Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Isi Mee Ka Ụra Gị Ka Mma

Ụzọ Isi Mee Ka Ụra Gị Ka Mma

Ụzọ Isi Mee Ka Ụra Gị Ka Mma

NSOGBU NDỊ METỤTARA ỤRA abụghị ihe ọhụrụ. Laa azụ na narị afọ nke ise T.O.A., otu onye na-eje ozi n’obí Eze Ahasuerọs nke Peasia dere na n’otu abalị, “ụra eze fepụrụ n’anya ya.”—Esta 6:1.

Taa, ọ na-esiri ọtụtụ nde mmadụ ike ihi ụra nke ọma. Dị ka otu onye Brazil bụ́ ọkachamara n’ihe banyere ụra, bụ́ Rubens Reimão, si kwuo, ihe dị ka pasent 35 nke ndị bi n’ụwa na-enwe nsogbu ehighị ụra nke ọma. Dr. David Rapoport nke nọ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Nsogbu Ihi Ụra na Mahadum New York kọwara nsogbu ehighị ụra nke ọma dị ka “otu n’ime nsogbu ndị kasị njọ nke na-agbasa ngwa ngwa ná mmalite nke narị afọ a.”

Nke ka njọ bụ na ọtụtụ ndị na-enwe nsogbu ehighị ụra nke ọma na-ata ahụhụ ahụ n’amaghị ihe mere ha ji enwe nsogbu ahụ. Dị ka ndị nnyocha nọ na Mahadum Gọọmenti Etiti dị na São Paulo, Brazil si kwuo, nanị pasent 3 nke ndị na-enwe nsogbu ehighị ụra nke ọma ka a na-achọpụta na ha nwere nsogbu ahụ n’ezie. Ọtụtụ ndị na-ewere nnọọ ehighị ụra nke ọma dị ka ihe ha na-apụghị izere ezere ma nọrọ nnọọ na-enwe ahụ́ mgbakasị ma na-ero ụra.

Mgbe O Siri Ike Ihi Ụra

Ịdagharị na ịtụgharị n’elu ihe ndina ruo ọtụtụ awa, na-ele anya zii, ebe ndị ọzọ nile na-ehiri onwe ha ụra n’udo, abụtụghị ahụmahụ dị ụtọ. Ma, inwe nsogbu ehighị ụra nke ọma mgbe ụfọdụ ruo ụbọchị ole na ole abụghị ihe ọhụrụ, ọ bụkwa nchekasị na ihe agazighị agazi ná ndụ na-akpatakarị ya. Otú ọ dị, mgbe nsogbu ehighị ụra nke ọma na-ekweghịzi akwụsị akwụsị, ọ pụrụ ịbụ n’ihi nsogbu mmetụta uche ma ọ bụ nke ahụ́ ike, ọ dịkwa mkpa ịchọ enyemaka ndị ọrụ ahụ́ ike.—Lee igbe dị n’elu.

Ọ̀ pụrụ ịbụ na ị na-enwe nsogbu ihi ụra? Ọ bụrụ na i dejupụtasịa fọm ajụjụ dị na peeji nke 17, wee kwubie na i nwere nsogbu ihi ụra, ọ dịghị mkpa ka i nwee obi nkoropụ. Ịghọta na ọ dị gị mkpa inweta enyemaka bụ ihe kasị mkpa n’ịgwọta nsogbu ihi ụra. Dị ka ọkà n’ọrịa akwara bụ́ Geraldo Rizzo si kwuo, a pụrụ ịgwọta pasent 90 nke ndị na-enwe nsogbu ehighị ụra nke ọma.

Otú ọ dị, iji nweta ọgwụgwọ kwesịrị ekwesị, ọ dị mkpa ịmara kpọmkwem ihe na-akpata nsogbu ehighị ụra nke ọma ahụ. Nnyocha ahụ́ ike a kpọrọ polysomnogram enyewo aka n’ịchọpụta na ịgwọ ọtụtụ nsogbu ihi ụra.—Lee igbe dị n’okpuru.

