Ikiri Ụwa
Ikiri Ụwa
Okwu Rere Ure Na-arịwanye Elu
Ọtụtụ Ndị Ebe Ugwu America na-echegbu onwe ha n’ihi “ọdịda ha dara n’ichebe àgwà ọma,” ka otu isiokwu dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kwuru. Nke a na-apụta ìhè karịsịa ná “nnabata na-arịwanye elu a na-anabata ịkpọ iyi.” Dị ka P. M. Forni, bụ́ onyeisi Atụmatụ Maka Àgwà Ọma na Mahadum nke Johns Hopkins si kwuo, okwu rere ure jupụtara ebe nile ugbu a nke na ọtụtụ ndị na-eto eto anaghị eche na o zighị ezi, ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị meworo okenye na-eme ka à ga-asị na ha amaghị banyere ya ma ọ bụ na ọ gbasaghị ha. Akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ na dị ka Prọfesọ Timothy Jay si kwuo, “ụmụaka na-amalite ikwu okwu rere ure mgbe ha dị nanị otu afọ, bụ́ mgbe ha na-enwe ike iṅomi okwu ndị ha nụrụ site n’ọnụ ndị mụrụ ha nakwa na telivishọn.” Ọnụ ọgụgụ e nwetara site n’otu nnyocha gosiri na “okwu rere ure mejupụtara pasent 10 nke okwu ndị onye meworo okenye na-eji eme ihe n’ebe ọrụ, mejupụtakwa pasent 13 nke okwu ndị ọ na-eji eme ihe n’ihe omume ntụrụndụ.” Ndekọ ọnụ ọgụgụ ọzọ Star hotara gosiri na na United States, “okwu rere ure a na-ekwu na telivishọn ji ihe karịrị pasent 500 mụbawanye site na 1989 ruo 1999.”
“Ọrịa Anyị Pụrụ Izere Ezere”
“Ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis bụ ọrịa anyị nwere ike izere ezere,” ka The Sun-Herald nke Australia na-ekwu. “Ọtụtụ mgbe a pụrụ igbochi ya egbochi. Ma, e kwuru na ka ọ na-erule afọ 2020, ọ bụ ndị inyom ọkpụkpụ ha gbajiri agbaji ga-emejupụta otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị e nyere àkwà n’ụlọ ọgwụ.” Akụkọ Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Ọkpụkpụ Bụ́ Osteoporosis nke Australia na-egosi na ọrịa ahụ, bụ́ nke na-eme ka ọkpụkpụ nwee oghere ma na-agbaji agbaji ngwa ngwa, “juru ebe nile karịa ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke cholesterol, ihe ndị ahụ́ na-asọ asọ, na àzụ̀zụ̀. Ọ na-ewe ego buru ibu iji gwọọ ya karịa ọrịa shuga ma ọ bụ ụkwara ume ọkụ. Ọnụ ọgụgụ ndị inyom na-anwụ n’ihi úkwù mgbaji karịrị nke ndị inyom nile na-anwụ n’ihi ọrịa cancer ma a gụkọta ha.” Dị ka Prọfesọ Philip Sambrook si kwuo, ngụkọ e mere gosiri na n’Australia, ọkpụkpụ nke ọkara ndị inyom na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị ikom ga-agbaji n’ihi ọrịa osteoporosis n’oge ndụ ha. “Ụzọ kasị mma isi gbochie ya,” ka akwụkwọ ahụ na-ekwu, “bụ mmadụ ime ka ọkpụkpụ ya sie nnọọ ike n’ime iri afọ atọ mbụ nke ndụ ya site n’inwe mmega ahụ́ na ịṅụ calcium zuru ezu.” A pụrụ ibelata ohere e nwere ịrịa osteoporosis site n’izere ise siga na ịṅụbiga ihe na-aba n’anya ma ọ bụ caffeine ókè. Àgwà ndị ga-enye aka belata ya gụnyere inwe mmega ahụ́ mgbe nile na iri ihe oriri ndị jupụtara na calcium na vitamin D.
Oziọma na Mbara Igwe
Ka ndị ọkà mmụta sayensị na-arụrịta ụka ma è nwere ihe ndị dị ndụ na mbara igwe, ndị ụkọchukwu nọ n’Ebe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Na-anọ Ekiri Kpakpando na Vatican, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Berliner Morgenpost na-akọ, ekwubiwo na “ọ bụghị nanị ndị bi n’ụwa bụ ihe ndị Chineke kere n’eluigwe na ụwa. Chineke kekwara ihe ndị dị ndụ n’ụwa ọzọ.” Dị ka George Coyne, bụ́ onye nduzi nke ebe ahụ ndị ọkà mmụta sayensị na-anọ ekiri kpakpando kọwara, “eluigwe na ala buru nnọọ ibu nke na nanị anyị apụghị ịnọ na ya.” Iji mee ka ndị a bi n’ụwa ọzọ nụ Oziọma ahụ, ọtụtụ ebe obibi ndị mọnk anọwo na-eziga Agba Ọhụrụ n’ime mbara igwe n’ụdị ozi e ji mkpụrụ akwụkwọ ndochianya dee. Ihe ọzọ Vatican ga-achọ ịmata, ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu, “bụ ma Jizọs Kraịst ọ̀ pụtawo ìhè na mbara ala ndị ọzọ.” Ọzọkwa, ka Coyne na-agbakwunye, “ma Jizọs Kraịst ọ̀ zọpụtawokwa ndị bi” na mbara ala ndị ahụ.
Ịhịgharị Klọọkụ “Ụbọchị Mbibi”
Ndị ntụzi nke akwụkwọ bụ́ The Bulletin of Atomic Scientists ejiriwo minit abụọ hịga aka Klọọkụ Ụbọchị Mbibi ahụ a ma ama “n’ihu ka ọ fọdụ minit asaa tupu elekere iri na abụọ nke etiti abali,” ka akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị na Paris bụ́ International Herald Tribune na-akọ. Ihe kpatara mgbanwe a bụ “nchegbu e nwere n’ihi mgbalị a na-eme nke nta nke nta ịchịsa ngwá agha, ịdị nchebe nke nkwakọba ngwá agha nuklia nke e nwere ugbu a na iyi ọha egwu.” Klọọkụ ahụ—nke bụ́ ihe na-egosi otú ụwa si nọrọ nso ná mgbuchapụ nke agha nuklia—abụwo nke a hịgharịrị ugboro 17 kemgbe a malitere iji ya eme ihe na 1947. Mgbe ọdịda Soviet Union gasịrị na 1991, a hịgara aka ya azụ ka ọ fọdụ minit 17 tupu etiti abalị, ma kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a aka klọọkụ ahụ anọwo na-eji nwayọọ nwayọọ na-abịaru etiti abalị nso. Mgbe ikpeazụ a hịgara aka klọọkụ ahụ ihu bụ na 1998, site na minit 14 tupu etiti abalị gaa na minit 9. Kemgbe ahụ, ọ bụ nanị ngwá agha nuklia 3,000 ka e bibiworo, na-ahapụ ihe karịrị 31,000 n’aka mba ndị nwere ngwá agha nuklia.