Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya?

Gịnị Bụ Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya?

Echiche nke Bible

Gịnị Bụ Ịhụ Ihe Onwunwe n’Anya?

A MỤKỌTARA ụmụ mmadụ na ikike ịbụ ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe nakwa ịbụ ndị nwere mkpa nke ife Chineke ofufe. Otú ọ dị, e ji ihe ndị a na-ahụ anya kee mmadụ, o nwekwara mkpa anụ ahụ́ na ikike ịnụ ụtọ ihe onwunwe. Ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ihe onwunwe dị ukwuu. Nke a n’onwe ya ọ̀ bụ ihe àmà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya na nke ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe? N’aka nke ọzọ, ndị dara ogbenye hà yikarịrị ka ha ga-abụ ndị na-adịghị ahụ ihe onwunwe n’anya nakwa ndị nwere mmasị karị n’ihe ime mmụọ?

N’ezie, ị ga-ekweta na ịhụ ihe onwunwe n’anya na-agụnye ihe karịrị nanị inwe akụ̀ na ụba ma ọ bụ ihe onwunwe buru ibu. Tụlee ihe atụ ndị na-esonụ sitere na Bible banyere ihe ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ n’ezie na ụzọ isi zere ihe ize ndụ ndị ọ na-eweta n’iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe.

Ha Nwere Akụ̀ na Ụba na Nsọpụrụ

N’etiti ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible, e nwere ụfọdụ ndị nwere akụ̀ na ụba na nsọpụrụ. Dị ka ihe atụ, Ebreham “bụkwa ọgaranya nke ukwuu n’anụ ụlọ na n’ọlaọcha na n’ọlaedo.” (Jenesis 13:2) A maara Job dị ka onye “dị ukwuu karị ụmụ Ihu anyanwụ nile” n’ihi na o nwere ìgwè anụ ụlọ buru ibu na ọtụtụ ndị ohu. (Job 1:3) Ndị eze Izrel, dị ka Devid na Solomọn, nwere akụ̀ na ụba buru ibu.—1 Ihe E Mere 29:1-5; 2 Ihe E Mere 1:11, 12; Eklisiastis 2:4-9.

E nwere Ndị Kraịst bara ọgaranya n’ọgbakọ nke narị afọ mbụ. (1 Timoti 6:17) A na-akpọ Lidia “onye na-ere ákwà odo odo, onye obodo Taịataịra, nakwa onye na-efe Chineke.” (Ọrụ 16:14) Ihe na-acha odo odo nke e ji esiji ákwà nakwa ákwà ndị e ji ya sijie na-ada oké ọnụ, ọ bụkwa ndị nọ n’ọkwá dị elu ma ọ bụ ndị bara ọgaranya na-azụkarị ha. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ na Lidia n’onwe ya batụrụ ọgaranya.

N’ụzọ dị iche na nke ahụ, ụfọdụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi fee Jehova n’oge Bible dara ezigbo ogbenye. Ọdachi ndị na-emere onwe ha, ihe mberede, na ọnwụ mere ka ezinụlọ ụfọdụ daa ogbenye. (Eklisiastis 9:11, 12) Lee otú ọ na-aghaghị isiworị bụrụ ihe isi ike nye ndị nọ ná mkpa ịhụ ka ndị ọzọ ji akụ̀ na ụba ha ma ọ bụ ihe onwunwe ha na-ekpori ndụ! N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gaara abụworị ihe na-ezighị ezi ha ikwubi na ndị nwere akụ̀ na ụba hụrụ ihe onwunwe n’anya ma ọ bụ ikwubi na ndị na-enweghị akụ̀ na ụba na-ejere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu karị. N’ihi gịnị? Tụlee isi ihe na-akpata ịhụ ihe onwunwe n’anya.

Ịhụ Ego n’Anya

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara ịhụ ihe onwunwe n’anya dị ka “itinyebiga uche ókè n’ihe onwunwe ma ọ bụ ịdị na-ekwu okwu mgbe nile banyere ya kama itinye uche ma ọ bụ ịdị na-ekwu okwu mgbe nile banyere ihe ndị ezi uche dị na ha ma ọ bụ ihe ime mmụọ.” N’ihi ya, ịhụ ihe onwunwe n’anya na-esite n’ọchịchọ anyị, n’ihe ndị anyị na-ebute ụzọ, na n’ihe ndị anyị na-elekwasị anya na ha ná ndụ. Ihe atụ abụọ na-esonụ sitere na Bible na-eme ka nke a dokwuo anya.

