Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

A Tọhapụrụ M n’Agbụ nke Ịkpọasị

A Tọhapụrụ M n’Agbụ nke Ịkpọasị

A Tọhapụrụ M n’Agbụ nke Ịkpọasị

DỊ KA JOSÉ GOMEZ SI KỌỌ

A MỤRỤ m na September 8, 1964, na Rognac, bụ́ obodo nta dị n’ebe ndịda France. Nne na nna m nakwa nne na nna m ochie bụ ndị Gypsy sitere n’ógbè Andalusia, bụ́ ndị a mụrụ n’Algeria na Morocco, n’Ebe Ugwu Africa. Dị ka ọ na-adịkarị n’etiti ndị Gypsy, ezinụlọ anyị bụ nnukwu ezinụlọ nke gụnyere ndị ikwu na ibe.

Nna m bụ onye na-eme ihe ike, ụfọdụ n’ime ihe ndị mbụ m chetara mere n’oge m dị obere na-agụnye ebe ọ na-eti nne m ihe. Ka oge na-aga, nne m họọrọ ịgba ya alụkwaghịm—ihe a na-adịghị ahụkebe n’etiti ndị Gypsy. Ọ kpọọrọ mụ na nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị laa Belgium, bụ́ ebe anyị biri n’udo ruo afọ asatọ sochirinụ.

Otú ọ dị, ihe gbanwere. Anyị bụ́ ụmụaka chọwara ịhụ nna anyị, ya mere nne m kpọọrọ anyị gaa France, ya na nna m kpezikwara. Ibinyekwara nna m ọzọ wetaara m ihe ịma aka. Na Belgium, anyị na-eso nne anyị aga ebe ọ bụla. Ma n’ezinụlọ nna m sitere na ya, ndị ikom kwesịrị iso ndị ikom na-akpakọrịta. Echiche ha nke igosi na ha bụ ndị ikom bụ na nwoke nwere ike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ime nakwa na ọ bụ ndị inyom nwe ịrụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị achọrọ m inyere nwanne papa m nke nwanyị aka ịkwachasị tebụl na ịsa efere mgbe anyị risịrị nri abalị, nwanne papa m nke nwoke boro m ebubo na m bụ onye na-edina ụdị onwe ya. N’ezinụlọ o si na ya, ịsa efere bụ nnọọ ọrụ dịịrị nwanyị. N’ikpeazụ, echiche a na-ezighị ezi bịara metụta ụzọ m si eche echiche.

O teghị aka nna m ejiri obi ọkụ mesowekwa nne m ihe ike ọzọ. Ọtụtụ oge anyị gbalịrị igbo ha, mụ na nwanne m nwoke aghaghị isi na windo mịpụ iji zere ịbụ ndị nna m suru ọkpọ. O rukwuru ọbụna nwanne m nwanyị ahụ́. N’ihi ya, ruo ókè o kwere mee, ana m anọ n’ebe ọzọ karịa ka m na-anọ n’ụlọ. Mgbe m gbara afọ 15, enweghị m nzube ná ndụ.

Ka oge na-aga, e ji iwe ọkụ m mara m. Ọ na-atọ m ụtọ ịrụsa ndị ọzọ arụrụala. Mgbe ụfọdụ m ga-ama ụma chọọ ụmụ okorobịa ndị ọzọ okwu, ma ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha ka egwu na-ekwe ịma m aka—karịsịa ebe ọ bụ na m na-ejikarị mma ma ọ bụ agbụ ígwè. N’oge na-adịghị anya, amalitere m izu ụgbọala na-ere. Mgbe ụfọdụ, m na-esunye ha nnọọ ọkụ ma na-enwe mmasị ikiri ka ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na-emenyụ ya. E mesịa, amalitere m ịwaba n’ụlọ ahịa nakwa n’ụlọ nkwakọba ihe dị iche iche na-ezuru ihe. E jidere m ọtụtụ ugboro. N’oge nke ọ bụla, ekpegaara m Chineke ekpere maka enyemaka!

