Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ime Ka Ihe Ndị A Tụfuru Atụfu Ghọọ Ọlaedo

Otu ụlọ ọrụ na-egwupụta akụ̀ dị n’ime ala na Japan achọpụtawo ụzọ dị mfe, nke na-ewetakwa uru karị, nke e si enweta ọla ndị dị oké ọnụ ahịa. Kama itinye oge na ego dị ukwuu n’ịchọ ọla ore, otu ụlọ ọrụ na-agbaze ma na-anụcha ihe n’Akita Prefecture na-agbazezi iberibe fon a na-eji agagharị agagharị na iberibe kọmpụta, bụ́ ndị a tụfuru atụfu, iji nweta ọla ndị dị oké ọnụ ahịa, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ IHT Asahi Shimbun nke Tokyo, na-akọ. Dị ka onyeisi ụlọ ọrụ ahụ si kwuo, “1 tọn fon a na-eji agagharị agagharị bụ́ ndị a tụfuru atụfu—ndị batịrị na-adịghị na ha—pụrụ inye ọtụtụ narị gram ọlaedo.” E jiri ya tụnyere ụzọ e si egwupụta akụ̀ dị n’ime ala kemgbe ụwa, ihe otu tọn “ikpo ngwá ndị a dị n’obodo ukwu” na-enye pụrụ ịkarị ihe ọla ore na-enye okpukpu iri. Ọzọkwa, ọ dịghị mkpa itinyekwu ego iji nweta ngwá ọrụ dị iche iche a na-eji enweta ọla, ebe ọ bụ na inweta ọlaedo site na fon ndị a na-eji agagharị agagharị adịchaghị iche n’inweta ígwè n’ime ore.

Anụ Llama Ndị Na-eche Nche

Iji na-eche atụrụ ha nche, ndị nwere ugbo a na-azụ atụrụ n’Ebe Ugwu America na-ejizi anụ llama eme ihe. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail, nke Canada, si kwuo, anụ llama “na-enwe nnọọ mmasị n’ebe anụmanụ ndị ha na ha na-anọkọrịta nọ.” Ha na-eji ike ha nile eche ìgwè atụrụ ha na ha nọ nche site n’iti mkpu, ịchịkọta atụrụ ndị ahụ, ịchụpụ anụ ndị wabataranụ, na ịgba anụ ndị na-eri atụrụ ụkwụ ma ọ bụ ịga ha mbọ́. Ọbụna ụfọdụ ndị ọrụ ugbo na-ahọrọ anụ llama karịa nkịta ndị na-eche nche n’ihi na ha dịtụ ọnụ ala. Ọzọkwa, akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na, “ebe ọ bụ na anụ llama na-eso atụrụ ndị ahụ ata nri, na-esokwa ha ehi ụra, a dịghị emefu ego ọzọ iji lekọta ha—ha pụkwara ịdịru ndụ ọtụtụ afọ karịa ụdị nkịta ndị na-eche nche bụ́ ndị a ma ama.” Otu onye Canada nwere ugbo a na-azụ atụrụ bụ́ onye nwere anụ llama si otú a kọwaa uru ndị dị n’inwe ya: “Ha adịghị efu gị ihe ọ bụla,” ‘ha adịghịkwa agbọ ụja.’

Ihe Na-eme Ka Ihe Jụọ Oyi nke Ọ Na-abụghị Aka Mere

Otu ìgwè na-eme nnyocha na Germany achọpụtawo mmiri ọgwụ ọ na-abụghị aka mere nke nwere ikike nke ime ka ihe jụọ oyi karịa menthol okpukpu 35, ma ka ghara ịtọ ka ihe nracha bụ́ mint. A chọpụtara mmiri ọgwụ ahụ, bụ́ nke na-apụtara onwe ya n’ime biya na whiskey n’Ụlọ Ọrụ Nnyocha Ọdịdị Ihe Oriri nke Germany dị na Garching, Munich. Magazin bụ́ New Scientist hotara Thomas Hofmann, bụ́ onye ntụzi ọrụ nke ìgwè nnyocha ahụ, dị ka onye na-ekwu, sị: “Ọ pụrụ ime ka ihe dịgasị iche iche, gụnyere biya, mmiri a gbanyere na karama, ihe ọṅụṅụ e ji oroma mee, chocolate na ihe nracha, jụọ nnọọ oyi n’ọnụ.” Ebe ọ bụkwa na mmiri ọgwụ ahụ na-ajụ oyi n’ahụ́ mgbe o ji okpukpu 250 dị obere karịa ihe nracha mint, ọ pụrụ ime ka ihe ntecha ma ọ bụ mmanụ otite dị mma n’ahụ́.