Jehova dụsiri Beruk ọdụ ike, bụ́ onye jere ozi dị ka odeakwụkwọ Jeremaịa onye amụma. O yiri ka Beruk ọ̀ dara ogbenye n’ihi ọnọdụ ndị dị na Jeruselem nakwa n’ihi mkpakọrịta chiri anya nke ya na Jeremaịa, bụ́ onye a na-enweghị mmasị n’ebe ọ nọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova kwuru, sị: “Ma gị onwe gị, ị̀ na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? achọla ha.” Ọ pụrụ ịbụ na Beruk malitere ịhụ ihe onwunwe n’anya, malite itinyebiga uche ókè n’akụ̀ na ụba ma ọ bụ ihe onwunwe nke ndị ọzọ. Jehova chetaara Beruk na Ya ga-anapụta ya ná mbibi nke gaje ịbịakwasị Jeruselem, ma na Ya agaghị echebe ihe onwunwe ya.—Jeremaịa 45:4, 5.

Jizọs nyere ihe atụ nke otu nwoke tinyebigara uche ókè n’otu aka ahụ n’ihe onwunwe. Nwoke a lekwasịrị anya n’akụ̀ na ụba ya kama iji ihe o nwere mụbaa ozi ọ na-ejere Chineke. Nwoke ahụ bara ọgaranya sịrị: “M ga-etidasị ụlọ nkwakọba ihe m ma wuo ndị ka ibu, . . . m ga-agwakwa mkpụrụ obi m, sị: ‘Mkpụrụ obi, i nwere ọtụtụ ezi ihe a kpakọbara maka ọtụtụ afọ; tụsara ahụ́, rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mee onwe gị obi ụtọ.’” Jizọs kwuziri, sị: “Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị ezi uche, n’abalị a ka a na-achọ mkpụrụ obi gị n’aka gị. Ònye ga-enwezi ihe ndị ị kwakọbara?’ Otu a ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:16-21.

Gịnị bụ isi ihe dị n’akụkọ abụọ a? Ha na-enyere anyị aka ịhụ na mmadụ ịhụ ihe onwunwe n’anya abụghị n’ihi otú ihe o nwere hà, kama n’ihi na ọ na-edebe ihe onwunwe n’ọnọdụ mbụ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ amaghị ihe nke na-emerụkwa ahụ́, bụ́ ndị na-akwakpu mmadụ ná mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ nile, sitekwa n’ịchụso ịhụnanya nke a e duhiewo ụfọdụ pụọ n’okwukwe, ha ejiriwokwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha aghara aghara.” (1 Timoti 6:9, 10) Ọ bụ ikpebisi ike ịba ọgaranya na ịhụ ihe onwunwe n’anya na-akpata nsogbu dị iche iche.

A Chọrọ Ime Nnyocha Onwe Onye

Ndị Kraịst na-akpachara anya izere ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya n’agbanyeghị ma hà dara ogbenye ma ha bara ọgaranya. Ike nke akụ̀ na ụba dị aghụghọ, ọ pụkwara ịkpagbu ọnọdụ ime mmụọ mmadụ. (Matiu 13:22) Tupu anyị amara ihe na-emenụ, anyị pụrụ iwepụ uche n’ihe ime mmụọ ma na-eche banyere ihe onwunwe, na-arụpụta ihe dị oké njọ.—Ilu 28:20; Eklisiastis 5:10.

N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka Ndị Kraịst nyochaa ihe ndị ha na-ebute ụzọ na ihe ndị ha lekwasịrị anya na ha ná ndụ. Ma mmadụ ọ̀ dara ogbenye ma ọ̀ bara ọgaranya, ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-agbalị ịgbaso ndụmọdụ Pọl nke bụ́ ịtụkwasị olileanya ha “ọ bụghị n’akụ̀ na ụba ndị a na-ejighị n’aka, kama na Chineke, onye na-enye anyị ihe nile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ.”—1 Timoti 6:17-19.