Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ike nke Mmụmụ Ọnụ Ọchị

Ike nke Mmụmụ Ọnụ Ọchị

Ike nke Mmụmụ Ọnụ Ọchị

Ọ BỤ ezie na ọ dịghị adịte aka, ị pụrụ ịdị na-echeta ya ná ndụ gị nile. Ọ bara nnọọ uru, ma ọ dịghị onye dara ogbenye ruo n’ókè nke na ọ pụghị imere ya onye ọzọ ma ọ bụ baa ọgaranya ruo n’ókè nke na ọ dịghị ya mkpa. Gịnị ka anyị na-ekwu banyere ya? Ọ bụ mmụmụ ọnụ ọchị.

Iji mụmụọ ọnụ ọchị, uru ahụ́ mmadụ ga-ekwegide ekwegide bụ́ nke na-eme ka anya gbukepụ egbukepụ, na-emekwa ka akụkụ ọnụ gbalitetụ elu n’ụzọ na-egosi obi ụtọ. N’ime izu ole na ole mbụ mgbe a mụsịrị nwa ọhụrụ, ọ na-amụmụ ọnụ ọchị, nke a kwa na-atọ nne na nna ọhụrụ ahụ ụtọ. Mmụmụ ọnụ ọchị ndị mbụ a na-abịara onwe ha. Ndị ọkachamara na-akọwa na a na-amụmụkarị ụdị ọnụ ọchị a n’oge mmadụ na-arọ nrọ, o yikwara ka ihe na-akpali ya ọ̀ bụ mmetụta uche na ihe ndị na-eme n’usoro ịrụ ọrụ nke ụbụrụ na akwara. Ọbụna mgbe anyị meworo okenye, anyị ka pụrụ ịmụmụ ọnụ ọchị na-abịara onwe ya mgbe anyị risịrị nri ma ọ bụ mgbe anyị na-ege egwú.

Otú ọ dị, malite mgbe nwa ọhụrụ dị izu isii, ọ na-amụmụ ọnụ ọchị ma ọ hụ ihu mmadụ ma ọ bụ nụ olu mmadụ. Ọnụ ọchị ‘a mụmụụrụ ndị mmadụ’—ọnụ ọchị a na-ama ụma amụmụ—na-eme ka anyị nwee ihu gbachapụrụ agbachapụ, ma ànyị bụ́ ụmụ ọhụrụ ma ànyị bụ́ ndị meworo okenye. A na-ekwu na mmụmụ ọnụ ọchị dị otú ahụ na-enwe mmetụta dị mma ọbụna n’ahụ́ ike anyị. Dị ka ndị na-agwọ nsogbu ikwu okwu, bụ́ Mirtha Manno na Rubén Delauro, bụ́ ndị nwere ụlọ ahụ́ ike ndị mmadụ na-amụ inyere onwe ha aka n’ụzọ ahụ́ ike, bụ́ nke a na-akpọ Ịmụmụ Ọnụ Ọchị na Ahụ́ Ike, si kwuo, nanị ịmụmụ ọnụ ọchị na-emepụta ihe mkpali na-emetụta akụkụ ahụ́ bụ́ pituitary gland. Akụkụ ahụ́ a, n’aka nke ya, na-emepụta endorphin, bụ́ mmiri ọgwụ na-adị n’ụbụrụ nke na-eme ka anyị nwee obi ụtọ.

Ihe ọzọ dị mkpa mere o ji kwesị ka anyị na-amụmụ ọnụ ọchị bụ mmetụta ọma ọ na-enwe n’ahụ́ ndị ọzọ. Mmụmụ ọnụ ọchị sitere n’obi na-egosipụta mmetụta anyị n’ekwughị okwu, ma ọ̀ bụ ịmụmụ ọnụ ọchị iji kelee ekele, iji gosi ọmịiko, ma ọ bụ iji nye agbamume. Mgbe ụfọdụ, nanị foto nwatakịrị na-amụmụ ọnụ ọchị n’ụzọ na-akpali mmasị pụrụ ime ka anyị mụmụọ ọnụ ọchị.

Mgbe mmadụ ji ihu enyị mụmụọrọ anyị ọnụ ọchị, ọ pụrụ inyere anyị aka inwekwu ahụ́ iru ala, ịnagidekwu nkụda mmụọ ma ọ bụ ihe ịma aka. Bible na-atụ aro, sị: “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya.” (Ilu 3:27) Ee, site n’ime ihe a dị mfe, anyị pụrụ irite uru, meekwa ka ndị ọzọ rite uru. Gịnị ma i mee mgbalị iji soro ndị ọzọ kerịta onyinye a bara nnọọ uru—mmụmụ ọnụ ọchị sitere n’obi?