Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Teta! Zọpụtara Ndụ M!”

“Teta! Zọpụtara Ndụ M!”

Teta! Zọpụtara Ndụ M!”

Ndị na-ebipụta Teta! natara akwụkwọ ozi ekele sitere n’Ịtali. Akụkụ ya ụfọdụ na-agụ, sị:

“Agụwo m Teta! ruo afọ 40, enwekwara m mmasị n’otú ọ na-esi ede banyere isiokwu dịgasị iche iche. N’oge na-adịbeghị anya, anọ m na-arụ ọrụ mgbe afọ na obi malitere igbu m mgbu nke ukwuu. Ekpebiri m ịlawa, ma mgbe ihe mgbu ahụ malitere nke ugboro abụọ, amatara m ihe na-eme m. Echetara m nnọọ otu isiokwu dị na Teta! bụ́ nke kọwara mgbaàmà nke nkụchi obi. * Ekpebiri m ịga ụlọ ọgwụ. M ka nọ n’ọnụ ụlọ nchere mgbe isi m kụdara n’otu akụkụ, m wee tụbọọ. A gwara m banyere nke a n’echi ya n’ọnụ ụlọ a na-enye nlekọta kpụ ọkụ n’ọnụ.

“Ndụ m dị taa bụ n’ihi ime ihe ngwa ngwa nke ndị dọkịta nwere nkà. Ma ekele aghaghịkwa ịgara magazin unu, bụ́ nke nyere ihe ọmụma nke nyeere m aka ime mkpebi ezi uche dị na ya ịga ụlọ ọgwụ. Teta! zọpụtara ndụ m!”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Lee mbipụta anyị nke December 8, 1996, peeji nke 6.