Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngafe Na-akpali Mmasị nke Ụmụ Anụmanụ Na-agafe Ebe Ọzọ

Ngafe Na-akpali Mmasị nke Ụmụ Anụmanụ Na-agafe Ebe Ọzọ

Ngafe Na-akpali Mmasị nke Ụmụ Anụmanụ Na-agafe Ebe Ọzọ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA KENYA

ỤDA ụkwụ nke nde anụmanụ na-azọ kitim kitim mere ka ala mee mkpọtụ. Imerime akatamkpo ụmụ anụmanụ awụrụ na-abịa, na-abọli uzuzu na-acha uhie uhie elu. Anụmanụ ndị ahụ, bụ́ ndị nwere ogologo ụkwụ ndị dị gịrịgịrị, wụụrụ ọsọ na-agafe ndagwurugwu ndị na-adịghị larịị na ugwu dị iche iche, na-agafe ala ahịhịa, osimiri na iyi dị iche iche. Ha nuuru na-abịa, na-azọda ahịhịa ndị dị n’ebe ha si gafee. Oké ìgwè anụmanụ a bụ́ ndị na-ebe ubé ma na-agba ọsọ n’eleghị anya n’azụ so n’ime ụmụ anụ ọhịa ndị kasị adọrọ mmasị n’ụwa—ngafe na-akpali mmasị nke ele wildebeest na-agafe n’ebe ọzọ.

Ogige Iden nke Africa

Serengeti bụ ala a na-akọghị ihe. Ọ bụ nnukwu ala ahịhịa dị na Tanzania na Kenya bụ́ nke ụmụ obere ugwu dị na ya, nke dị ihe dị ka kilomita 30,000 n’akụkụ anọ ya. Ájá kpuchiri ala ebe a, bụ́ nke si n’ugwu gbawara agbawa sọpụta, nke na-eme nri nke ọma, na-eme ka ọnọdụ dịrị ahịhịa ndị tojuru n’ala ahụ mma. E nwere ebe ndị osisi acacia jupụtara nakwa ebe osisi ndị nwere ogwu jupụtara bụ́ ebe ìgwè enyí dị iche iche na-ata nri. Ìgwè anịgọ ndị nwere ụkwụ ogologo na-eji nwayọọ nwayọọ agafe ala ahịhịa ahụ n’ụzọ na-akpali akpali.

N’ebe ụfọdụ na mbara ala ahụ, e nwere ebe ndị okwute gbalitere elu, bụ́ ndị ifufe na mmiri mere ka ha na-akwọ mụrụmụrụ, ha na-abụkwa ebe ndị dị mma ọdụm na agụ owuru na-anọ elepụ anya. Enyi mmiri na agụ iyi jupụtara n’osimiri ndị gbara ngọ bụ́ ndị na-asọsi ike n’ala ahụ. A pụrụ ịhụ ka ìgwè ele wildebeest, ele hartebeest, ele topi, na ọtụtụ ụdị ele ndị ọzọ na-ata nri. Ịnyịnya ọhịa ndị akpịrị na-akpọ nkụ na-agbakọ n’òkòkòrò mmiri dị n’ime ya, gbaa ha gburugburu dị ka ihe olu ndị e ji ákà ndị na-acha ọcha na ndị na-eji oji mee. Ele ọhịa na ele impala na-amali nnọọ elu n’enweghị ihe isi ike ọ bụla gafere mbara ala ahụ. Ìgwè atụ, bụ́ ndị gbara agba ma nwee nnukwute mpi rọgọrọ arọgọ, weturu obi ala na-ata nri, jiri ọnụ ha sara mbara na-efoli ahịhịa.

Ìgwè ọdụm dị iche iche jupụtara na Serengeti. N’oge anwụ na-achasi ike n’ụbọchị, ha na-edina na ndò osisi na-eche ka oge mgbede ruo, bụ́ mgbe ebe nile ga-ajụ oyi, ka ha wee chụọ nta. Ọ fọrọ nke nta ka a ghara ịhụ agụ owuru ndị tụrụ àgwà n’ebe ha dina, ha na-amakpu n’ụzọ magburu onwe ya n’elu ebe osisi ndị dị elu wara alaka, na-abụ ndị onyinyo tụrụ àgwà nke ndò osisi ahụ na-eme ka o sie ike ịhụ ha. Agụ owuru na-ahụ ala ahịhịa ahụ dị ka ebe dị mma ịnọ na-awụgharị. A dịghị ahụchazi ahụ́ ya dị gịrịgịrị ka ọ na-achụrụ anụ oriri gafere mbara ala ahụ.

