Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Chebe Ụmụ Gị

Ụzọ Isi Chebe Ụmụ Gị

Ụzọ Isi Chebe Ụmụ Gị

“Ọ bụ ndị mụrụ ụmụ kasị nọrọ n’ọnọdụ dị mma ichebe ụmụaka pụọ n’iji ihe na-eri ahụ́ eme ihe. Ha aghaghị isetịpụrụ ụmụ ha ezi ihe nlereanya, na-enyekwa ha ihe ọmụma.”—DONNA SHALALA, ODEAKWỤKWỌ NKE ỤLỌ ỌRỤ NA-AHỤ MAKA AHỤ́ IKE NA IJERE ỌHA OZI NA UNITED STATES.

DỊ KA nne ma ọ bụ nna, i nwere òkè kasị mkpa ị ga-ekere n’ọgụ ahụ a na-alụso iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ọ dị mwute na ọ bụghị ndị nne na nna nile pụrụ ịghọta ókè ọrụ ahụ dịruru ná mkpa. “Papa m na-ejikarị ọrụ n’aka,” ka Ireneu, bụ́ onye ntorobịa si Brazil, na-echeta. “Anyị na ya na-enwe nanị obere mkparịta ụka. Ọ dịtụbeghị mgbe o nyere anyị ndụmọdụ banyere ọgwụ ọjọọ.”

N’ụzọ dị iche, tụlee ihe Alecxandros, bụ́ onye ntorobịa ọzọ si Brazil, na-echeta: “Mgbe a na-egosi ihe omume banyere ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ na TV, papa m na-akpọbata mụ na ụmụnne m ndị nwoke n’ime ụlọ ka anyị wee kirie ha. Ọ na-egosi anyị ọnọdụ jọgburu onwe ya ndị ahụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ nọ na ya n’ihi ojiji ha na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji ohere ahụ ajụ anyị ma ọ̀ dịwo ndị ntorobịa ọzọ anyị hụrụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ọ na-esi otú ahụ adọ anyị aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ndị dị n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.”

Ì sorowo ụmụ gị kwurịta ihe ize ndụ ndị dị n’ọgwụ ọjọọ? Iji mee otú ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i nweta ihe ọmụma n’onwe gị banyere nke a. Nne na nna bụ́ Ndị Kraịst pụrụ inyere ụmụ ha aka ịghọta na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-emerụ ha ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Bible na-agba anyị ume idebe ahụ́ anyị ọcha pụọ ná mmerụ nile, ma nke anụ ahụ́ ma nke ime mmụọ. (2 Ndị Kọrint 7:1) Mmadụ isoro ụmụ ya na-enwe ọmụmụ Bible chiri anya pụrụ ịbụ ụzọ dị irè isi chebe ha. *

“Enyi A Pụrụ Ịtụkwasị Obi”

Ọ dịkwa mkpa ka gị na ụmụ gị malite inwe mmekọrịta a pụrụ ịtụkwasị obi. Jehova bụ “enyi a pụrụ ịtụkwasị obi” nke ụmụ ya ndị nọ n’elu ala. (Jeremaịa 3:4, NW) Ị̀ bụ enyi a pụrụ ịtụkwasị obi nke nwa gị? Ị̀ na-ege nwa gị ntị n’ezie? Nwa gị ọ̀ na-enwe ahụ́ iru ala mgbe ọ na-akọrọ gị nsogbu ya? Ị̀ na-adị ngwa ịkatọ ya karịa ka ị na-adị n’ịja ya mma? Wepụta oge iji mata nwa gị. Ò nwere ndị enyi? Olee ndị ha bụ? E kwuwerị, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Atụla egwu ịkpara ya ókè ọ na-agaghị agafe ma ọlị ma ọ bụ inye ịdọ aka ná ntị n’ụzọ ịhụnanya. Bible na-ekwu, sị: “Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-emekwa ka i zuo ike; ee, ọ ga-enye mkpụrụ obi gị ihe ụtọ.”—Ilu 29:17.

Ọzọkwa, eledala ihe ize ndụ ndị nwa gị na-eche ihu anya. Ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ iche n’ụzọ ejighị ihe kpọrọ ihe na ebe ọ bụ na ụmụ ha si n’ezinụlọ a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu, ha abụghị nnọọ ụdị ndị ga-etinye aka n’ọgwụ ọjọọ. Ma, Dr. José Henrique Silveira, na-akọwa, sị: “Ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-enwe mmasị n’imeta ụmụ nke ndị a ma ama enyi n’ihi na ọ na-ewetara ha uru.” Ee, ọ bụrụ na e nwee ike ịrabanye onye ntorobịa a na-akwanyere nnọọ ùgwù n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ndị ọzọ na-eto eto pụrụ nnọọ ịgbaso ihe nlereanya ya.

