Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ileta Ugbo Unere

Ileta Ugbo Unere

Ileta Ugbo Unere

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SOUTH AFRICA

Ọ NA-AMASỊ m mgbe nile ịra unere. Ejikwa m n’aka na ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-enwe mmasị ịra ya. Ọ bụghị nanị na unere na-atọ ụtọ, kamakwa o nwere vitamin, mineral, na fiber n’ụba. Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere mkpụrụ osisi a na-edozi ahụ́? Na nso nso a, otu onye ọrụ ugbo na nwunye ya gosiri m ụzọ dị ịtụnanya unere si epupụtaghachi.

Tony na Marie, (bụ́ ndị e gosiri foto ha n’elu) na-arụ ọrụ ugbo na Limpopo Province nke South Africa, n’ógbè a na-akpọ Levubu. Ha na-akọ ọtụtụ ihe n’ugbo ha dị hekta 55. Otú ọ dị, ihe bụ́ isi ha ji ya mere bụ ugbo unere. Tony ga-achọ ịgwakwu anyị banyere mkpụrụ osisi a a ma ama.

Uto Ya na Ọnọdụ Ihu Igwe

“Ụdị ala kasị mma,” ka Tony na-akọwa, “na-enwe ụrọ nke ukwuu, ọ dịghịkwa abụ ájá uzuzu ma ọ bụ nke okwute okwute. Ájá ahụ aghaghịkwa ịbami n’ala ma bụrụ nnọọ nke mmiri na-adịghị adọrọ na ya. Unere na-eme nke ọma n’ebe ndị ice na-adịghị ada. N’eziokwu, ha na-eme nke ọma n’ebe ndị e nwere okpomọkụ. Nkezi nke ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ a na-enwe na Levubu n’afọ bụ n’agbata 12 degrees Celsius na 35 degrees Celcius.” Mgbe m jụrụ ya banyere mmiri ozuzo, Tony zaghachiri, sị: “Unere chọrọ ka mmiri na-ezo n’ụzọ chiri anya ma ọ bụ ka a na-agba ya mmiri kwa izu.”

Unere pụrụ ịdị ka osisi, ma ogwe ya abụghị osisi kama ọ bụ okporo akwụkwọ ya fụkọtara afụkọta. Unere abụghị osisi. Úkwù ya dị n’ime ala. Ọ bụ n’úkwù a dị n’ime ala ka akwara na-esi agbanye n’ala, akwụkwọ ya, nakwa n’ikpeazụ, ifuru buru ibu nke na-acha pinki pinki, na-esi na ya epupụta. Ome dị iche iche na-esikwa n’úkwù a dị n’ime ala epulite iji ghọọ úkwù unere ndị ọhụrụ.

Unere nwere nkebi atọ bụ́ isi nke uto, bụ́ ndị ndị ọrụ ugbo n’ógbè ahụ na-ezo aka na ha dị ka “nne ochie, nwa, na nwa nwa.” (Lee foto.) “Nne ochie” ga-amị mkpụrụ n’afọ a, “nwa” amịa n’afọ ọzọ, “nwa nwa” amịa n’afọ nke atọ. “Nwa nwa” na-epulite nnọọ n’ụba n’akụkụ “nne” ha. Mgbe “ụmụ ọhụrụ” a torutere ebe dị ka n’ikpere, a na-egbupụ ha nile ma e wezụga nke yikarịsịrị ka ọ̀ ga-amị unere.

Ifuru ahụ buru ibu na-acha pinki pinki bụ́ nke na-emesịa ghọọ ụyọkọ unere, na-esi n’ogwe unere ahụ dị n’ime ala topụta n’etiti unere ahụ. Ọ na-emesịzi si n’etiti akwụkwọ abụọ ndị dị n’elu elu pụta ma kwụdaa akwụda. Ka akụkụ dị iche iche nke ifuru ahụ na-adasị, ógbè 10 ruo 15 ndị ahụ na-akabeghị aka bụ́ ndị mejupụtara ụyọkọ unere ahụ na-apụta ìhè—ọ na-adị onye na-amaghị nke a na-akọ ka hà si n’ike na-eto! Otu ógbè pụrụ inwe unere 20 ma ọ bụ karịa, bụ́ ndị na-ebuchabeghị ibu, bụ́ ndị a na-ezo aka na ha dị ka mkpịsị aka unere.