N’ezie, usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na Serengeti bụ paradaịs ụmụ anụmanụ nke na-akpali mmasị n’ikiri ya. Ma ọ bụ ìgwè ele wildebeest dịgasị nnọọ iche iche kasị dị ịtụnanya n’ala ụmụ anụmanụ ahụ.

Anụ Na-eme Ihe Ọchị na Mbara Ala Ahụ

Ihe e mere atụmatụ ịbụ ele wildebeest nde 1.5 na-akpagharị na Serengeti. Ọ bụ anụ jọrọ njọ n’ile anya, nke nwere ogologo isi na anya na-egbukepụ egbukepụ, bụ́ ndị na-adịkọtaghị ọnụ ma dịrị n’elu elu isi ya. Mpi ya, bụ́ nke yiri nke ehi rọgọrọ arọgọ, kpọdotụ ihu n’ala, gbatịpụ n’ihu ma kpọlizie ihu elu. Azụ ya gbadara ala ruo n’ukwu ya, bụ́ nke yiri ihe na-esighị ike ma dị obere karịa ubu na olu siri ike nke anụmanụ ahụ. Ele wildebeest ahụ, bụ́ nke buru ibu, nwere ogologo ụkwụ ndị dị gịrịgịrị. N’ịbụ nke nwere afụ ọnụ na-acha ọcha, nwee nnukwu ajị̀ olu na-eji oji, na ọdụdụ yiri nke ịnyịnya, ele wildebeest yiri ọtụtụ anụmanụ n’ụzọ dị iche iche.

Ele wildebeest na-emekarị ihe ọchị ma na-akpali mmasị. Mgbe ha zukọtara n’ìgwè, ha na-ebe ubé na-ada oké ụda bụ́ nke na-eyi ebe ọtụtụ puku akịrị na-ebe ube. Ka ha guzo na mbara ala ahụ, ha na-eyi ndị nwere mgbagwoju anya na ijuanya ka ha na-elegharị anya gburugburu ha.

Mgbe ụfọdụ, ele wildebeest nke oké na-agbagharị na mbara ala ahụ, na-agba akụkụ akụkụ ma na-agba gburugburu. Ka ọ na-efegharị isi ya, ọ na-eji ụkwụ ya na-apịajighị apịaji awụli elu, na-abọli uzuzu elu n’ụzọ na-atọ ọchị. Ụfọdụ na-ekwu na ọ na-eme ihe a iji kpalie mmasị ndị nke nne ma ọ bụ iji dọọ ndị nke oké ndị ọzọ aka ná ntị site n’igosi ha ike ya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, oké ele na-eyi ka ọ̀ na-egwuri egwu nkịtị.

Anụmanụ A Mụnyere n’Ụwa Na-enweghị Omume Enyi

Mgbe ọnọdụ dị mma, ele wildebeest na-amalite ịmụ nwa. Ha nwere ikike pụrụ iche nke ịmụkọta nwa otu mgbe, na-amụ pasent 80 ruo 90 nke ụmụ ha n’ime izu atọ. N’oge a ìgwè anụmanụ a na-amụba, a na-enwe ọtụtụ puku ụmụ ele wildebeest na-ebe ubé. Nne ele wildebeest nke ọ bụla na nwa ya aghaghị ịkpachiwe anya ngwa ngwa, n’ihi na ọ bụrụ na ọsọ esu, nne na nwa ya pụrụ ịgba iche iche n’ụzọ dị mfe, nwa ele wildebeest ahụ agachaghịkwa enwe ike ịdịgide ndụ n’onwe ya.

Ha na-amụ ụmụ n’ụwa na-enweghị omume enyi bụ́ ebe e nwere anụ ndị na-eri ibe ha bụ́ ndị anya dị nkọ mgbe nile. Ndị nke nne na-echere ruo mgbe a na-enweghị ihe àmà ọ bụla nke ihe ize ndụ tupu ha amalite ịmụ ụmụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anụ na-eri ibe ha abịa na mberede, ha nwere ikike dị ịtụnanya nke ịkwụsịtụ ọmụmụ nwa ma gbalaga. E mesịzie, mgbe a na-enweghị ihe ize ndụ, ha na-amụtọpụ nwa ha.

