Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Nnwere Onwe Ikwu Okwu

Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Nnwere Onwe Ikwu Okwu

Ụlọikpe Kasị Elu Akwadoo Nnwere Onwe Ikwu Okwu

ỤBỌCHỊ AHỤ DỊ OKÉ MKPA ruru na June 17, 2002, bụ́ mgbe Ụlọikpe Kasị Elu bipụtara mkpebi ya e dere ede. Gịnị ka e kpebiri? Isi akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche mere ka nke ahụ pụta ìhè. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kpọsara, sị: “Ụlọikpe Ewepụ Ihe Mgbochi ná Nleta Ndịàmà Jehova Na-eme.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Columbus Dispatch nke Ohio kwuru, sị: “Ụlọikpe Dị Elu Akagbuo Iwu Inweta Akwụkwọ Ikike.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Plain Dealer nke Cleveland, Ohio, kwuru, n’ụzọ dị mfe, sị: “Ọ Dịghị Ndị Arịrịọ Mkpa Inweta Nkwado Site n’Isi Ụlọ Ọrụ Gọọmenti Ime Obodo.” Peeji dị n’akụkụ peeji e nwere uche akwụkwọ akụkọ bụ́ USA Today kpọsara, sị: “Nnwere Onwe Ikwu Okwu Enwee Mmeri.”

A kagburu mkpebi ndị ụlọikpe ka ala mere megide Ndịàmà Jehova mgbe e nwesịrị ntụli aka bụ́ nke mmadụ 8 kwadoro ka a kagbuo ya ebe 1 onye na-akwadoghị ya! Ọ bụ Ọkàikpe John Paul Stevens dere Mkpebi Ụlọikpe ahụ bụ́ nke dị peeji 18. Mkpebi ahụ bụ nkwupụtaghachi siri ike nke nchebe Ndezigharị Mbụ ahụ nyere ozi ihu ọha nke Ndịàmà Jehova. Ná mkpebi Ụlọikpe ahụ dere ede, ọ kọwara na Ndịàmà ahụ etinyeghị akwụkwọ maka akwụkwọ ikike n’ihi na ha na-azọrọ na “ikike ha nwere ime nkwusa sitere n’Akwụkwọ Nsọ.” Mgbe ahụ, Ụlọikpe ahụ hotara ihe akaebe ndị e zoro aka na ha n’akwụkwọ arụmụka ha: “Anyị chere na ịchọ inweta akwụkwọ ikike site n’aka obodo iji mee nkwusa ga-afọdụ nke nta ka ọ bụrụ ịkparị Chineke.”

Mkpebi Ụlọikpe ahụ kwuru, sị: “Ruo ihe karịrị afọ 50, Ụlọikpe a ewepụwo ihe mgbochi ndị e tinyere n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ nakwa n’ikesa akwụkwọ nta. Ọ bụghị ihe ndaba nkịtị na ihe ka ọtụtụ n’okwu ikpe ndị a metụtara ihe ndị ruuru mmadụ, ndị Ndịàmà Jehova wepụtara n’ụlọikpe bụ́ ndị dị ná Ndezigharị Mbụ ahụ, n’ihi na ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ bụ ihe a chọrọ ha n’aka n’okpukpe ha. Dị ka anyị kwuru n’okwu ikpe dị n’etiti Murdock na Pennsylvania, . . . (1943), Ndịàmà Jehova ‘na-ekwu na ha na-agbaso ihe nlereanya Pọl, na-ezi ihe “n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Ọrụ 20:20. Ha ghọtara n’ụzọ nkịtị iwu ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́, “Gaanụ n’ime ụwa dum kwusaara ihe nile e kere eke ozi ọma.” Mak 16:15. Site n’ime otú ahụ, ha kwenyere na ha na-erube isi n’iwu Chineke.’”

Mkpebi ahụ hotakwara okwu ikpe e nwere n’afọ 1943 ọzọ: “Ná Ndezigharị Mbụ ahụ, ụdị ihe omume okpukpe a dị mkpa dị nnọọ ka ofufe a na-efe n’ụlọ ụka nakwa ikwu okwuchukwu n’elu ikpo okwu. O ruru eru ịbụ nke e chebere dị nnọọ ka a na-echebe ihe omume okpukpe ndị a nabatara bụ́ ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ.” N’ihota okwu ikpe e nwere n’afọ 1939, Mkpebi ahụ kwuru, sị: “Ịchọ ka a na-achịkwa ihe omume mmadụ site n’iti iwu ka e nweta akwụkwọ ikike bụ́ nke ga-eme ka ikesa akwụkwọ nta n’enweghị ihe mgbochi ghara ikwe omume bụ nnọọ imebi ihe ndị ruuru mmadụ n’ụzọ iwu.”—Ọ bụ ha dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.

