Gris Akwadoo Ihe Ndị Ruuru Mmadụ n’Ụzọ Okpukpe
Gris Akwadoo Ihe Ndị Ruuru Mmadụ n’Ụzọ Okpukpe
NA NKE MBỤ YA, ọchịchị Gris n’afọ gara aga nyere Ndịàmà Jehova ikike iji otu n’ime ọgbọ egwuregwu ya kasị mma nwee mgbakọ ukwu. Ọ bụ Ụlọ Egwuregwu Olympic maka egwuregwu ndị a na-eme n’ime ụlọ, bụ́ nke nwere oche na-ezu ihe dị ka mmadụ 20,000. Ọgbọ egwuregwu a bụ́ nke nwere ntụoyi bụ akụkụ ihe owuwu a ga-eji mee Egwuregwu Olympic nke 2004 n’Atens.
N’ụzọ dị ịrịba ama, na 1963 nakwa na 1988, Ndịàmà dokwara iji nnukwu ọgbọ egwuregwu ndị dị n’Atens nwee mgbakọ ha. Otú ọ dị, n’oge abụọ ndị ahụ, ndị ọchịchị tụrụ ụjọ n’ihi iyi egwu Chọọchị Ọtọdọks nke Gris yiri ha, ha wee jụ ikwe ka Ndịàmà jiri ha mee ihe.
Ihe Dị Iche Esi na Ya Pụta
Na February 2001, Ndịàmà tinyere akwụkwọ maka iji Ụlọ Egwuregwu Olympic ahụ—otu n’ime ụlọ egwuregwu ole na ole buru nnọọ ibu ịbata ha—mee ihe. Ma ha chere ma ihe mere mbụ ọ̀ ga-eme ọzọ. Dị ka a tụrụ ụjọ ya, ndị ọchịchị jụrụ ná nzaghachi mbụ ha.
Ma ozugbo ahụ, e jekwuuru ndị isi ọchịchị ọkwá ha dị elu bụ́ ndị e ji ikpe ziri ezi na enweghị ajọ mbunobi mara. Hà ga-adị njikere ịkwado ikike ife ofufe na inwe mgbakọ udo bụ́ nke iwu obodo kwadoro? Hà ga-eguzogide nrụgide sitere n’aka ndị okpukpe? Ha mere otú ahụ, mkpebi ọhụrụ e mere kagburu ọjụjụ a jụburu. Nke a mere ka Ndịàmà nwee ike idokwa inwe mgbakọ ha n’Ụlọ Egwuregwu ahụ na July 27-29, 2001.
N’otu oge ahụ, ndị ọchịchị nyere ikike ka Ndịàmà jiri ụlọ egwuregwu ọzọ gọọmenti na-achịkwa, bụ́ Palais de Sport dị na Tesalonaịka, mee ihe.
Nrụgide Siri Ike Akụọ Afọ n’Ala
Ka ụbọchị mmeghe nke mgbakọ ahụ n’Atens na-eru nso, a nọgidere na-ajụ ajụjụ ndị na-akpata ahụ́ erughị ala: Ndị ọchịchị hà ga-anọgide n’ihe ha kwetaworo n’agbanyeghị nrụgide sitere n’aka ndị ụkọchukwu Ọtọdọks? Ndịàmà hà ga-enwekwa ike inwe nnọkọ ha n’abụghị ndị ìgwè ndị mmebi iwu ga-egbochi?
Chọọchị Ọtọdọks ahapụghị ụzọ aghụghọ ya dịteworo aka nke ịnwa iji ikike o nwere kpaghasịa mgbakọ ahụ. Ụlọ ọrụ TV dị iche iche kpughere na ndị ụkọchukwu Ọtọdọks gwasiri ha ike ka a ghara ikwute banyere mgbakọ ahụ. Otú ọ dị, mgbalị chọọchị ahụ kụrụ afọ n’ala.
N’ụzọ megidere ihe bụ́ eziokwu, Chọọchị Ọtọdọks ebowo Ndịàmà ebubo na ha bụ okpukpe nzuzo. Ma n’ezie ọ bụ chọọchị ahụ nwara igbochi ọha na eze ịmara ihe na-eme n’ime Ụlọ Egwuregwu ahụ. Ọ bụ ihe obi ụtọ na nrụgide nke ndị ụkọchukwu egbochighị ndị nta akụkọ obi siri ike sitere n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị iche iche. Ha ji ịkwụwa aka ọtọ kọzuchaa banyere mgbakọ ahụ.
