Ngosipụta nke Ịhụnanya—Ọrụ Enyemaka nke Were Ogologo Oge Ma Sie Ike
Ngosipụta nke Ịhụnanya—Ọrụ Enyemaka nke Were Ogologo Oge Ma Sie Ike
RICHARD VARA, onye nchịkọta akụkọ nwere ahụmahụ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ Houston Chronicle, bụ onye ihe na-adịghị amasị ngwa ngwa, ma n’afọ gara aga e nwere ihe masịrị ya. “Ahụtụbeghị m ihe ọ bụla yiri ya!” ka o kwupụtara. “O juru m anya.” Lee P. Brown, bụ́ onyeisi obodo Houston Texas, U.S.A., nwekwara otu mmetụta ahụ. Ọ sịrị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na onye ọ bụla nọ na Houston ga-enwe ike ịhụ ihe unu rụrụ. Ọ masịrị m nke ukwuu.” Gịnị ka ha na-ekwu banyere ya? Onye nchịkọta akụkọ ahụ na onyeisi obodo ahụ nọ na-ekwu banyere ọrụ enyemaka Ndịàmà Jehova rụrụ na Houston. Gịnị ka ọrụ enyemaka a gụnyere? Gịnị mere o ji dị mkpa? Gịnị mere o ji bụrụ nnọọ ihe dị ịrịba ama? Iji chọpụta, ka anyị bidogodị n’isi.
Idei Mmiri Kasị Ukwuu E Nwetụrụla
Ná mmalite June 2001, otu oké ifufe nke na-efe n’ebe okpomọkụ, nke a na-akpọ Allison, fere n’akụkụ dị larịị n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Texas ugboro ugboro. N’ikpeazụ, na Friday, June 8, n’ime awa iri abụọ na anọ, Allison butere oké mmiri ozuzo kpatara idei mmiri dị otu mita n’ogo na Houston—obodo nke anọ kasị buo ibu ná mba ahụ. * N’oge na-adịghị anya, mmiri ahụ nke na-eto n’ike n’ike banyere n’ime ụlọ ahịa, ọfịs dị iche iche, na ọtụtụ iri puku ebe obibi. Okporo ụzọ awara awara ndị dị gburugburu obodo ahụ ghọrọ osimiri na-ekwo ekwo, nke rikpuru ụgbọala na gwongworo ndị dị ogo bụ́ ndị tọrọ atọ. Ogo mmiri ahụ mere ka ọ gharadị ikwe omume iji ụgbọala ndị e ji agbanyụ ọkụ na ụgbọala ndị ọzọ e ji arụ ọrụ nnapụta gaa n’ụfọdụ okporo ụzọ idei mmiri ahụ jupụtara. A kpọrọ ndị ji helikọpta na ụfọdụ ndị agha ji nnukwute ụgbọala ha ka ha napụta ndị mmadụ.
N’ikpeazụ, mgbe ihu igwe gbachapụrụ na Monday, June 11, ọ bịara doo anya na Allison egbuwo ọtụtụ ndị ma bibie ọtụtụ ihe. O gburu mmadụ iri abụọ na abụọ, gụnyere Ndịàmà Jehova abụọ: Jeffrey Green, Onye Kraịst bụ́ okenye, na ọgọ ya nwanyị bụ́ Frieda Willis. * Ọzọkwa, o bibiri ihe ruru ebe obibi 70,000, nke mere ka idei mmiri a bụrụ otu n’ime ọdachi ndị na-emere onwe ha kasị njọ metụtaworo nnukwu obodo mepere emepe. N’eziokwu, site n’ibibi ihe onwunwe ọnụ ego ya fọrọ nke nta ka o ruo ijeri $5, Allison ghọrọ oké ifufe na-efe n’ebe okpomọkụ nke kasị bibie ihe n’akụkọ ihe mere eme nke United States.
