Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Vidio Egwú—Olee Otú M Pụrụ Isi Na-eme Nhọrọ?

Vidio Egwú—Olee Otú M Pụrụ Isi Na-eme Nhọrọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Vidio Egwú—Olee Otú M Pụrụ Isi Na-eme Nhọrọ?

“Mgbe m hụrụ e gosiri aha òtù egwú ma ọ bụ egwú rụrụ arụ, mgbe ahụ ka m na-agbanwe chanel ahụ.”—Casey.

VIDIO EGWÚ—ọtụtụ ndị ntorobịa na-ewere ha dị ka ihe ndị na-enye obi ụtọ nke ukwuu. Ma, dị ka isiokwu gara aga n’usoro isiokwu a gosiri, ọtụtụ vidio egwú na-egosi mmekọahụ rụrụ arụ na ime ihe ike na-awụ akpata oyi n’ahụ́. * N’ezie, mgbe ụdị ntụrụndụ ọ bụla na-akwalite ihe Chineke kpọrọ asị, Onye Kraịst kwesịrị izere ikiri ya. Otú ọ dị, ọ bụghị vidio egwú nile rụrụ nnọọ arụ n’ụzọ pụtara ìhè. Ụfọdụ pụrụ ịdịtụ mma. Ndị ọzọ pụrụ ịdị ka hà adịghị njọ gabiga ókè. N’agbanyeghị nke ahụ, vidio ndị dị otú ahụ pụrụ nnọọ ịdị na-ezipụ ozi aghụghọ nke na-emegide Okwu Chineke.

Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị ekwe ka ị na-ekiri vidio egwú, ọ ga-adị mkpa ka ị na-eme nhọrọ ma jiri “ikike nghọta” gị nke e ji Bible zụọ na-eme ihe ka i wee nwee ike ịmata ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-ekwesịghị ekwesị ikiri. (Ndị Hibru 5:14) Olee ụkpụrụ Bible ndị pụrụ inyere gị aka n’ihe banyere nke a? Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ na okwu ụfọdụ na-esonụ ga-enyere gị aka.

Ilu 4:23: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” Ì nwere ngwá egwú ma ọ bụ ihe ndị e ji eme egwuregwu bụ́ ndị dị oké ọnụ ahịa nye gị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-agbalị idote ya n’ọnọdụ dị nnọọ mma nakwa ebe dị nchebe. N’ezie, ị gaghị achọ idebe ya n’okporo ámá ọbụna ruo nwa oge n’enweghị onye na-elekọta ya ka a ghara imebi ya ma ọ bụ zuru ya. Ee, ị na-echebe ya nke ọma. N’otu aka ahụ, ị ghaghị ikpebi na ị ga-echebe obi gị, ọbụna na-ezere itinyetụ ya n’ihe ize ndụ site n’inwe ntụrụndụ na-adịghị mma.

Ndị Efesọs 2:1, 2: “Ọzọkwa, ọ bụ unu ka [Chineke mere ka unu dị ndụ] ọ bụ ezie na unu nwụrụ anwụ ná njehie na mmehie unu, bụ́ nke unu jere ije na ha n’otu mgbe dị ka usoro ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị ikike nke ikuku ahụ si dị, bụ́ mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” Ikuku ahụ bụ mmụọ nke ụwa, nke bụ́ ụzọ iche echiche na omume ndị na-akpata àgwà asọpụrụghị Chineke. Mmụọ a na-apụta ìhè n’ọtụtụ vidio egwú, na-emegidekwa n’ụzọ nile, mmụọ Chineke nke na-amịpụta àgwà ndị dị ka ọṅụ, udo, na njide onwe onye.—Ndị Galeshia 5:22, 23.

