Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ihe Gbawara n’Otu Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Fatịlaịza

Mgbe Ihe Gbawara n’Otu Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Fatịlaịza

Mgbe Ihe Gbawara n’Otu Ụlọ Ọrụ Na-emepụta Fatịlaịza

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA FRANCE

NA SEPTEMBER 21, 2001, nanị ụbọchị iri mgbe a wakposịrị Ebe Azụmahịa Ụwa dị na New York, otu ihe nke gbawara n’ọghọm n’ụzọ dị ukwuu n’otu ụlọ ọrụ na-emepụta fatịlaịza, bibiri ihe dị ukwuu n’ime ime obodo Toulouse, nke dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ France. Ọ bụ nke magazin akụkọ nke France bụ́ Le Point kọwara dị ka “ọdachi kasị njọ e nwetụworo n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe na France kemgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ.”

Ihe dị ka tọn fatịlaịza 300 gbawara, gwuo olulu dị mita 50 n’obosara, nke dịkwa mita 15 n’omimi. Ihe ahụ gbawaranụ na oké okpomọkụ na ikuku ọ kpatara gburu mmadụ 30 ma merụọ ihe karịrị mmadụ 2,200 ahụ́. O bibiri ihe dị ka ebe obibi 2,000, bibiekwa 27,000 ndị ọzọ dịpụrụ adịpụ ruo ihe dị ka kilomita asatọ. Egwu jidere ndị mmadụ ka ha chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ ndị na-eyi ọha egwu kpatara ya nakwa na ikuku na-egbu egbu esiwo n’ụlọ mmepụta ihe ahụ kupụta.

Ihe ahụ gbawaranụ merụrụ ọtụtụ ndị n’etiti Ndịàmà Jehova ahụ́, o metụtakwara ọtụtụ ndị n’ime ha n’ụzọ ndị ọzọ. Ịhụnanya Ndị Kraịst kpaliri Ndịàmà ibe ha ime ihe ngwa ngwa. (Jọn 13:34, 35) Akụkọ na-esonụ bụ banyere ọrụ enyemaka ahụ.

“Ụlọ ahụ Afọdụghị”

Khoudir bụ otu n’ime ndị na-anwụghị nke na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ na-emepụta fatịlaịza. Ihe ahụ gbawaranụ na iberibe ihe ndị fepụtagasịrịnụ kụtara ya, mee ka ọ gharazie ịma onwe ya, merụọ ya ahụ́ n’agbà ma chipụ ọkpụkpụ olu ya. Ihe ahụ gbawaranụ buuru Benjamin, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ dị n’akụkụ ụlọ ọrụ ahụ na-emepụta fatịlaịza, tufee n’otu ọfịs ma kụọ ya ná mgbidi. Iberibe ugegbe ndị fesasịrịnụ chara ya n’ọtụtụ ebe n’ahụ́ ma rụnye ya n’anya aka nri ya, mebie anya ya. “Enwere m ihe ndabara ọma na m anọghị n’oche m,” ka o kwuru. “Brik ruru ihe dị ka kilogram 600 dakwasịrị n’elu oche m.”

Alain, bụ́ onye nkụzi n’otu ụlọ akwụkwọ dị nanị mita 200 site n’ụlọ ọrụ ahụ, ji ígwè photocopier na-ebipụtaghachi mpempe akwụkwọ ụfọdụ mgbe ihe ahụ gbawara. O kwuru, sị: “Ụlọ ahụ afọdụghị, nanị iberibe ígwè. Mgbidi adịghịzi, elu ụlọ adịghịzi, ọ dịghị nnọọ ihe fọdụrụ. Iberibe ugegbe merụchara m ahụ́. Enwere m ọnyá ndị miri emi n’ihu m nile. Ọ dị ka ebe e ji okpiri kụọ mmadụ n’ihu.” Otu anya kpọrọ Alain, ọ dịghịkwa anụchazi ihe n’ihi ihe ahụ gbawaranụ.

Ọrụ Enyemaka Ndị Dị Ngwa

Ngwa ngwa o kwere mee, ndị okenye nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova 11 ndị ọdachi ahụ metụtara kpọtụụrụ onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ iji hụ ma è nwere ndị merụrụ ahụ́ ma ọ bụ ihe e mebiri. E zigara ndị ọrụ afọ ofufo ozugbo n’ebe ndị nwere mkpa enyemaka karịsịa nọ. N’oge na-adịghị anya, ndị ọrụ afọ ofufo ahụ chọpụtara na e bibiri ihe dị ka ebe obibi 60 nke Ndịàmà, ha nyekwara aka n’ime ka ihe dị ka ezinụlọ 10 kwaga ebe ọzọ. Ndị ọrụ afọ ofufo nyekwara aka rụzie Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ mebiri emebi. Tụkwasị na nke a, ha nyere aka n’ụzọ bara uru banyere ụzọ a ga-esi mee ka ụlọ ọrụ ịnshọransị kwụọ ha ụgwọ.

