Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Anyị Na-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ’

‘Anyị Na-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ’

‘Anyị Na-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ’

Mgbe ọ dị afọ 17, Adam so n’ime mmadụ atọ merịrịnụ n’asọmpi nke Ebe Ndebe Ihe Ncheta nke Oké Mgbukpọ ahụ nke dị na United States kwadoro. Ndị nyefere ihe omume ha maka asọmpi ahụ—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 500—ji ihe osise ma ọ bụ ihe odide gosipụta obi ike e nwere n’okpuru ọchịchị nchịgbu ndị Nazi. Adam bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o kpebikwara ise ihe osise ndị a dụgidechara n’otu obosara ákwà bụ́ nke ga-egosi ahụhụ ndị òtù okpukpe ya tara n’okpuru ọchịchị Nazi. Ihe osise ahụ, ka Adam na-ekwu, gosipụtara ọ bụghị nkụda mmụọ ma ọ bụ obi ilu, kama ọṅụ, n’ihi na Ndịàmà Jehova meriri ná mwakpo kpụ ọkụ n’ọnụ nke onye mmegbu obi ọjọọ ahụ. A dụgidere nwatakịrị e sere ese na ya. N’ihi gịnị? “Iji gosi na ọbụna ụmụaka guzosiri ike ná mkpagbu ndị Nazi,” ka Adam na-ekwu.

Ọ bụ ihe a maara nke ọma na n’oge ọchịchị Nazi, Ndịàmà Jehova jụrụ igbuchapụrụ Hitler ma ọ bụ ịkwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya. E gosipụtara mkpebi ha n’elu akụkụ aka nri nke ihe osise Adam. N’ebe ahụ, e hotara akwụkwọ ozi ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova zigaara gọọmenti Germany n’October 7, 1934. Akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ ozi ahụ na-agụ, sị: “Iwu gị na iwu Chineke ekwekọtụghị, n’ịgbasokwa nzọụkwụ ndịozi kwesịrị ntụkwasị obi, ‘anyị kwesịrị irubere Chineke isi karịa mmadụ,’ nke a ka anyị ga-emekwa. (Ọrụ 5:29) . . . Ebe ọ bụ na gọọmenti gị na ndị gị na ha na-achị nọgidere na-anwa ịmanye anyị inupụrụ iwu kasịnụ n’eluigwe na ala isi, a kpaliwo anyị ugbu a ime ka unu mara na, site n’amara ya, anyị ga-erubere Jehova Chineke isi ma tụkwasị obi kpam kpam n’ebe Ọ nọ na ọ ga-anapụta anyị ná mmegbu nile nakwa n’aka ndị mmegbu nile.”

Obi dị Adam ụtọ inwe ihe nketa ime mmụọ a. “Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike n’ịghara imerụ mmadụ ibe ha ahụ́ nakwa n’ịghara ife onye ọ bụla ọzọ karịa Chineke, ọbụna ma a sị na nke a ga-eweta ọnwụ,” ka ọ na-ekwu. Nguzo na-adịghị ada ada nke Ndịàmà Jehova pụtara ìhè n’isiokwu nke ihe osise Adam bụ́: “Anyị Ga-erubere Chineke Isi Karịa Mmadụ!”