2 Timoti 2:22: “Gbanahụ ọchịchọ nke oge ntorobịa.” Ikiri ebe a na-enwe mmekọahụ—ọbụna mgbe e gosiri ha nwa oge—ga-eme ka agụụ inwe mmekọahụ sikwuo ike. Ọtụtụ ndị na-eto eto kwetara na ọ na-esiri ha ike ichefu ihe ndị dị otú ahụ; ha pụkwara ọbụna ịdị na-atụleghachi ha ugboro ugboro n’uche ha. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Dave, bú onye kiriri vidio na-egosi omume rụrụ arụ kwetara, sị: “Mgbe nke ahụ gasịrị, oge ọ bụla m nụrụ egwú ahụ, vidio a na-abata m n’uche.” Ya mere, ikiri ihe ngosi vidio ndị dị otú ahụ pụrụ ịkpalite agụụ inwe mmekọahụ na-ezighị ezi.—1 Ndị Kọrint 6:18; Ndị Kọlọsi 3:5.

Ilu 13:20: “Enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” Jụọ onwe gị ajụjụ, sị: ‘M̀ nwere ike ịkpọbata ndị na-eme ihe ike, ndị mgbaasị, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị na-eme omume ruru arụ n’ime ụlọ m?’ Isoro ndị dị otú ahụ na-akpakọrịta site na telivishọn bụ otu ihe ya na ịkpọbata ha n’ime ụlọ gị. Ime otú ahụ ọ̀ pụrụ ime ka ị bụrụ onye “a ga-emejọ”? Kimberly na-ekwu, sị: “Ahụwo m ọnọdụ dị iche iche ná nnọkọ oriri ebe ụmụ agbọghọ na-eṅomi ejiji ma ọ bụ egwú ndị na-akpali omume rụrụ arụ bụ́ ndị ha kiriri na vidio n’oge na-adịbeghị anya.” Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ihe yiri nke ahụ. Site n’iṅomi ndị na-enweghị nsọpụrụ maka ụkpụrụ Chineke, ndị ntorobịa a na-egosi na ha amaliteworị ịbụ ndị “a ga-emejọ.” N’ezie, zere ụdị “mkpakọrịta ọjọọ” ọ bụla.—1 Ndị Kọrint 15:33.

Abụ Ọma 11:5: “Jehova [na-enyocha, NW] onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” Ọ bụrụ na anyị na-ekiri vidio ndị na-akwalite ime ihe ike ezi uche na-adịghị na ha nakwa ndị na-ewetu mmadụ ala, ọ̀ pụrụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ime ka ndị ọzọ na-ele anyị anya dị ka ‘ndị na-ahụ ime ihe ike n’anya’?

Ihe Ịma Aka nke Ịdị Na-eme Nhọrọ

N’ihi na “ụwa dum dị n’ike aka nke ajọ onye ahụ” ọ na-esiwanye ike inweta ihe nkiri na-adịghị egosi echiche na àgwà dị iche iche nke ụwa. (1 Jọn 5:19) Ụfọdụ chanel ndị na-egosi vidio egwú pụrụ igosi ọtụtụ ihe ndị na-adịghị mma. Ọbụna mgbe ihe omume ahụ na-enweghị omume rụrụ arụ nakwa ime ihe ike pụtara ìhè, ọ ka na-akwalitekarị mmụọ nke ụwa. Otu onye ji egwú mere aka ọrụ kwuru na otu chanel a ma ama nke na-egosi vidio egwú “agbanwewo site n’ịbụ chanel na-egosi egwú gaa n’ịbụ ‘chanel na-egosi ụzọ e si ebi ndụ.’”

Ihe ngwọta ya pụrụ iyi ihe dị mfe: Ọ bụrụ na ihe omume vidio ị na-ekiri adịghị mma, gbanwee chanel ahụ. Ihe dị ebe ahụ bụ, ọ dị gị mkpa ịmụrụ anya n’otu ụzọ ahụ mgbe i na-ekiri chanel TV ndị ọzọ. Ọtụtụ na-egosi ihe omume ndị na-egosi ime ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ ndị na-egosi ndị nọ n’ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ha mee omume rụrụ arụ. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe na-akpasu iwe—ikekwe ọbụna ihe na-akụda mmụọ—mmadụ ịchọ ịtụrụ ndụ ma n’otu aka ahụ dịrị njikere ịgbanwe chanel ahụ. Mgbe ụfọdụ, tupu a gbanwee chanel ahụ, ihe emechaala emechaa. Onyinyo ndị rụrụ arụ abanyeworị n’uche gị. Ka o sina dị, ị pụrụ ijide n’aka na Jehova Chineke ga-agọzi mgbali ọ bụla ziri ezi i tinyere iji chekwaa obi gị.—2 Samuel 22:21.