N’ihi ya, lee ihe anya otú ha dị n’ezie. Mata ụfọdụ n’ime mgbaàmà ndị mbụ na-egosi na mmadụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Dị ka ihe atụ, nwa gị ọ̀ malitewo na mberede ịnọrọ onwe ya, inwe ịda mbà n’obi, inwe obi ọjọọ, ma ọ bụ ime isi ike? Ò kewapụwo onwe ya n’ebe ndị enyi ya mbụ ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ ya nọ n’ụzọ a na-apụghị ikwu ihe kpatara ya? Mgbe ahụ, ọ pụrụ ikwesị ekwesị ka i chebara ya echiche.

N’ụzọ dị mwute, n’agbanyeghị mgbalị kwesịrị ịja mma ndị nne na nna na-etinye, ụfọdụ ndị na-eto eto ka na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’ihi nrụgide. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na nwa gị emee otú ahụ?

Mgbe Onye Ntorobịa Na-eji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe

“Nwanne m nwoke ejiwo ọgwụ ọjọọ mee ihe ruo ọtụtụ ọnwa,” ka Ireneu na-ekwu, “tupu ndị mụrụ m achọpụta ya. Ebe ọ bụ na ha echetụbeghị na otu n’ime ụmụ ha pụrụ ịghọ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ otu ụbọchị, mmeghachi omume mbụ ha bụ ịtụ egwu. Na mbụ, nanị ihe papa m chere na ya pụrụ ime bụ iji aka ike taa nwanne m nwoke ahụhụ.”

Mgbe ndị mụrụ ụmụ chọpụtasịrị na nwa ha na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, mmeghachi omume mbụ ha yikarịrị ka ọ̀ ga-abụ iwe iwe, inwe nkụda mmụọ, na inwe mmetụta nke ịbụ onye na-emezughị ihe a chọrọ. Otú ọ dị, akwụkwọ ihe ọmụma nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mmụta na United States na-ebipụta na-adụ ọdụ, sị: “Atụla egwu! Atakwala onwe gị ụta. Ihe dị mkpa ugbu a bụ inwe obi iru ala [na] ịchọpụta ihe na-emenụ. . . . Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe bụ àgwà a pụrụ igbochi egbochi. Ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ́ bụ ọrịa nwere ngwọta.”

Ee, nwee obiọma ma kwụsie ike ka ọnọdụ ahụ ghara ịka njọ. Iwe iwe ma ọ bụ inwe nkụda mmụọ gabiga ókè pụrụ ime ka nwa gị ghara inwere onwe ya ngwa ngwa. Ọzọkwa, ị chọrọ inyere nwa gị aka itolite ma ghọọ onye a pụrụ ịtụkwasị obi nke pụrụ ime mkpebi n’onwe ya. N’ihi ya, wepụta oge jiri obi eziokwu soro onye ntorobịa ahụ tụgharịa uche iji nyere ya aka ịhụ abamuru ndị dị n’ejighị ọgwụ ọjọọ eme ihe. Gbalịa iji ajụjụ chọpụta ihe dị n’obi nwatakịrị ahụ gahiere ụzọ, dịkwa njikere ịṅa ntị.—Ilu 20:5.

Ireneu gara n’ihu icheta, sị: “Ka e mesịrị, nne na nna m gbanwere ụzọ ha si emeso nwanne m nwoke ma malite inye ya ndụmọdụ, na-akpara ya ókè ebe ndị ọ pụrụ ịgadebe, na-agbanwe oge o ji aga ịmụ ihe iji mee ka ọ ghara ịdị na-ezute otu ụmụ akwụkwọ ibe ya ahụ kwa ụbọchị. Ha malitere ịchịkwa mkpakọrịta ya na ilebakwuru ya na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ anyị anya.”

Tụlee otú ụfọdụ ndị nne na nna ndị ọzọ siworo mee ihe banyere ọnọdụ ahụ n’ụzọ gara nke ọma mgbe ha chọpụtara na ụmụ ha na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe.

Ime Ihe Banyere Ọnọdụ ahụ n’Ụzọ Gara nke Ọma

“Ọ bụ ihe kasị njọ metụworo anyị,” ka Marcelo, bụ́ nwoke bi na São Paulo, Brazil, na-akọwa. “Mụ na nwunye m achọpụtaghị ihe ọ bụla dị njọ n’àgwà ụmụ anyị ndị nwoke abụọ na-eto eto. Ọtụtụ ugboro, ha sooro otu ìgwè ndị ọzọ na-eto eto bụ́ ndị anyị chere na anyị maara nke ọma na-eri nri n’ụlọ nri. Obi gbawara anyị mgbe otu enyi anyị gwara anyị na ụmụ anyị ndị nwoke abụọ na-ese wii wii. Otú ọ dị, mgbe anyị jụrụ ha ma ha na-ese wii wii, ha kwetara ozugbo.”

