Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwukwe n’Okpuru Ule na Slovakia

Okwukwe n’Okpuru Ule na Slovakia

Okwukwe n’Okpuru Ule na Slovakia

DỊ KA JÁN BALI SI KỌỌ

A MỤRỤ m na December 24, 1910, na Záhor, bụ́ obodo nta nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Slovakia ugbu a. N’oge ahụ, obodo nta anyị bụ akụkụ Alaeze Ukwu Austria na Hungary. Na 1913, nne m kpọọrọ m lakwuru nna m na United States, bụ́ onye buworo ụzọ hapụ Záhor. Afọ abụọ mgbe mụ na nne m rutesịrị Gary, Indiana, a mụrụ nwanne m nwanyị, bụ́ Anna. E mesịa, nna m dara ọrịa ma nwụọ na 1917.

Aghọrọ m nwa akwụkwọ dị uchu, nke nwere mmasị n’okpukpe karịsịa. Na Chọọchị Calvin ebe m nọ na-aga Sunday school, onye nkụzi chọpụtara na m nwere mmasị n’ihe ime mmụọ. Iji mejuo agụụ m, o nyere m Mbipụta Holman nke Bible, bụ́ nke bu ihe dị ka ajụjụ na azịza 4,000. Nke ahụ mere ka m, bụ́ onye dị afọ 11, nwee ihe dị ukwuu m ga-eche banyere ya.

‘Nke A Bụ Eziokwu Ahụ’

N’afọ ndị mbụ ahụ, ụfọdụ n’ime ndị si na Slovak kwabata n’ógbè ahụ anyị bi na ya ghọrọ Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Otu n’ime ha bụ nwanne nna m nke nwoke bụ́ Michal Bali, bụ́ onye gwara anyị eziokwu Bible. Otú ọ dị, na 1922, mụ na nne m na nwanne m nwanyị laghachiri Záhor, bụ́ nke ghọworo akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ Czechoslovakia n’oge ahụ.

Obere oge mgbe e mesịrị, Deede Michal ziteere m mpịakọta nile nke akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures, nke Charles Taze Russell dere, nakwa magazin Ụlọ Nche ndị e bipụtaghachiri ebipụtaghachi laa azụ ná mbipụta ya nke mbụ bụ́ July 1, 1879. Agụchara m ha nile, gụọ akụkụ ụfọdụ ọtụtụ ugboro, ma bịa kwenye na achọtawo m eziokwu Bible m nọ na-achọ.

N’ihe dị ka n’oge ahụ, Ndị Mmụta Bible ụfọdụ a mụrụ na Slovak si United States lọta n’ala nna ha. Ha ghọrọ Ndị Mmụta Bible mbụ na-asụ asụsụ Slovak nọ na Czechoslovakia. Mụ na nne m gara nzukọ ndị a a nọ na-enwe n’oge mbụ ahụ, n’obodo nta anyị bụ́ Záhor nakwa n’ebe ndị ọzọ dị nso.

Nzukọ ndị ahụ yiri nzukọ Ndị Kraịst e nwere na narị afọ mbụ. Anyị na-ezukọtakarị n’ụlọ otu n’ime Ndị Mmụta Bible ahụ, bụ́ ebe anyị na-anọdụ gburugburu otu tebụl nke ọkụ mpanaka dọrọ n’etiti ya. Ebe ọ bụ m kasị bụrụ nwata, m na-anọtụ n’ebe azụ, na-ege ntị n’itiri. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, a na-akpọ m ka m kere òkè. Mgbe ndị ọzọ na-aghọtachaghị ihe a gụrụ n’asụsụ Slovak, ha na-asị: “Em, Ján, gịnị ka asụsụ Bekee kwuru n’ebe ahụ?” M na-enwe oké mmasị ịbịaru mpanaka ahụ nso ma jiri asụsụ Slovak kọwaa ihe akwụkwọ nke Bekee ahụ kwuru.