Oge A Ga-egbute Ya

Oge ọ na-ewe site n’oge unere ahụ mara ifuru ahụ na-acha pinki pinki ruo n’oge a ga-egbute ya pụrụ ịdịgasị iche malite n’ọnwa atọ ruo ọnwa isii, dabere n’oge ọ bụ n’afọ. A na-egbute unere mgbe ọ na-achabeghị acha, ma ọ bụ nanị mgbe mkpịsị aka unere ndị ahụ karala aka ma gbaa gburugburu. Nkezi nke ịdị arọ nke ụyọkọ unere a na-ere ere na-abụ ihe dị ka kilogram 35. E gbutesịa ya, a na-eji wọtapruf ekpuchi ya iji gbochie ihe ọ bụla ichihịa ya ahụ́ mgbe a na-ebuga ya n’ụlọ ebe a na-ekpu ya. A na-anọ n’ebe a ebegasị ógbè ndị ahụ gaa n’ìgwè ndị dị nta nke agbata mkpịsị aka unere atọ na isii, mgbe ahụ, a na-ejizi mmiri ọgwụ na-eme ka ihe ghara ịma èbù saa ha.

Na South Africa, a na-akwanyezi mkpụrụ osisi ahụ na katọn ndị nwegasịrị oghere bụ́ ndị e tere wax n’ime ha ma buba ha n’ọnụ ụlọ ọ na-anọ acha. N’ebe a ka otu gas, bụ́ ethylene, na-akpali ya ịmalite chawa. * A na-edewe katọn ndị ahụ n’ebe a n’ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ a chịkwara achịkwa ruo otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ, mgbe ahụ e bugaziere ya onye ga-azụ ya.

“Ikekwe ọ pụrụ ịbụ na m na-ekwulara obodo m,” ka Tony ji ọchị na-ekwu, “ma echere m na unere Levubu na-atọ ụtọ pụrụ iche, ma eleghị anya, ọ bụ n’ihi ájá anyị. N’ụzọ dị mwute, ebe ọ bụ na anyị bi n’ebe dịpụrụ adịpụ n’obodo ukwu ọ bụla a pụrụ ibuga ya, anyị na-ara ya nanị n’ime obodo ebe a.”

Ọ Dị Mma Maka Ahụ́ Ike Gị

Unere nwere potassium n’ụba. “Ọtụtụ nnyocha ndị e mere na-egosi na potassium pụrụ inye aka mee ka ọkpụkpụ gị sikwuo ike ma belata ohere i nwere ịrịa ọbara mgbali elu na strok,” ka magazin bụ́ Health na-ekwu n’otu isiokwu o dere banyere unere. “Unere,” ka magazin ahụ na-agbakwụnye, “nwere folic acid na-enye aka egbochi ịmụ nwa nwere nkwarụ, bụ́ vitamin nke nọ n’ìgwè B nke dị oké mkpa maka onye ọ bụla dị ime ma ọ bụ onye ọ bụla toruworo ịmụ nwa.” Unere nwere mineral ndị ọzọ dị oké mkpa, dị ka magnesium, bụ́ nke na-enyere ọkpụkpụ aka ịmịrị calcium wee si otú ahụ nọgide na-esi ike.

Ọ bụ amino acid 18 mejupụtara protein dị n’unere, gụnyere ihe nile dị oké mkpa ndị ahụ́ gị na-apụghị imepụta n’ókè zuru ezu ma ọ bụ ndị ahụ́ gị na-apụghị imepụta ma ọlị. Unere nwere carbohydrate ruru pasent 22, bụ́ nke na-enye ike ngwa ngwa ebe ọ bụ na unere na-adị nnọọ mfe mgbari. Marie nwere obi ụtọ ịgbakwụnye, sị: “Unere bụ ihe dị mma na-enye vitamin A, B, na C. Ọzọkwa, o yiri ka hà na-ebelata agụụ iri ihe, ebe ọ bụ na o yighị ka mmadụ ọ̀ ga-achọ ịracha nnọọ ọtụtụ n’otu mgbe.” Ya mere, gịnị ma ị raa otu—ọ ga-adị gị mma, dịkwa nnọọ ụtọ!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Mgbe unere chara n’onwe ha, ha na-ewepụta otu gas ahụ, bụ́ nke na-eme ka ha chaa ngwa ngwa. N’ihi ya, ụzọ ọzọ isi mee ka unere na-achaghị acha chaa bụ idebe ole na ole chara acha n’etiti ha.

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 24]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Akwụkwọ unere

Ifuru/unere

Úkwù akwụkwọ unere

Elu ala

Úkwù dị n’ime ala

Akwara

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ihe osise: Ọ dabeere n’ihe osise e nwetara n’akwụkwọ bụ́ The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Nne ochie

Nwa

Nwa nwa

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

Ifuru ahụ buru ibu na-acha pinki pinki na-emecha ghọọ ụyọkọ unere

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nke Kazuo Yamasaki sere

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Oge a na-egbute ya (n’aka ekpe); unere ndị na-etolite etolite (n’elu)