Ụlọikpe ahụ kwuziri ihe dị ịrịba ama: “Ikpe ndị ahụ na-egosi na mgbalị Ndịàmà Jehova na-eme iguzogide iji iwu na-achịkwa ikwu okwu abụghị ọgụ ha na-alụ maka ihe ndị ruuru nanị onwe ha.” Mkpebi ahụ kọwara na “ọ bụghị nanị [Ndịàmà] bụ ‘ndị nkịtị’ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e ji iwu ndị yiri nke Obodo Nta ahụ mechie ọnụ.”

Mkpebi ahụ gara n’ihu ikwu na iwu ahụ “bụ mkparị—ọ bụghị nanị nye ụkpụrụ omume ndị Ndezigharị Mbụ ahụ na-echebe, kamakwa nye echiche bụ́ na e nwere ọha mmadụ nweere onwe ya—na mgbe nwa amaala chọrọ isoro ndị ọzọ nwee nkwurịta okwu nkịtị, ọ ghaghị iburu ụzọ gwa gọọmenti banyere ọchịchọ ya ịgwa ndị agbata obi ya okwu ma nwetazie ikike ime otú ahụ. . . . Iwu nke na-achọ ka e nweta akwụkwọ ikike iji nwee nkwurịta okwu dị otú ahụ bụ ịhapụ nnọọ ụzọ e siworo na-eme ihe ná mba anyị na ụzọ iwu kwadoro ka e si na-eme ihe.” Mkpebi Ụlọikpe ahụ kwuziri banyere “mmetụta dị nnọọ njọ nke akwụkwọ ikike dị otú ahụ a chọrọ ka e nweta ga-enwe.”

Mpụ Pụrụ Ịdị

Olee banyere echiche bụ́ na akwụkwọ ikike ahụ bụ ihe nchebe pụọ n’aka ndị na-etika ụlọ na ndị omempụ ndị ọzọ? Ụlọikpe ahụ rụrụ ụka, sị: “N’agbanyeghị na anyị lere nchegbu ndị a anya dị ka ndị ezi uche dị na ha, ụkpụrụ anyị tụrụ emewo ka o doo anya na a ghaghị inwe nguzozi n’agbata nchegbu ndị a na mmetụta iwu ahụ ga-enwe n’ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ ndị dị ná Ndezigharị Mbụ ahụ.”

Mkpebi Ụlọikpe ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “O yighị ka enweghị akwụkwọ ikike ọ̀ ga-egbochi ndị omempụ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ na inwe nkwurịta okwu ndị iwu a na-akpọtụghị aha. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịjụ ajụjụ ụzọ ma ọ bụ rịọ ka ha kpọọ fon, . . . ma ọ bụ ha pụrụ idebanye aha na-abụghị aha ha n’akwukwọ ma lafere.”

N’izo aka ná mkpebi ndị e mere n’afọ ndị 1940, Ụlọikpe ahụ, dere, sị: “Ụdị okwu ndị e jiri mee ihe ná mkpebi ndị e mere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ ndị mere ugboro ugboro ka ndị òtù okpukpe nke onye gbara akwụkwọ [Watch Tower Society] ghara ịbụ ndị a kpụpụrụ n’ụlọikpe gosipụtara otú Ụlọikpe a si ele nnwere onwe ndị dị ná Ndezigharị Mbụ ahụ anya bụ́ ndị okwu ikpe a metụtara.”

Gịnị ka Ụlọikpe ahụ kwubiri? “A kagbuwo mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe, e weghachiwokwara ha okwu ahụ maka ilebakwu ya anya n’ụzọ kwekọrọ ná mkpebi a. Nke a bụ ntụziaka anyị.”

N’ihi ya, ihe si n’okwu ahụ pụta bụ, dị ka e kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Chicago Sun-Times, “Ụlọikpe Akwadoo Ndịàmà Jehova,” ọ bụkwa mmadụ 8 n’ime mmadụ 9 mere otú ahụ.

Gịnị Banyere Ọdịnihu?

