Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anya Ugo

Anya Ugo

Anya Ugo

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SPEN

NDỊ Spen na-akọwa onye na-ahụ nnọọ ụzọ nke ọma dị ka onye nwere anya ugo (vista de águila). Ndị Germany nwekwara okwu yiri ya (Adlerauge). N’inwe ezi ihe kpatara ya, ọhụhụ ugo na-ahụ ụzọ nke ọma abụrụwo ihe e ji ama atụ kemgbe ọtụtụ narị afọ. Akwụkwọ Job, nke e dere ihe karịrị puku afọ atọ gara aga, na-ekwu banyere ugo, sị: “Anya ya abụọ na-esi n’ebe dị anya legide ya.”—Job 39:27, 29.

Ruo ókè hà aṅaa ka ugo pụrụ n’ezie ịhụ ihe dị n’ebe dị anya? “N’ọnọdụ ndị dị otú o kwesịrị, ugo nke na-acha ọlaedo ọlaedo (Aquila chrysaetos) pụrụ ịnọ ihe karịrị kilomita 2 hụta ntakịrị mmegharị ahụ́ nke ewi,” ka The Guinness Book of Animal Records na-akọwa. Ndị ọzọ ekwuwo na ugo pụrụ ịhụ ihe nọ ebe dị anya ọbụna karị!

Gịnị na-eme ka ugo na-ahụ ụzọ nke ọma otú a? Nke mbụ, ugo nke na-acha ọlaedo ọlaedo nwere nnukwute anya abụọ, bụ́ ndị weghaara akụkụ buru ibu n’isi ya. Akwụkwọ bụ́ Book of British Birds na-ekwu na a bịa n’ihe banyere ugo nke na-acha ọlaedo ọlaedo, anya ya “buru oké ibu n’ezie ma ọ dịghị arọ nke na ọ na-egbochi ya ife efe.”

Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ mkpụrụ ndụ na-adọta ìhè ndị dị n’anya ugo ji ihe dị ka okpukpu ise karịa ole dị n’anya anyị—ihe dị ka 1,000,000 cone n’otu square milimita ebe nke anyị dị 200,000. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e jikọtara mkpụrụ ndụ nke ọ bụla na-adọta ìhè na akwara na-ebu ozi. N’ihi ya, akwara dị n’anya ugo, bụ́ nke na-esi n’anya buru ozi gaa n’ụbụrụ, nwere ọnụ ọgụgụ akwara ji okpukpu abụọ karịa nke dị n’anya mmadụ. Ka a sịkwa ihe mere ihe ndị a e kere eke ji na-ahụ àgwà dị iche iche nke ọma! N’ikpeazụ, nnụnụ ndị na-eri anụ, dị ka nnụnụ ndị ọzọ, nwere ihe ndị yiri enyo na-ahụ ụzọ nke ọma n’anya ha, bụ́ ndị ha pụrụ ịhazigharị ngwa ngwa isi n’ilekwasị anya n’ihe ndị dị nnọọ sentimita ole na ole gaa n’ihe ndị dị n’ebe dị nnọọ anya. Anya ha karịkwara nnọọ anya anyị n’akụkụ a.

Ugo na-aka ahụ ụzọ n’oge ehihie, ma ikwiikwii na-aka ya ahụ ụzọ n’abalị. Nnụnụ ndị a na-efe n’abalị, bụ́ ndị na-eri anụ, nwere anya ndị jupụtara n’ihe ndị na-ahụ ìhè nke a na-akpọ rod, nweekwa ihe sara nnọọ mbara nke yiri enyo. N’ihi ya, n’abalị, ha pụrụ ịhụ ụzọ nke ọma karịa anyị otu narị ugboro. Otú ọ dị, n’oge ndị ahụ a na-adịghị enwekebe, mgbe ọchịchịrị na-agba kpam kpam, ikwiikwii aghaghị ịdabere kpam kpam n’ikike ịnụ ihe nke ọma ha iji nweta anụ ha ga-eri.

Ònye nyere nnụnụ ndị a ikike ndị dị otú ahụ? Chineke jụrụ Job, sị: “Ọ̀ bụ n’okwu ọnụ gị ka ugo na-efeli elu?” N’ezie, ọ dịghị mmadụ pụrụ ikwu na ọ bụ ya ka otuto ga-adịrị maka ọrụ okike a dị ịtụnanya. Job n’onwe ya ji ịdị umeala n’obi kweta, sị: “Amawo m na Ị [Jehova] pụrụ ime ihe nile.” (Job 39:27; 42:1, 2) Anya ugo bụ otu ihe akaebe ọzọ nke amamihe Onye Okike anyị nwere.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ugo nke na-acha ọlaedo ọlaedo

[Foto dị na peeji nke 30]

Ikwiikwii nke na-acha ọcha