E nwere nzọụkwụ ndị ọzọ dị irè ndị ị pụrụ iji mee ihe. Casey, onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, kọwara ihe na-enyere ya aka: “A na-egosikarị aha òtù egwú na isiokwu egwú ha mgbe vidio ahụ na-amalite. Òtù egwú dị iche iche nwere àgwà ndị e ji amata ha, n’ihi ya, ị maraworị òtù egwú na egwú ndị na-agaghị adị mma. N’ihi ya, mgbe ọ bụla m hụrụ e gosiri aha òtù egwú ma ọ bụ egwú rụrụ arụ, ana m agbanwe chanel ahụ. Ozugbo ahụ ọ malitere.”

‘Ikwu Eziokwu n’Obi Gị’

Ọ burugodị na i maara ụkpụrụ Bible dị iche iche nke ọma, ọ dị mfe ịmalite ịnabata ihe ndị na-adịghị mma. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iche na ihe ị na-eme ziri ezi. (Jems 1:22) Bible na-agwa anyị na enyi Chineke bụ onye “na-ekwu eziokwu n’obi ya.” (Abụ Ọma 15:2) N’ihi ya na-agwa onwe gị eziokwu. Zere ịghọgbu onwe gị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na ị na-ele ihe nkiri ndị rụrụ arụ anya dị ka ihe ziri ezi, jụọ onwe gị sị: ‘Jehova ọ̀ ga-akwado m ikiri ihe a n’ezie?’ Cheta na ọtụtụ mgbe, ihe na-esi ike abụghị nanị ịmara ihe bụ́ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, kama gị ikpebi na ị ga-eme ihe ziri ezi! Ị ghaghị ile mmekọrịta gị na Jehova anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ụdị ihe ntụrụndụ ụfọdụ.—2 Ndị Kọrint 6:17, 18.

Ọtụtụ mgbe, ime mkpebi na-esiteghị n’obi dum ịdị na-elezikwu anya ná nhọrọ ndị ị na-eme ezughị. Mkpebi gị pụrụ ịjụ oyi ngwa ngwa ma ọ bụrụ na o sighị ike. Bible na-agwa anyị otú onye nke Chineke aha ya bụ Job si kpebisie ike ikwesị ntụkwasị obi nye nwunye ya. O kwuru sị: “Mụ na anya m abụọ gbara ndụ; m ga-esikwa aṅaa lekwasị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya?” (Job 31:1) Cheedị banyere ya! Job na onwe ya gbara ndụ, ịkpara ihe ndị anya ya ga-ekiri ókè. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ị pụkwara ime otu ihe ahụ. Mee mkpebi siri ike—kwee onwe gị nkwa siri ike—na ị gaghị ekiri ihe ndị na-ezighị ezi. Kpaara onwe gị ókè ụfọdụ. Tinye ya n’ekpere. Nọgidesie ike ná nkwa gị, ọbụna dee ya n’akwụkwọ ma ọ bụrụ na nke ahụ ga-enyere gị aka. Ọ bụrụ na ị chọkwuru enyemaka, gịnị ma i soro onye ị tụkwasịrị obi nke tọrọ gị kwurịta ya—ma eleghị anya ndị mụrụ gị?

N’ihi ihe ize ndụ dị n’ime ya, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị ntorobịa ekpebiwo na ha agaghị ekiri vidio egwú ma ọlị. Ihe ọ bụla bụ mkpebi gị n’okwu a, jiri ikike nghọta gị mee ihe. Nọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha. Site n’ịnọgide na-enwe ntụrụndụ ndị dị ọcha nakwa ndị na-enye obi ụtọ, ị pụrụ izere imerụ onwe gị ahụ́ ma jigide ọbụbụenyi gị na Jehova.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

[Foto dị na peeji nke 20]

Ụfọdụ vidio ndị na-enweghị omume rụrụ arụ pụtara ìhè na-akwalitekwa echiche ndị na-emerụ ahụ́

[Foto dị na peeji nke 21]

Kpebisie ike na ị gaghị ekiri ihe ndị Chineke kpọrọ asị