Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otu Nwoke nke Họọrọ Irubere Chineke Iisi

Otu Nwoke nke Họọrọ Irubere Chineke Iisi

Otu Nwoke nke Họọrọ Irubere Chineke Iisi

N’OGE jọgburu onwe ya nke afọ 1937, bụ́ mgbe echiche ndị megidere ibe ha kpatara esemokwu n’ọtụtụ mba ndị dị na Europe, nhọrọ ndị siri ike chere ezi Ndị Kraịst ihu. Hà kwesịrị irubere Chineke isi ka ọ̀ bụ mmadụ? (Ọrụ 5:29) Ụmụ okorobịa toruworo ogo ịga agha maara na irubere Chineke isi pụrụ iwetara ha ọnwụ.

Antonio Gargallo bụ́ onye Spen nke dị afọ 19, bụ onye nhọrọ dị otú ahụ chere ihu. Agha obodo e nwere na Spen alụworị ruo ihe dị ka otu afọ mgbe òtù ndị agha nke Ọchịagha Franco, bụ́ ndị na-alụ agha maka nnwere onwe, kpọrọ ya maka ije agha. N’afọ bu ụzọ, e mewo Antonio baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ gụwokwa ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́ na ndị ohu Chineke kwesịrị ịnọgide na-anọpụ iche nakwa na ha agaghịdị amụta agha. (Aịsaịa 2:4; Jọn 17:16) Ebe ọ na-achọghị ịghọ onye soja wee gbuo ụmụ amaala ibe ya, Antonio nwara ịgbaga France. Ma e jidere ya, kpọgakwa ya n’ogige ndị agha dị na Jaca, Huesca, nke dị nso n’ókè mba France.

Òtù ikpe ndị agha chere ya otu nhọrọ doro anya n’ihu: Ọ bụrụ na ị ghara ịga agha, a ga-egbu gị. Antonio kpebiri irubere Chineke isi. Nwa obere oge tupu e gbuo ya, o degaara nne ya na nwanne ya nwanyị, bụ́ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, akwụkwọ ozi na-esonụ:

“E jidewo ma maa m ikpe ọnwụ n’ekweghị ka m zara ọnụ m. N’abalị taa, agaghịzi m adị ndụ n’ụwa a. Unu enwela mwute ma ọ bụ kwaa ákwá . . . , n’ihi na erubeworo m Chineke isi. Ka o sina dị, ọ dịghị ezigbo ihe funahụrụ m, n’ihi na ọ bụrụ uche Chineke, aga m ebi ndụ ọhụrụ, nke kakwa mma. . . . Ahụ́ ruru m nnọọ ala ka awa ikpeazụ m na-eru nso. Biko naranụ ibi ọma ikpeazụ nke onye òtù ezinụlọ unu nke hụrụ unu n’anya n’ezie.” *

Ndị agha atọ kọrọ na mgbe a na-aga igbu Antonio, ọ nọ na-abụ abụ otuto nye Jehova. Chineke na Ọkpara ya na-ahụ àjà ndị dị otú ahụ. Anyị pụrụ ijide n’aka na Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Antonio, ga-enweta ụgwọ ọrụ ha site ná mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Akwụkwọ ozi Antonio, nke e chekwara ruo ọtụtụ iri afọ n’ebe ndebe ihe ochie nke ndị agha Spen, erughị nne ya aka ma ọlị.