Nsị́ Anụ na Nje Ndị Bụ́ Ọnyịrị Ọnwụ

“Ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị ize ndụ nke ọgwụ nje ndị a gbara ụmụ anụmanụ a na-akpa akpa emetọwo ugbo ndị dị gburugburu Europe,” ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. A na-agba ụmụ anụmanụ ndị a na-akpa akpa ihe karịrị tọn 10,000 nke ọgwụ nje kwa afọ ná Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe nakwa na United States, iji kwalite uto ma gbochie ọrịa. “Ma ná nnyocha e mere na nso nso a, a chọpụtara ihe jikọtara kpọmkwem ojiji a na-ejiwanye ọgwụ ndị a a na-agba ụmụ anụmanụ ndị a na-akpa akpa eme ihe na mpụta nke nje ndị ọgwụ nje na-adịghị egbu bụ́ ndị ndị mmadụ na-ebute,” ka magazin ahụ na-ekwu. “Ọgwụ ndị ahụ, bụ́ ndị dị na nsị́ anụ ndị a na-awụ n’ugbo dị ka fatịlaịza, pụrụ ịdị na-abanye n’ihe oriri na mmiri anyị . . . , [ma] na-emetọ ihe ọkụkụ, bụ́ ndị a na-emesị rie,” ka magazin bụ́ New Scientist na-ekwu.

Ndị Nne na Nna Ochie Maka “Nkuchi”

Ụfọdụ ezinụlọ ndị dị na Spen emewo ndokwa ‘ikuchi’ ndị agadi 66 na-enweghị ndị ikwu, ka akwụkwọ akụkọ Spen bụ́ El País, na-akọ. “Nzube nke ihe omume a . . . bụ ime ka ndị na-apụghịzi ibi nanị ha nwee ebe ọzọ ha ga-aga ma e wezụga ịga n’ebe obibi ndị agadi,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu. Ndị so tinye akwụkwọ maka ịkpọrọ ndị agadi ahụ bụ ndị di na nwunye nọ n’afọ ndị nke 50 ha bụ́ ndị chọrọ ka onye meworo agadi kere òkè ná ndụ ha. Ezinụlọ ndị ọzọ nwere obere ụmụaka na-ekwu na ha ga-achọ inwe nne ma ọ bụ nna ochie n’ebe obibi ha. Ọ bụ ezie na a na-enye ezinụlọ ndị kuchiri ha onyinye ego, “ihe na-akpali ha n’ezie abụghị ego,” ka onye ntụzi ukwu nke ihe omume ahụ, bụ́ Marisa Muñoz-Caballero, na-akọwa. “Ọ bụrụ na ọ bụ ego na-akpali ha, n’oge na-adịghị anya ike ga-agwụ ha n’ihi na ilekọta ndị agadi bụ ọrụ siri ike.”

Ime Ihe Ike n’Ebe Obibi na Europe

“Otu onye n’ime ụmụ nwanyị ise ọ bụla nọ na Europe na-abụ onye di ya mesoro ihe ike n’otu oge ná ndụ ya,” ka Anna Diamantopoulou, onye Europe bụ́ kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na ihe omume ọha na eze, kwuru. Diamantopoulou kwuru ná Nzukọ Ndị Minista Maka Ịkwụsị Imeso Ndị Inyom Ihe Ike, bụ́ nke e nwere na Spen ná mmalite afọ a, sị: “Gburugburu ụwa, ndị inyom dị n’agbata afọ 15 na afọ 44 yikarịrị ka hà ga-abụ ndị a ga-akwarụ ma ọ bụ ndị ga-anwụ n’ihi ime ihe ike nke ndị ikom, karịa ka o yiri ka hà ga-anwụ n’ihi ọrịa cancer, ịba, ihe mberede okporo ụzọ ma ọ bụ agha, ma a gụkọta ha nile.” Na United Kingdom, “otu nwanyị na-anwụ kwa ụbọchị 3 n’ihi ime ihe ike n’ebe obibi,” ebe “ihe karịrị ọkara ụmụ nwanyị e gburu na Ireland na-abụ ndị nwoke ha na ha bi ma ọ bụ di ha gburu.” N’Austria kwa, ka akwụkwọ akụkọ France a na-ebipụta kwa ụbọchị bụ́ Le Monde na-akọ, “ọkara nke ịgba alụkwaghịm nile a na-enwe na-abụ n’ihi mkpesa ndị bụ́ nwunye na-eme na di ha na-emeso ha ihe n’ụzọ obi ọjọọ.”