Michal Šalata so n’ime ndị ghọrọ Ndị Mmụta Bible na United States ma laghachi n’ebe ghọworo Czechoslovakia. Ọ laghachiri n’obodo nta bụ́ Sečovce, nke dị nso, bụ́ ebe o biburu, o nyekwara aka n’ịhazi ọrụ nkwusa ahụ na Czechoslovakia. Nwanna Šalata kpọọrọ m mee njem nkwusa ụfọdụ. E mesịa, na 1924, mgbe m dị afọ 13, agwara m ya ka o mee m baptizim. Ọ bụ ezie na nne m lere m anya dị ka obere nwa iwere nzọụkwụ siri ike otú ahụ, emere m ka o kwenye na nke a bụ mkpebi siri ike m mere. Ya mere, n’ọnwa July ahụ, n’oge e nwere mgbakọ otu ụbọchị na nso Osimiri Ondava, egosipụtara m nrara m raara onwe m nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptizim n’osimiri ahụ.

Ihe Ùgwù Ije Ozi Ndị M Ji Kpọrọ Oké Ihe

Mgbe m dị afọ 17, anụrụ m na a ga-enwe ememe olili ozu n’ebe dị kilomita ole na ole site n’obodo nta ebe m nọ na-eme nkwusa. Ọ bụ nke mbụ Ndị Mmụta Bible ga-enwe n’ógbè ahụ. Mgbe m bịarutere, agafere m ndị obodo ahụ nwere mmasị ịmata ihe na-emenụ ma gakwuru ọkà okwu ahụ. Mgbe m ruru n’ebe ọ nọ, o chigharịkwuuru m ma kwuo, sị: “M ga-ebu ụzọ kwuo okwu, mgbe ahụzi, i kwuru gawa.”

Ekwuru m okwu dabeere na 1 Pita 4:7, bụ́ nke na-agụ, sị: “Ọgwụgwụ nke ihe nile eruwo nso.” Eji m Akwụkwọ Nsọ gosi na ọbụna ọgwụgwụ nke nhụjuanya na ọnwụ eruwo nso, akọwakwara m olileanya nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) N’agbanyeghị eziokwu bụ́ na o yiri ka m bụ nwata n’ile anya ọbụna karịa afọ ndụ m—ma ọ bụ ma eleghị anya n’ihi ya—ndị nile bịaranụ gere ntị nke ọma.

A hụrụ akụkọ na-akpali akpali n’Ụlọ Nche nke September 15, 1931, bụ́ nke kọwara na anyị achọghịzi ka e jiri Ndị Mmụta Bible ma ọ bụ aha ọ bụla ọzọ yiri ya mara anyị, kama na anyị chọrọ ka a mara anyị dị ka Ndịàmà Jehova. Mgbe Ndị Mmụta Bible nọ n’ógbè anyị gụsịrị ihe ọmụma a, ha mere ndokwa maka nzukọ pụrụ iche. Ihe dị ka 100 Ndị Mmụta Bible zukọrọ n’obodo nta bụ́ Pozdišovce. N’ebe ahụ, enwere m ihe ùgwù ikwu okwu nke isiokwu ya bụ “Aha Ọhụrụ Ahụ,” bụ́ nke dabeere n’isiokwu Ụlọ Nche ahụ m kpọtụrụ aha n’elu.

Ndị nile bịaranụ ji oké aṅụrị welie aka elu mgbe a gwara ha ka ha nakwere otu mkpebi ahụ ndị kwere ekwe ibe ha nakwewooro n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa. E mesịa, anyị zigaara isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, telegram nke na-agụ, sị: “Anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova gbakọtara n’ụbọchị taa na Pozdišovce, kwenyere ná nkọwa dị n’Ụlọ Nche banyere aha ọhụrụ ahụ, anyị na-anakwerekwa aha ọhụrụ a, bụ́ Ndịàmà Jehova.”

