Nzọụkwụ Mbụ—Nrụrịta Ụka n’Ihu Ụlọikpe Kasị Elu
Nzọụkwụ Mbụ—Nrụrịta Ụka n’Ihu Ụlọikpe Kasị Elu
ỤBỌCHỊ E WEPỤTARA a ga-enwe nrụrịta ụka ahụ n’ihu Ọkàikpe Ukwu William Rehnquist na ndị ọkàikpe ibe ya asatọ nke Ụlọikpe Kasị Elu bụ February 26, 2002. Ìgwè nke ndị ọkàiwu anọ mejupụtara kpechitere ọnụ Ndịàmà Jehova.
Onye ndú ndị ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà ji okwu na-akpali mmasị malite arụmụka ya: “Ọ kụọla elekere anya 11:00 nke ụtụtụ Saturday n’Obodo Nta Stratton. [Mgbe ahụ, ọ kụrụ aka ugboro atọ n’elu tebụl ikpo okwu.] ‘Ị̀ bọọla chi. N’ihi ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya, etinyewo m mgbalị dị ukwuu iji bịa n’ebe obibi gị ịgwa gị ihe Onye Amụma bụ́ Aịzaịa kọwara dị ka ihe ka mma. Nke ahụ bụ oziọma ahụ Kraịst Jizọs kwuru banyere ya, oziọma nke Alaeze Chineke.’”
Ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ọ bụ ime mpụ bụ́ ịga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ n’Obodo Nta Stratton ma zie ozi ahụ ọ gwụla ma onye ahụ ò buru ụzọ nweta akwụkwọ ikike n’aka obodo nta ahụ iji mee otú ahụ.”
‘Ọ̀ Bụ na Unu Adịghị Ekwu Ka E Nye Unu Ego?’
Ọkàikpe Stephen G. Breyer jụrụ ajụjụ ụfọdụ dị mkpa banyere Ndịàmà. Ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na ndị kpọrọ gị adịghị ekwu ka e nye ha ego, ọbụnadị otu peni, nakwa [na] ha adịghị ere Bible, na ha adịghị ere ihe ọ bụla, nanị ihe ha na-eme bụ ikwu, sị, ‘Achọrọ m ịgwa gị banyere okpukpe’?”
Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà zara, sị: “Nna Anyị Ukwu, ihe ndị meworonụ doro nnọọ anya, n’Obodo Nta Stratton, Ndịàmà Jehova ekwughị ka e nye ha ego. N’ógbè ndị ọzọ, ihe ndị meworonụ dokwara anya na mgbe ụfọdụ ha ga-ekwu banyere onyinye afọ ofufo. . . . Anyị adịghị achọ ebe anyị ga-arịọta ego. Nanị ihe anyị na-achọ bụ ịgwa ndị mmadụ banyere Bible.”
Ọ̀ Dị Mkpa Inweta Ikike n’Aka Gọọmenti?
Ọkàikpe Antonin Scalia ji nghọta jụọ, sị: “Echiche unu ọ́ bụghị na unu ekwesịghị ịgakwuru onyeisi obodo ma rịọ maka akwụkwọ ikike iji gwa ndị agbata obi unu banyere ihe na-akpali mmasị?” Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà ahụ zaghachiri, sị: “Anyị ekwenyeghị na Ụlọikpe a kwesịrị ịkwado iwu Gọọmenti nke chọrọ ka nwa amaala nweta akwụkwọ ikike iji gwa nwa amaala ọzọ okwu n’ebe obibi ya.”
