Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na nke Ugbu a, Ọ Gwara M Okwu”

“Na nke Ugbu a, Ọ Gwara M Okwu”

“Na nke Ugbu a, Ọ Gwara M Okwu”

Na 1994, Ndịàmà Jehova bipụtara otu broshuọ nke kwuru banyere ihe ịma aka nke ịnagide ọnwụ onye a hụrụ n’anya. Kemgbe ahụ, ọ nọwo na-ewetara ọtụtụ ndị nkasi obi.

N’oge na-adịbeghị anya, a natara akwụkwọ ozi sitere n’aka otu onye nwere ekele nke na-agụ akwụkwọ anyị na Pennsylvania, U.S.A., bụ́ onye dere, sị: “Mgbe mbụ m nwetara broshuọ ahụ, echere m, sị, ‘Ọ bụ nnọọ ezigbo akwụkwọ.’ Otú ọ dị, amataghị m ókè ọ baruru n’uru ruo mgbe nwa m nwanyị nwụnahụrụ m izu abụọ gara aga. N’ịbụ onye nwere nnọọ mwute ma na-achọ enyemaka, amalitere m ịgụ broshuọ ahụ. Na nke ugbu a, ọ gwara m okwu. O kwuru banyere ihe nile na-egbu m mgbu n’obi, ọ kasikwara m obi.”

Broshuọ ahụ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ na-aza ajụjụ ndị dị ka: Olee otú m pụrụ isi nagide iru újú m? Olee otú ndị ọzọ pụrụ isi nye aka? Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụrụ anwụ?

Ikekwe gị ma ọ bụ onye ị maara ga-enwetakwa nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a dị peeji 32. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.