Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọnọdụ Ahụ Chọrọ Ime Ihe Ngwa Ngwa nke Na-esi Ike Nchọpụta’ Ga-ejedebe N’isi Nso!

‘Ọnọdụ Ahụ Chọrọ Ime Ihe Ngwa Ngwa nke Na-esi Ike Nchọpụta’ Ga-ejedebe N’isi Nso!

‘Ọnọdụ Ahụ Chọrọ Ime Ihe Ngwa Ngwa nke Na-esi Ike Nchọpụta’ Ga-ejedebe N’isi Nso!

“E JIRI oge a tụnyere oge gara aga na-adịchabeghị anya, anyị bi taa n’ụwa nwere ihe oriri n’ụba. . . . E nwere ihe oriri zuru nnọọ ezu maka mmadụ nile . . . ma e kwuwe ya n’ọnụ.” Otú ahụ ka e kwuru ná nnyocha Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO) mere. Ya bụrụ otú ahụ, gịnịzi n’ezie mere e ji enwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́?

“Ihe bụ́ nsogbu bụ na a dịghị emepụta ma ọ bụ na-ekesa ihe oriri n’ụzọ hà nhata,” ka òtù WHO na-ekwu. N’ụzọ dị mwute, mgbe mgbe, ndị ogbenye nọ ná mba ndị ka na-emepe emepe, bụ́ ndị ala ha na-eme nri, na-agbara aka—burukwa agụụ—na-ekiri ka a na-ebuga ihe ubi n’ụba ná mba ndị ọzọ iji nweta ego. Ọ na-ewetara mmadụ ole na ole uru na-adịru nwa oge, na-ewetara ọtụtụ ndị mfu na-adịte aka.” Nnyocha Òtù Na-ahụ Maka Ihe Oriri na Ọrụ Ugbo nke Mba Ndị Dị n’Otu (FAO) mere na nso nso a na-egosi na ‘otu ụzọ n’ụzọ ise kasị baa ọgaranya ná ndị’ bi na mbara ụwa ‘na-eri pasent 45 nke anụ na azụ̀ nile; ebe otu ụzọ n’ụzọ ise kasị daa ogbenye na-enweta nanị pasent 5.’

N’aka nke ọzọ, “enwetaghị ezi agụmakwụkwọ na ihe ọmụma ziri ezi na-akpatakwa nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́,” ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na e meghị ndokwa ka ndị mmadụ nweta ihe ọmụma nakwa usoro agụmakwụkwọ ka mma, a pụghị ịzụlite amamihe, nkà na àgwà ndị dị mkpa iji lụsoo nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ọgụ.” Ma, ụkọ ihe oriri, n’aka nke ya, na-eme ka mmadụ ghara inwecha ahụ́ ike na ikike ọ ga-eji nweta agụmakwụkwọ ka mma—n’ụzọ dị otú ahụ, otu nsogbu na-ekote nnọọ ibe ya.

Ikpe Ziri Ezi na Inwe Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ n’Ụzọ Achọghị Ọdịmma Onwe Onye Nanị

N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị dị otú ahụ na-ekoropụ obi, ụfọdụ ndị ọkachamara n’akụkụ a ka nwere nchekwube. Dị ka ihe atụ, nnukwu onyeisi nke òtù FAO, bụ́ Jacques Diouf, kwupụtara olileanya a: “Ana m ese onyinyo ụwa ebe nwoke, nwanyị na nwatakịrị ọ bụla ga-enwe ihe oriri na-edozi ahụ́, ndị na-adịghị ize ndụ, n’ụzọ zuru ezu, kwa ụbọchị. N’onyinyo m, e belatara ngabiga ókè na-awụ akpata oyi n’ahụ́ nke ịba ọgaranya nakwa ịda ogbenye. Ana m ahụ ebe mmadụ na-ekwe ka ibe ya nọrọ, ọ bụghị ịkpa ókè megide ya; ebe e nwere udo, ọ bụghị esemokwu obodo; ebe e ji ihe ndị sitere n’okike eme ihe n’ụzọ na-adịghị ize ndụ, ọ bụghị mmebi nke gburugburu ebe obibi; ebe e nwere ọganihu nke ọha mmadụ, ọ bụghịkwa enweghị olileanya nke na-akụda mmụọ.”

Otú ọ dị, dị ka anyị hụworo, ọ ga-ewe ihe karịrị mmụba ná mmepụta na nkesa nke ihe oriri iji mezuo olileanya ndị dị otú ahụ. Ikpe ziri ezi na inwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị, dị mkpa. Ma a dịghị ahụ àgwà ndị a magburu onwe ha n’azụmahịa nke oge a.