Otu n’ime ihe ndị kasị akpata nsogbu na-adịghị ala ala nke ehighị ụra nke ọma metụtara ikwo ụra. Ọ bụrụ na gị na onye na-ekwo ụra ehitụwo ụra, ị ga-amara na nke a pụrụ nnọọ ịdị na-agbakasị ahụ́. Ikwo ụra pụrụ ịbụ mgbaàmà nke nsogbu nke mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra, bụ́ nke mkpachi nke akpịrị na-egbochi onye na-ehi ụra ikunye ikuku n’akpa ume ya ruo nwa oge. Nzọụkwụ ndị mbụ n’ịgwọ nsogbu nke mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra gụnyere ifelata, izere ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya, na izere ọgwụ ndị na-akụnwụ ahụ́. Ndị ọkachamara pụkwara ịtụ aro ka a ṅụọ ụdị ọgwụ ụfọdụ kpọmkwem ma ọ bụ ka e jiri ngwá ndị a na-afanye n’ezé ma ọ bụ ígwè ọrụ na-adịghị anyụ anyụ nke na-ekunye ikuku n’oghere imi, na-eme ihe. *

N’ọnọdụ ndị dị njọ karị, ọ pụrụ ịdị mkpa ka a waa onye ahụ akpịrị, agbà, ire, ma ọ bụ imi iji mee ka ọ dịkwuo mfe ikuru na ikupụ ume.

Ụmụaka pụkwara inwe nsogbu ehighị ụra nke ọma. Mgbaàmà nke ichu onwe onye ụra pụrụ ịpụta ìhè n’ụlọ akwụkwọ—enwetaghị akara dị elu n’ụlọ akwụkwọ, ahụ́ erughị ala, etinyeghị uche n’ihe—ikekwe, ọ pụrụ ime ka a ghara ịchọpụta ihe ọ bụ n’ụzọ ziri ezi, e wee kpọọ ya oké aghara.

Ụmụaka ụfọdụ adịghị achọ ihi ụra, ha na-ahọrọ ịbụ abụ, ikwu okwu, ma ọ bụ ige onye na-akọ akụkọ ntị—ihe ọ bụla ma e wezụga ịlakpu ụra. Nke a pụrụ nnọọ ịbụ ụzọ ha si achọ ka nne ma ọ bụ nna ha lebara ha anya. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ, ụjọ ihi ụra pụrụ ịdị na-atụ nwatakịrị n’ihi ịrọ nrọ ọjọọ ugboro ugboro bụ́ ndị metụtara ihe nkiri sinima ndị na-emenye egwu, akụkọ ụwa ndị kọrọ banyere ime ihe ike, ma ọ bụ esemokwu ndị e nwere n’ebe obibi ha. Site n’ịkwalite ọnọdụ udo na nke ịhụnanya n’ebe obibi, ndị nne na nna pụrụ inye aka mee ka e zere nsogbu ndị a. N’ụzọ doro anya, e kwesịrị ịchọ enyemaka ndị ọrụ ahụ́ ike ma ọ bụrụ na mgbaàmà ndị ahụ adịgide. Obi abụọ adịghị ya na ụra abalị dị mma dị ụmụaka mkpa dịkwa nnọọ ka ọ dị ndị okenye.

Ụzọ Isi Hie Ụra Abalị nke Ọma

Eri ọtụtụ narị afọ, ọ bụwo ihe a ma ama na ezigbo ụra abalị adịghị abịara onwe ya. Ihi ụra nke ọma dabeere n’ọtụtụ ihe ndị ọzọ ma e wezụga nanị ịchịkwa nchekasị na nrụgide.

Ihi ụra abalị nke ọma bụ ụzọ ndụ. Ọ gụnyere inwe mmega ahụ́ n’oge kwesịrịnụ n’ụbọchị. Imega ahụ́ n’ụtụtụ ma ọ bụ n’ehihie pụrụ inye aka ime ka ụra tụọ mmadụ mgbe ọ lakpuru. Ma mmadụ inwe mmega ahụ́ n’oge na-adịghị anya tupu ọ lakpuo pụrụ imetụta ụra ya.

Ihe nkiri sinima ndị na-akpali akpali ma ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ ndị na-adọrọ mmasị pụkwara inwe mmetụta na-akpali akpali. Tupu ị lakpuo ụra, ọ pụrụ ịka mma ịgụ ihe na-akụjụ obi, ige egwú ndị dị jụụ, ma ọ bụ iji mmiri dị ṅara ṅara saa ahụ́.