Ógbè buru ibu nke Slovakia na Transcarpathia, bụ́ nke bụ akụkụ Czechoslovakia tupu Agha Ụwa nke Abụọ, ghọrọ ubi na-emepụta ihe nye ozi Ndị Kraịst anyị. Anyị ji ụkwụ, ụgbọ okporo ígwè, bọs, nakwa ịnyịnya ígwè rụzuo ókèala a buru ibu. N’oge ahụ, e gosiri “Photo-Drama of Creation,” bụ́ ihe nkiri a na-emegharị ahụ́ na ya nakwa ihe ngosi slide ndị ha na okwu ndị e kwunyere na teepu na-agakọ, n’ọtụtụ obodo ukwu. Mgbe e gosichara ya n’ebe nke ọ bụla, a na-anakọta adres ndị nwere mmasị. E nyere m ọtụtụ n’ime adres ndị a ma gwa m ka m hazie Ndịàmà ileta ndị nwere mmasị. N’obodo ukwu ụfọdụ, anyị ṅụtara ụlọ mgbakọ bụ́ ebe m kwuru okwu pụrụ iche sochiri ihe ngosi ahụ.

N’afọ ndị 1930, enwere m ihe ùgwù nke ịbụ onye nnọchiteanya ná mgbakọ ndị buru ibu karị n’isi obodo, bụ́ Prague. Na 1932, a haziri mgbakọ mba nile mbụ na Czechoslovakia. Anyị zukọrọ n’Ọ́gbọ̀ Egwuregwu Varieté. Isiokwu nke okwu ihu ọha ahụ, bụ́ “Europe Tupu Mbibi,” dọtara mmasị ndị mmadụ, ihe dịkwa ka mmadụ 1,500 bịara gee ya. E nwere mgbakọ mba nile ọzọ na Prague na 1937, enwekwara m ihe ùgwù nke ikwu otu n’ime okwu ndị e kwuru na ya. E nwere ndị si n’ọtụtụ mba Europe bịa, anyị nile nwetakwara agbamume dị mkpa nke ga-enye anyị ume ịnagide ule ndị sochiri n’oge na-adịghị anya a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ.

Ịlụ Nwunye, na Ule Ndị Tara Akpụ

Mgbe anyị lọghachitere Czechoslovakia, mụ na nne m so nnọọ Ndị Mmụta Bible ndị ọzọ rụkọọ ọrụ nkwusa ọnụ na Pozdišovce nke dị nso. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m hụrụ otu asampete nwa agbọghọ aha ya bụ Anna Rohálová. Mgbe anyị tolitetụkwuru, anyị ghọtara na mmetụta anyị nwere n’ebe ibe anyị nọ karịrị nnọọ ịhụnanya nkịtị na-adị n’etiti nwanna nwoke na nwanna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst. Na 1937, anyị lụrụ di na nwunye. Site n’oge ahụ gaa n’ihu, Anna kwadoro m, ọbụna “n’oge nsogbu” ndị gaje ịbịa.—2 Timoti 4:2.

N’oge na-adịghị anya anyị gbasịrị akwụkwọ, ọ bịara doo anya na Europe na-akwadebe maka Agha Ụwa nke Abụọ. Ka ọ na-erule November 1938, Hungary, bụ́ nke nọ na-akwado Nazi Germany, weghaara ebe ndịda Transcarpathia na Slovakia. Ndị uwe ojii Hungary machibidoro nzukọ anyị iwu, anyị aghaghịkwa ịdị na-aga egosi onwe anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii mgbe nile.

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitesịrị na September 1939, e jichiri ọtụtụ n’ime anyị si Záhor, ma ndị ikom ma ndị inyom, ma kpọga anyị n’otu nnukwu ụlọ ochie a gbachigidere ogige nke dị nso na Mukacheve, nke dị na Ukraine ugbu a. N’ebe ahụ, anyị hụrụ ọtụtụ Ndịàmà ibe anyị si n’ọgbakọ ndị dị na Transcarpathia. Mgbe a gbasịrị anyị ajụjụ ruo ọnwa atọ ma ọ bụ ọnwa anọ ma tie anyị ihe mgbe mgbe, otu ụlọikpe pụrụ iche nke ndị agha kpere anyị ikpe. A jụrụ anyị nile nanị otu ajụjụ: “Ùnu dị njikere isoro Hungary lụsoo U.S.S.R. ọgụ?” Ebe ọ bụ na anyị jụrụ, a magasịrị anyị ikpe, e mesịakwa, tụọ anyị mkpọrọ na Budapest, Hungary, na 85 Margit Boulevard.