Olee ihe Marcelo mere banyere omume ụmụ ya ndị nwoke? “Mụ na nwunye m ezochighị obi mgbawa anyị nwere,” ka ọ na-ekweta. “Ma ọ bụ ezie na anyị katọrọ ojiji ha na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, anyị eleghị ha anya dị ka ndị na-abaghị uru. Anyị kwekọrịtara na site n’oge ahụ gawa, nzube anyị ga-abụ inyere ụmụ anyị nwoke aka inwere onwe ha pụọ n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Anyị kwupụtakwara ihe anyị na-ezube ime, ha abụọ nabatakwara ọnọdụ ndị anyị nyere ha. Ha ga-aga n’ihu n’ihe ọmụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ma nọgide na-arụ ọrụ. Ha agaghịzi na-apụ nanị ha. Anyị gosipụtara ịhụnanya anyị nwere n’ebe ha nọ kwa ụbọchị, ọ bụghị nanị n’oge ndị pụrụ iche. Ebe ọ bụ na m na-arụ ọrụ dị ka owu ụlọ, ana m akpọrọ ha aga ọrụ ruo ókè m nwere ike. Anyị malitere inwekwu obi ụtọ, na-etinyekwu oge n’ikwu banyere ọdịnihu na mkpa ọ dị inwe ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru ná ndụ.” Marcelo na nwunye ya si n’ụzọ dị otú ahụ nwee ike inyere ụmụ ha ndị nwoke aka ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.

Tụleekwa ahụmahụ nna ọzọ si Brazil. Nwa ya, bụ́ Roberto, na-echeta, sị: “Mgbe papa m chọpụtara na nwanne m nwoke na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, kama iji iwe baara ya mbá ma ọ bụ nye ya ahụhụ, papa m gosipụtara na ya bụ enyi ya ma nweta obi nwanne m. Ọ bịara mata ndị enyi nwanne m nwoke nakwa ebe ndị ọ na-agakarị, ọ malitekwara ime ka nwanne m nwoke ghọta na ọgwụ ọjọọ na ndị enyi dị otú ahụ adịghị ya mkpa. Papa m gwara ya na ya achọghị ichu onwe ya ụra ọtụtụ abalị na-achọ ya.” Ná mgbalị ya ime ka anya doo onye ntorobịa ahụ nwere nsogbu, nwunye nna ya nyere di ya nkwado zuru ezu. Ha abụọ kwekọrịtara na ha aghaghị ime ihe ozugbo ma kpebie inyere ya aka n’ụlọ.—Lee igbe bụ́ “Inweta Enyemaka.”

Ike Agwụla Gị!

Ịzụlite ezinụlọ ‘n’oge a pụrụ iche nke siri ike obibi’ pụrụ ịkpata ike ọgwụgwụ ma bụrụ nke siri ike. (2 Timoti 3:1) Ma, i kwesịghị ileghara mkpa mmetụta uche na nke ime mmụọ nke gị onwe gị anya. (Matiu 5:3) Lee ka okwu ndị dị n’Ilu 24:10 si bụrụ eziokwu: “Ọ bụrụ na ị dị umengwụ n’ụbọchị ahụhụ, ike gị pere mpe.” Ị pụrụ inweta nnọọ ume site n’isoro ezi Ndị Kraịst na-akpakọrịta. Ná nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, ị pụrụ inweta nkwado na agbamume.—Ndị Hibru 10:24, 25.

N’ezie, izi ezinụlọ gị inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ pụrụ ịbụ ihe ga-akasị chebe ha pụọ n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. N’ezie, Chineke adịghị amanye ndị ntorobịa ịgbaso ụzọ ọ bụla ná ndụ. Ma ọ na-enye ndụmọdụ a pụrụ ịdabere na ya. Dị ka e dekọrọ n’Abụ Ọma 32:8, Chineke na-ekwu, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.” Ebe ọ bụ Nna nke eluigwe nke na-ahụ n’anya, Chineke chọrọ ichebe ndị na-eto eto pụọ ná mmebi nke mmetụta uche, anụ ahụ́, na nke ime mmụọ. (Ilu 2:10-12) Jide n’aka na Chineke ga-akwadokwa ma nyere ndị nne na nna kpebisiri ike ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova,” aka.—Ndị Efesọs 6:4.