Catherine na Michel bi nnọọ n’ihu ụlọ ọrụ ahụ. Catherine nọ na-akwọ ụgbọala ya mgbe ihe ahụ gbawara. Ọ na-akọwa, sị: “Na mbụ, o mere dị ka a ga-asị na ọ bụ ala ọma jijiji. Sekọnd ole na ole mgbe nke ahụ mesịrị, anyị nụrụ ihe gbawaranụ. Mgbe ahụ, anyị hụrụ anwụrụ ọkụ na-ala elu. Akwọọrọ m ụgbọala m gaa n’agbata obi anyị; o yiri ọgbọ agha. Ụlọ nile dị n’ebe ahụ dakasịrị adakasị, windo ụlọ ahịa ndị dị n’ebe ahụ gbarisikwara. Ndị mmadụ nọ na-agba ọsọ n’okporo ámá. Ndị ọzọ nọdụrụ ala ma ọ bụ dinara ala n’okporo ụzọ, na-ebe ákwá ma ọ bụ na-eti mkpu. N’ụlọ anyị, windo nile anyị na ọbụna osisi ha dakapụsịrị, ọ dịghịkwa ibo ụzọ fọdụrụnụ. Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị gbataara anyị ọsọ enyemaka ngwa ngwa. Ka ọ na-erule n’ehihie, otu ìgwè sitere n’ọgbakọ anyị ejiriwo bọket na azịza nakwa gbamgbam plastik bịarute iji kụchie windo ndị ahụ.”

Alain na Liliane bikwa nso n’ụlọ ọrụ ahụ. Ihe ahụ gbawaranụ bibiri ụlọ ha kpam kpam. “Ihe nile gbarisịrị,” ka Alain na-ekwu. “Mgbidi na taịl nile gbawasịrị, windo, ibo ụzọ, na ngwá ụlọ nile bibichara. Ọ dịghị nnọọ ihe fọdụrụnụ. Ụmụnna anyị Ndị Kraịst bịara ozugbo iji nye aka. Ha kpochasịrị unyi nile ma nye aka kpochaa ebe obibi ndị ọzọ dị n’ụlọ ahụ. O juru nnọọ ndị agbata obi anyị anya na ọtụtụ mmadụ bịara inye aka.” N’ụtụtụ tupu ihe ahụ agbawaa, onye Alain na-amụrụ Bible kpọrọ ya na fon rịọ ya ka ọ bịa duziere ya ọmụmụ Bible. Liliane gakwara ozi. N’ihi ya, ọ dịghị onye nke n’ime ha nọ n’ụlọ mgbe ihe ahụ gbawara.

Ọ bụghị nanị ndị òtù ọgbakọ ka Ndịàmà nyeere aka. Mgbe ha nyesịịrị ibe ha aka, ha nyeziiri ndị agbata obi ha aka, na-ekpocha unyi n’ebe obibi, na-akụchikwa windo ndị gbawara agbawa. Ndị agbata obi ahụ nwere nnọọ ekele, o jukwara ha anya na ọ dịghị ego a nara ha.

E nyekwaara ndị ọchịchị obodo ahụ aka, bụ́ ndị ókè mbibi ahụ ruru riri ọnụ. Ndịàmà kpochara ụlọ akwụkwọ dị iche iche na ụlọ ndị ọha na eze na-eji eme ihe. N’otu ógbè, ndị ọchịchị obodo zigara Ndịàmà na-arụ ọrụ afọ ofufo ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ iji chọpụta mkpa ndị mmadụ nwere.

Inye Aka n’Ụzọ Ime Mmụọ

Tụkwasị n’enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe, ọtụtụ n’ime Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ ihe gbawara nwere mkpa nke enyemaka n’ụzọ ime mmụọ. N’ihi ya, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, tinyere ndị okenye nọ n’ógbè ahụ, letara ndị nile ọdachi ahụ metụtara. Ha nwere nnọọ ekele maka nkwado ahụ. Catherine kwuru, sị: “Ndị okenye ji ịdị n’otu kwadoo anyị. Ha bịara gbaa anyị ume. N’ezie, nke a bụ ihe dị anyị mkpa, karịa enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe.”

Ịhụnanya Ndị Kraịst e tinyere n’ọrụ mgbe e nwesịrị ọdachi ahụ kpaliri ụfọdụ ndị ikwu ihe ndị na-akpali mmasị. Otu Onyeàmà nke merụrụ nnọọ ahụ́ kwuru, sị: “Anyị amaghị nnọọ ihe ga-eme echi. Anyị aghaghị ịnọgide na-ejere Jehova ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ ụbọchị ikpeazụ anyị.” (Jems 4:13-15) Onyeàmà ọzọ kwubiri, sị: “Ihe a nile enyeworo anyị aka ịghọta na anyị ekwesịghị ịtụkwasị obi anyị n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihe onwunwe ọ bụla. Ihe bara nnọọ ezi uru bụ ịbụ onye a chọtara n’etiti ndị Jehova.”

[Foto dị na peeji nke 22]

Benjamin na Khoudir

[Foto dị na peeji nke 22]

Alain

[Foto dị na peeji nke 23]

Toulouse, ụbọchị sochiri ihe ahụ gbawaranụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© LE SEGRETAIN PASCAL/CORBIS SYGMA

[Foto dị na peeji nke 23]

Alain na Liliane