A dịghị enyeju ndị mkpọrọ ahụ nile afọ. N’oge na-adịghị anya, ọrịa dị iche iche gbasara, ndị mkpọrọ malitekwara ịnwụ. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ mgbe nwunye m si Záhor mee ogologo njem ahụ nile ịbịa hụ m! N’agbanyeghị na anyị kwuru okwu nanị ihe dị ka minit ise ka o guzo n’ihu ígwè ndị e ji gechibido ebe m nọ, enwere m ekele n’ebe Jehova nọ maka nwunye dị otú ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi. *

Site n’Ụlọ Mkpọrọ Gaa n’Ogige Ọrụ Mmanye

E si n’ụlọ mkpọrọ kpọrọ m gaa kpọmkwem na Jászberény, Hungary, bụ́ ebe a kpọgaworo ihe dị ka Ndịàmà 160. Ka anyị nọ n’ebe ahụ, ọfịsa bụ́ onye Hungary gwara anyị ihe ikpeazụ gọọmenti Hungary kwuru ka anyị mee ma ọ bụrụ na anyị chọọ: “Ọ bụrụ na ị dị njikere ịbụ onye agha, pụta ebe a.” Ọ dịghị onye pụtaranụ. Ọfịsa ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na ekwenyeghị m n’ihe unu na-eme, mkpebi unu nwere ijigidesi okwukwe unu ike masịrị m.”

Ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri n’Osimiri Danube ma malite njem gawa n’otu ogige ọrụ mmanye dị nso n’obodo Bor nke dị na Yugoslavia. Mgbe anyị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ, ndị soja na ọchịagha ha nọgidere na-anwa ime ka anyị mebie okwukwe anyị. Ọchịagha ahụ mere ka ndị soja ahụ jiri égbè ha na-akụ anyị, na-agba anyị buutu ha, jirikwa ụzọ ndị ọzọ mekpọọ anyị ọnụ.

Mgbe e nyefere anyị n’aka Lieutenant Colonel András Balogh, bụ́ ọchịagha nke ogige ọrụ mmanye dị na Bor, ọ gwara anyị, sị: “Ọ bụrụ na ihe a gwara m banyere unu bụ eziokwu, unu ga-anwụ n’oge na-adịghị anya.” Ma mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ozi a rachiri arachi nke sitere n’aka ndị isi ọchịchị, o mesoro anyị n’ụzọ nkwanye ùgwù. Balogh nyetụrụ anyị nnwere onwe ịgagharị agagharị, o kwere ọbụna ka anyị wuoro onwe anyị ogige. Ọ bụ ezie na nri dị ụkọ, anyị nwere kichin nke anyị, ya mere e kere nri n’ụzọ ha nhata.

Na March 1944, Germany malitere iweghara Hungary. N’oge ahụ, otu onye ọchịagha na-akwado ndị Nazi, nke aha ya bụ Ede Marányi, nọchiri Balogh. O mere ka e nwee usoro iwu ndị tara akpụ, dị nnọọ ka nke a na-enwe n’ogige ịta ahụhụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, usuu ndị agha Russia bịawara, a gbahapụkwara ogige ahụ dị na Bor. E mesịa, n’oge njem anyị, anyị ji anya anyị hụ mgbuchapụ nke ndị Juu nọ na Cservenka. O yiri ọrụ ebube na e gbughị anyị.

Mgbe anyị na-eru ókè Hungary na Austria, e nyere anyị iwu igwu okokoro ebe a ga-adọnye égbè ukwu ndị na-awụpụ mgbọ. Anyị kọwara na ihe medịrị anyị ji bụrụ ndị mkpọrọ bụ n’ihi na anyị jụrụ itinye aka n’ihe omume ndị agha. Ebe ọ bụ m nọ n’ihu ìgwè ahụ, otu ọfịsa onye Hungary dọkpụụrụ m ma malite iti m ihe. “M ga-egbu gị!” ka o tiri ná mkpu. “Ọ bụrụ na ị rụghị ọrụ, ndị ọzọ ga-agbaso ihe nlereanya ọjọọ gị!” Ọ bụ nanị mbata András Bartha, bụ́ Onyeàmà meworo okenye karị nke duziworo ọrụ nkwusa anyị, batara n’okwu ahụ zọrọ m. *