Ndị ọkachamara na-ekwu na ị pụrụ ịkụziri ụbụrụ gị ijikọ ihe ndina na ụra site n’idina ala nanị mgbe ị chọrọ ihi ụra n’ezie. Ọ pụrụ isikwuru ndị na-anọ n’elu ihe ndina eri ihe, amụ ihe, arụ ọrụ, ekiri TV, ma ọ bụ egwu egwuregwu vidio ike ihi ụra.

Ịkwadebe ahụ́ gị ihi ụra na-edò ahụ́ gụnyekwara ịkpachara anya banyere ihe oriri gị. Ọ bụ ezie na ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya na-eme mmadụ iro ụra, ha pụrụ n’ezie ibelata ịdị mma nke ụra gị. E kwesịrị izere ihe ọṅụṅụ ndị e ji kọfị, tii, koko, chocolate, na cola mee n’abalị n’ihi na ha na-eme ka a mụrụ anya. N’aka nke ọzọ, ọ̀tụ̀tụ̀ dị obere nke mango, ji nwannu, unere, osikapa, akịdị, ma ọ bụ mkpụrụ akụ́kụ́ na-akwalite mmepụta nke mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ serotonin, n’ihi ya kwa, ha pụrụ ịkpata ụra. Ma kpachara anya: Iri nri buru ibu mgbe oge garala n’abalị pụrụ imerụ ahụ́ dị nnọọ ka iburu agụụ lakpuo ụra.

Gburugburu ebe anyị na-ehi ụra dị mkpa dị nnọọ ka ihe ndị anyị na-eme tupu anyị ehie ụra. Ebe jụrụ oyi otú dị mma, ọnụ ụlọ gbara itiri na nke ụzụ na-adịghị na ya, nakwa matarasị na pilo ndị na-eme ka ahụ́ ruo ala, na-eme ka mmadụ hie ụra abalị nke ọma. N’eziokwu, i nwee ahụ́ iru ala otú ahụ, ọ pụrụ isiri gị ike ibili n’ụtụtụ echi ya. Ma cheta na ịnọ n’ihe ndina karịa ka o kwesịrị, ọbụna ná ngwụsị izu, pụrụ ịkpaghasị usoro ihi ụra gị ma mee ka o siere gị ike karị ihi ụra n’abalị na-eso ya.

N’ezie, ị gaghị ama ụma mebie akụkụ ahụ́ gị ndị dị oké mkpa. Ụra dị nnọọ mkpa otú ahụ, ọ bụ akụkụ nke ndụ nke a na-ekwesịghị ileghara ma ọ bụ ledaa anya. E kwuwerị, anyị na-eji otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndụ anyị ehi ụra. Ị̀ pụrụ ime ka ụzọ i si ehi ụra ka mma? Gịnị ma ị malite n’abalị a!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Onye nwere nsogbu ahụ na-ekpu otu obere ihe n’ihu ehi ụra, bụ́ nke na-esi n’otu tuubu a kwụnyere n’otu ígwè ọrụ enweta ikuku. Ikuku a na-eme ka okpo iku ume ghere oghe ma meekwa ka onye nwere nsogbu ahụ na-eku ume otú o kwesịrị.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

Isi Ihe Ndị Na-akpata Nsogbu Ehighị Ụra Nke Ọma

IHE NDỊ METỤTARA AHỤ́ IKE: Ọrịa Alzheimer; nsogbu nke mkpachi okpo iku ume n’oge a na-ehi ụra; nsogbu nke ụkwụ anọghị jii; ọrịa Parkinson; nsogbu nke imegharị ụkwụ na aka site n’oge ruo n’oge, bụ́ mmegharị nke na-eme ka mmadu teta n’ụra mgbe ụfọdụ; ụkwara ume ọkụ; ọrịa obi na nke eriri afọ.

IHE NDỊ METỤTARA UCHE: ịda mbà n’obi, nchegbu, oké ụjọ, nsogbu àgwà nrụgide na-eri isi, nsogbu nrụgide mgbe ọdachi gasịrị.

IHE NDỊ METỤTARA GBURUGBURU EBE OBIBI: ìhè, ụzụ, okpomọkụ, oyi, matarasị na-adịghị eme ka ahụ́ ruo mmadụ ala, di ma ọ bụ nwunye nke na-atụgharị mgbe nile n’elu ihe ndina.

IHE NDỊ ỌZỌ NA-AKPATA YA: aṅụrụma na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, mmetụta na-adịghị mma nke ọgwụ ụfọdụ.

