Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igosipụta Ịhụnanya n’Oge Nsogbu

Igosipụta Ịhụnanya n’Oge Nsogbu

Igosipụta Ịhụnanya n’Oge Nsogbu

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA NIGERIA

A KPỌRỌ Sunday, January 27, 2002, Sunday Ọdachi na Lagos, Nigeria. Ihe gbawara n’ebe a na-akwakọba ngwá agha n’okpuru ala mere ka obodo ukwu ahụ dum maa jijiji nke ukwuu ma mee ka ìhè nwuo n’igwe n’abalị ahụ. Ruo ọtụtụ awa, ihe ndị ahụ na-agbawanụ nọ na-atụsasị ọtụtụ nnukwu bọmbụ na iberibe bọmbụ ruo kilomita atọ, na-eme ka ndị nọ n’obodo ahụ maa jijiji nke ukwuu.

Kepu kepu ndị na-enweghị isi mere ka ndị mmadụ tụkwuo egwu. Ìgwè mmadụ egwu jidere nupụtara n’okporo ámá, n’amaghị ihe ha na-agbara ọsọ ma ọ bụ ebe ha na-agbaga. N’ọchịchịrị nke uhuruchi ahụ, ọtụtụ narị mmadụ, gụnyere ọtụtụ ụmụaka egwu jidere, gbabara n’ime mmiri unyi nke dị n’otu ọwà mmiri, mmiri wee rie ha. E bibiri ụlọ, ụlọ akwụkwọ, na ebe achụmnta ego dị iche iche, na-eme ka ọtụtụ puku mmadụ bụrụ ndị na-enwekwaghị ebe obibi na ọrụ. E mere atụmatụ na 1,000 mmadụ nwụrụ n’ọdachi ahụ. Atụmatụ ndị e mere mgbe e mesịrị, dị elu ọbụna karị.

E mesịrị chọta bọmbụ, rọketi, na grenade ndị a na-eji aka atụ, bụ́ ndị na-agbawaghị agbawa, ndị dị ihe dị ka 1,350, n’ebe ndị mmadụ bi gburugburu ogige ndị agha ahụ ihe gbawara na ya. Otu nwoke hụrụ okporo ígwè na palọ ya. N’amaghị na ọ bụ bọmbụ, ọ tụtụlitere ya, tinye ya n’azụ obere ụgbọala ya, ma weghachiri ya ndị ọchịchị.

Ozugbo alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke Nigeria nụrụ akụkọ banyere ihe ahụ gbawaranụ, ha kpọtụụrụ otu okenye nọ na Lagos ma gwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị 16 nọ n’ógbè ahụ ka ha chọpụta ọnọdụ Ndịàmà 36,000 nọ na Lagos. Alaka ahụ zigara otu nde naira (ihe dị ka $10,000 U.S.), nyekwa ntụziaka ka e guzobe kọmitii enyemaka iji nye nkwado.

N’etiti Ndịàmà, ibé bọmbụ merụrụ otu nwoke ahụ́ nke ukwuu; n’ụzọ dị mwute, ụmụ agbọghọ abụọ nwụrụ; e bibiri Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ na ụlọ nke ezinụlọ 45.

Ụbọchị isii mgbe ihe ndị ahụ gbawasịrị n’ebe ahụ a na-akwakọba ngwá agha, na February 2, 2002, esemokwu agbụrụ dapụtara n’akụkụ ọzọ nke obodo ukwu ahụ. Dị ka òtù Red Cross si kwuo, 100 mmadụ nwụrụ n’ọgụ ahụ, e merụrụ mmadụ 430 ahụ́, mmadụ 3,000 gbahapụrụ ebe obibi ha, a gbakwara ụlọ 50 ọkụ. Kọmitii enyemaka nke nọworo na-ahụ maka mkpa nke ndị “Sunday Ọdachi” ahụ metụtara chọtara ụmụnna ha Ndị Kraịst ozugbo n’ógbè a.

N’oge a, ọ dịghị onye nwụrụnụ n’ime Ndịàmà, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ n’ime ha gara mgbakọ sekit mgbe ọgụ ahụ dara. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị òtù nke ọgbakọ ise dị n’ógbè ahụ enweghị ebe obibi ha ga-abanye ma ha lọta. Ụmụnna ha Ndị Kraịst ji obi ha nile kpọbata ha. Otu dọkịta bụ́ Onyeàmà na nwunye ya nyere mmadụ 27 na-enwekwaghị ebe obibi ebe ha ga-ebi.

Ndịàmà nọ na Lagos bụ́ ndị ihe ndị ahụ gbawaranụ na esemokwu agbụrụ ahụ na-emetụtaghị ji mmesapụ aka nye ihe oriri, uwe, na arịa ụlọ n’onyinye. Onye nlekọta obodo ahụ kọrọ, sị: “Ihe ụmụnna nọ na Lagos na-enye n’onyinye karịrị nnọọ ihe dị ndị ahụ nsogbu ahụ metụtara mkpa.” Alaka ụlọ ọrụ degaziiri ọgbakọ ndị dị n’obodo ahụ akwụkwọ, na-agwa ha ka ha kwụsị inye onyinye. E ji ụgbọala atọ buga ihe ndị mafọrọ amafọ n’alaka ụlọ ọrụ maka nchekwa.

Ndị okenye ọgbakọ letara ọtụtụ ndị ọdachi ahụ metụtara nakwa ndị òtù ezinụlọ nke ndị ahụ nwụrụnụ. Ha gbalịrị inye nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Kọmitii enyemaka ahụ mere nhazi maka ịrụzi ebe obibi ndị e bibiri. Ha nyere ndị ọdachi abụọ ahụ metụtara arịa ụlọ, uwe, na ihe oriri, nyekwara ndị na-enweghịzi ebe obibi aka inweta ebe obibi. Kọmitii ahụ nyeere ngụkọta nke mmadụ na ezinụlọ 90 aka.

Enyemaka nke ọtụtụ ndị ọdachi ahụ metụtara nwetara riri ha ọnụ. Otu Onyeàmà gwara kọmitii enyemaka ahụ, sị: “Ọ bụrụhaala na m dị ndụ, M ga na-eme Jehova ‘ebe mgbaba m na ike m’!”—Abụ Ọma 46:1, 2.

Ndị na-abụghị Ndịàmà hụrụ otú Ndịàmà Jehova si lekọta ibe ha n’oge nsogbu ndị a. Deede nke otu n’ime Ndịàmà ahụ nwụrụnụ gwara ndị okenye nke ọgbakọ Onyeàmà ahụ nwụrụ anwụ nọ na ya, sị: “Aga m abịa ọzọ iji kelee unu nnọọ nakwa iji mụtakwuo ihe.” Ọ gwara ezinụlọ ya, sị: “Ihe m hụrụ na Lagos dị nnọọ ịtụnanya. Ọbụna ndị ikwu emeghị ihe ndị a mere.”

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụgbọala nke a kwanyejuru ihe enyemaka

[Foto dị na peeji nke 23]

Ụfọdụ ndị e nyeere aka

[Foto dị na peeji nke 24]

Di na nwunye a nyere mmadụ 27 na-enweghịzi ebe obibi ebe ha ga-ebi

[Foto dị na peeji nke 24]

Ndịàmà na-arụ ọrụ n’ụlọ e bibiri ebibi

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

N’elu: Sam Olusegun–akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian