Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Nrụgide Ndị Ọgbọ?

“Nrụgide ndị ọgbọ zuru ebe nile.”—Jesse, onye dị afọ 16.

“Nrụgide ndị ọgbọ nke sitere n’aka ụmụ akwụkwọ ibe m bụ otu n’ime ihe ndị kasị siere m ike ịnagide mgbe m na-etolite etolite.”—Johnathan, onye dị afọ 21.

N’EZIE, nrụgide ndị ọgbọ bụ ihe a na-ekwesịghị ileghara anya. Otú ọ dị, mara na ị pụrụ iguzogide ya. N’eziokwu, ị pụrụ ịchịkwa ya, ọbụnakwa mee ka ọ baara gị uru. Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

N’isiokwu nke bu ụzọ n’usoro isiokwu a, anyị tụlere ihe mbụ dị oké mkpa ị ga-eme: Ghọta ike nrụgide ndị ọgbọ na-akpa nakwa na ọ pụrụ imetụta gị. * Olee ihe ndị ọzọ bara uru ị pụrụ ime? Nduzi na-enye aka dị gị mkpa dị n’Okwu Chineke. Ilu 24:5 na-ekwu, sị: “Onye nwere ihe ọmụma na-eme ka ike nwee ume.” Ihe ọmụma dị aṅaa pụrụ ime ka i nwekwuo ike iguzogide nrụgide ndị ọgbọ? Tupu anyị azaa ya, ka anyị buru ụzọ tụlee nsogbu nke pụrụ ime ka nrụgide ndị ọgbọ nwee ike n’ahụ́ gị.

Enweghị Obi Ike—Ihe Ize Ndụ

Ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-ahụta nrụgide ndị ọgbọ mgbe ụfọdụ dị ka ihe ịma aka pụrụ iche n’ihi na ụzọ ndụ ha gụnyere ịgwa ndị ọzọ banyere okwukwe ha. (Matiu 28:19, 20) Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ịgwa ndị ntorobịa ndị ọzọ i zutere ihe ndị i kweere na ha? Ọ bụghị nanị gị ka ọ na-eme otú ahụ. Melanie, bụ́ onye dị afọ 18, na-ekwu, sị: “A bịa n’ịgwa ndị na-eto eto na m bụ Onyeàmà, o siiri m ike karịa otú m chere.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ozugbo m ga-akachi obi ikwu na m bụ Onyeàmà, ụjọ atụwakwa m.” O yiri ka ọ bụ nrụgide na-ezighị ezi nke ndị ọgbọ, na-egbochi ya ikwu ya.

Bible na-emesi anyị obi ike na ọbụna ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe dị ịrịba ama alawo azụ n’ịgwa ndị mmadụ banyere Chineke. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa na-eto eto maara na a ga-akwa ya emo ma kpagbuo ya ma ọ bụrụ na o rube isi n’iwu Chineke bụ́ ikwu okwu n’asọghị anya. Ọzọkwa, Jeremaịa enweghị obi ike. N’ihi gịnị? Ọ gwara Chineke, sị: “Lee, amaghị m ikwu okwu, n’ihi na nwata ka m bụ.” Chineke ò kwetara na ọbụbụ Jeremaịa bụ onye ntorobịa mere ka ọ ghara iru eru ikwu okwu? Ee e. Jehova mesighachiri onye amụma ahụ obi ike, sị: “Asịla, Nwata ka m bụ.” Jehova gara n’ihu inye nwa okorobịa ahụ na-ala azụ ọrụ dị mkpa.—Jeremaịa 1:6, 7.

Mgbe anyị na-enweghị obi ike, mgbe obi na-akaghị anyị, nrụgide ndị ọgbọ pụrụ ịbụ ihe siri ike nnagide. Nnyocha ndị e mere egosiwo nke a. Dị ka ihe atụ, laa azụ na 1937, otu ọkà mmụta sayensị aha ya bụ́ Muzafer Sherif mere otu nchọpụta a ma ama. O dubara ndị mmadụ n’otu ọnụ ụlọ gbara itiri, gosi ha otu ìhè ọkụ a gbadoro n’ihe ma jụọ ha ókè ìhè ahụ megharịruru emegharị.

N’ezie, ìhè ahụ emegharịghị ma ọlị; nke ahụ bụ mmegharị anya nkịtị. Mgbe a nwalere ha otu otu, ndị mmadụ nyere atụmatụ nke ha banyere ihe a e chere na ọ bụ mmegharị. Otú ọ dị, n’ìgwè, a gwara ha ka ha kwupụta atụmatụ ha mere ekwupụta. Gịnị mere? N’ịbụ ndị na-enweghị obi ike n’echiche nke onwe ha, ha metụtara ibe ha. Mgbe e mere nnwale ahụ ugboro ugboro, azịza ha bịara yikwuo nke ibe ha ruo mgbe e nwere “nkwekọ ìgwè.” Ọbụna mgbe a nwalere ha ọzọ n’otu n’otu, echiche ahụ ha nwere n’ìgwè ka nwekwara mmetụta n’ebe ha nọ n’otu n’otu.