Igbochi Mmiri Iri Ụmụaka

Ná mba 26 n’ime mba ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa, mmiri iri mmadụ bụ ihe nke abụọ kasị egbu ụmụaka ndị na-agafebeghị afọ 14, ka magazin bụ́ BMJ (nke bụ́bu British Medical Journal), na-akọ. Dị ka magazin ahụ si kwuo, “o yikarịrị ka mmiri ọ̀ ga-eri ụmụ ọhụrụ n’ebe obibi (ọ na-abụkarị n’ọkwá ịsa ahụ́); yie ka ọ̀ ga-eri ụmụaka na-amụ ije n’ọdọ mmiri ndị didewere ebe obibi ndị dị ka ebe igwu mmiri ma ọ bụ ọdọ mmiri; yiekwa ka ọ̀ ga-eri ụmụaka ndị totụworo eto ná mmiri ndị ọ na-abụghị aka mere ndị dị ka ọdọ mmiri na osimiri.” Iji gbochie ihe mberede ndị dị otú ahụ, ndị ọkachamara na-atụ aro ihe na-esonụ: Na-elebara ụmụ ọhụrụ ndị nọ n’ọkwá ịsa ahụ́ ma ọ bụ gburugburu ọdọ mmiri ọ bụla anya mgbe nile; gbaa ọdọ mmiri e gwuru n’ubi ma ọ bụ ebe igwu mmiri ogige otú a na-agaghị esi n’ebe obibi banye na ya; ekwela ka ụmụntakịrị gwuo mmiri nanị ha ma ọ bụ n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ; nata ọzụzụ banyere ụzọ a na-esi atụte mmadụ.

Iru ná Mmalite Oge Uto na Nwata

“A na-eruwanye mmalite oge uto ngwa ngwa karị,” ka akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Berliner Zeitung na-ekwu. Ọ bụghịzi ihe ọhụrụ oge ịbụ nwata ijedebe, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ọdịdị elu ahụ́, mgbe nwatakịrị nọ n’agbata afọ 10 na afọ 12 ma ọ bụ tupu mgbe ahụ. N’ụwa nile, ndị nnyocha ahụwo ihe ọhụrụ a na-emenụ ma ha ejighị ihe ndị na-akpata ya n’aka. E kwuru na ọ pụrụ ịbụ ihe oriri kawanyere mma na mbelata nke ọrịa ndị na-efe efe na-akpata ya. Ndị ọzọ na-ebo ya nsí ndị dị na gburugburu ebe obibi, karịsịa ihe ndị ahụ na-enwe mmetụta dị ka mmiri ọgwụ hormone ndị inyom bụ́ estrogen. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya na-akpata ya, itozu okè n’ụzọ mmekọahụ na nwata pụrụ ime ka a malite inwe mmekọahụ na nwata. “Ọtụtụ mgbe, site n’oge mmadụ na-amụ ije ruo n’oge ọ ga-enwe mmekọahụ mbụ ya na-ewe nanị afọ ole na ole,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu.

Iwe Ọkụ Pụrụ Igbu Gị

“Ndị na-ewe iwe ọkụ yikarịrị ka hà ga-arịa ọrịa strok,” ka akwụkwọ akụkọ Spen bụ́ Diario Médico, na-ekwu. Ọ dịwo anya ndị dọkịta jikọtawara àgwà obi ọjọọ na ohere buwanyere ibu mmadụ nwere ịrịa ọrịa obi. Nnyocha e mere na nso nso a egosiwo na àgwà dị otú ahụ na-amụbawanye ohere e nwere ịrịa ọrịa strok. Ná nnyocha e mere mmadụ 14,000 toworo eto, ndị na-ewekarị iwe bụ́ ndị na-erubeghị afọ 60 nwere ohere ịrịa ọrịa strok karịa ndị ọzọ okpukpu atọ. N’ihi gịnị? O yiri ka iwe ọ̀ pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị, mkpachi nke akwara, na ọ̀tụ̀tụ̀ ihe na-eme ka ọbara kpụkọọ akpụkọọ ji amụba, “rịa nnọọ elu,” bụ́ nke “ka oge na-aga, pụrụ imetụta nrugharị ọbara n’ụbụrụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.