Iburu Nchebe n’Uche
Iburu Nchebe n’Uche
ỊNỌ n’ụgbọelu na-efe n’ebe dị kilomita 11 site n’ụwa pụrụ ịbụrụ ụfọdụ ndị ahụmahụ na-emenye ụjọ. Ọ pụrụ ịdị ka ọ̀ na-emegide iwu dị iche iche nke okike. Ebe ọ bụ na e nwewo ọganihu n’ụkpụrụ nchebe nakwa ná ndabere a pụrụ ịdabere n’iji ụgbọelu eme njem, ihe ize ndụ nke pụrụ ịdị n’ịnọ n’ụgbọelu ji oké ọsọ na-efe n’elu adịwo obere. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ihe ike ndị na-emenụ na-echetara anyị na ihe mberede pụrụ ime.
Ịnagide Ụjọ
N’agbanyeghị ihe ndị ahụ na-emenụ, eri oge dị anya gara aga, ụmụ mmadụ ekwupụtawo ọchịchọ ha nwere ife efe. Otu puku afọ tupu Kraịst, Eze Devid dere, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na enwere m nku dị ka nduru! M ga-efela.” (Abụ Ọma 55:6) Dị ka e gosiwororị, nkà na ụzụ nke oge a emewo ka iji ụgbọelu eme njem bụrụ otu n’ime usoro ime njem nke kasị bụrụ nke na-adịghị ize ndụ. Ee e, o zughị okè. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’ụwa a nke na-adịtụghị ize ndụ ma ọ bụ nke a pụrụ ịmatazu ihe ga-esi na ya pụta.
Ọ dị oké mkpa icheta nke ahụ ma ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike imeghachi omume n’ụzọ ezi uche dị na ya mgbe ọ bụ onye ọzọ na-anya ya. Ụfọdụ ndị pụrụ ịdị na-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na m achịkwaa ọnọdụ a, ọ gaghị emenyecha m egwu.’ Ọ bụrụ otú ahụ, ndị dị otú ahụ pụrụ inwe ihe isi ike n’ọnọdụ ndị ha na-enweghị ohere ọ bụla ịchịkwa. Iji ụgbọelu eme njem bụ otu n’ime ọnọdụ ndị ahụ.
N’agbanyeghị mgbalị ndị a na-eme iji mee ka iji ụgbọelu eme njem bụrụkwuo nke na-adịghị ize ndụ, ọ dịghị onye kwesịrị inwe omume ọ̀ gbasara m. Ndị nile na-eji ụgbọelu eme njem pụrụ ijikọta aka n’ibelata ihe ndị pụrụ ịkpata ọdachi. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ọchịchị na-adọ aka ná ntị banyere ihe iyi egwu ndị na-aga n’ihu. Otu ilu Bible amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Onye nwere Ilu 22:3) Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịghọta na a ga-enwetụ ihe ize ndụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe omume ọ bụla. Iji lee ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, cheta na iji ụgbọelu eme njem ga-achọ ka i jiri ezi uche mee ihe n’izere ọdachi dị nnọọ ka ị ga-esi jiri ya mee ihe n’ichebe onwe gị n’ọnọdụ ndị ọzọ.
ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.” (Ndị na-eji ụgbọelu eme njem mgbe mgbe pụrụ ịka dịrị njikere ilekọta onwe ha n’oge ndị a siri ike. Nke a bụ n’ihi na ndị na-eme njem mgbe mgbe maara banyere ọdụ ụgbọelu na ụgbọelu nke ọma karịa ndị njem ndị ọzọ. Ị pụrụ inweta ihe ọmụma zuru ezu ma nwee ahụ́ iru ala dị ka ha onwe ha site n’ịgbaso nzọụkwụ ndị dị mfe a kọwara n’igbe ndị malitere na peeji bu nke a ụzọ.