Ee, ekweere m na Chineke. N’oge anyị nọ na Belgium, agara m ụlọ akwụkwọ ndị okpukpe nwe. Ya mere, amaara m na ihe m na-eme ezighị ezi. Ka o sina dị, nkwenye m kwenyere na Chineke enweghị mmetụta ọ bụla n’akparamàgwà m. Echere m na nanị ihe m ga-eme agwụla ịrịọ mgbaghara Chineke, o wee gbaghara m mmehie m.

Na 1984, a mara m ikpe ịga mkpọrọ ọnwa 11 maka izu ohi. A kpọgara m n’Ụlọ Mkpọrọ Baumettes, dị na Marseilles. N’ebe ahụ, egburu m egbugbu n’akụkụ dị iche iche nke ahụ́ m. Otu egbugbu gụrụ, sị, “ịkpọasị na ịbọ ọ́bọ̀.” Kama ịgbanwe, ekwere m ka ụlọ mkpọrọ mee ka m kpọkwuo ndị ọchịchị na ọha na eze n’ozuzu ha, asị. Mgbe a tọhapụrụ m, ka m nọsịrị mkpọrọ ruo nanị ọnwa atọ, enwekwuru m ịkpọasị karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Mgbe e mesịrị, otu ọdachi gbanwere ụzọ ndụ m.

Ịbọ Ọ́bọ̀ Aghọọ Ihe Mgbaru Ọsọ M

Ezinụlọ anyị na otu ezinụlọ ndị Gypsy ọzọ nwere esemokwu. Mụ na ụmụnne papa m ndị nwoke kpebiri ịwakpo ha iji mee ka okwu ahụ bie. Ezinụlọ abụọ ahụ bucha ngwá ọgụ. N’arụmụka sochirinụ, a gbagburu nwanne papa m nke nwoke bụ́ Pierre na nwa nwanne nna m ochie. Isi gbakara m nnọọ nke ukwuu nke na m buuru égbè guzoro n’okporo ámá na-aba mba n’oké iwe. Otu n’ime ụmụnne papa m ndị nwoke mesịrị hịọnara m égbè ahụ.

Ọnwụ Deede Pierre, bụ́ onye m weere dị ka nna m, kpataara m oké iru újú. Amalitere m iru újú dị ka omenala ndị Gypsy si dị. Ruo ọtụtụ ụbọchị, akpụghị m ajị agba ma ọ bụ rie anụ ọ bụla. Ajụrụ m ikiri telivishọn ma ọ bụ ige egwú. Aṅụrụ m iyi na m ga-egbugwara ogbugbu e gburu nwanne papa m, ma ndị ikwu m gbochiri m inweta égbè.

N’August 1984, e debara aha m n’òtù ndị agha. Mgbe m dị afọ 20, edebara m aha n’òtù ndị agha nchebe udo nke Mba Ndị Dị n’Otu na Lebanọn. Igbu mmadụ ma ọ bụ ịbụ onye e gburu bụ ihe ize ndụ m nakweere. N’oge ahụ, anọ m na-ese hashish nke ukwuu. Tụkwasị n’ime ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye ahụ́ dị mma, o mere ka m nwee mmetụta na ọ dịghị ihe pụrụ imerụ m ahụ́.

Ọ dị mfe inweta ngwá ọgụ na Lebanọn, ya mere ekpebiri m izilaga ngwá ọgụ na France iji jikerekwuo maka igbugwara ogbugbu e gburu nwanne papa m. Azụtara m obere égbè abụọ na mgbọ n’aka ndị bi n’ógbè ahụ. Atụkasịrị m égbè ndị ahụ, zoba ha n’ime redio abụọ, ma zilaga ha.

