Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ
Ndị Na-eto Eto na Ọgwụ Ọjọọ
“Hà ga-anwụrịrị?”
Nke ahụ bụ ajụjụ a jụrụ n’ihu magazin Brazil bụ́ Veja. N’akụkụ ebe e dere okwu ndị ahụ, e sere foto ọmarịcha ndị ntorobịa ahụ́ zuru okè, bụ́ ndị nwụworonụ—ha nwụrụ n’ihi iji ọgwụ ọjọọ eme ihe.
N’AGBANYEGHỊ ihe ize ndụ ndị a maara nke ọma dị na ya, ndị mmadụ anọgidewo na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe, àgwà dị otú ahụ anọgidewokwa na-ebibi ndụ ndị mmadụ. Kwa afọ, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-efu United States ihe dị ka 100 ijeri dollar n’inweta ọgwụgwọ, n’ihi arụpụtaghị ihe nke ọma, ụgwọ ọrụ ndị furu efu, na mpụ. Ikekwe, ọ bụ ndị na-eto eto—ụmụaka—kasị ata ahụhụ ya. Dị ka otu nnyocha e mere na Brazil bụ́ nke a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal da Tarde, na-egosi, pasent 24.7 nke ndị ntorobịa nọ n’agbata afọ 10 na afọ 17 anwaleworị ụdị ọgwụ ọjọọ ụfọdụ.
Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ọnụ ọgụgụ ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe na United States adalatatụwo n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto n’ebe ahụ bụ ndị o riri ahụ́. Tụlee ụmụ akwụkwọ kọleji. Dị ka otu nnyocha gosiri, pasent 37 nke ụmụ akwụkwọ kọleji n’ebe ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, anwalewo wii wii n’afọ bu ụzọ. Otu onye n’ime ụmụ akwụkwọ kọleji 5 ejiriwo ya mee ihe n’ọnwa bu ụzọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 onye n’ime ụmụ akwụkwọ kọleji 10 anwalewo ọgwụ ecstasy n’afọ bu ụzọ. Ihe karịrị pasent 6 anwalewo ọgwụ LSD.
Akụkọ a na-enweta n’ụwa nile dị mwute. Ụlọ Ọrụ Britain Na-ahụ Maka Ndekọ Ọnụ Ọgụgụ ná Mba ahụ na-akọ na “pasent 12 nke ụmụ akwụkwọ ndị nọ n’afọ 11 ruo 15 ejiwo ọgwụ ọjọọ mee ihe n’afọ gara aga . . . O yikarịrị ka ọ̀ bụ wii wii ka e ji nnọọ mee ihe.” Ihe kasị atụ egwu bụ eziokwu ahụ bụ́ na “e nyewo ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ (pasent 35) n’ime ha otu ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ karịa.”
Otu akụkọ nke Njikọ nke Mba Ndị Dị na Europe kwadoro n’ụzọ ego na-ekpughe n’otu aka ahụ na n’etiti ndị na-eto eto, “aṅụrụma na-aghọwanye ihe zuru ebe nile.” Akụkọ ahụ na-akọkwa na “e jikọtara ịṅụbiga mmanya ókè dị otú ahụ na mmetụta dịgasị iche iche bụ́ ndị na-adịghị adịte aka, ndị dị ka ihe mberede, ime ihe ike na mkpaghasị uche, nakwa nsogbu ito eto na nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya.” Otu akụkọ sitere Japan na-ekwu na “ọgwụ ọjọọ ndị ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eji eme ihe na Japan karịsịa bụ ihe ndị nwere ísì na-ekpo ekpo, bụ́ nke pụrụ iduga n’iji ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ eme ihe.”