Ime Njem n’Enweghị Nchegbu
Ọ bụ ezie na ebe ndị a na-enyocha ndị mmadụ na-arụ ọrụ ndị dị mkpa, ụfọdụ ndị njem—karịsịa ndị ọ dị ngwa ngwa—na-elekarị ha anya dị ka ihe mkpasu iwe. N’iburu n’uche usoro nchebe ka ukwuu e nwere n’ọtụtụ ọdụ ụgbọelu, ị pụrụ ịchọ ịmalite itinye aro ndị na-esonụ n’ọrụ maka ịgafe n’ebe ndị a na-enyocha mmadụ n’ụzọ dị mfe karị:
▪ Rute n’oge. Site n’ime ndokwa ka ị nọrọ n’ọdụ ụgbọelu ruo oge ụfọdụ tupu ụgbọelu efelie, ị pụrụ iji nwayọọ mee ihe, mee ka ahụ́ ruo gị ala, ma zere nchegbu nke ihe ị na-atụghị anya ya ma ọ bụ ihe ndị pụrụ isiri gị ike pụrụ ịkpata.
▪ Mgbe ị na-ahọrọ ụgbọelu ị ga-eso, chọọ nke ndị achụmnta ego na-ejikarị eme njem. Ha maara ihe ékwé na-akụ, na-ebu obere ihe, ma na-achọ ife ọsọ.
▪ Tupu i si n’ọnụ ụzọ ahụ na-achọpụta ígwè gafee, wepụta ihe ndị ahụ i chere pụrụ ime ka ihe mgbaàmà bewe. Ha na-agụnye mkpịsị ugodi, mkpụrụ ego, ọla, na fon ndị a na-eji agagharị agagharị. Nye ha onye na-elekọta ebe ahụ mgbe ị na-ejikere isi n’ọnụ ụzọ ahụ gafere.
▪ Nyiwe akpa na ibu ndị ọzọ na belt na-ebu ngwongwo; ọ bụrụ na onye na-ahụ maka kọmputa na-ese ihe dị n’ime akpa foto ahụ onyinyo nke ihe a na-edozighị edozi, ọ pụrụ ịchọ ka i wepụtasịa ihe ndị i tinyere n’ime akpa gị ma ọ bụ ka i tinyeghachi ya na belt ahụ na-ebu ngwongwo.
▪ Gwa onye ahụ na-anọ n’ọnụ ụzọ na ọ dị ihe ndị a na-adịghị ahụkebe ị na-atụ anya na onye ahụ na-ahụ maka kọmputa na-ese ihe ndị dị n’akpa foto ga-ahụ, dị ka ngwá egwú ochie bụ́ mandolin nke e ji ọlaọcha mee bụ́ nke nne gị ochie nyere gị. N’ịbụ onye nkọwa ezi uche dị na ya i nyere banyere onyinyo dị aṅaa ọ hụrụ na kọmputa ahụ juru afọ, o yikebeghị ka onye ahụ na-anọ n’ọnụ ụzọ ọ̀ ga-esi ọnwụ na ya ga-enyocharịrị ya. Ọ bụrụ n’ezie na ọ dị gị ngwa ngwa, wepụta ihe ahụ tupu ha achọọ inyocha ya ma kwuo ka e jiri aka nyochaa ya.
▪ Ọ bụrụ na ihe mgbaàmà ahụ ebewe, mee ihe ha chọrọ ka i mee ma nye nkọwa ozugbo. Ọ bụrụ na onye ahụ na-anọ n’ọnụ ụzọ amara na ọ bụ ihe dị iche mere ka ihe mgbaàmà ahụ bewe, ọ bụrụ na o nwere onye ya na ya nọ nke ji ihe a na-eji n’aka achọpụta ígwè, ọ ga-agwa gị ka ị gakwuru ya.
▪ Otu ihe doro anya ga-eme ka ụgbọelu hapụ gị bụ iji ijichi ụgbọelu ma ọ bụ bọmbụ gwuo egwu. Tụkwasị n’ịbụ onye ndị na-ahụ maka nchebe n’ọdụ ụgbọelu nyochara nke ọma, a pụrụ ibo gị ebubo ịda iwu.
Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Iji Ụgbọelu Eme Njem!
