Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nzukọ Kasị Mkpa n’Afọ

Nzukọ Kasị Mkpa n’Afọ

Nzukọ Kasị Mkpa n’Afọ

Were ya na ị na-arịa ọrịa nke na-egbu mmadụ. A pụrụ ịgwọ ọrịa ahụ site n’ịwa gị ahụ́, ma ị gaghị akwụli ụgwọ ịwa ahụ́ ahụ. Ka e were ya na otu onye omepụrụ onye ọ dịịrị ekweta ịkwụ ụgwọ ịwa ahụ́ ahụ. Ị́ gaghị enwe ekele maka onyinye ya nke na-azọpụta ndụ?

Bible na-akụzi na mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, bufeere ụmụ ha nile mmehie na ọnwụ. N’otu echiche, onye ọ bụla n’ime anyị bu ọrịa na-enweghị ọgwụgwọ pụta ụwa—ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ ihe a ga-eji gwọọ ya. (Abụ Ọma 49:7-9) Ma, Jehova Chineke nyere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, dị ka ihe mgbapụta iji kwụọ ụgwọ mmehie anyị. N’ihi onyinye a na-azọpụta ndụ, anyị nwere ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs.—Ndị Rom 6:23.

Na Wednesday, April 16, mgbe anyanwụ dasịrị, Ndịàmà Jehova ga-eme ememe ncheta ọnwụ Jizọs. N’afọ gara aga, ihe karịrị mmadụ 15,000,000 bịara ememe a—ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụghị Ndịàmà Jehova. A na-akpọ gị òkù ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke afọ a. N’ezie, ọ bụ nzukọ kasị mkpa a ga-enwe n’afọ. Biko jụta Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu kpọmkwem oge na ebe a ga-eme ya.