Nanị izu abụọ tupu m jesịa ozi agha m, mụ na ndị enyi m atọ hapụrụ ebe ọrụ anyị n’anataghị ikike. Mgbe anyị laghachitere n’ogige ndị agha, a kpọchiri anyị. N’oge m nọ na nga, ọnụma sụjuru m obi, m wee tie otu onye nche ihe. O nwerenụ ka ọ dị na onye payo—onye na-abụghị onye Gypsy—ga-akparị m. N’echi ya, mụ na onye ọzọ chịpụrụ ya, na nke ugbu a, ọ bụ mụ na otu onye ọfịsa. A kpọgara m n’Ụlọ Mkpọrọ Montluc, dị na Lyons, iji nọtọpụ oge fọdụrụnụ n’ozi agha m.

Achọtara M Nnwere Onwe—N’ụlọ Mkpọrọ

N’ụbọchị mbụ m nọrọ n’Ụlọ Mkpọrọ Montluc, otu nwa okorobịa nwere ihu ọchị kelere m nnọọ nke ọma. Achọpụtara m na ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa na ya na ndị ha na ya nọ n’otu okpukpe nọ n’ụlọ mkpọrọ nanị n’ihi na ha achọghị ibuli ngwá ọgụ. Nke ahụ juru m anya. Achọrọ m ịmụtakwu ihe.

Achọpụtara m na Ndịàmà Jehova nwere ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, ụkpụrụ omume ọma dị elu ha nwere masịkwara m. Ma, m ka nwere ọtụtụ ajụjụ. Karịsịa, achọrọ m ịmata ma ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ iso ndị dị ndụ kwurịta okwu ná nrọ—ihe ọtụtụ ndị Gypsy kwenyere na ya. Otu Onyeàmà aha ya bụ Jean-Paul kwuru ka ya soro m mụọ Bible, o ji akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe. *

Agụchapụrụ m akwụkwọ ahụ n’otu abalị, ihe m gụrụ metụkwara m n’obi. Achọtawo m ezi nnwere onwe n’ụlọ mkpọrọ ebe a! Mgbe e mesịrị tọhapụ m n’ụlọ mkpọrọ, ebuuru m akpa m nke akwụkwọ ndị dabeere na Bible jupụtara, banye ụgbọ okporo ígwè laa.

Iji kpọtụrụ Ndịàmà nọ n’ógbè m, agara m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Martigues. Anọgidere m na-amụ Bible, nke ugbu a bụ site n’enyemaka nke otu onye ozi oge nile nke na-akatabeghị ahụ́, onye aha ya bụ Eric. N’ime ụbọchị ole na ole, akwụsịrị m ise ụtaba, akwụsịkwara m iso ndị mụ na ha na-emekọbu mpụ na-akpakọrịta. Ekpebisiri m ike ime ihe kwekọrọ n’Ilu 27:11, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” Ahụwo m Jehova dị ka Nna nke na-ahụ n’anya, bụ́ onye m chọrọ ime ihe na-atọ ya ụtọ.

Ihe Ịma Aka nke Ime Mgbanwe

Ọ dịghịrị m mfe itinye ụkpụrụ Ndị Kraịst n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, amaliteghachiri m ịṅụ ọgwụ ọjọọ ruo ọtụtụ izu. Ma ihe ịma aka siiri m ike karịsịa bụ ịkwụsị ọchịchọ nke imegwara ihe. Eric amaghị na m na-ebugharị égbè mgbe nile nakwa na m ka na-emesi atụmatụ ike igbugwara ogbugbu e gburu nwanne papa m. Eji m otu abalị dum nwaa ịchọta ha.

Mgbe m gwara Eric banyere nke a, ọ kọwaara m n’ụzọ doro anya na apụghị m iso Chineke nwee ezi mmekọrịta mgbe m ka na-ebugharị ngwá ọgụ ma na-achọ imegwara ihe. Aghaghị m ime nhọrọ. Atụgharịrị m uche na ndụmọdụ Pọl onyeozi nke dị ná Ndị Rom 12:19: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere.” Nke a, na ikpesi ekpere ike, nyeere m aka ịchịkwa mmetụta m. (Abụ Ọma 55:22) N’ikpeazụ, atụfuru m ngwá ọgụ m. Na December 26, 1986, mgbe m mụsịworo Bible ruo otu afọ, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova Chineke site na baptizim ime mmiri.