Ọ̀ pụrụ ikwe mee ịhọrọ ụgbọelu nke na-adịghị ize ndụ? Eenụ. N’agbanyeghị ụgbọelu nke ị họọrọ, ohere ndị e nwere na ị ga-erute n’enweghị mmerụ ahụ́ buru ibu. Ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ, mee nnyocha banyere ihe ndekọ maka adịghị ize ndụ nke ụgbọelu ị na-eme atụmatụ iji mee njem. Buru n’uche na n’agbanyeghị ihe mberede ụgbọelu, a ka na-ele iji ụgbọelu eme njem anya dị ka otu n’ime ụzọ ndị kasị bụrụ ndị na-adịghị ize ndụ e si eme njem.
Ka ọ dịgodị, anyị pụrụ ịtụ anya oge—mgbe Chineke ga na-achị ụwa—a ga-anọ ná nchebe ma nọrọ ná ntụkwasị obi. N’ime ezinụlọ na-atụ egwu Chineke, nke dị n’udo, a gaghị enwe ọnọdụ maka onye ọ bụla na-etinye ndụ ụmụ mmadụ n’ihe ize ndụ. Ndị mmadụ “ga-anọ ná nchebe n’atụghị egwu ọdachi.”—Ilu 1:33, Holy Bible—Contemporary English Version.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 10, 11]
ARO ỤFỌDỤ MAKA NCHEBE
Jiri ụgbọelu na-agaghị akwụsị n’ụzọ na-eme njem. Ihe ka ọtụtụ n’ihe mberede ndị a na-enwe na-ewere ọnọdụ mgbe ụgbọelu na-agba ọsọ ọ ga-eji felie, mgbe ọ na-efeli, mgbe ọ na-efedata, ma ọ bụ mgbe ọ na-ada. Iji ụgbọelu na-agaghị akwụsị n’ụzọ eme njem ga-eme ka mmadụ ghara ikpughepụ onwe ya nye oge ndị a ụgbọelu na-enwekarị ihe mberede na ha.
Họrọ ụgbọelu buru ibu karị. A na-agbasokarị ụkpụrụ ndị siri ike karị arụ ụgbọelu ndị na-ebu ihe karịrị mmadụ 30, na-agbasokwa otu ụkpụrụ ahụ iji kpebie ma ò ruru eru ife n’elu karịa ụkpụrụ ndị a na-agbaso ma a bịa n’ụgbọelu ndị dị obere karị. Ọzọkwa, ọ bụrụ na e nwee ajọ ihe mberede, bụ́ nke na-eyighị ka ọ ga-eme, ndị njem na-enwe ohere ka ukwuu ịdị ndụ n’ụgbọelu nke buru ibu karị.
Ṅaa ntị ná ntụziaka a na-enye tupu ụgbọelu efelie. Ọ bụ ezie na ihe ọmụma ahụ na-eyi ihe a na-ekwu ugboro ugboro, ebe ọnụ ụzọ nke kasị dịrị gị nso bụ́ nke a pụrụ isi na ya pụọ ma e nwee ọnọdụ mberede, dị, pụrụ ịdị iche dabere n’ụgbọelu ị bara nakwa n’oche nke ị nọ na ya.
Etinyela ihe ndị dị arọ n’ebe a na-etinye ihe n’elu ebe ị nọ. Ebe ndị a na-etinye ihe n’elu ebe ị nọ nwere ike ghara ijideli ihe ndị dị nnọọ arọ ma ụgbọelu ṅagharịwa aṅagharịwa, n’ihi ya ọ bụrụ na i bu ihe ga-adị gị arọ iburu tinye n’ebe ahụ a na-etinye ihe, debe ya ebe a na-edebe ibu tupu ị banye.
Kee belt oche gị mgbe ị nọdụrụ ala. Ike belt gị mgbe ị nọdụrụ ala ga-enyekwu gị nchebe pụrụ ịdị gị mkpa ma ọ bụrụ na ụgbọelu ahụ aṅagharịa na mberede.
