Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrịa Shuga—“Ogbu na Nwayọọ”

Ọrịa Shuga—“Ogbu na Nwayọọ”

Ọrịa Shuga—“Ogbu na Nwayọọ”

MGBE Ken dị afọ 21, n’ụzọ na-eju anya, ọ malitere inwe akpịrị ịkpọ nkụ, nke na-ekweghị mmejụ. Ọ na-anyụkwa mamịrị ugboro ugboro—o mesịrị na-anyụzi mamịrị ihe dị ka minit 20 ọ bụla. N’oge na-adịghị anya, aka Ken malitere ịnyị ya arọ. Ike na-agwụ ya mgbe nile, ọ malitekwara ịhụ inyoghi inyoghi.

Egwú dagharịrị mgbe Ken butere otu nje virus. Mgbe dọkịta nyochara ya, ọ bịara doo anya na ọ bụghị nanị azụ̀zụ̀ ka Ken nwere—ọ na-arịakwa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ. Nsogbu a nke metụtara mmiri ọgwụ ahụ́ na-akpaghasị ikike ahụ́ nwere iji ihe ụfọdụ na-edozi ahụ́, karịsịa shuga na-adị n’ọbara nke a na-akpọ glucose, eme ihe. Ken nọrọ izu isii n’ụlọ ọgwụ tupu ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị ya n’ọbara agbadaa otú o kwesịrị.

Nke ahụ mere ihe karịrị afọ 50 gara, ụzọ e si agwọ ya akawokwa nnọọ mma n’ime iri afọ ise gara aga. Ka o sina dị, Ken ka na-arịa ọrịa shuga, ọ bụghịkwa nanị ya. A na-eme atụmatụ na n’ụwa nile, ihe karịrị nde mmadụ 140 nwere nsogbu a, dịkwa ka Òtù Ahụ́ Ike Ụwa si kwuo, ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ ịmụba okpukpu abụọ ka ọ na-erule afọ 2025. N’ụzọ kwere nghọta, ndị ọkachamara na-echegbu onwe ha maka otú ọrịa shuga si jupụta ebe nile. “N’iburu ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-arịa ya anyị maliteworo ịhụ n’uche,” ka Dr. Robin S. Goland, bụ́ onye so bụrụ onyeisi n’otu ụlọ ọrụ na-agwọ ọrịa shuga na United States

na-ekwu, “nke a pụrụ ịbụ mmalite nke ntiwapụ nke ọrịa.”

Tụlee akụkọ ndị a dị mkpirikpi sitere gburugburu ụwa:

AUSTRALIA: Dị ka Ụlọ Ọgwụ Mba Nile Maka Ọrịa Shuga nke Australia si kwuo, “ọrịa shuga bụ otu n’ime nsogbu ahụ́ ike sikarịsiri ike ọgwụgwọ na narị afọ nke 21.”

INDIA: Ọ dịkarịa ala, nde mmadụ 30 na-arịa ọrịa shuga. “Ihe dị ka afọ 15 gara aga, o siri ike anyị inwe ndị na-erubeghị afọ 40 na-arịa ya,” ka otu dọkịta kwuru. “Taa otu onye n’ime mmadụ abụọ ọ bụla na-arịa ya erubeghị afọ ndụ a.”

SINGAPORE: Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị nọ n’agbata afọ 30 na 69 n’obodo ahụ, na-arịa ọrịa shuga. A chọpụtawo ọtụtụ ụmụaka—ụfọdụ ndị dị nanị afọ iri—na-arịa ya.

UNITED STATES: Ihe dị ka nde mmadụ 16 na-arịa ya, kwa afọ, a na-achọpụtakwa na ihe dị ka mmadụ 800,000 ndị ọhụrụ na-amalite ịrịa ya. Ọtụtụ nde mmadụ na-arịa ya ma ha amatabeghị.

Ịgwọ ọrịa shuga na-esi ike karị n’ihi na o nwere ike ịdị mmadụ n’ahụ́ ruo ogologo oge tupu a chọpụta ya. “A dịghị achọpụtakarị ọrịa shuga,” ka magazin bụ́ Asiaweek na-ekwu, “n’ihi na mgbaàmà ndị mbụ ọ na-enye adịghị enye nnukwute nsogbu.” N’ihi ya, a kpọwo ọrịa shuga ogbu na nwayọọ.

N’ihi otú nsogbu a si jupụta ebe nile nakwa n’ihi otú ọ dịruru ná njọ, isiokwu ndị na-esonụ ga-eleba anya n’ajụjụ ndị bụ́:

● Gịnị na-akpata ọrịa shuga?

● Olee otú ndị nwere nsogbu ahụ pụrụ isi mee ihe banyere ya?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

Ihe Mere E Ji Kpọọ Ya Ọrịa Shuga

Okwu ndị ndị dọkịta na-eji eme ihe mgbe ha na-akọwa nsogbu ahụ na-ezo aka n’eziokwu ahụ bụ́ na otú mmiri na-esi aga n’ahụ́ onye na-arịa ọrịa shuga na-adị ka a ga-asị na o si n’ọnụ wụnye mmiri, ya esi n’ọwara mamịrị wụpụ n’ala ozugbo. Ọzọkwa, mamịrị ya na-atọ bịrịbịrị n’ihi na shuga dị na ya. N’eziokwu, tupu a chọpụta ụzọ ndị dị irè karị isi chọpụta ọrịa shuga, otu ụzọ e ji mee ihe bụ ịwụsa mamịrị onye na-arịa ọrịa shuga n’akụkụ mkpu. Ọ bụrụ na ọ dọta ụmụ ahụhụ, nke a na-egosi na shuga dị na mamịrị ahụ.