Mgbanwe nke Arụmụka, Mgbanwe nke Ọnọdụ Uche
Oge eruwo ugbu a ka Obodo Nta ahụ kwuo nke ha. Onye ndú ndị ọkàiwu ha kọwara iwu Stratton, na-ekwu, sị: “Stratton ji ikike nchịkwa o nwere eme ihe mgbe ọ chọrọ ịhụ na e chebere oge ndị bi na ya ji anọrọ
onwe ha, mgbe ọ chọrọ igbochi mpụ. Iwu megidere ịgagharị na ịrịọ arịrịọ n’ebe obibi mmadụ chọrọ nanị ka e buru ụzọ debanye aha n’akwụkwọ nakwa ka mmadụ jide akwụkwọ ikike mgbe ọ na-aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ.”Ọkàikpe Scalia wanyere ji ahụ mma n’ebe o kwesịrị mgbe ọ jụrụ, sị: “Ọ̀ dị okwu ikpe ọzọ unu maara anyị [Ụlọikpe Kasị Elu] lebatụworo anya na ya bụ́ nke metụtara iwu sara mbara dị ka nke a, nke metụtara ịrịọ arịrịọ, ọ bụghị ịrịọ ego, ọ bụghị ire ngwá ahịa, kama ọbụna, nke metụtara ihe dị ka, ‘Achọrọ m ikwu banyere Jizọs Kraịst,’ ma ọ bụ ‘Achọrọ m ikwu banyere ichebe gburugburu ebe obibi?’ Ànyị elebatụwo anya n’okwu ikpe dị otú ahụ?”
Ọkàikpe Scalia gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ dịghị ikpe dị otú ahụ m maara e kpetụworo n’ime ihe karịrị narị afọ abụọ gara aga.” N’ebe a ka Ọkàikpe Ukwu Rehnquist kwuru n’ụzọ na-atọ ọchị, sị: “Ị dịrubeghị ndụ otú ahụ.” Nke ahụ kpasuru ọchị n’ụlọikpe ahụ. Ọkàikpe Scalia gara n’ihu n’arụmụka ya, sị: “Ókè okwu a saruru mbara bụ ihe ọhụrụ n’anya m.”
Ọ̀ Bụ Echiche Magburu Onwe Ya?
Ọkàikpe Anthony M. Kennedy jụrụ ajụjụ a kapịrị ọnụ, sị: “I chere na ọ bụ echiche magburu onwe ya bụ́ na m ga-anatarịrị Gọọmenti akwụkwọ ikike tupu mụ agbadaa n’okporo ámá, bụ́ ebe m na-amaghị ndị nile bi na ya, [ma] kwuo, sị, Achọrọ m ịgwa unu okwu n’ihi na otú e si ekpofu ihe adịghị mma, n’ihi na ana m enwe nchegbu banyere Onye Omeiwu anyị, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ yiri ya. M̀ kwesịrị ịgwa Gọọmenti tupu mụ emee ya?” Ọ gbakwụnyere, sị, “Nke ahụ dị ịtụnanya.”
Mgbe nke ahụ gasịrị, Ọkàikpe Sandra Day O’Connor tinyere ọnụ n’arụmụka ahụ, na-ajụ, sị: “Olee banyere ụmụaka na-eme ngagharị n’oge ememe na-ekwu na ọ bụrụ na e nyeghị ha ihe ha chọrọ ha emebie ihe? Hà kwesịrị inweta akwụkwọ ikike?” Ọkàikpe O’Connor na Ọkàikpe Scalia rụkwuru ụka n’akụkụ a. Ọkàikpe O’Connor webatara arụmụka ọzọ: “Olee banyere mmadụ ịgbazite otu iko shuga n’aka onye agbata obi ya? M̀ ga-aga nweta akwụkwọ ikike iji gaa gbaziri otu iko shuga n’aka onye agbata obi m?”
Ndịàmà Hà Bụ Ndị Na-achọgharị Ndị Nkwado?
Ọkàikpe David H. Souter, jụrụ, sị: “Gịnị mere iwu a ji metụta Ndịàmà Jehova? Hà bụ ndị na-achọgharị ndị nkwado, ndị arịrịọ, ndị na-agba mgbere ahịa, ndị ahịa mbugharị, ndị ahịa na-ejegharị ejegharị? Ọ dịghị nke ọ bụla ha bụ, ka ọ̀ dị?” Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Obodo Nta ahụ hotara iwu ahụ nke ukwuu ma gbakwụnye na ụlọikpe ka ala kọwara Ndịàmà Jehova dị ka ndị na-achọgharị ndị nkwado. Ọkàikpe Souter zaghachiri na nke a, sị: “Ọ pụtanụrụ na i nwere nkọwa sara mbara maka ndị na-achọgharị ndị nkwado, ma ọ bụrụ na ọ gụnyere Ndịàmà Jehova.”
