Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’isi Nso—Ụwa Ọgwụ Ọjọọ Na-adịghị na Ya

N’isi Nso—Ụwa Ọgwụ Ọjọọ Na-adịghị na Ya

N’isi Nso—Ụwa Ọgwụ Ọjọọ Na-adịghị na Ya

Ị̀ pụrụ iche echiche banyere ụwa nke a na-agaghị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe na ya?

ODEAKWỤKWỌ UKWU nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ Kofi Annan kpọkuru mba nile ịrụ ọrụ iji mee ka e nwee ụwa dị otú ahụ. O kwuru, sị: “Anyị aghaghị ime ihe ndị doro anya, bụ́ ndị a na-emebeghị mbụ, iji lụsoo ihe ọjọọ a ọgụ; ihe otiti a nke jichiworo nnọọ ọtụtụ n’ime ụmụ anyị.”

Ọ bụ ezie na ndị ndú pụrụ ikweta ibelata mmepụta na nkesa nke ọgwụ ọjọọ n’ụwa nile, ihe ịma aka dị na ya na-eri ọnụ. Hennadiy Udovenko nke Ukraine, bụ́ onye na-eje ozi dị ka onyeisi nke nnọkọ pụrụ iche nke Nzukọ Ezumezu nke òtù UN, kwuru na “ebe ọ bụ na ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-enye ihe e mere atụmatụ ịbụ ihe karịrị ijeri $400 kwa afọ, ọ bụ otu n’ime achụmnta ego ahịa iwu ndị kasị eweta uru, . . . ndị pụrụ imebi ma ọ bụ itisasị achụmnta ego ụwa nile.” O kwukwasịrị na nsogbu ọgwụ ọjọọ “aghọwo ihe zuru ụwa ọnụ, ọ dịghịkwa mba pụrụ inwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe pụọ n’aka ihe a dị ize ndụ.”

O siri ike iche echiche banyere ụwa nke ọgwụ ndị dị ize ndụ na-adịghị na ya. N’ezie, gọọmenti dị iche iche nke ụmụ mmadụ egosiwo na ha apụghị ikpochapụ ha. Otú ọ dị, ọ dịghị onye pụrụ igbochi Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile imezu nzube ya bụ́ iweta paradaịs elu ala ebe a ga-egbo mkpa mmetụta uche, nke anụ ahụ́, na nke ime mmụọ ọ bụla. (Abụ Ọma 145:16; Luk 23:43; 2 Pita 3:13) Dị ka onye amụma bụ́ Aịzaịa si kwuo, okwu Chineke ‘agaghị alaghachikwute ya n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ ya ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe O zigara ya.’—Aịsaịa 55:11.

Inwe olileanya ná nkwa ndị dị otú ahụ pụrụ iweta abamuru ndị dị ịrịba ama ọbụna ugbu a. Dị ka ihe atụ, Edmundo na-ejibu ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ma, ikwere ná nkwa Bible kwere banyere ụwa ọhụrụ nke ezi omume mere ka o lerughachi ndụ ya anya. Edmundo na-ekwuzi, sị: “Lee nnọọ iberibe m mere ịla oge m n’iyi.” N’ịbụ onye nwere ọchịchọ nke ịnọgide na-abụ onye Chineke nakweere, ọ bụwo onye a kwaliri ugbu a izere iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ee, ihe ọmụma banyere Chineke na nkwa ya pụrụ ịkwali anyị ugbu a ‘iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’—Ndị Efesọs 4:24.

Ọtụtụ ndị ọzọ na-ejibu ọgwụ ọjọọ eme ihe amalitewokwa isoro Onye Okike ha na-enwe mmekọrịta chiri anya. Nye ha, okwu ọbụ abụ ahụ nwere ezi ihe ọ pụtara: “Echetala mmehie nile m mehiere n’okorobịa m, ha na njehie m nile: Dị ka ebere Gị si dị Gị onwe gị cheta m, n’ihi ịdị mma Gị, Jehova. Onye dị mma na onye ziri ezi ka Jehova bụ: n’ihi nke a ka Ọ na-ezi ndị mmehie ihe n’ụzọ.” (Abụ Ọma 25:7, 8) Lee ihe na-enye nkasi obi ọ bụụrụ ndị nne na nna nke ụmụaka ndị na-agahie agahie ịmata na ụmụ ha pụrụ ịgbanwe! Site n’iji ịdị uchu na-eme mgbalị, ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụ ha aka iguzogide ihe otiti nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe nakwa ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ bụ́ nke a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ Chineke.—1 Timoti 6:19.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Olileanya nke ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke akwaliwo ọtụtụ ndị na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe ịgbanwe ndụ ha