Olee otú Ndịàmà Jehova nọ n’Ọgbakọ Wellsville dị nso si lee mmeri a e nwere n’Ụlọikpe Kasị Elu anya? N’ezie, e nweghị ihe mere ha ga-eji jiri ya tuo ọnụ ruo n’ókè nke iwetara ndị bi na Stratton ihere. Ndịàmà adịghị ewesa ndị obodo ahụ iwe bụ́ ndị kwesịrị nsọpụrụ. Gregory Kuhar, bụ́ Onyeàmà nọ n’obodo nta ahụ, kwuru, sị: “Ọ bụbughị ọchịchọ anyị iwega okwu a n’ụlọikpe. O doro anya na iwu ahụ n’onwe ya ezighị ezi. Ihe anyị mere abụghị nanị maka anyị onwe anyị, kamakwa ọ bụ maka mmadụ nile.”

Ihe ndị na-eme na-egosi na Ndịàmà emewo mgbalị dị ukwuu ịghara ịkpasu ndị nọ n’obodo nta ahụ iwe. Gene Koontz, bụ́ Onyeàmà ọzọ, kọwara, sị: “Oge ikpeazụ anyị mere nkwusa na Stratton bụ na March 7, 1998—ihe karịrị nnọọ afọ anọ gara aga.” Ọ gbakwụnyere, sị: “A gwara m na a ga-ejide m. N’ime afọ ndị ahụ, anyị nụrụ ọtụtụ akụkọ banyere egwu ndị uwe ojii na-eyi anyị na ha ga-ejide anyị. Ma, mgbe anyị kwuru na anyị chọrọ ịhụ iwu ahụ nke e dere ede, ha azaghị anyị ihe ọ bụla.”

Koontz gbakwụnyere, sị: “Ọ ga-akara anyị mma isoro ndị agbata obi anyị na-enwe mmekọrịta dị mma. Ọ bụrụ na ụfọdụ achọghị ka anyị leta ha, anyị ga-akwanyere mkpebi ha ùgwù. Ma e nwere ndị ọzọ nwere omume enyi bụ́ ndị na-anabata nkwurịta okwu Bible.”

Gregory Kuhar kọwara, sị: “Anyị ejighị okwu ikpe ahụ gaa n’ụlọikpe iji sesa ndị Stratton okwu. Nanị ihe anyị chọrọ ime bụ iguzobe nnwere onwe anyị ikwu okwu dị ka Ụkpụrụ Iwu si dị.”

Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “E mesịa, anyị nwere olileanya ịlaghachi Stratton. Obi ga-adị m ụtọ ịbụ onye mbụ ga-akụ aka n’ọnụ ụzọ mgbe anyị laghachiri. N’ime ihe kwekọrọ n’iwu Kraịst nyere, anyị aghaghị ịlaghachi.”

Ihe e kpebiri n’ikpe dị n’etiti “Watchtower na Obodo Nta Stratton” enwewo mmetụta dị ukwuu. Mgbe ọtụtụ ndị ọchịchị ime obodo nọ na United States nụrụ banyere mkpebi Ụlọikpe Kasị Elu ahụ, ha matara na a pụghịzi iji iwu ime obodo gbochie ọrụ izisa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova. Ruo ugbu a, e doziwo ihe isi ike ndị a na-enwe n’ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’ihe dị ka ógbè 90 nke United States.

[Igbe dị na peeji nke 9]

“NDỊÀMÀ JEHOVA EMEELA YA ỌZỌ”

Charles C. Haynes, bụ́ nnukwu ọkachamara na onye ntụzi ọrụ nke usoro ihe omume ndị metụtara mmụta ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ndezigharị Mbụ ahụ, dere okwu ndị ahụ dị n’elu n’ebe ndebe ihe ọmụma n’Intanet a kpọrọ Freedom Forum, n’okpuru isiokwu bụ́ “Nnwere Onwe Okpukpe.” Haynes gara n’ihu ikwu, sị: “N’izu gara aga [Ndịàmà] nwere mmeri ha nke ugboro 48 n’Ụlọikpe Kasị Elu—ọtụtụ okwu ikpe nke meworo ka nchebe Ndezigharị Mbụ ahụ na-enye ndị America nile buo nnọọ ibu.” Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Cheta nke a: Ọ bụrụ na gọọmenti pụrụ igbochi nnwere onwe nke otu okpukpe, o nwere ikike nke igbochi nnwere onwe nke okpukpe ọ bụla—ma ọ bụ okpukpe nile. . . . N’ezie, ndị mmadụ nweere onwe ha ịjụ ige ntị—na imechi ọnụ ụzọ ha. Ma gọọmenti ekwesịghị inwe ikike nke ikpebi onye a ga-ekwe ka ọ kụọ aka n’ọnụ ụzọ. N’ihi ya, ekele dịrị Ụlọikpe Kasị Elu.”