Ṅaa ndị na-elekọta ndị njem n’ụgbọelu ntị. Ihe bụ́ isi mere e ji enwe ndị na-elekọta ndị njem n’ụgbọelu bụ maka nchebe, n’ihi ya, ọ bụrụ na otu n’ime ha agwa gị mee ihe, buru ụzọ mee ya tupu ị jụwa ajụjụ.
Ejila ihe ọ bụla dị ize ndụ. E nwere ọtụtụ ihe ndị dị ize ndụ a na-adịghị ekwe ka e jiri banye n’ụgbọelu, ma ezi uche kwesịrị ime ka ị mata na i kwesịghị iji mmanụ ụgbọala, ihe ndị na-erichapụ ihe, gas ndị nwere nsí, na ihe ndị yiri ha, banye n’ụgbọelu, ọ gwụla ma ụlọ ọrụ nwe ụgbọelu ahụ ò kwere ka i jiri ha banye ma tinye ha n’arịa kwesịrị ekwesị.
Aṅụbigala mmanya ókè. Mmanya ọ bụla na-aba n’anya ị ṅụrụ ga-emetụta gị nke ukwuu n’elu karịa n’ala. Ịṅụ mmanya ókè kwesịrị ekwesị bụ ihe ezi uche dị na ya ma ị̀ nọ n’elu ma ị̀ nọ n’ala.
Nọrọ na nche. Ọ bụrụ na e nwee ọnọdụ mberede, bụ́ nke na-eyikarịghị ka ọ ga-eme, dị ka ịkpọpụ ndị mmadụ na mberede iji zere ọdachi, i kwesịrị ịgbaso ntụziaka nke ndị na-elekọta ndị njem n’ụgbọelu na ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọelu ma si n’ụgbọelu ahụ pụta ngwa ngwa o kwere mee.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: AirSafe.com
[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]
IMESIGHACHI EZINỤLỌ GỊ OBI IKE
Ọ bụrụ na ị na-eme njem, lee ụzọ ị pụrụ isi nyere ezinụlọ gị aka ịnagide nchegbu ndị ha na-enwe. E nwetara ya n’ebe òtù United Behavorial Health na-edebe ihe n’Intanet
Soro ezinụlọ gị kwurịta okwu. Tupu gị agawa njem, wepụtatụ oge soro ndị ị hụrụ n’anya kwurịta banyere nchebe gị nakwa nke ha. Kọwaa ihe ọhụrụ ndị e meworo maka nchebe nakwa otú ha ga-esi atụnye ụtụ ná nchebe gị mgbe ị na-eme njem.
Kwee ka ha kwupụta nchegbu ndị ha na-enwe. Kwee ka ezinụlọ gị kwuo banyere nchegbu ha na-enwe. Ha hụrụ gị n’anya ma chọọ ka ị ghara ịnọ n’ihe ize ndụ. Gee ha ntị nke ọma, n’akatọghịkwa ha, na-ekweta na ụjọ ha na nchegbu ha kwesịrị nnọọ ekwesị.
Mesighachi ha obi ike site n’ikwu eziokwu. Kwuo otú ụlọ ọrụ dịgasị iche iche si na-agbalị igbochi ndị na-eyi ọha egwu ime mwakpo ọzọ. Mgbalị ndị a na-agụnye ihe ndị a na-eme iji nọrọkwuo ná nchebe n’ọdụ ụgbọelu nakwa n’ime ụgbọelu. Ohere e nwere na ihe ọjọọ ga-eme mgbe ị nọ n’ụgbọelu dị nnọọ obere.
Na-akpọtụrụ ha. Kwee ha nkwa na ị ga-akpọ ha na fon mgbe i ruru ebe ị na-aga. Nọgide na-akpọ ezinụlọ gị na fon n’ụzọ chiri anya mgbe ị na-alọtabeghị. Ọ dịkwa mkpa ka ezinụlọ gị mara ụzọ ha ga-esi kpọtụrụ gị ma ọ bụrụ na ọnọdụ mberede adapụta.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Dị njikere ime ihe a gwara gị mee n’ebe ndị a na-enyocha ndị mmadụ