Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Achọtaghachiri M Jizọs E Chezọrọ Echezọ’

‘Achọtaghachiri M Jizọs E Chezọrọ Echezọ’

‘Achọtaghachiri M Jizọs E Chezọrọ Echezọ’

Mgbe otu nwanyị si Saint-Jérôme, Quebec, Canada, gụsịrị akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, o dere, sị: “Ọ bụ oké mmasị ka m ji chọtaghachi Jizọs e chezọrọ echezọ, bụ́ onye ndị ọkà n’ise ihe na-esekarị n’ụzọ na-eyitụghị onye dị adị.”

Nwanyị ahụ kwuru banyere ihe osise ndị dị n’akwụkwọ ahụ, sị: “Ihe ndị e sere n’akwụkwọ unu masịrị m nke ukwuu. Ndị e sere na ya yiri m ka hà bụ ndị ahụ dịrị ndụ n’ezie n’oge Jizọs dị ndụ ma na-eme nkwusa.” O kwubiri, sị: “Mma mmanụ maka ide akwụkwọ a. Ọ bụ ihe nduzi nke na-eduzi ndị na-achọ ịmụtakwu eziokwu ndị Jizọs kụziri.”

Akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu na-agbalị ịkọwa ihe omume ọ bụla mere ná ndụ elu ala Jizọs bụ́ ndị a kọrọ n’Oziọma anọ ndị ahụ, gụnyere okwu ndị Jizọs kwuru na ihe atụ ndị o nyere na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ. Ruo n’ókè o kwere mee, a kọrọ ihe nile n’usoro e kweere na ha si mee. Dịkwa ka a kọrọ n’elu, akwụkwọ ahụ nwere ihe osise ndị mara mma ma bụrụ ndị yiri ihe dị adị, bụ́ ndị e sere iji gosịpụta mmetụta Jizọs na nke ndị ya na ha dịkọrọ ndụ.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a dị peeji 448, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.