Ka o sina dị, nrụgide nke ịzụlite ụmụaka n’ọnọdụ e nwere taa pụrụ isi ike mgbe ụfọdụ. Ọ̀ dị olileanya ọ bụla e nwere na a ga-agwọta ya n’isi nso?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ndịàmà Jehova ebipụtawo ihe ọmụma pụrụ inyere ndị mụrụ ụmụ aka isoro ụmụ ha kwurịta isiokwu ndị dị ka ihe ize ndụ ndị dị n’ọgwụ ọjọọ. Dị ka ihe atụ, lee isi nke 33 na nke 34 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

“Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe bụ àgwà a pụrụ igbochi egbochi. Ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ́ bụ ọrịa nwere ngwọta.”—ỤLỌ ỌRỤ NA-AHỤ MAKA MMỤTA NA UNITED STATES

[Igbe dị na peeji nke 6]

Inweta Enyemaka

Ụfọdụ ndị nne na nna pụrụ ikpebi na ọ ga-akasị mma ka nwa ha na-eto eto kwụsị iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe n’okpuru nlekọta nke ndị ọrụ ahụ́ ike. Ụdị ọgwụgwọ nke nne na nna ga-achọ kpọmkwem bụ ihe ha ga-ekpebiri onwe ha. Ma, ebe ọ bụ na ọdịdị nke nlekọta a na-enye n’ụlọ ahụ́ ike na-akpụzigharị uche na-adịgasị nnọọ iche iche, ọ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ emee nchọpụta nke ọma tupu ha ekweta ka e nweta ọgwụgwọ n’ụlọ ahụ́ ike. Dị ka dibịa na-agwọ ọrịa uche bụ́ Arthur Guerra de Andrade, bụ́ prọfesọ na Mahadum São Paulo dị na Brazil, si kwuo, ọ bụ nanị pasent 30 nke ndị a gwọrọ n’ụlọ ahụ́ ike dị iche iche na-enwere onwe ha pụọ n’iri ahụ́ nke ọgwụ ọjọọ. N’ihi ya, ndị mụrụ ụmụ aghaghị inwe mmasị dị ukwuu n’ime ka ụmụ ha nwere onwe ha, ọbụnadị mgbe ndị ọkachamara n’ihe banyere nkà ọgwụ na-enyere ha aka.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Enyemaka Maka Ndị Na-agbalị Ịkwụsị Iji Ọgwụ Ọjọọ Eme Ihe

Ị̀ bụ onye ntorobịa nke na-agbalị ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe? Ya bụrụ otú ahụ, ị ga-achọpụta na ịgụ Bible na itinye ihe ị gụrụ n’omume pụrụ inyere gị aka ná mgbalị ị na-eme ịkwụsị ya. Ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe na-enye aka karịsịa ịgụ akwụkwọ Abụ Ọma, ebe ọ bụ na o dekọrọ ọtụtụ n’ime mmetụta ndị na-egbu mgbu ị pụrụ ịdị na-enwe ugbu a. Ikpegara Chineke ekpere sitere n’obi, ịgwa ya ihe dị gị nnọọ n’obi, ga-enyekwara gị aka. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ị ga-amalite inwe mmetụta na ọ na-eche banyere gị n’ezie nakwa na ọ chọrọ ka i nwee ihe ịga nke ọma. Ma, ebe ọ bụ na Chineke adịghị amanye mmadụ ime ihe ga-emebi nnwere onwe ya ime nhọrọ, ọ dị oké mkpa ka ọ bụrụ ọchịchọ gị n’ezie ịkwụsị iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nwetara nkwado Chineke ọtụtụ ugboro, kwuru, sị: “Elesiri m anya Jehova ike; o wee tọọrọ m ntị Ya n’ala, nụ ntiku m. O wee mee ka m si n’olulu mbibi, n’apịtị nke ala ụrọ, rịgopụta; o wee mee ka ụkwụ m abụọ guzo n’elu nkume dị elu, Ọ na-eme ka nzọụkwụ m nile guzosie ike.” (Abụ Ọma 40:1, 2) N’otu ụzọ ahụ taa, Chineke na-akwado ndị nwere ọchịchọ idebe onwe ha ọcha na ijere ya ozi.

[Foto dị na peeji nke 5]

“Papa m dọrọ anyị aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ndị dị na ya”—Alecxandros

[Foto dị na peeji nke 8]

Wepụta oge iji dọọ ụmụ gị aka ná ntị banyere ihe ize ndụ anụ ahụ́ na nke ime mmụọ ndị dị n’iji ọgwụ ọjọọ eme ihe

[Foto dị na peeji nke 8]

Mata ndị ha na nwa gị na-akpakọrịta

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ime ihe banyere ọnọdụ ahụ n’ụzọ dị jụụ pụrụ igbochi ime ka ọnọdụ dị njọ kawanye njọ