Ọzọkwa, ọtụtụ puku ndị bịaranụ keere ókè n’ịgwa ọha na eze banyere mgbakọ ahụ ma na-agwa ha okwu banyere ihe ndị ha kweere. N’ebe ọ bụla ndị gara mgbakọ ahụ jere, e ji baajị odo odo ha mata ha. A kpọrọ ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova òkù ịbịa mgbakọ ahụ, ha bịakwara wee mụbaa ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ n’Ụlọ Egwuregwu ahụ n’ụbọchị nke ikpeazụ ịbụ 15,760. Ná ngwụsị izu abụọ ikpeazụ nke July, mgbakọ ndị e nwere na Palais de Sport dị na Tesalonaịka nwere ngụkọta nke mmadụ 13,173 bịaranụ.
A Kpaliri Mmasị Ndị Kiriri Ihe Merenụ
Mgbe ọtụtụ ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo dị 2,604—bụ́cha Ndịàmà Jehova—gbakọtara n’Ụlọ Egwuregwu ahụ, na-asacha ya, na-ete ya ágbá, na-akwadebekwa maka mgbakọ ahụ, manịja ọgbọ egwuregwu ahụ sịrị: “Anyị bịara iji anya anyị hụ ihe na-emetụbeghị mbụ n’ebe a.” Otu onye kwuru, sị: “Unu kwesịrị iji ihe owuwu a na-eme ihe kwa afọ ka unu wee na-edozigharị ya n’ụzọ zuru ezu.”
A kpaliri mmasị nke Andreas Vardakis, bụ́ onye ntụzi n’ihe ndị metụtara ọha na eze n’Ụlọ Egwuregwu ahụ. “Unu achọwo ihe owuwu a mma,” ka o kwuru. “Anyị nwere ndị ọrụ ịrụ ọrụ n’ebe a. Ma òkè unu keere bụ isi ihe mere mgbakọ a ji gaa nke ọma.”
N’oge mgbakọ ahụ, mgbe otu onyeisi ndị uwe ojii matara na ọ dịghị mkpa ka o ziga ndị ikom ịga chịkwaa ìgwè ahụ na-eme ihe n’udo, ọ sịrị: “Ahụtụbeghị m omume ọma na ime ihe n’usoro dị otú ahụ! ”
Ihe Pụtara Ìhè ná Mgbakọ Ahụ
N’okwu mmechi nke mgbakọ ahụ, a mara ọkwa na Ministrị Na-ahụ Maka Agụmakwụkwọ na Okpukpe ná Mba Gris anabatawo Ndịàmà Jehova dị ka “okpukpe a ma ama.” Ọzọkwa, Ministrị ahụ enyeworị isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova ná mba ahụ bụ́ nke dị n’Atens nnabata ndị ọchịchị kwadoro. Otu akụkụ ihe odide gọọmenti ahụ kwuru, sị:
“Ọchịchị a na-agụ Ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Jehova dị ka okpukpe a ma ama . . . ha ga na-erite uru nile iwu kwadoro bụ́ nke ga-esi na ya pụta. Akụkụ Iwu Obodo ahụ a kpọtụrụ uche na-echekwa nnwere onwe ife ofufe, ụzọ na ihe ndị e ji efe ofufe, na nnwere onwe ime nhọrọ banyere ụzọ isi na-eduzi nakwa na-ahazi chọọchị ma ọ bụ nnọkọ okpukpe nke ọ bụla. N’ụzọ doro anya, nchekwa nke a metụtara ala na ihe owuwu òtù ahụ bụ́ nke dị na Marousi [alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ka] ebe dị nsọ, nke a raara nye maka ofufe Chineke. A na-akpọ ihe owuwu dị otú ahụ Betel, ya bụ, ‘Ụlọ Chineke.’”
Ndịàmà Jehova, tinyere onye ọ bụla ọzọ na-akwado nnwere onwe okpukpe, nwere obi ekele maka ihe ndị a merenụ. Ekpere ha bụ na n’ihi ihe a merenụ, ndị mmadụ ga-enwe ike ibi ndụ ha dị ka Ndị Kraịst n’ụzọ “dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe akpọrọ ihe.”—1 Timoti 2:1, 2.
[Foto ndị dị na peeji nke 30]
Ndịàmà agbakọọ n’Ụlọ Egwuregwu Olympic
[Ebe E Si Nweta Foto]
Harry Bilios