Mgbe nke ahụ gasịrị, Ọkàikpe Breyer hotara nkọwa akwụkwọ ọkọwa okwu nyere maka ndị na-achọgharị ndị nkwado iji gosi na ọ gụnyeghị Ndịàmà. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla m gụtara n’arụmụka i dere bụ́ nke kwuru ihe mere e ji chọọ ka ndị a [Ndịàmà Jehova] bụ́ ndị na-enweghị mmasị n’ego, na-enweghị mmasị n’ire ihe, ọbụna na-enweghị mmasị n’ime ntụli aka, gaa n’ụlọ ezumezu obodo ma debanye aha ha n’akwụkwọ. Gịnị bụ nzube obodo ahụ?”
“Ihe Ùgwù” nke Nkwurịta Okwu
Mgbe ahụ, Obodo Nta ahụ rụrụ ụka na “nzube nke obodo ahụ bụ igbochi iwe nke ndị nwe ebe obibi.” O mekwuru ka o doo anya na ọ bụ maka ichebe ndị bi n’obodo ahụ pụọ n’igwu wayo nakwa pụọ n’aka ndị omempụ. Ọkàikpe Scalia hotara iwu ahụ iji gosi na onyeisi obodo ahụ pụrụ ikwu ka e nyekwuo ihe ọmụma banyere onye na-edebanye aha ya n’akwụkwọ na nzube o ji eme otú ahụ iji “kọwaa n’ụzọ ziri ezi ọdịdị nke ihe ùgwù ọ chọrọ.” Ọ gbakwụnyere, n’ụzọ a kapịrị ọnụ, sị: “Unu na-ekwu na ọ bụ ihe ùgwù bụ́ ịgagharị iji mee ka ụmụ amaala ibe unu kwenye n’otu ihe ma ọ bụ n’ihe ọzọ—o kweghị m nnọọ nghọta.”
Ọkàikpe Scalia gakwara n’ihu na-ajụ, sị: “À ga-achọ ka onye ọ bụla
ga-apị mgbịrịgba ọnụ ụzọ gaa ka e were akara mkpịsị aka ya n’isi ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo tupu [ya] enwee ike ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ? Obere ohere ahụ e nwere na a ga-eme mpụ ò zuru ime ka a chọọ ka onye ọ bụla chọrọ ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ gaa debanye aha n’isi ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo? N’ezie, ọ dịghị otú ahụ.”Ọ̀ Na-echebe Ndị Bi n’Obodo?
Mgbe minit 20 e nyere ya gwụrụ, ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Obodo Nta ahụ nyeere osote ọkàikpe ukwu nke steeti Ohio ohere. O kwuru na iwu ahụ e tiri ka mmadụ ghara ịrịọ arịrịọ chebere ndị bi n’obodo nta ahụ pụọ ná nleta nke onye ha na-amaghị, “bụ́ onye a na-akpọghị akpọ n’ezie, [nke] nọ n’ebe obibi m . . . echekwara m na o ruuru obodo nta ahụ ikwu, sị, ‘Anyị na-enwe nchegbu banyere ụdị ihe omume dị otú ahụ.’”
Mgbe ahụ, Ọkàikpe Scalia kwuru, sị: “Obodo nta ahụ na-ekwu na ọbụna ndị ahụ na-anabata Ndịàmà Jehova, ọ bụrụgodị na owu na-ama ha, bụrụkwa ndị ga-achọ ịgwa mmadụ okwu banyere ihe ọ bụla, na ọ ka dịkwa mkpa ka ndị a [Ndịàmà Jehova] gaa debanye aha ha n’akwụkwọ na nke onyeisi obodo iji nweta ihe ùgwù nke ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ ha.”
