Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụlọikpe Kasị Elu Anabata Ikpe Ahụ

Ụlọikpe Kasị Elu Anabata Ikpe Ahụ

Ụlọikpe Kasị Elu Anabata Ikpe Ahụ

N’AFỌ NDỊ NA-ADỊBEGHỊ ANYA, Ụlọikpe Kasị Elu ekwetawo ikpebi ihe dị ka ikpe 80 ruo 90 n’ime ihe karịrị ikpe 7,000 a na-arịọ ha ka ha leba anya na ha kwa afọ—nke ji obere ihe karịa 1 pasent.

Na May 2001, Ndịàmà Jehova tinyere Akwụkwọ Mkpesa n’Ụlọikpe Kasị Elu maka inweta ikike ilebagharị anya n’ikpe ahụ, na-ajụ, sị: “Ndị ozi okpukpe, bụ́ ndị na-agwa ndị ọzọ banyere nkwenkwe okpukpe ha site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na nke a nọworo na-eme eri otu narị afọ, ha na ndị na-agba mgbere hà bụ otu ma e lee ya anya dị ka ụkpụrụ iwu obodo si dị, hà kwesịrị idebe iwu na-ekwu na a ga-enweta ikike n’aka obodo iji gwa ndị ọzọ banyere Bible ma ọ bụ nyefee ha akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’efu?”

N’October 15, 2001, e mere ka Ngalaba Okwu Iwu nke Watchtower mara na Ụlọikpe Kasị Elu nke United States ekwetawo ileba anya n’okwu ikpe dị n’etiti Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., tinyere ndị ọzọ na Obodo Nta Stratton, tinyere ndị ọzọ!

Ụlọikpe ahụ nabatara nanị okwu ikpe nke metụtara kpọmkwem nnwere onwe ikwu okwu, ya bụ, ma nkwado Ndezigharị Mbụ ahụ nyere nnwere onwe ikwu okwu ọ̀ gụnyere oruru o ruuru mmadụ ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ihe ọ bụla n’ebughị ụzọ nata ndị isi ọchịchị ikike.

Ugbu a, a ghaghị ịrụrụ okwu ahụ ụka n’ihu ndị ọkàikpe itoolu nke Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. Ndịàmà ahụ ga-enwe ndị ọkàiwu nke ha; Obodo Nta Stratton ga-enwekwa ndị ọkàiwu nke ha. Olee otú ihe ga-esi gaa n’ụlọ ikpe ahụ?

[Igbe dị na peeji nke 5]

GỊNỊ BỤ NDEZIGHARỊ MBỤ?

“NDEZIGHARỊ MBỤ (NGUZOBE NKE OKPUKPE; NNWERE ONWE IKPE OKPUKPE, IKWU OKWU, ỊGBASA AKỤKỌ, ỊGBAKỌ ỌNỤ, IME MKPESA) Nzukọ Ndị Omeiwu agaghị eme iwu ọ bụla banyere nguzobe nke okpukpe, ma ọ bụ ịmachibido ikpe okpukpe n’enweghị mgbochi iwu; ma ọ bụ ịkpara nnwere onwe ikwu okwu ma ọ bụ nke ịgbasa akụkọ ókè; ma ọ bụ ikike ndị mmadụ nwere izukọta n’udo, na ịrịọ Gọọmenti arịrịọ maka ileba anya ná mkpesa.”—Ụkpụrụ Iwu United States.

“Ndezigharị Mbụ ahụ bụ ebe usoro ọchịchị onye kwuo uche ya nke United States hiwere isi. Ndezigharị Mbụ machibidoro Nzukọ Ndị Omeiwu ime iwu ndị na-egbochi nnwere onwe ikwu okwu, nke ịgbasa akụkọ, nke izukọta n’udo, ma ọ bụ nke ime mkpesa. Ọtụtụ ndị na-ele nnwere onwe ikwu okwu anya dị ka nnwere onwe nke kasị mkpa na ntọala nke nnwere onwe ndị ọzọ nile. Ndezigharị Mbụ ahụ machibidokwara Nzukọ Ndị Omeiwu ime iwu ndị na-eguzobe okpukpe ọchịchị na-akwado ma ọ bụ nke na-egbochi nnwere onwe ikpe okpukpe.” (The World Book Encyclopedia) N’ụzọ na-akpali mmasị, ná mkpebi ikpe dị n’etiti Cantwell na Connecticut, 310 U.S. 296 (1940), bụ́ mkpebi ikpe dị ịrịba ama nke metụtakwara Ndịàmà Jehova, Ụlọikpe Kasị Elu nke United States kpebiri na Ndezigharị Mbụ ahụ machibidoro ọ bụghị nanị “Nzukọ Ndị Omeiwu” (gọọmenti etiti) kamakwa ọchịchị ime obodo (steeti na ime obodo) ime iwu ndị ga-emebi nnwere onwe ndị e nwere ná Ndezigharị Mbụ ahụ n’ụzọ na-ekwekọghị n’ụkpụrụ iwu.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Okwu ahụ metụtara ụdị dịgasị iche iche nke ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Photograph by Franz Jantzen, Collection of the Supreme Court of the United States