Ìgwè Ndị Ọrụ Afọ Ofufo
Akpata oyi wụrụ ndị mmadụ n’ahụ́. Otu onye ọrụ enyemaka kwuru, sị: “Àkwà ha dere mmiri. Kapet ha dere mmiri. Foto ndị ha sere mgbe ha bụ nwata furu.” Ọtụtụ n’ime ihe karịrị Ndịàmà Jehova 16,000 nọ n’ógbè Houston nwere mfu. O bibiri Ụlọ Nzukọ Alaeze asatọ na ọtụtụ narị ebe obibi nke Ndịàmà. Mmiri dị ọtụtụ sentimita jupụtara n’ụfọdụ n’ime ebe obibi ndị a; ebe mmiri jupụtara ná ndị ọzọ ruo elu ụlọ. Ná ngụkọta, o metụtara ihe karịrị ọgbakọ 80 nke Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, a hapụghị ndị ihe a metụtara n’enweghị enyemaka. N’ime ụbọchị ole na ole, ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo gbataara ha ọsọ enyemaka. Òlee otú nke ahụ si mee?
Ọbụna tupu idei mmiri ahụ amalite ịtalata, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị na Houston amaliteworị ime ihe. “Anyị letara ma kpọọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na fon,” ka otu okenye kọrọ. “Anyị chọpụtakwara ihe ndị mebirinụ, ma ka ọ na-erule na Monday, June 11, anyị akwadebewo ihe ndekọ ebe e depụtara aha ndị idei mmiri ahụ metụtara, ọnụ ọgụgụ ebe obibi ndị o bibiri, na ókè mbibi ahụ ruru. E zigakwara ihe ndekọ ahụ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn,
New York.” Ka ụbọchị ole na ole gasịrị, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na United States guzobere kọmitii ọrụ enyemaka nke Ndị Kraịst asatọ bụ́ ndị okenye si Houston mejupụtara ma nye ego enyemaka. Gịnị bụ ọrụ e kenyere kọmitii ahụ? Ọ bụ inyere ndị idei mmiri ahụ metụtara aka inweta onwe ha n’ụzọ mmetụta uche nakwa ịrụzigharị ebe obibi nke Ndịàmà mebiri emebi—nke karịrị ebe obibi 700!‘Òlee otú anyị pụrụ isi rụọ nnukwu ọrụ a?’ ka ndị so na Kọmitii Enyemaka Houston 2001 nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke e guzobere ọhụrụ nọ na-eche. Ha rụgidere ọrụ ruo ime abalị iji hazie atụmatụ mbụ ma kpọọ ihe karịrị ọgbakọ 160 nke Ndịàmà dị n’ógbè Houston òkù ịbịa nye aka. “Ha zaghachiri n’ụzọ dị ukwuu,” ka onyeisi oche kọmitii ahụ kọrọ. “Ihe karịrị Ndịàmà 11,000 wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ, na-enye oge, ikike, na nkà ha n’efu.”
Ọgụ Ndị Ọrụ Afọ Ofufo Lụrụ Megide Ebu
Ụbọchị ole na ole ka idei mmiri tasịrị, ndị ọrụ afọ ofufo ahụ gara ọrụ n’ebe obibi nke ndị idei mmiri ahụ metụtara, wepụsịa kapet ndị dere mmiri, ala ụlọ ndị mebiri emebi, ahụ́ ụlọ ndị mebiri emebi, oche ndị mmiri rikpuru, ibo ụzọ ndị hikọrọ ahịkọ, na ihe ọ bụla ọzọ idei mmiri ahụ mebiri. “Anyị nwere nchegbu ọ bụghị nanị banyere ịrụzi ebe obibi nke ụmụnna anyị,” ka otu onye ọrụ afọ ofufo kọrọ, “kamakwa banyere ichebe ahụ́ ike ha.” Ebe ọ bụ na ebu nke nwere nsí ga-amalite ngwa ngwa ịdị n’ahụ́ ájá na n’ime kọbọd, ọ dị mkpa na e buru ụzọ were ọgwụ na-egbu nje hichaa ebe obibi nile nke ọma.