Ka a sịkwa ihe mere Odeakwụkwọ Ukwu nke òtù UN bụ́ Kofi Annan ji kwuo, sị: “Ọgwụ ọjọọ na-etisasị ọha mmadụ, na-akpata mpụ, na-agbasa ọrịa ndị dị ka AIDS, na-egbu ndị ntorobịa anyị, na-ebibikwa ọdịnihu anyị.” Ọ bụ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-emekarị mpụ ndị dị ka ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na igbu ọchụ nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe kpatara. Ọzọkwa, n’ihi iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ọtụtụ ndị na-abụ ndị e mesoro ihe ike, ndị e merụrụ ahụ́, ma ọ bụ na-enwe mmekọahụ dị ize ndụ, bụ́ nke ha na-emeghị atụmatụ ya. Ọ bụrụkwa na ị na-eche na ọ gaghị emetụta ezinụlọ gị, cheghachi echiche banyere ya! Otu akụkọ sitere n’aka gọọmenti United States, kọrọ, sị: “Ọgwụ ọjọọ abụghị nsogbu nke nanị ndị ogbenye, ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ, ma ọ bụ ndị bi n’obodo ndị mepere emepe. . . . A na-ahụ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe n’etiti ndị nọ n’ọnọdụ
dị iche iche ná ndụ nakwa ndị si n’akụkụ dị iche iche nke mba a. Nsogbu ọgwụ ọjọọ na-emetụta mmadụ nile.”Ma, ndị mụrụ ụmụ adịghị amatakebe ihe ize ndụ dị na ya ruo mgbe oge gafeworo. Tụlee ihe banyere otu nwa agbọghọ bụ́ onye Brazil. “Ọ nọ na-aṅụ mmanya na-aba n’anya,” ka nwanne ya nwanyị bụ́ Regina, na-akọwa. * “Ezinụlọ anyị chere na ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị. Ma nke a dugara ya n’isoro ndị enyi ya nwoke na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m na-emesokarị ya dị ka a ga-asị na nsogbu ndị ọ kpatara enweghị ihe ọ bụ, ọnọdụ ya bịara dị njọ gabiga ókè. Ọtụtụ mgbe, ọ pụrụ n’enweghị onye maara ebe ọ gara. Mgbe ọ bụla a hụrụ ozu nwa agbọghọ, ndị uwe ojii na-akpọ papa m iji mata ma ọ̀ bụ nwanne m nwanyị! Nke a kpataara ezinụlọ anyị oké nhụjuanya.”
Òtù Ahụ Ike Ụwa kwuru ihe ise bụ́ isi mere ndị na-eto eto pụrụ iji bụrụ ndị a dọtara mmasị ha n’ebe n’ọgwụ ọjọọ dị:
(1) Ha na-achọ inwe mmetụta nke ịbụ ndị toworo eto na ime mkpebi nke onwe ha
(2) Ha na-achọ igosi na ha sokwa biri
(3) Ha na-achọ inwe ntụsara ahụ́ ma nwee obi ụtọ
(4) Ha na-achọ ime ihe ndị dị ize ndụ ma nupụ isi
(5) Ha na-achọkwa imejụ ọchịchọ ha nwere ịmata ihe
Nnweta a pụrụ inweta ọgwụ ọjọọ n’ụzọ dị mfe na nrụgide ndị ọgbọ na-amụbakwa ohere e nwere na ndị ntorobịa ga-amalite ụzọ ndụ a nke ibibi onwe onye. “Ndị mụrụ m ekwutetụghị ihe ọ bụla banyere ọgwụ ọjọọ. N’ụlọ akwụkwọ, ndị nkụzi kwuru okwu banyere nsogbu dị na ya ma ha akọwaghị ya nke ọma,” ka Luiz Antonio, bụ́ onye ntorobịa si Brazil, na-akọwa. N’ịbụ onye ụmụ akwụkwọ ibe ya gbara ume, ọ malitere iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe mgbe ọ dị afọ 14. E mesịa, mgbe ọ nwara ịkwụsị ya, “ndị enyi” ya ndị na-enye ya ọgwụ ọjọọ, ji mma yie ya egwu, na-arụgide ya ịnọgide n’àgwà ya!
Ị̀ ghọtawo eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ nke gị onwe gị pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ? Gịnị ka i meworo iji chebe ha pụọ n’iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụzọ ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi chebe ụmụ ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 9 A gbanwewo aha ụfọdụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Ọgwụ ọjọọ na-etisasị ọha mmadụ, na-akpata mpụ, na-agbasa ọrịa ndị dị ka AIDS, na-egbu ndị ntorobịa anyị, na-ebibikwa ọdịnihu anyị.”—KOFI ANNAN, ODEAKWỤKWỌ UKWU NKE ÒTÙ UN
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
© Veja, Editora Abril, May 27, 1998