Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnukwu Ọdachi

Nnukwu Ọdachi

Nnukwu Ọdachi

Erik * dị ọnwa isii. Otú ọ dị, ịdị arọ na ogo ya eruchaghịdị nke nwa ọhụrụ dị otu ọnwa ma ọ bụ ọnwa abụọ. N’agbanyeghị na ọ dịghị arọ otú kwesịrịnụ, ụkwụ ya abụọ na afọ ya zachara aza, ihu ya kokwara eko ma gbaa gburugburu. Akpụkpọ ahụ́ ya chagharịchara achagharị, ntutu isi ya dị nwịrị nwịrị ma chanwụọ achanwụ, ọnyá jupụtakwara ya n’ahụ́. O yiri ka ahụ́ erutụghị ya nnọọ ala. Ka dọkịta na-enyocha anya Erik, ọ ghaghị ịkpachara nnọọ anya, ebe ọ bụ na uru anya ya pụrụ ịdọwa n’ụzọ dị mfe. O yiri ka nke ahụ ò metụtawo uto nke ọnọdụ uche Erik. N’ụzọ dị mwute, ọ bụtụghị nanị nwatakịrị a nọ n’ụdị ọnọdụ a.

“O SO egbu ihe karịrị ọkara ụmụaka nile na-anwụ gburugburu ụwa—ọ̀tụ̀tụ̀ ọ na-adịbeghị ọrịa ọ bụla na-efe efe ruru ya kemgbe e nwesịrị Ọnwụ Ojii. Ma, ọ bụghị ọrịa na-efe efe. Mmetụta ọjọọ ya na-eru ọtụtụ nde mmadụ ọ na-egbughị, kama ha na-abụ ndị ọ kwarụrụ, na-eme ka ha nọgide na-abụ ndị ọ dịịrị mfe ịda ọrịa, ndị ọ na-emetụtakwa ọgụgụ isi ha. Ọ na-etinye ndị inyom, ezinụlọ dị iche iche, nakwa n’ụzọ bụ́ isi, ọganihu nke obodo, n’ihe ize ndụ.”—The State of the World’s Children, Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu.

Olee ọrịa e ji okwu ndị ahụ na-akọwa? Ọ bụ nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́—karịsịa, nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-enye protein na ume ọrụ, bụ́ nke Òtù Ahụ́ Ike Ụwa (WHO) kpọworo “ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke na-esi ike nchọpụta.” Olee ókè ọdachi a bururu ibu? Òtù WHO na-ekwu na o “so egbu ma ọ dịkarịa ala ọkara n’ime nde ụmụaka 10.4 na-anwụ kwa afọ.”

Nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ gụnyere ọtụtụ nrịanrịa, malite n’ụkọ nke otu n’ime ihe ndị na-edozi ahụ́ ma ọ bụ karịa—dị ka ụkọ vitamin na mineral—gaa n’oké ibu na ọrịa ndị ọzọ metụtara ihe oriri bụ́ ndị na-adịghị ala ala. Otú ọ dị, nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-enye protein na ume ọrụ “bụ otu ụdị nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ bụ́ nke kasị dị nnọọ ize ndụ,” ka òtù WHO na-ekwu. Ndị ọ na-emetụtakarị bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise.

Chetụdị echiche banyere Erik, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, nakwa ọtụtụ nde ụmụaka ndị na-enwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. Ụta adịghịrị ha maka ịnọ n’ọnọdụ ahụ, ha apụghịkwa ịgbanahụ ya. Ọkachamara n’ihe banyere ọrịa ụmụaka na ihe oriri, bụ́ Georgina Toussaint, gwara Teta! sị: “Ndị na-ata ahụhụ ya bụ ndị ụta na-adịchaghịrị ma ọ bụ ha ka ọ na-emetụtakarịsị.”

Ụfọdụ ndị pụrụ iche na nsogbu ahụ bụ nke a na-apụghị izere ezere—na e nweghị nnọọ ihe oriri ga-ezuru mmadụ nile. N’ụzọ dị iche, dị ka òtù WHO si kwuo, “anyị bi taa n’ụwa nke ihe oriri jupụtara na ya.” E nwere ihe oriri zuru ezu maka mmadụ nile nọ n’elu ala—ọbụnakwa karị. Ọzọkwa, nsogbu na-esi na mmadụ erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ bụ ọrịa kasị mfe mgbochi na nke kasị dịrị ọnụ ala ịgwọ. Eziokwu ndị a, hà adịghị akpasu gị iwe?

Olee Ndị Ọ Na-emetụta?

Ọ bụghị nanị ụmụaka na-enwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. Dị ka otu akụkọ nke òtù WHO wepụtara na July 2001 na-ekwu, “nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ jupụtara ebe nile, na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 800—20% nke ndị nile bi ná mba ndị ka na-emepe emepe.” Nke a pụtara na 1 onye n’ime mmadụ 8 ọ bụla n’ụwa na-enwe nsogbu ahụ.

Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ndị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ nọ n’Eshia—karịsịa n’ógbè ndịda nakwa n’ógbè etiti—ebe e nwere ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke ndị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ bụ n’Africa ma e kezie ya na pasent. Mba ụfọdụ ka na-emepe emepe bụ́ ndị dị na Latin America nakwa n’ógbè Caribbean na-esochizi.

Mba ndị mepere emepe hà adịghị enwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́? Ha na-enwe. Dị ka akwụkwọ bụ́ The State of Food Insecurity in the World 2001 si kwuo, nde mmadụ 11 bụ́ ndị bi ná mba ndị mepere emepe na-enwe nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́. Nde mmadụ 27 ndị ọzọ bụ́ ndị na-enwe nsogbu ahụ bi ná mba ndị a na-akpọ mba ndị na-aghọ ndị mepere emepe, karịsịa ndị nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe nakwa na ripọblik ndị dị n’ebe bụbu Soviet Union.

N’ihi gịnị ka nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ji ghọọ oké nsogbu otú a? Ọ̀ dị ihe ọ bụla pụrụ ime ka ọnọdụ nke ndị nwere nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́ ka mma ugbu a? Ọ̀ dị mgbe mbara ala anyị ga-enwere onwe ya pụọ ná nsogbu na-esi n’erighị ihe ndị na-edozi ahụ́? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 Ọ bụghị ezigbo aha ya.

[Chaatị/Map dị na peeji nke 4]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

MBA NDỊ NWERE NDỊ NỌ N’IHE IZE NDỤ NKE ENWETAGHỊ IHE ORIRI NA-EDOZI AHỤ́ NKE ỌMA

OBERE IHE IZE NDỤ

IHE IZE NDỤ NA-ADỊCHAGHỊ UKWUU

OKÉ IHE IZE NDỤ

ENWEGHỊ IHE IZE NDỤ MA Ọ BỤ IHE NDEKỌ EZUGHỊ EZU

[Foto dị na peeji nke 3]

Ichere maka ihe enyemaka na Sudan

[Ebe E Si Nweta Foto]

UN/DPI Photo nke Eskinder Debebe sere