Ezinụlọ M Emeghachi Omume

Mgbanwe ndị m mere n’akparamàgwà m kpaliri nne na nna m ịmụ Bible. Ha lụgharịrị, e mekwara nne m baptizim na July 1989. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị ọzọ si n’ezinụlọ anyị nabatara ozi Bible ma ghọọ Ndịàmà Jehova.

N’August 1988, ekpebiri m ịghọ onye ozi oge nile. E mesịa, abịara m nwee ịhụnanya n’ahụ́ otu nwanna nwanyị na-eto eto nọ n’ọgbakọ m, onye aha ya bụ Katia. Anyị lụrụ di na nwunye na June 10, 1989. Afọ mbụ nke alụmdi na nwunye anyị adịghị mfe, n’ihi na m ka nwere mgbanwe ndị m ga-eme n’ụzọ m si emeso ndị inyom. O siiri m ike itinye okwu ndị dị na 1 Pita 3:7 n’ọrụ, bụ́ nke na-agba ndị bụ́ di ume ịdị na-enye nwunye ha nsọpụrụ. Ugboro ugboro, ekpere m ekpere maka ikike iji chịkwaa mmetụta m ma gbanwee echiche m. Ihe ji nke nta nke nta ka mma.

Ọnwụ nwanne papa m ka na-akpatara m oké ihe mgbu, mgbe ụfọdụkwa, apụghị m ịkwụsị anya mmiri na-agba m mgbe m chetara ya. Agbalịrị m ịchịkwa oké mmetụta ndị m na-enwe ma m cheta ogbugbu e gburu ya. Ruo ọtụtụ afọ, ọbụna mgbe e mesịrị m baptizim, atụrụ m ụjọ izute ndị òtù nke ezinụlọ ahụ anyị na ha seburu okwu na mberede. Gịnị ka m ga-eme ma ọ bụrụ na ha awakpoo m? Olee otú m ga-esi meghachi omume? Àgwà ochie m ọ̀ ga-achịkwa m?

Otu ụbọchị, ekwuru m okwu ihu ọha n’otu ọgbakọ dị nso. N’ebe ahụ, ahụrụ m Pepa, bụ́ onye ikwu nke ndị ikom ahụ gburu nwanne papa m. Aghaghị m ikweta na anya nkịtị m hụrụ ya tinyere nnọọ àgwà m dị ka Onye Kraịst n’ule. Ma ewepụrụ m ihe ahụ nile n’uche m. Mgbe e mesịrị, n’ụbọchị e mere Pepa baptizim, amakụrụ m ya ma jaa ya mma maka mkpebi o mere ijere Jehova ozi. N’agbanyeghị ihe nile meworonụ, anabatara m ya dị ka nwanna m nwanyị n’ụzọ ime mmụọ.

Kwa ụbọchị, ana m ekele Jehova maka ịtọhapụ m n’agbụ nke ịkpọasị. Olee ebe m gaara anọ taa ma e wezụga ebere Jehova? Site n’enyemaka ya, ana m enwe ndụ ezinụlọ obi ụtọ. Enwekwara m olileanya maka ọdịnihu—nke ụwa ọhụrụ ebe ịkpọasị na ime ihe ike na-agaghị adị na ya. Ee, enwere m obi ike zuru ezu na nkwa Chineke ga-emezu: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi [vaịn] ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.”—Maịka 4:4.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 19]

Mgbe m so ná ndị agha nchebe udo nke òtù UN nọ na Lebanọn, n’afọ 1985

[Foto dị na peeji nke 20]

Mụ na Katia na ụmụ m ndị ikom, bụ́ Timeo na Pierre