Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga-adarịrị Ogbenye?

Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga-adarịrị Ogbenye?

Echiche nke Bible

Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga-adarịrị Ogbenye?

N’OTU oge, Jizọs gwara otu onye ọchịchị na-akatabeghị ahụ́ nke bara ọgaranya na ọ dị mkpa ka ọ laa ma ree ihe nile o nwere ma nye ya ndị ogbenye. Akụkọ ahụ na-ekwu na okwu Jizọs wutere nwoke ahụ, o wee pụọ ná mwute, “n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe onwunwe.” Mgbe ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lee otú ọ ga-esi siere ndị nwere ego ike ịba n’alaeze Chineke!” Jizọs gbakwụnyere, sị: “Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa onye bara ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”—Mak 10:21-23; Matiu 19:24.

Gịnị ka Jizọs bu n’uche? Ọ̀ bụ na akụ̀ na ụba na ezi ofufe adịghị agakọ? Ndị Kraịst hà kwesịrị inwe obi amamikpe ma ọ bụrụ na ha nwere ego? Chineke ọ̀ chọrọ ka ha na-ebi ndụ nke ịnapụ onwe ha ihe ụtọ?

Chineke Na-anabata “Ụdị Mmadụ Nile”

N’oge ochie, Chineke achọghị ka ndị Izrel daa ogbenye. Tụlee: Mgbe ụmụ Izrel banyesịrị n’ala ahụ e nyere ha, ha tinyere aka n’ọrụ ugbo nakwa n’azụmahịa iji nweta ihe ha na ndị ha hụrụ n’anya ga-eji na-ebi ndụ. Ihe ndị dị ka ọnọdụ akụ̀ na ụba, ihu igwe, ahụ́ ike, ma ọ bụ nkà azụmahịa ga-emetụta ókè mgbalị ha ga-enweru ihe ịga nke ọma. Iwu Mozis nyere ụmụ Izrel ntụziaka ka ha nwee ọmịiko ma ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee nsogbu akụ̀ na ụba ma daa ogbenye. (Levitikọs 25:35-40) N’aka nke ọzọ, ụfọdụ ghọrọ ndị ọgaranya. A kọwara Boaz, bụ́ nwoke nwere okwukwe ma na-eguzosi ike n’ezi ihe, nke ghọrọ nna nna Jizọs Kraịst, dị ka ‘nwoke nke bụ́ dike n’akụ̀.’—Rut 2:1.

Ọnọdụ ahụ dịgidere otú ahụ n’oge ndụ Jizọs. N’ịgwa ọgaranya ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite okwu, ọ bụghị ọchịchọ Jizọs ịkwalite ndụ nke mmadụ ịta onwe ya ahụhụ. Kama nke ahụ, ọ nọ na-akụzi ihe dị mkpa. N’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọ pụrụ iyi ihe na-agaghị ekwe omume bụ́ ndị bara ọgaranya igosipụta obi umeala ma nakwere ụzọ Chineke si eweta nzọpụta. Ma, Jizọs kwuru, sị: “Nke a agaghị ekwe omume n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ma n’ebe Chineke nọ ihe nile kwere omume.”—Matiu 19:26.

Ọgbakọ Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ nabatara “ụdị mmadụ nile.” (1 Timoti 2:4) Nke a gụnyere ụfọdụ ndị bara ọgaranya, ndị ọzọ bụ́ ndị nwetụrụ akụ̀, na ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị dara ogbenye. Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ n’ime ha kpatara akụ̀ tupu ha aghọọ Ndị Kraịst. N’aka nke ọzọ, ọnọdụ ndị dị mma na ọrụ achụmnta ego ndị amamihe dị na ha pụrụ iwetaworo ndị ọzọ akụ̀ na ụba mgbe ha ghọsịworo Ndị Kraịst.

Ọzọkwa, òtù ụmụnna Ndị Kraịst taa gụnyere ndị nọ n’ọnọdụ akụ̀ na ụba dịgasị iche iche. Ha nile na-agbalịsi ike ịgbaso nduzi Bible ndị metụtara okwu ego, ebe ọ bụ na ịhụ ihe onwunwe n’anya pụrụ imetụta onye ọ bụla. Ihe Jizọs kụziri banyere onye ọchịchị ahụ na-akatabeghị ahụ́ nke bara ọgaranya na-eme ka Onye Kraịst ọ bụla mara mmetụta dị ike ego na ihe onwunwe pụrụ inwe n’ahụ́ mmadụ.—Mak 4:19.

Ịdọ Aka ná Ntị nke Dịịrị Ndị Ọgaranya

Ọ bụ ezie na Bible adịghị akatọ akụ̀ na ụba n’onwe ya, ọ na-akatọ ịhụ ego n’anya. Onye so dee Bible, bụ́ Pọl, kwuru, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile.” O kwuru na site n’ịgbahapụ ihe ime mmụọ n’ihi ọchịchọ nke ịba ọgaranya, “e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.”—1 Timoti 6:10.

N’ụzọ na-akpali mmasị, Pọl nyere ndị ọgaranya ntụziaka a kapịrị ọnụ. O kwuru, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha tụkwasịkwa olileanya ha, ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.” (1 Timoti 6:17) Ihe àmà na-egosi na e nwere ihe ize ndụ na ndị ọgaranya pụrụ ịmalite ịdị mpako ma nwewa echiche nke ịka ndị ọzọ mma. Ọzọkwa, a pụrụ ịnwa ha iche na akụ̀ na ụba pụrụ iweta ezi nchebe—ihe ọ bụ nanị Chineke pụrụ inye n’ụzọ zuru ezu.

Ndị Kraịst bara ọgaranya pụrụ ịnọ na nche megide ihe ize ndụ ndị a site ‘n’ịba ọgaranya n’ezi ọrụ.’ Ọrụ ndị a na-agụnye ịbụ ndị “na-emesapụ aka, na-adị njikere ikerịta ihe,” jiri mmesapụ aka na-enyere ndị nọ ná mkpa aka. (1 Timoti 6:18) Ndị Kraịst—ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye—pụkwara iji ụfọdụ n’ime ihe ha nwere mee ihe n’ịgbasa ozi ọma nke Alaeze Chineke, bụ́ ihe bụ́ isi ezi Ndị Kraịst na-ekere òkè na ya taa. Mmụọ mmesapụ aka a na-egosipụta àgwà kwesịrị ekwesị n’ebe ihe onwunwe dị ma mee ka mmadụ bụrụ onye Jehova Chineke na Jizọs Kraịst hụrụ n’anya, bụ́ ndị na-ahụ ndị ji ọṅụ na-enye ihe n’anya.—Matiu 24:14; Luk 16:9; 2 Ndị Kọrint 9:7.

Ihe Ndị Ka Mkpa

N’ụzọ doro anya, ọ bụghị iwu na Ndị Kraịst ga-adarịrị ogbenye. Ha ekwesịghịkwa ịbụ ndị “kpebisiri ike ịba ọgaranya.” (1 Timoti 6:9) Ha na-arụsi ọrụ ike iji nweta ihe e ji ebi ndụ n’ókè kwesịrị ekwesị. Dabere n’ihe dịgasị iche iche nakwa n’usoro akụ̀ na ụba e nwere n’ebe ha bi, mgbalị ha ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ókè dịgasị iche iche.—Eklisiastis 11:6.

Ihe ọ sọrọ ọnọdụ akụ̀ na ụba ha ya bụrụ, Ndị Kraịst kwesịrị ịgbalịsi ike ‘ijide ihe ndị ka mkpa n’aka.’ (Ndị Filipaị 1:10) Site n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ, ha “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:19.