Nwa ele wildebeest n’onwe ya yiri ka ọ na-enwe mmetụta ebumpụta ụwa na ihe ize ndụ dị, ọ na-eguzorokwa ọtọ n’ime minit ole na ole a mụsịrị ya. Mgbe otu izu gasịrị, nwa ele wildebeest ahụ na-enwe ike ịwụgharị na mbara ala ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ nke kilomita 50 n’otu awa.

Oge Eruwo Maka Ịgafe Ebe Ọzọ

Ele wildebeest na-esi n’otu akụkụ nke Serengeti gafee n’akụkụ ọzọ n’ìgwè. Ihe bụ́ isi na-eme ka ha gafee ebe ọzọ n’ìgwè bụ mmiri ozuzo. Ihe na-achịkwa mmiri ozuzo bụ mgbanwe nke ihu igwe na-agbanwe kwa afọ. Mgbe nile n’afọ a na-enwerịrị ebe mmiri na-ezo n’ala ahịhịa a sara mbara.

Ọ dị ele wildebeest mkpa ịṅụ mmiri kwa ụbọchị, ọ ghaghịkwa inwe ahịhịa ọ ga na-ata mgbe nile. Ọ bụrụhaala na e nwere ihe oriri na mmiri, ha na-anọgide ebe ha nọ. Ma ka ọkọchị na-aga n’ihu, ahịhịa ndị dị na mbara ala ahụ na-amalite ịkpọnwụ, mmiri na-atakọkwa. Ìgwè ele wildebeest apụghị ịnọ chere ka mmiri bịakwute ha. Ha aghaghị ịga ebe mmiri na-ezo.

Ebe ọ bụla mmiri zoro, mbara ala ahụ kpọrọ nkụ na-agbanwe ngwa ngwa. N’ime ụbọchị ole na ole, ahịhịa na-epulite ma tojupụta n’ala ahụ ngwa ngwa. Ụmụ ahịhịa ndị a pulitere epulite na-enwe nnọọ ihe na-edozi ahụ́ na mmiri—ihe na-amasị ele wildebeest nke ukwuu.

Anụmanụ ndị a nwere ikike dị ịtụnanya nke ịchọpụta ebe mmiri na-ezo, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ na-ezo n’ebe dị nnọọ anya. Ọ dịghị onye ji n’aka otú ha na-esi amata na mmiri na-ezo n’akụkụ ọzọ nke Serengeti—ma ọ bụ site n’ịhụ urukpuru nke dị n’elu n’ebe dị anya ma ọ̀ bụ n’ikuru ikuku jụrụ oyi. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, iji dịgide ndụ, ìgwè anụmanụ ahụ aghaghị ịga ebe ahụ. N’ezie, ha na-agakwa ebe ahụ!

Njem Dị Ize Ndụ

Ha na-amalite ọpụpụ ha nwayọọ nwayọọ. Ele wildebeest bụ anụ na-esokarị ibe ha akpakọrịta; mgbe otu malitere ịga otu ebe, ndị ọzọ nọ ya gburugburu na-akwụsị ịta nri ma gbalịa iso ya. N’oge na-adịghị anya ìgwè anụmanụ ahụ dum ga-enuru gawa ebe ahụ n’ụzọ na-akpali akpali. N’ịbụ ndị akpịrị kpọrọ nkụ na ndị agụụ ji, ha ga na-aga n’ihu. Mgbe ụfọdụ ha na-agba ọsọ. N’oge ndị ọzọ ha na-akwụ n’ogologo ahịrị, na-eme ka e nwee ọwara dị omimi n’ala uzuzu ahụ.