Izu ole na ole mgbe e mesịrị, agha ahụ biri, anyị lawakwara. Ndị mkpọrọ ndị ọzọ, bụ́ ndị e buworo ụzọ tọhapụ na Bor, kọrọ na e gbuwo anyị nile bụ́ ndị a kpọọrọ gaa Cservenka. N’ihi ya, ruo ihe dị ka ọnwa isii, nwunye m weere onwe ya dị ka nwanyị di ya nwụrụ. Lee ihe ijuanya o nwere ịhụ m n’ọnụ ụzọ otu ụbọchị! Anya mmiri ọṅụ gbara anyị n’anya ka anyị makụrụ onwe anyị mgbe e kewasịworo anyị ruo ọtụtụ afọ.

Ịhazigharị Ọrụ Ahụ

Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, e jikọghachiri Slovakia na Czechia iji ghọọ Czechoslovakia. Otú ọ dị, Transcarpathia, bụ́ nke akụkụ ya buru ibu dị na Czechoslovakia tupu agha ahụ, ghọrọ akụkụ Ukraine nke dị na Soviet Union. Na 1945, mụ na Michal Moskal gara Bratislava, nke bụ́ isi obodo Slovakia ugbu a, bụ́ ebe anyị zutere ndị nwere ibu ọrụ iji hazigharịa ọrụ nkwusa ahụ. N’agbanyeghị na ike gwụrụ anyị n’anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ mmetụta uche, anyị nwere oké mmasị ịmalite ịrụzu ọrụ e nyere anyị bụ́ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14; 28:18-20.

Mgbe agha ahụ bisịrị, mgbakọ dị iche iche bụ ihe mkpali dị ukwuu nye ọrụ anyị. Na September 1946, mgbakọ nke mbụ e nwere ná mba ahụ nile weere ọnọdụ n’obodo Brno. Enwere m ihe ùgwù nke ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Owuwe Ihe Ubi ahụ, Ọgwụgwụ Ụwa.”

Na 1947, e nwere mgbakọ mba ọzọ na Brno. N’ebe ahụ, Nathan H. Knorr, Milton G. Henschel, na Hayden C. Covington, bụ́ ndị si n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York bịa, kwuru okwu ndị na-agba ume. Enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye ntụgharị okwu n’okwu ndị ha kwuru. N’agbanyeghị na anyị nwere ihe dị ka ndị mkpọsa Alaeze 1,400 na Czechoslovakia n’oge ahụ, ihe dị ka mmadụ 2,300 bịara gee okwu ihu ọha ahụ.

Mkpagbu n’Okpuru Ọchịchị Kọmunist

Na 1948, ndị Kọmunist weghaara mba ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya, a machibidoro ọrụ nkwusa anyị iwu ruo afọ 40. Na 1952, a tụrụ ọtụtụ n’ime anyị, bụ́ ndị ndị ọchịchị lere anya dị ka ndị ndú, mkpọrọ. E boro ihe ka ọtụtụ ebubo ịgba ọchịchị mgba okpuru, ma e boro ole na ole n’ime anyị ebubo ajọ ịgba ọchịchị mgba okpuru. A tụrụ m mkpọrọ ma gbaa m ajụjụ ruo ọnwa 18. Mgbe m jụrụ otú m si bụrụ onye sabo, ọkàikpe kwuru, sị: “Ị nọ na-ekwu banyere Alaeze Chineke. Ị sịkwara na ọ ga-eweghara ọchịchị nke ụwa a. Nke a gụnyekwara Czechoslovakia.”

“Ya bụrụ otú ahụ,” ka m zaghachiri, “ị ghaghị ikpe ndị nile na-ekpe Ekpere Onyenwe Anyị ma na-arịọ ka ‘Alaeze Chineke bịa’ ikpe dị ka ndị sabo.” Ka o sina dị, a mara m ikpe ịnọ n’ụlọ mkpọrọ afọ ise na ọkara, a kpọgakwara m n’ajọ ụlọ mkpọrọ ndị Kọmunist nke dị na Jáchymov, Czechoslovakia.