Ọ̀ ga-ekwe mee iwepụ nnukwu ihe mgbochi ndị dị ka anyaukwu, ịda ogbenye, esemokwu, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị wee si otú ahụ mee ka a gharazie inwe nsogbu si n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ n’ụwa? Ka nke a ọ̀ bụ olileanya na-apụghị imezu emezu?

Nanị Ezi Ihe Ngwọta Dịnụ

Dị ka Bible si kwuo, ihe ndị bụ́ isi na-akpata nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ekwesịghị iju anyị anya. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “N’ụbọchị ikpeazụ, oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị njikere ime nkwekọrịta ọ bụla, . . . ndị na-enweghị ịhụnanya maka ezi ihe, . . . ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya.”—2 Timoti 3:1-5.

Ihe a kpọrọ mmadụ hà pụrụ iwepụ àgwà ndị dị otú ahụ gbamiworo mkpọrọgwụ n’enwetaghị enyemaka Chineke? O yighị ka ha ga-eme ya, ka ò yiri? Ikekwe ị rịbawo ama na n’oge ụfọdụ ndị na-achị achị na-enwe ezi ebumnobi banyere nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ịhụ ego n’anya, na ezughị okè nke ndị ọzọ na-emetụta ma mebie ọbụna mgbalị ndị e ji ezi obi mee.—Jeremaịa 10:23.

Otú ọ dị, ihe ngwọta ya abụghị olileanya na-apụghị imezu emezu. Bible na-ekwe nkwa na Alaeze Chineke ga-akwụsị nsogbu nke ikpe na-ezighị ezi nakwa nsogbu ndị ọzọ ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe taa.

Aịsaịa 9:6, 7 na-enye anyị olileanya a magburu onwe ya: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ́ Dike, Nna Nke bụ́ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ, n’elu ocheeze Devid, na n’elu alaeze ya, ime ka o guzosie ike, na ịkwagide ya n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.”

Ọ bụ otu Alaeze a ka ndị mmadụ na-ekpe ekpere maka ya mgbe ha na-ekwughachi Ekpere Onyenwe Anyị ma na-agwa Chineke, sị, “Ka alaeze gị bịa.” (Matiu 6:9, 10) Rịba ama na Aịzaịa na-ekwu na “ekworo Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-eme nke a.” Ee, Jehova Chineke anọgidewo na-enwe nnọọ mmasị n’igbo mkpa ụmụ mmadụ. O mewo ụwa a ka ọ na-emepụta ihe oriri zuru ezu maka mmadụ nile.

Abụ Ọma 65:9-13 na-ekwu banyere ya, sị: “I letawo ala, wee mee ka o jupụta n’ihe, Ị na-eme ka o nwee akụ̀ hie nne; mmiri iyi Chineke jupụtara ná mmiri: Ị na-edozi ọka ha, mgbe I si otú a dozie ala onwe ya. Ị na-edè ọ̀bà ala ubi ya mmiri: Ị na-eme ka ebe elu ya nile dị larịị: Ị na-eji oké mmiri ozuzo gbazee ya; Ị na-agọzi ihe opupu ya. . . . E werewo ìgwè ewu na atụrụ yikwasị ebe ịta nri nile dị ka uwe; a na-ewere ọka kpuchie ndagwurugwu nile.”

Ee, Onye Okike, bụ́ Jehova, bụ onye kasị enye ihe a kpọrọ mmadụ ihe na-akpa ha. “Ọ na-enye anụ ahụ́ nile nri: n’ihi na ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị.”—Abụ Ọma 136:25.

Anyị pụrụ inwe obi ike na Alaeze Chineke nke dị n’okpuru Kraịst ga-elekọta mmadụ nile. “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile,” ka Bible na-ekwu. Ma a ga na-ekesakwa ya n’ụzọ ha nhata, n’ihi na “[Jizọs Kraịst] ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. . . . Ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta.” (Abụ Ọma 72:12, 13, 16) Ya mere nwee obi ike! A na-aga iweta ‘ọnọdụ a chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke na-esi ike nchọpụta’ ná njedebe n’ụzọ na-adịgide adịgide.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]

“E kwuwe ya ekwuwe, ọ ga-ekwe mee ịkwụsị agụụ na nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. Ihe ndị a ga-eji mee ya dị adị. Ihe ịma aka e nwere bụ . . . mba dị iche iche na mba nile ime ihe ndị pụtara ìhè.”—Òtù Ahụ́ Ike Ụwa

[Foto dị na peeji nke 10]