Iji mụta otú e si arụ ọrụ ahụ n’enweghị mmerụ ahụ́, ọtụtụ Ndịàmà rịọrọ maka ọzụzụ site n’aka Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Etiti Na-ahụ Maka Ọnọdụ Mberede (FEMA), bụ́ ụlọ ọrụ gọọmenti na-ahụ maka ọdachi. Mgbe nke ahụ gasịrị, nke ọ bụla n’ime Ndịàmà ahụ natara ọzụzụ site n’aka ụlọ ọrụ FEMA kpọrọ ndị ọrụ afọ ofufo iri isoro ya gaa n’ebe obibi mebiri emebi, bụ́ ebe a nọ kụziere ha otú ha ga-esi jiri ọgwụ gbuo nje dị n’ebe obibi ahụ kpam kpam. N’ụbọchị sochirinụ, nke ọ bụla n’ime ndị ọrụ afọ ofufo iri ahụ natara ọzụzụ ọhụrụ n’aka nke ya, kpọkwaara ndị ọrụ afọ ofufo iri ndị ọzọ. “N’ime ụbọchị ole na ole,” ka otu onye ọrụ afọ ofufo kwuru, “ọnụ ọgụgụ ndị matara otú e si arụ ọrụ a mụbara ruo ọtụtụ narị.” Ebu ahụ na-agbasa agbasa akarịghị ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ọrụ afọ ofufo ahụ! Ndị lara ezumike nká na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị nọ ezumike ụlọ akwụkwọ rụrụ ọrụ n’ehihie. N’abalị, ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ na-eweghara ọrụ ahụ ma rụrụ ya gawa. N’ime izu isii ebe obibi nile ruru unyi nke Ndịàmà adịwo ọcha ma dị nchebe.
Otu Ebe Nlekọta Ọrụ na Ógbè Nlekọta Ọrụ Asaa
Ka ọ dịgodị, kọmitii enyemaka ahụ zụtara ọtụtụ bọọdụ e ji ete ahụ́ ụlọ plasta na ọtụtụ tọn ihe ndị e ji arụ ụlọ. Ma olee ebe a ga-edebe ha? “Mgbe manịja otu ụlọ ọrụ matara banyere ihe na-akpa anyị,” ka ọnụ na-ekwuchitere kọmitii
enyemaka ahụ na-akọ, “o kwuru na anyị nwere ike iji otu ụlọ nkwakọba ihe—nke nwere ohere dị square mita 5,000—mee ihe!” E wezụga ihe ndị e ji arụ ụlọ e debere na ya, ụlọ nkwakọba ihe ahụ nwekwara ohere maka ọfịs. N’oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ ebe nlekọta ọrụ enyemaka ahụ, bụ́ ebe ndị ọrụ afọ ofufo 200 ruo 300 nọ rụọ ọrụ ọtụtụ ụbọchị, abalị, na ngwụsị izu.Ebe ọ bụ na ebe obibi ndị o bibiri dịgasị ebe dị iche iche n’ógbè buru ibu, e guzobere ógbè nlekọta ọrụ dị iche iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze asaa. Ná ngwụsị izu, nke ọ bụla n’ime ógbè nlekọta ọrụ ndị a na-ejupụta ná ndị ọrụ afọ ofufo. (Lee igbe bụ́ “Ógbè Nlekọta Ọrụ.”) Ọtụtụ n’ime ha arụkọbuwo ọrụ n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ógbè ahụ. N’ezie, ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà bụ́ ndị si na Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè 11 dị iche iche n’Arkansas, Louisiana, Oklahoma, na Texas nyere aka. * N’ógbè nlekọta ọrụ nke ọ bụla, ndị kapịnta, ndị na-ete ụlọ ágbá, ndị plọmba, na ndị ọrụ ndị ọzọ nwere nkà butere ụzọ ma nye ndị ọzọ ọzụzụ.—Lee igbe bụ́ “Usoro Ọzụzụ Dị Iche Iche.”
Otu Ụkpụrụ na Otu Nchịkọba Ihe Ọmụma Dị na Kọmputa
Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ji ụkpụrụ ihe owuwu e kebiri ụzọ asaa mee ihe. A na-ebuga ihe ndị e ji ewu ụlọ n’ebe obibi ndị ahụ ná nkebi anọ, e mekwara ndokwa na ịrụzi ebe obibi nke ọ bụla ga-ewe ngwụsị izu atọ. N’ụzọ dị otú a, a ga-arụcha ọrụ enyemaka ahụ dum n’ihe dị ka ọnwa isii.