Mgbe m nọsịrị ihe ka ukwuu n’oge mkpọrọ m, a tọhapụrụ m. Nwunye m, bụ́ Anna, ejiwo ikwesị ntụkwasị obi kwadoo m site n’idetara m akwụkwọ ozi na ịbịa leta m, nakwa nlekọta o lekọtara nwa anyị nwanyị, bụ́ Mária. N’ikpeazụ, e jikọtaghachiri anyị ọnụ dị ka otu ezinụlọ, anyị maliteghachikwara ọrụ Ndị Kraịst anyị, bụ́ nke anyị nọ na-arụ na nzuzo.

Ndụ Na-enye Afọ Ojuju nke Ijere Jehova Ozi

N’ime ihe karịrị afọ 70 gafeworonụ, Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè anyị ejewo ozi n’okpuru ọnọdụ dịgasị iche iche, n’oge ka ukwuu n’okpuru ọchịchị Kọmunist. N’eziokwu, emewo m agadi, ahụ́ esighịzikwa m ike, ma m ka na-enwe ike ije ozi dị ka Onye Kraịst bụ́ okenye na Záhor, mụ na ndị kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ján Korpa-Ondo, bụ́ onye ka dị ndụ n’afọ ndụ 98. * Nwunye m m hụrụ n’anya, onye bụ́ ezi onyinye Jehova nyere m, nwụrụ n’afọ 1996.

M ka nwere onyinyo doro anya nke ihe omume ihe atụ ahụ a kọwara na peeji nke 228 ruo 231 n’akwụkwọ bụ́ The Way to Paradise, nke e bipụtara na 1924. A gwara onye na-agụ ya ka o see onyinyo ebe ọ nọ na Paradaịs na-anụ ka mmadụ abụọ e si n’ọnwụ kpọlite na-ekwurịta okwu. Ha nọ na-eche nnọọ ebe ha nọ. Mgbe ahụ, onye nke lanarịrị Amagedọn nwere ihe ùgwù nke ịkọwara mmadụ abụọ ahụ na a kpọlitewo ha n’ọnwụ baa na Paradaịs. (Luk 23:43) Ọ bụrụ na mụ alanarị Amagedọn, ọ ga-amasị m ịkọwara nwunye m, nne m, na ndị ọzọ m hụrụ n’anya ihe ndị dị otú ahụ mgbe a ga-esi n’ọnwụ kpọlite ha. Ma ọ bụrụ na mụ anwụọ tupu Amagedọn, m na-atụ anya oge mgbe otu onye n’ụwa ọhụrụ ahụ ga-agwa m ihe nile mere mgbe m nwụsịrị.

Ugbu a, ana m anọgide na-enwe ekele maka ihe ùgwù pụrụ iche, nke dị nnọọ ịtụnanya, bụ́ ịgwa Eze Onyenwe eluigwe na ala okwu na inwe ike ịbịaru ya nso. Mkpebi m bụ ịnọgide na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Pọl onyeozi dị ná Ndị Rom 14:8: “Ọ bụrụ na anyị na-adị ndụ, anyị na-adị ndụ maka Jehova, ọ bụrụkwa na anyị na-anwụ anwụ, anyị na-anwụ maka Jehova. Ya mere, ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 22 Lee akụkọ banyere Andrej Hanák na Teta! nke April 22, 2002, peeji nke 19-23. N’ebe ahụ, a kọwara ọnọdụ ndị e nwere n’ụlọ mkpọrọ a nakwa ihe ndị mere na Cservenka, bụ́ nke a ga-akpọtụ aha n’isiokwu a.

^ par. 28 Lee Ụlọ Nche nke July 15, 1993, peeji nke 11, iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere András Bartha.

^ par. 39 Lee akụkọ ndụ ya ná mbipụta Ụlọ Nche nke September 1, 1998, peeji nke 24-28.

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na Anna, otu afọ anyị lụsịrị di na nwunye

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Mụ na Nathan H. Knorr ná mgbakọ e nwere na Brno na 1947