Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Dị Mkpa Ka Ị Na-ehi Ụra nke Ọma!

Ọ Dị Mkpa Ka Ị Na-ehi Ụra nke Ọma!

Ọ Dị Mkpa Ka Ị Na-ehi Ụra nke Ọma!

Ọ̀ dị onye ga-agbagha okwu ahụ bụ́ na ihi ụra nke ọma n’abalị bụ isi ihe na-eme ka a nọgide na-enwe ezi ahụ́ ike? Ikekwe ọ dịghị onye ga-agbagha ya. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị, ụra bụ ihe na-adịchaghị mkpa. “Ma ọ ga-abịara gị ụgwọ n’ụbọchị na-esochinụ,” ka Shawn Currie, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ na osote prọfesọ na Mahadum Calgary, nke dị na Canada, na-ekwu. Ọ bụrụ na i highị ụra nke ọma, o yikarịrị ka ị ga-enwe ahụ́ mgbakasị karị, mgbe ụfọdụkwa ọbụna ị ga-enwe ịda mbà n’obi.

“Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ụra na-eme ka ụbụrụ dịghachi nkọ, nakwa na a na-anọgide na-amụta ihe mgbe a na-ehi ụra,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Calgary Herald, na-ekwu. Prọfesọ Currie na-ekwu, sị: “N’abalị, ị na-eme ka ikike ncheta gị dịkwuo nkọ, ihe ọ bụla ị mụtara n’ụbọchị ahụ na-abụ nke e chekwara nke ọma n’abalị. Ewepụtaghị oge iji zuo ike na-ebelata ikike ịmụta ihe n’ezie.” Ọ na-ekwukwa na “ọ bụrụ na i hie ụra nke ọma, ikekwe ọ ga-enye aka n’ụzọ ụfọdụ iji mee ka i nwee obi iru ala.”

Ya mere, olee ókè e kwesịrị ihiru ụra? Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụ awa asatọ maka mmadụ nile, Currie na-ekwu, sị: “Otú ụra si adị ndị mmadụ mkpa na-adị iche iche.” N’ihi nke ahụ, ọ na-atụ aro ka a na-agbalị ihimi ụra ehimi. Ma olee otú a pụrụ isi mee nke a, karịsịa nye ndị na-adịghị enwe ike ihi ụra nke ọma? Lee aro ụfọdụ:

▪ Jiri mmiri dị ṅara ṅara saa ahụ́ tupu ị lakpuo.

▪ Nwee mmega ahụ́ n’ókè kwesịrị ekwesị ọtụtụ ugboro n’izu; ma enwela mmega ahụ́ siri ike tupu ị lakpuo.

▪ Mee ka ọnụ ụlọ ihi ụra gị dịrị jụụ, gbaa ọchịchịrị, ma jụtụ oyi.

▪ Gbalịa inwe otu oge ị ga na-ebili kwa ụtụtụ iji wee mee ka oge ị na-eji ehi ụra ma na-ebili mara gị ahụ́.

N’ihi abamuru ndị doro anya dị na ya, nwee ezi uche ma mee ka ụra soro n’ihe ndị dị oké mkpa nye gị.