Iji mee ka ụkpụrụ ọrụ ahụ gaa nke ọma, kọmitii ahụ guzobere ngalaba ọrụ 22, gụnyere ndị na-ahụ maka ihe ndị a chọrọ iji rụzuo ọrụ ahụ, ịzụta ihe, ụlọ obibi, na iji gwongworo ebuga ngwa ọrụ. E ji ihe ọmụma buru ibu dị na kọmputa bụ́ nke ndị ọrụ afọ ofufo chepụtara nyere ngalaba nile aka. Tupu ọrụ ịrụzi ihe ahụ amalite, ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ji ụbọchị iri debanye ihe ọmụma n’ime kọmputa. “Ọ bụ usoro itinye ihe ọmụma nke were oge ma sie ike,” ka otu akụkọ kwuru. Otú ọ dị, ná ngwụsị “ụbọchị iri ahụ,” e nwetara nchikọta ihe ọmụma bara uru. Site n’ịpị mouse kọmputa ahụ aka, ebe ndebe ihe ọmụma ahụ na-egosi mgbe ndị ọrụ afọ ofufo ahụ dị 11,000 ga-abịa, nkà ndị ha nwere, na otú a pụrụ isi kpọtụrụ ha. Site n’ịpị ya aka ọzọ, ọ na-egosi ihe a ga-arụzi, ikike iwu ihe owuwu a chọrọ, na ihe ndị ọzọ a chọrọ maka ebe obibi ndị ahụ mebiri emebi. A matara ebe ndebe ihe ọmụma ahụ dị ka “akụkụ bụ́ isi nke ọrụ enyemaka ahụ.”
O riri Ha Ọnụ, Ha Nwekwara Ekele
Ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà n’iwu ụlọ letara ebe obibi ndị kọrọ akọ bụ́ ndị na-enweghị ebu iji mata ihe ndị a chọrọ iji rụzie ebe ndị mebiri emebi. “Ndị ọrụ afọ ofufo ndị a ga-edepụta ihe ndị a ga-eji rụọ ụlọ ruo n’ókè nke ịgụkọta ọnụ ọgụgụ ntú a chọrọ,” ka ọnụ na-ekwuchitere kọmitii ahụ kwuru.
“Anyị achọghị ịla ego ma ọ bụ ihe ọrụ ndị e nyere n’onyinye n’iyi.” N’otu oge ahụ, ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ nwetakwara akwụkwọ ikike ndị dị mkpa e ji ewu ihe owuwu site n’aka ndị ọchịchị obodo ahụ.Ọzọ, a kpọrọ ezinụlọ ndị idei mmiri ahụ metụtara ka ha bịa n’ụlọ nkwakọba ihe ahụ iji họrọ kapet, oche, vinyl e ji eme ala ụlọ, na ihe ndị ọzọ iji dochie ihe ndị funahụrụ ha. O riri ndị idei mmiri ahụ metụtara ọnụ, ha bekwara ákwá ọtụtụ ugboro mgbe ha hụrụ ihe ndị e nyere maka ha. Ndị idei mmiri ahụ metụtara nwetakwara ndụmọdụ site n’aka ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ ọkachamara n’ihe ndị metụtara ịnshọransị na ụkpụrụ dị iche iche nke gọọmenti. Mgbe ahụ, e mere ndokwa maka ịrụzi ebe obibi dị iche iche, ndị ọrụ afọ ofufo na-anya gwongworo na-ebute ihe ndị e ji ewu ụlọ kpọmkwem n’ụbọchị ndị ọrụ nrụzi ahụ chọrọ ha. Otu onye na-abụghị Onyeàmà nke a nọ na-arụ ụlọ ya mebiri emebi gwara nwunye ya bụ́ Onyeàmà sị: “Ụmụnna unu dị egwu. Ndị ọrụ nke a na-apụ, ndị ọzọ ana-abata ngwa ngwa. Ha na-arụ ọrụ ka ndanda!”
