufe.”—Eklisiastis 4:4.

N’ụzọ na-akpali mmasị, otu onye na-apịabu baseball n’ọgba league nke mbụ na-agba ndị nne na nna ume ile mmeri na ọdịda anya otú kwesịrịnụ, ọ bụghị iwe iwe mgbe nwatakịrị na-emeghị nke ọma ma ọ bụ ịṅụrịbiga ọṅụ ókè mgbe o meriri. Kama ime ka mmeri bụrụ ihe kasị mkpa, ndị nne na nna kwesịrị ilekwasị anya ná ntụrụndụ nke ụmụaka ahụ nakwa n’abamuru nke ha ịnọgide na-enwe ahụ́ ike.

N’ihi ya, ụfọdụ ndị nne na nna ekwubiwo na egwuregwu ụmụaka a haziri ahazi na-akpali mmụọ na-adịghị mma nke asọmpi. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ụmụ ha adịghị eso ndị ọzọ egwuri egwu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst achọpụtawo na ụmụ ha na-anụ ụtọ iso ndị kwere ekwe ibe ha na-egwuri egwu n’azụ ụlọ ma ọ bụ n’ogige ntụrụndụ dị n’ógbè ha. N’ụzọ dị otú a, nne na nna ahụ na-aka enwe ike ịchịkwa mkpakọrịta nke ụmụ ha. Ezinụlọ ime mkpapụ pụrụ iwetakwu ohere ndị ọzọ iji nwee egwuregwu na-ewuli elu. N’eziokwu, o yikarịrị ka egwuregwu a nọ n’azụ ụlọ na-eme agaghị enwe mkpali yiri nke ịnọ n’òtù egwuregwu na-emeri emeri. Otú ọ dị, echefula na “ọzụzụ nke ahụ́ bara uru nke nta; ma nsọpụrụ Chineke bara uru maka ihe nile.” (1 Timoti 4:8) Site n’ịnọgide na-enwe echiche a ziri ezi banyere egwuregwu, ị pụrụ ime ka nwa gị ghara ịbụ onye ntiwapụ ọhụrụ a nke ime ihe ike metụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Egwuregwu kwesịrị ịbụ ihe ntụrụndụ, ọ bụghị ihe na-akpata esemokwu