“Mmachibido Ezi Uche Dị Nnọọ na Ya”
Mgbe a na-ajụ ajụjụ ndị ahụ, Ọkàikpe Scalia kwuru otu ihe gbara ọkpụrụkpụ mgbe o kwuru, sị: “Anyị nile pụrụ ikweta na mba ndị kasị dịrị nchebe n’ụwa bụ ndị nọ n’ọchịchị aka ike. Mpụ na-adị nnọọ obere na ha. Ọ bụ ihe a maara ebe nile na, ruo n’ókè ụfọdụ, nnwere onwe na-akpata mmebi iwu ka ukwuu, isiokwu abụrụkwa ma ihe e ji maka ya tie iwu a ọ̀ na-akwụsị mmebi iwu ruo n’ókè kwesịrịnụ nke na ya na ihe ịchọ ka e nweta ihe ùgwù iji pịa mgbịrịgba ọnụ ụzọ mmadụ ga-efu hà nhata.” Mgbe ahụ, osote ọkàikpe ukwu steeti ahụ kwuru na “ọ bụ mmachibido ezi uche dị nnọọ na ya.” Ọkàikpe Scalia zaghachiri na ezi uche dị nnọọ na ya nke na “anyị apụghị ịchọta okwu ikpe ọ bụla nke na-ekwu banyere otu obodo nke metụworo ụdị iwu ahụ. Echeghị m na ezi uche dị na ya.”
N’ikpeazụ, n’ihi nrụgide nke otu n’ime ndị ọkàikpe ndị ahụ, osote ọkàikpe steeti ahụ kwetara, sị: “Agaghị m ekwetacha na mmadụ pụrụ ịmachibido ịpị mgbịrịgba ọnụ ụzọ ma ọ bụ ịkụ aka n’ọnụ ụzọ iwu kpam kpam.” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, o mechiri okwu ya.
Mgbe a na-eme mgbagha okwu, ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ndịàmà kọwara na iwu ahụ enweghị usoro nnyocha. “Apụrụ m ịga n’isi ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo ma kwuo, sị, ‘Abụ m [Onye dị otú a],’ ma nweta akwụkwọ ikike ma gaa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ.” Ọ kọwakwara na onyeisi obodo nwere ikike ịjụ inye onye sịrị na ya anọghị n’òtù ọ bụla akwụkwọ ikike ahụ. “Anyị kwenyere na nke a bụ n’ụzọ doro anya mkpebi onwe onye,” ka o kwuru ma gbakwụnye, sị: “Eji m nkwanye ùgwù na-ekwu na ọrụ anyị [Ndịàmà Jehova] dabeere n’akụkụ bụ́ isi ná Ndezigharị Mbụ ahụ.”
Obere oge mgbe nke a gasịrị, Ọkàikpe Ukwu Rehnquist wetara arụmụka ahụ ná njedebe, na-ekwu, sị: “Okwu ikpe a abatawo n’aka [Ụlọikpe Kasị Elu].” Nnụrụ okwu ikpe ahụ nile were nanị ihe karịrị otu awa. Ókè otu awa ahụ dịruru ná mkpa gaje ịpụta ìhè ná mkpebi ụlọikpe e dere ede bụ́ nke e wepụtara na June.
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ọkàikpe Ukwu Rehnquist
Ọkàikpe Breyer
Ọkàikpe Scalia
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Rehnquist: Collection, The Supreme Court Historical Society/Dane Penland; Breyer: Collection, The Supreme Court Historical Society/Richard Strauss; Scalia: Collection, The Supreme Court Historical Society/Joseph Lavenburg
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ọkàikpe Kennedy
Ọkàikpe O’Connor
Ọkàikpe Souter
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Kennedy: Collection, The Supreme Court Historical Society/Robin Reid; O’Connor: Collection, The Supreme Court Historical Society/Richard Strauss; Souter: Collection, The Supreme Court Historical Society/Joseph Bailey
[Foto dị na peeji nke 8]
Ime ụlọikpe
[Ebe E Si Nweta Foto]
Photograph by Franz Jantzen, Collection of the Supreme Court of the United States