Ọ na-ewe ngwụsị izu atọ iji rụzie ihe ndị bụ́ isi n’ebe obibi ọ bụla. “Ma, mgbe ụfọdụ, ọ na-ewe izu ise ma ọ bụ asatọ,” ka onyeisi oche kọmitii ahụ kwuru. Mgbe ndị ọrụ afọ ofufo ahụ kụturu mgbidi ndị dị n’ụlọ ochie, ha na-ahụ ebe o mebiburu, ha adịghị achọ ịrụnye mgbidi ndị ọhụrụ n’ebughị ụzọ rụzie nsogbu ndị ochie. Otu onye ọrụ afọ ofufo nwere nkà kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ anyị na-achọpụta na àkị́kà dị n’ibé osisi ndị e ji wuo ụlọ, ya mere anyị na-ahụ na e gburu ha. Anyị rụziri ọtụtụ ogwe osisi ndị e ji jide ụlọ. Anyị mere ka ebe obibi ndị ahụ nọrọ n’ọnọdụ dị mma.” Otu onye idei
mmiri ahụ metụtara gosipụtara mmetụta nke ọtụtụ ndị ọzọ nwe ebe obibi ndị ahụ mgbe o ji ekele gwa otu onye ọbịa sị: “Ụlọ m ka mma ugbu a karịa mgbe m zụrụ ya!”Nri Ndị E Siri Ma Kesaa Ngwa Ngwa
Iji nye ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ihe oriri, otu ìgwè Ndịàmà jiri otu ụlọ nkwakọba ihe dị n’azụ Ụlọ Nzukọ Alaeze mere ebe a na-esi ma na-ekesa ihe oriri. Ndịàmà si n’akụkụ nile nke mba ahụ nyere friji, friza, ígwè e ji asa efere, stov, na ihe ndị ọzọ e ji eme ihe na kichin n’onyinye. Na Saturday na Sunday ọ bụla, ndị osi nri 11 na ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 200 na-esi nri ọtụtụ puku mmadụ ga-eri n’ebe ahụ a na-esi nri. Onye ọrụ afọ ofufo nke lekọtara isi ihe na kichin sịrị: “Anyị anọwo na-esi nri maka owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo afọ 19, ma ọrụ nke a buru ibu karịa otú anyị chere.”
A na-akwakọba ihe oriri nile ahụ ná nnukwute arịa 120. A na-etinye ha n’ime ụgbọala 60 nọ na-eche eche, bụ ndị na-ebuga ihe oriri ndị ahụ n’ógbè nlekọta ọrụ dị iche iche na n’ebe nlekọta ọrụ. Ka ọ dịgodị, ìgwè ndị ọrụ ọ bụla na-arụ ọrụ n’ebe obibi zigara otu onye ọrụ afọ ofufo n’ógbè nlekọta ọrụ e kenyere ha maka ibute nri nke ìgwè ahụ dum. Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ riri nri n’ebe obibi ndị ahụ ma laghachi n’ọrụ ozugbo.
A Rụzuru Ọrụ Ahụ!
N’ikpeazụ, n’April 2002, ndị ọrụ afọ ofufo 11,700, bịara ná njedebe nke ọrụ enyemaka kasị wee oge nke Ndịàmà Jehova rụtụrụla. Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ tinyere 1,000,000 awa n’ịrụzi ma ọ bụ ịrụgharị ngụkọta nke Ụlọ Nzukọ Alaeze 8 na ebe obibi 723. Otu onye idei mmiri ahụ metụtara ji anya mmiri kwupụta ekele ya n’aha ọtụtụ ndị ọzọ mgbe ọ sịrị: “Ana m ekele Jehova na ndị ọrụ afọ ofufo ahụ maka enyemaka nile ha nyeworo anyị. Ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna na-ahụ n’anya bụ nnọọ ihe nkasi obi!”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Obodo New York, Los Angeles, na Chicago nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu karị. Akụkụ Houston mepere emepe nwere ihe dị ka mmadụ 3,500,000 bi na ya ma buo ibu karịa mba Lebanọn nke dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.
^ par. 5 Ndị enyi Jeffrey na Frieda dị mmadụ 1,300 bịara ememe olili ozu ha. Nkwado ahụ kasiri nnọọ Abigail—nwunye Jeffrey na nwanne nwanyị Frieda—obi.