Haynes kwubiri, sị: “Anyị nile ji Ndịàmà Jehova ụgwọ ekele. N’agbanyeghị ugboro ole a kparịworo ha, ugboro ole a chụpụworo ha, ma ọ bụ ọbụna wakpoo ha n’ụzọ anụ ahụ́, ha na-anọgide na-alụ ọgụ maka nnwere onwe ha (nakwa nke anyị) ikpe okpukpe. Mgbe ha merikwara, anyị nile na-erite uru.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

MKPEBI ỤLỌIKPE KASỊ ELU—IHE AKWỤKWỌ AKỤKỌ DỊ ICHE ICHE KWURU

“Ụlọikpe Akwadoo Ndịàmà Jehova; Ozi Ụlọ n’Ụlọ Achọghị Akwụkwọ Ikike

N’ihe omume ha nke ịkụ aka n’ọnụ ụzọ dị ka Ndịàmà Jehova, [Ndịàmà] kwenyere mgbe nile na Chineke na-akwado ha. Ugbu a, Ụlọikpe Kasị Elu nke United States akwadowokwa ha.”—Chicago Sun-Times, nke June 18, 2002.

“Nnwere Onwe Ikwu Okwu Enwee Mmeri

Oge ọzọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova mere ka ị kwụsị nri ị na-eri, mara ma ị̀ ga-ekele ha. Ná nrara ha ji obi ike rara onwe ha nye ụkpụrụ okpukpe ha, ma eleghị anya okpukpe a nke na-esoghị n’okpukpe ndị bụ́ isi, nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 nde mmadụ mejupụtara [na United States], emewo ihe dị ukwuu karịa òtù ọ bụla ọzọ iji nwetara ndị America n’otu n’otu nnwere onwe ikwu okwu. . . .

“Ịga ụlọikpe dị elu abụghị ihe ọhụrụ nye Ndịàmà. N’ihe karịrị okwu ikpe iri abụọ na anọ ha nweworo n’ihe karịrị afọ 65, ha alụsowo ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ọchịchị aka ike ọgụ n’ụzọ dị irè.”—USA TODAY, nke June 18, 2002.

“E Kpebie na Ịrịọ Arịrịọ Site n’Ọnụ Ụzọ Ruo n’Ọnụ Ụzọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ n’Ụzọ Iwu. Mkpebi ahụ Bụụrụ Ndịàmà Jehova Mmeri

Ụlọikpe Kasị Elu nke United States kpebiri na Monday na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, òtù dị iche iche nke okpukpe, Ụmụ Agbọghọ bụ́ Ndị Scout na ndị ọzọ, nweere onwe ha n’ụzọ iwu ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ịkpọsa ụkpụrụ ha n’ebughị ụzọ nweta ikike n’aka ndị ọchịchị obodo.”—San Francisco Chronicle,  nke June 18, 2002.

“Ụlọikpe Kasị Elu: Ị Pụghị Igbochi Ndịàmà Jehova na Ụmụ Agbọghọ Bụ́ Ndị Scout Ịkụ Aka n’Ọnụ Ụzọ

WASHINGTON—Ụkpụrụ Iwu na-echebe oruru o ruuru ndị ozi ala ọzọ, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọzọ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ n’ebughị ụzọ nweta ikike n’aka ndị ọchịchị obodo, ka Ụlọikpe Kasị Elu kpebiri taa. . . .

“Site ná ntụli aka e nwere mmadụ 8 n’otu akụkụ ma nwee 1 onye n’akụkụ nke ọzọ, ụlọikpe ahụ kpebiri na nnwere onwe ikwu okwu nke Ndezigharị Mbụ ahụ nyere ikike ya, na-agụnye ikike mmadụ nwere iji ozi gakwuru mmadụ kpọmkwem n’ebe obibi ya.”—Star Tribune, nke June 18, 2002, bụ́ nke a na-ebipụta na Minneapolis.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọkàikpe Stevens

[Ebe E Si Nweta Foto]

Stevens: Collection, The Supreme Court Historical Society/Joseph Bailey