[Igbe dị na peeji nke 16]

Ịchọpụta Nsogbu Ihi Ụra

A na-enwe usoro ile ahụ́ dị iche iche iji dekọọ usoro ihi ụra nke onye nwere nsogbu ihi ụra n’oge ọ na-ehi ụra n’ọnọdụ ndị dị nnọọ mma ruo n’ókè o kwere mee. A na-eji ngwá ọrụ dị iche iche eme ihe n’inyocha ọnọdụ dịgasị iche iche.

▪ E nwere nke na-achọpụta nzirịta ozi nke akwara ndị dị n’ụbụrụ, nke e jikwa achọpụta ụdị ụra onye ahụ nọ na ya nakwa ókè o hiruru nkebi ụra nke ọ bụla.

▪ Ọzọ na-edekọ otú anya si na-emegharị ná nkebi ụra mgbe anya na-ama jijiji.

▪ Nke ọzọ na-enyocha ọ̀tụ̀tụ̀ uru ahụ́ ndị dị na ntì nakwa n’ụkwụ ji esekọta ná nkebi ụra mgbe anya na-ama jijiji.

▪ Otu ngwá ọrụ na-enyocha ọ̀tụ̀tụ̀ obi ji eti eti n’abalị dum.

▪ Ngafe nke ikuku mgbe a na-eku ume nakwa mmegharị ahụ́—A na-atụ nke a n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’idekọ otú ikuku si agafe n’imi nakwa n’ọnụ tinyere mmegharị nke afọ na ǹgụ̀.

▪ Njupụta nke hemoglobin gwakọtatụrụ n’oxygen—Ịchọpụta ókè oxygen dị n’okpo ọbara dị iche iche haruru, bụ́ nke a na-eji ngwá ọrụ a na-akpọ oximeter eme, bụ́ nke a na-akwụnye ná mkpịsị aka onye nwere nsogbu ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 17]

ỊCHỌPỤTA Ọ̀TỤ̀TỤ̀ IRO ỤRA

Olee ohere e nwere na ụra ga-eburu gị n’ọnọdụ ndị a kpọtụrụ aha n’okpuru ebe a? N’iji nọmba ndị na-esonụ mee ihe, kaa ihe gburugburu azịza gị, e mesịzie, gụkọta ọnụ ọgụgụ ole i nwetara.

Ụra agaghị eburu gị ma ọlị

Ohere dị nta nke ụra iburu gị

Ohere na-adịchaghị ukwuu nke ụra iburu gị

Ohere dị ukwuu nke ụra iburu gị

a Ịnọdụ ala na-agụ ihe 0 1 2 3

b Ikiri TV 0 1 2 3

ch Ịnọdụ ala n’emeghị ihe ọ bụla n’ebe ọha mmadụ 0 1 2 3

na-anọ, dị ka n’ọgbọ egwuregwu ma ọ bụ ná nzukọ

d Ịbụ onye e bu n’ụgbọala ruo otu awa 0 1 2 3

n’akwụsịghị akwụsị

e Ịnọdụ jụụ mgbe i risịrị nri ehihie 0 1 2 3

n’aṅụghị mmanya na-aba n’anya

f Idina ala iji zuo ike n’ehihie 0 1 2 3

g Ịnọdụ ala na-agwa mmadụ okwu 0 1 2 3

gb N’ụgbọala, mgbe ị nọ n’ọnọdụ agaghị ihu gaghị azụ 0 1 2 3

Ọnụ Ọgụgụ I Nwetara ․․․․․․․․․․․

Ihe Ọnụ Ọgụgụ I Nwetara Na-egosi

1-6: Ọ dịghị mkpa ichegbu onwe gị

7-8: Ọ dịtụ mma

Ihe gafere 9: Chọọ ndụmọdụ ndị ọrụ ahụ́ ike

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ọ dabeere n’Ihe Ọ̀tụ̀tụ̀ Banyere Ụra nke Ụlọ Ọgwụ Epworth mepụtara, bụ́ nke sitere n’aka Mahadum Stanford, California, U.S.A.

[Foto dị na peeji nke 15]

Mmadụ ichu onwe ya ụra pụrụ ịdị ize ndụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Mmega ahụ́, ịgụ akwụkwọ, na nri dị mfe pụrụ ime ka ụra gị ka mma