^ par. 15 Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-ahụkarị maka iwu ebe Ndịàmà Jehova na-ezukọta.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 21]
ÓGBÈ NLEKỌTA ỌRỤ
Ọ bụ n’elekere 7 nke ụtụtụ Saturday, n’Ógbè Nlekọta Ọrụ nke 4 dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Houston. Ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ ndị na-akpa nkata, na-achị ọchị, na-aṅụ kọfị, na-atakwa donọt nọ na-akpakọrịta n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụfọdụ si n’obodo ha nyaa ụgbọala ọtụtụ narị kilomita iji bịaruo n’ebe a. Ma n’elekere 7:30 nke ụtụtụ, mkparịta ụka ahụ na-ekpo ọkụ kwụsịtụrụ, onye na-elekọta ebe nlekọta ọrụ ahụ duzikwara nkwurịta okwu dabeere n’otu akụkụ Bible. Ọ makwara ọkwa na a ga-enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’elekere 7:30 nke ụtụtụ na Sunday, tupu ndị ọrụ afọ ofufo ahụ agaa ebe ndị e kenyere ha ịrụ ọrụ, ọ gbakwara mmadụ nile ume ka ha kere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ site n’ịza ajụjụ n’asụsụ Bekee ma ọ bụ n’asụsụ Spanish. Ọ gụpụtara ozi ekele sitere n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke ha nabatara site n’ịkụ aka.
Mgbe ahụ, onye na-elekọta ebe nlekọta ọrụ ahụ kwuru otú ihe si kwụrụ n’ọrụ enyemaka ahụ ma kelesie ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ike maka mmụọ afọ ofufo ha. Ọ jụrụ ajụjụ sị: “È nwere onye ọ bụla nọ n’ebe a na-amaghị ihe ọ ga-ọrụ ma ọ bụ ebe ọ ga-eje taa?” Ọ dịghị onye weliri aka elu. “Efere nri ole ka anyị chọrọ?” Mmadụ nile wee welie aka ha elu ma dapụ n’ọchị. N’ikpeazụ, e kpere ekpere, ndị ọrụ afọ ofufo ahụ dị 250—ndị nwoke, ndị nwanyị, ndị na-eto eto na ndị okenye—wee gaa ebe ndị ha ketara ịrụ ọrụ, ma dịrị njikere ịrụsị ọrụ ike ụbọchị ahụ dum.
Otu ihe ahụ weere ọnọdụ n’ógbè nlekọta ọrụ isii ndị ọzọ nakwa n’ụlọ nkwakọba ihe. Ka ọ dịgodị, ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ na-arụ ọrụ na kichin bụ́ isi anọworị na-esi nri—e kwuwerị, n’etiti ehihie taa ndị ọrụ afọ ofufo karịrị mmadụ 2,000 agụụ ji bụ́ ndị nọ ebe nile na Houston ga-adị njikere maka iri nri dị ọkụ!
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22]
USORO ỌZỤZỤ DỊ ICHE ICHE
N’oge ọrụ enyemaka ahụ, ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà duziri ihe ọmụmụ dị iche iche iji zụọ ndị ọrụ afọ ofufo na-enweghị nkà n’ọrụ ụfọdụ kpọmkwem. E nyere ụfọdụ ọzụzụ n’otú e si eji ọgwụ na-egbu nje ehichasị ebe obibi. Ndị ọzọ mụtara otú e si arụ mgbidi na otú e si arụnye kọbọd. Ndị ọzọ mụtakwara otú e si ete ahụ́ ụlọ plasta nakwa otú e si ete ágbá. E tinyere Nzukọ Ọmụmụ Ihe Ndị Ọrụ Nwere Nkà ndị a na teepu vidio, ma jirizie vidio ndị ahụ nye ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ ọzụzụ n’ógbè nlekọta ọrụ ndị ahụ. “Site ná nzukọ ọmụmụ ihe ndị a,” ka otu onye so na kọmitii ọrụ enyemaka ahụ kwuru, “anyị hụrụ na ọrụ nrụzigharị ahụ bụ ọkpọka.”