Nchọpụta ahụ gosiri otu isi ihe dị mkpa. Akataghị obi na enweghị obi ike na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị nrụgide ndị ọgbọ pụrụ imetụta karị. Nke ahụ na-akpali iche echiche, ọ́ bụghị ya? E kwuwerị, nrụgide ndị ọgbọ pụrụ imetụta ndị mmadụ ma a bịa n’ihe ndị dị nnọọ mkpa, gụnyere echiche ha banyere mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, nakwa ọbụna ihe mgbaru ọsọ ndị ha ga-achụso ná ndụ. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka “nkwekọ ìgwè” na-emetụta anyị ma a bịa n’ihe ndị dị otú ahụ, anyị pụrụ ime ihe ga-emetụta ọdịnihu anyị n’ụzọ dị ukwuu. (Ọpụpụ 23:2) Gịnị ka a pụrụ ime?

Olee otú i chere ị gaara esiwo eme n’ule ahụ ma a sị na ị maara n’eziokwu na ìhè ahụ emegharịghị emegharị? Ma eleghị anya, ìgwè ahụ agaraghị emetụta gị. Ee, obi ike dị anyị mkpa. Ma olee ụdị obi ike ọ bụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi nweta ya?

Mee Jehova Obi Ike Gị

Ị pụrụ ịnụ ọtụtụ okwu banyere ịzụlite obi ike onwe onye. Ma a bịa n’otú e si enweta ya—na ókè ọ dịruru gị mkpa—e nwere echiche ndị dịgasị iche iche. Bible nwere ndụmọdụ a kwesịrị ekwesị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche; kama ka ọ na-eche echiche iji wee nwee uche zuru okè.” (Ndị Rom 12:3) Nsụgharị ọzọ nke amaokwu a na-agụ, sị: “Aga m agwa onye ọ bụla n’ime unu ka ọ ghara ịtụ onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ karịa uru ọ bara n’ezie, kama ka o jiri nlezianya mara otú ọ hà.”—Charles B. Williams.

Iji ‘nlezianya mara otú ị ha n’ezie’ na-agụpụ ịdị mpako, ịka anya, ma ọ bụ ịdị nganga. N’aka nke ọzọ, echiche ziri ezi otú ahụ ga-agụnye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi ike n’ikike iche echiche gị, na nke ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha. Onye Okike gị nyere gị ‘ike iche echiche,’ nke ahụ abụghịkwa obere onyinye. (Ndị Rom 12:1) Iburu nke ahụ n’uche pụrụ inyere gị aka iguzogide mkpali nke ikwe ka ndị gbara gị gburugburu na-emere gị mkpebi. Otú ọ dị, e nwere ụdị obi ike nke ga-echebe gị ọbụna karị.

E nyere Eze Devid ike mmụọ nsọ ide, sị: “Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova; Gị bụ ntụkwasị obi m site na nwata.” (Abụ Ọma 71:5) Ee, Devid nwere obi ike zuru ezu n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ, o mewokwa otú ahụ kemgbe ọ bụ nwata. ‘Nwata ka ọ bụ’—ikekwe ọ nọ n’afọ iri na ụma ya—mgbe agadaga nwoke Filistia ahụ bụ́ Golaịat kwuru ka onye agha Izrel nke isi kara pụta ka ya na ya lụọ ọgụ. Egwu jidere ndị agha ahụ. (1 Samuel 17:11, 33) Ikekwe, nrụgide na-ezighị ezi nke ndị ọgbọ bilitere n’etiti ha. Obi abụọ adịghị ya na ha kwuru okwu na-akụda mmụọ banyere otú Golaịat hà nakwa ike na obi ike ya, ma kwuo na ọ gwụla onye isi mebiri ga-anakwere ịma aka dị otú ahụ. Nrụgide dị otú ahụ emetụtaghị Devid. N’ihi gịnị?

Rịba ama ihe Devid gwara Golaịat: “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m: ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke [Izrel], Onye ị taworo ụta.” (1 Samuel 17:45) O doro Devid anya na Golaịat gbara agba, dị ike, ma nwee ngwá agha. Ma otu ihe doro ya nnọọ anya, dị ka o doro ya anya na ọkụ na-ere ere. Ọ maara na ọ dịghị ihe Golaịat bụ ma e jiri ya tụnyere Jehova Chineke. Ọ bụrụ na Jehova nọnyeere Devid, oleezi ihe ga-eme ọ ga-eji tụọ Golaịat egwu? Obi ike dị otú ahụ Devid nwere n’ebe Chineke nọ mere ka ọ nọrọ ná nchebe. Ọ dịghị ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla nke nrụgide ndị ọgbọ pụrụ inutu ya.