Njem ha jupụtara n’ihe ize ndụ. Anụ ndị na-eri ibe ha na-eso ìgwè ele wildebeest ahụ, na-elepụ anya ịhụ anụmanụ nke ọ bụla na-adịghị agbasi ike, nke dara ngwụrọ, ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa. Ka ele wildebeest ndị ahụ na-aga, ha na-abanye n’ógbè ìgwè ọdụm, bụ́ ndị na-ezo n’ọhịa na-eche ha. N’ịbụ ndị zoro n’ahịhịa dị ogologo, ọdụm ndị ahụ gbara agba na-agbaba n’ime ìgwè anụmanụ ahụ na-ata nri, na-eme ka ha gbasasịa n’oké ụjọ. Agụ owuru, nkịta ọhịa, na anụ hyena, na-eji ohere ahụ ejide anụmanụ ndị lara azụ ma ọ bụ ndị si n’ìgwè ahụ kpafuo. Mgbe e gburu otu anụmanụ, udele na-efega ebe ahụ. Ha na-azọ ihe ndị fọdụrụ n’anụmanụ ahụ ụzọ ma na-alụ ọgụ maka ya, ọ dịghị ihe ha na-erifọ ma e wezụga ọkpụkpụ ya, bụ́ nke anwụ Africa nke na-achasi ike na-eme ka ọ na-acha ọcha.

Osimiri ndị na-asọsi ike na-abụ oké ihe mgbochi nke ìgwè ele wildebeest ahụ na-aghaghị ịgafe. Ịgafe osimiri na-abụ ihe omume dị ịrịba ama, ebe ọtụtụ puku anụmanụ na-esi n’ikpere mmiri dị elu na-amaba n’ime mmiri. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha na-agafe akụkụ nke ọzọ n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ndị ọzọ na-abụ ndị mmiri na-achị ọkụ buuru ma ọ bụ ndị agụiyi bụ́ ndị na-echere n’ime mmiri ahụ jidere. Ha na-eme njem a dị ize ndụ kwa afọ. Mgbe ha mesịrị ya, ha pụrụ ịgawo ihe dị ka kilomita 3,000.

Mmadụ—Onye Kasị Egbu Ha

Ruo ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ emetụtachaghị ngafe nke ele wildebeest na-agafe ebe ọzọ. Ugbu a, ọ bụ ụmụ mmadụ kasị egbochi ihe omume a dị ịrịba ama. N’iri afọ ole na ole gara aga, gọọmenti Tanzania na nke Kenya agbalịwo ichebe ụmụ anụmanụ ndị nọ na Serengeti. Ma, ọ bụ ezie na ngafe nke ele wildebeest na-agafe ebe ọzọ kasị ewere ọnọdụ n’ókèala e chebere echebe nke ụmụ anụmanụ, ndị na-achụ ntá na-eji ọnyà ejide ma gbuo ọtụtụ puku ụmụ anụmanụ a n’ụzọ iwu na-akwadoghị. N’ịbụ ndị na-eji ọnyà waya, akụ́ nwere nsí, na égbè, ha na-achụ ntá ụmụ anụmanụ iji nweta anụ na akụkụ ahụ́ anụmanụ bụ́ ndị ha na-eresị ndị ahịa na-achọsi ha ike. Ìgwè ndị na-elekọta anụmanụ na ndị na-elekọta oké ọhịa na-agagharị n’ebe ndị ahụ e chebere echebe, ma Serengeti buru nnọọ ibu nke na ọ gaghị ekwecha mee ichebe ya n’ụzọ zuru ezu. Ka ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-arị elu, a na-enwewanye nrụgide ịmanye aka n’ala ahịhịa a na-eme nri. Iwepụta ala buru ibu maka anụ ndị bi n’ọhịa bụ isiokwu tara akpụ nke a nọgidere na-arụrụ ụka.

Ọ dị mgbe ọtụtụ nde atụ nọ na-awagharị na mbara ala ndị dị n’Ebe Ugwu America. Ha adịghịzi. Ụfọdụ ndị na-atụ egwu na otu ihe ahụ ga-eme ìgwè ele wildebeest ndị ikpeazụ e nwere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. Ọ ga-abụ ihe mwute ma ọ bụrụ na anyị anọrọ na-ele nnọọ anya ihe a e kere eke nke dị nnọọ ịtụnanya apụọ n’anya. Anyị na-atụ anya ụbọchị ahụ bụ́ mgbe mmadụ na anụmanụ ga-ebi n’udo n’emerụghị ibe ha ahụ́ n’okpuru ọchịchị ezi omume nke Chineke. (Aịsaịa 11:6-9) Ka ọ dịgodị, anyị ga-anọgide na-enwe ihe ijuanya n’ihe omume a dị ịrịba ama—ngafe na-akpali mmasị nke ele wildebeest na-agafe ebe ọzọ.

[Foto dị na peeji nke 22]

Ìgwè anụmanụ ahụ aghaghị ịgafe osimiri ndị na-achị ọkụ