[Foto]
Ndị ọrụ nwere nkà duziri ihe ọmụmụ dị iche iche
[Igbe dị na peeji nke 24]
“AKA ỌRỤ NKE CHINEKE N’EZIE”
“Ụlọ ọrụ inshọransị na-akpọ ọdachi ndị na-emere onwe ha aka ọrụ nke Chineke,” ka otu onye so na kọmitii ọrụ enyemaka kwuru. “Otú ọ dị,” ọ gbakwụnyere sị, “ndị ọrụ afọ ofufo ndị rụrụ ọrụ n’ebe a n’ọnwa ndị ahụ nile bụ aka ọrụ nke Chineke n’ezie. Òtù ụmụnna anyị dị egwu!” N’oge ọrụ enyemaka a, ndị ọrụ afọ ofufo 2,500 ma ọ bụ karịa na-abịa arụ ọrụ ná ngwụsị izu. Onyeisi oche kọmitii ọrụ enyemaka ahụ kwuru, sị: “Ndị ọrụ afọ ofufo ahụ a na-akwụghị ụgwọ kagburu ezumike ha mere atụmatụ ya, hazigharịa usoro ihe omume nke ezinụlọ ha, ma yigharịa ihe omume ndị ọzọ ha nwere, iji nye aka n’otu n’ime ọrụ enyemaka kasị ukwuu Ndịàmà Jehova rụtụrụla.”
Ọrụ enyemaka ahụ were ogologo oge chọrọ ịchụ ihe dị iche iche n’àjà. Otu onye ọrụ afọ ofufo nke kwadoro ọrụ ahụ site ná mmalite ruo ná ngwụsị nwere ọrụ ego ọ na-etinye awa 50 na ya kwa izu. N’agbanyeghị nke ahụ, o tinyere awa 40 kwa izu n’ọrụ enyemaka ahụ. “Jehova nyere m ume,” ka o kwuru. “Ndị enyi m na-ajụ m sị, ‘À na-akwụ gị ụgwọ n’ọrụ ahụ?’ Ana m agwa ha sị, ‘Ọ dịghị ego unu ga-akwụ m nke ga-eme ka m rụọ ọrụ a.’” Ná ngwụsị izu, mgbe ha rụchara ọrụ ego otu izu zuru ezu, otu ezinụlọ si steeti Louisiana na-eji ụgbọala aga kilomita 800 uje na ụla iji nye aka n’ọrụ enyemaka ahụ. Ọtụtụ ndị rụrụ ọrụ site n’ụtụtụ ruo uhuruchi, ma jirizie ụgbọala laghachi n’ebe obibi ha. Otu ìgwè ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà bụ́ ndị dị mmadụ 30, ndị ji ụgbọala mee njem awa asa ruo awa iri nanị n’ojije, sịrị: “N’ezie, o kwesịrị mgbalị e tinyere na ya.” Onye ọrụ afọ ofufo ọzọ mechiri ọrụ ya n’elekere 3:30 nke ehihie ma rụọ ọrụ afọ ofufo n’ebe nlekọta ọrụ enyemaka ahụ ruo elekere 10:00 nke abalị. Ná ngwụsị izu, o nyekwara aka n’ọrụ enyemaka ahụ. “Ọ na-enye afọ ojuju,” ka o kwuru.
N’ezie, ndị ọrụ afọ ofufo ndị a na ndị ọzọ nile dị njikere inye aka n’ihi na ha nwere ịhụnanya ụmụnna—nke bụ́ akara e ji amata ezigbo Ndị Kraịst. (Jọn 13:35) Ka onyeisi obodo nke Houston letasịrị ebe nlekọta ọrụ enyemaka ahụ, a kpaliri ya ịgwa otu ìgwè Ndịàmà, sị: “Unu kwenyere n’ime ihe Chineke gwara anyị ka anyị mee. Unu na-etinye ihe unu kweere n’ọrụ.”
[Foto dị na peeji nke 20, 21]
Idei mmiri erikpuo Houston, June 9, 2001
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Houston Chronicle
[Foto dị na peeji nke 21]
Okporo ụzọ awara awara ghọrọ osimiri
[Foto dị na peeji nke 21]
Mmiri banyere n’ebe obibi dị iche iche
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Ụfọdụ n’ime ọtụtụ puku Ndịàmà bụ́ ndị rụrụ ọrụ afọ ofufo
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị rụrụ ọrụ na kichin siri nri ihe karịrị mmadụ 250,000 riri!
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]
NOAA