Ì nwere obi ike dị otú ahụ n’ebe Jehova nọ? Ọ gbanwebeghị kemgbe oge Devid. (Malakaị 3:6; Jems 1:17) Ka ị na-amụkwu banyere ya, otú ahụ ka ị ga-enwekwu obi ike n’ihe nile ọ na-agwa gị n’Okwu ya. (Jọn 17:17) N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ụkpụrụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe, ndị a pụrụ ịdabere na ha, iji duzie gị ná ndụ ma nyere gị aka iguzogide nrụgide ndị ọgbọ. Tụkwasị n’ime ka Jehova bụrụ obi ike gị, e nwere ihe ọzọ ị pụrụ ime.

Họrọ Ezi Ndị Ndụmọdụ

Okwu Chineke na-eme ka mkpa ọ dị ịchọta ezi nduzi pụta ìhè. “Onye nghọta wee nwetakwa ezi ndụmọdụ,” ka Ilu 1:5 na-ekwu. Nne na nna gị, bụ́ ndị na-eche nnọọ banyere ọdịmma gị kasị mma, pụrụ ịbụ isi iyi nke nduzi. Indira maara nke a nke ọma. Ọ na-akọ, sị: “Ọ bụ n’ihi na nne na nna m nọ na-eji Akwụkwọ Nsọ esoro m atụgharị uche mgbe mgbe ma mee ka Jehova bụrụ onye dị adị n’ezie ná ndụ m, mere m ji nọrọ n’ụzọ nke eziokwu ahụ ugbu a.” Ọtụtụ ndị na-eto eto na-eche otú ahụ.

Ọ bụrụ na ị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, i nwere isi iyi nke nkwado magburu onwe ya n’ebe ahụ—ndị nlekọta ma ọ bụ ndị okenye a họpụtara ahọpụta, nakwa Ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè. Nadia, bụ́ onye na-eto eto, na-echeta, sị: “N’ezie, ana m akwanyere ndị okenye ọgbakọ m ùgwù. Apụrụ m icheta otu okwu nke onyeisi oche ndị nlekọta kwuru bụ́ nke a kwadebere maka ndị ntorobịa karịsịa. Mgbe a gbasara nzukọ, mụ na enyi m nwere mkpali n’ihi na ihe o kwuru bụ ihe anyị chere anyị na-agabiga.”

Ngwá ọgụ ọzọ dị ike megide nrụgide na-ezighị ezi nke ndị ọgbọ bụ nrụgide ziri ezi nke ndị ọgbọ. Ọ bụrụ na i jiri ezi uche họrọ ndị enyi gị, ha pụrụ inyere gị aka ịnọgide na-enwe ezi ihe mgbaru ọsọ na ụkpụrụ ndị ziri ezi. Olee otú anyị pụrụ isi mee nhọrọ dị mma? Buru ndụmọdụ a n’uche: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) Nadia ji nlezianya họrọ ndị enyi maara ihe n’ụlọ akwụkwọ—ndị kwere ekwe ibe ya, bụ́ ndị nwere ụkpụrụ omume ọma dị ka ya. Ọ na-echeta, sị: “Mgbe ụmụ okoro ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ bịara ịrịọ anyị enyi, anyị nyere ibe anyị nkwado.” Ezi ndị enyi pụrụ inye aka n’iwepụta àgwà anyị ndị kasị mma. Ha na mgbalị ndị e mere ịchọta ha kwekọrọ.

Jide n’aka na ọ bụrụ na i nwee obi ike n’ebe Jehova nọ, chọọ nduzi n’aka Ndị Kraịst tozuru okè, ma họrọ ndị enyi gị n’ụzọ ezi uche dị na ya, ị pụrụ ịnagide ihe ịma aka nke nrụgide ndị ọgbọ. N’ezie, ị pụrụ ịghọ akụkụ nke nrụgide ziri ezi nke ndị ọgbọ n’etiti ndị enyi gị ma nyere ha aka isoro gị nọgide n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Lee isiokwu bụ́ “Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ò Siri Nnọọ Ike n’Ezie?” ná mbipụta Teta! nke December 8, 2002.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]

Chọta ezi ndị enyị, bụ́ ndị hụrụ Chineke na ụkpụrụ ya n’anya dị ka gị

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

“Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.”—1 Ndị Kọrint 15:33

“Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe.”—Ilu 13:20