Ọtụtụ Ihe E Ji Ahụekere Eme
Ọtụtụ Ihe E Ji Ahụekere Eme
Ahụekere ọ̀ na-amasị gị? Ya bụrụ otú ahụ, e nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ ọ na-amasị. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ na-ata ahụekere. Mba abụọ ndị kasị nwee ọnụ ọgụgụ mmadụ n’ụwa—China na India—na-akọpụta ihe karịrị pasent 50 nke ahụekere nile a na-akọpụta n’ụwa.
Mba United States na-akọpụta ahụekere dị ọtụtụ ijeri kilogram kwa afọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 10 nke ahụekere nile a na-akọpụta n’ụwa. Argentina, Brazil, Malawi, Nigeria, Senegal, South Africa, na Sudan bụkwa mba ndị bụ́ isi na-akọpụta ahụekere. Olee otú ahụekere si bịa bụrụ ihe na-ewu nnọọ ewu ? Ọ̀ dị mgbe ọ bụ ihe amamihe dị na ya izere ịta ahụekere?
A Maara Ya Eri Oge
A na-eche na a malitere ịkọ ahụekere n’Ebe Ndịda America. Otu n’ime ọrụ nkà ndị kasị mee ochie, nke na-egosi mmasị ụmụ mmadụ nwere n’ahụekere, bụ arịa ịchọ mma e ji mee ihe n’America tupu oge Columbus bụ́ nke a chọtara na Peru. Arịa ịchọ mma ahụ yiri ahụekere, e jikwa ihe osisi ndị yiri ahụekere chọọ ya mma. Ndị Spen na-eme nchọpụta, bụ́ ndị hụrụ ahụekere na nke mbụ ya n’Ebe Ndịda America, hụrụ ya dị ka ezigbo ihe oriri na njem ụgbọ mmiri ha. Ha jikwa ụfọdụ laghachi Europe. Ndị Europe jiri ahụekere mee ihe n’ụzọ ndị ọzọ, ọbụna jiri ya mee ihe n’ọnọdụ mkpụrụ kọfị.
Ka e mesịrị, ndị Portugal webatara ahụekere n’Africa. N’ebe a, a matara ahụekere ozugbo dị ka ihe oriri bara uru nke pụrụ ito n’ala na-adịghị nnọọ eme nri bụ́ ebe ihe ọkụkụ ndị ọzọ na-apụghị ito. N’eziokwu, ahụekere na-eme n’ezie ka nitrogen, bụ́ nke dị nnọọ mkpa, jupụta n’ala na-adịghị eme nri. Ka e mesịrị, e si n’Africa wega ahụekere n’Ebe Ugwu America n’oge ahụ a na-azụ ahịa ohu.
N’afọ ndị 1530, ndị Portugal wegara ahụekere n’India na Macao, ndị Spen wegakwara ya na Philippines. Ndị ahịa sizi n’ala ndị a wega ahụekere na China. N’ebe ahụ, e weere ahụekere dị ka ihe ọkụkụ nke pụrụ inyere mba ahụ aka ịnagide nsogbu nke ụkọ nri.
Ndị ọkà mmụta ihe ọkụkụ, bụ́ ndị dịrị ndụ n’afọ ndị 1700, mere nnyocha banyere ahụekere, ma kwubie na ọ ga-abụ ezigbo ihe oriri maka ezì. Ka ọ na-erule ná mmalite afọ ndị 1800, a kọwalarị ahụekere maka orire na South Carolina dị na United States. Mgbe a na-alụ Agha Obodo America, bụ́ nke malitere n’afọ 1861, ndị soja nọ n’akụkụ abụọ ahụ na-alụ agha jiri ahụekere mere ihe oriri.
Otú ọ dị, n’oge ahụ, ọtụtụ ndị chere na ahụekere bụ nri ndị ogbenye. Echiche a so n’ihe mere ndị ọrụ ugbo nọ n’America n’oge ahụ na-ejighị na-akọ ahụekere hie nne maka oriri. Ọzọkwa, tupu e mepụta ígwè ọrụ e ji akọ ahụekere n’ihe dị ka n’afọ 1900, a na-eji ọtụtụ ndị ọrụ na ego dị ukwuu akọ ya.
Ma, ka ọ na-erule n’afọ 1903, George Washington Carver, onye mbụ bụ́ ọkachamara n’ihe banyere iji ihe ndị a na-akọ n’ugbo emepụta mmiri ọgwụ ndị ọzọ n’America, amalitewo ime nnyocha banyere ihe ndị ọzọ a ga-eji ahụekere mee. O mesịrị jiri ya mepụta ihe dị iche iche karịrị 300, gụnyere ihe ọṅụṅụ, ihe ntecha, ihe e ji esiji ákwà, ọgwụ, ncha e ji asa ákwà, ọgwụ ahụhụ, na ink e ji ebi akwụkwọ. Carver gbakwara ndị ọrụ ugbo nọ n’ógbè ahụ ume ịkwụsị ịkọ nanị ogho, bụ́ nke na-eme ka ike gwụ ala, ma na-eme ha kọtụ ogho, ha akọtụ ahụekere. N’oge ahụ, ụtụ nọ na-ebibi ogho, bụ́ nke mere ka ọtụtụ
ndị ọrụ ugbo gbasoo ndụmọdụ Carver. Gịnị ka ọ rụpụtara?Ahụekere bịara baa nnọọ ụba nke na ọ ghọrọ ihe ọkụkụ bụ́ isi na-enye ego n’ebe ndịda United States. Taa, ihe ncheta nke Carver dị na Dothan, Alabama. Ọbụna obodo bụ́ Enterprise, Alabama, ewuwokwa ihe ncheta nke ụtụ ahụ, ebe ọ bụ na mbibi nke ahụhụ ahụ kpatara nyere aka kpalie ndị ọrụ ugbo ịkọ ahụekere.
Ịkọ Ahụekere
A na-eji aha ahụ bụ́ “ahụekere” eme ihe maka úkwù ahụekere na mkpụrụ ọ na-amị. Ka ahụekere na-eto, ọ na-ama ifuru ndị na-acha odo odo bụ́ ndị na-efesa ntụ okooko n’ahụ́ ibe ha.
Ọnụ ọnụ akwara na-amịpụta ahụekere, bụ́ nke nwere akpụ̀, na-amalite ịbanye n’ime ala. Akpụ̀ a na-atọgbọrọ atọgbọ n’ime ala, ma malite ịka aka, na-enwe ọdịdị a maara nke ọma nke ahụekere. Ihe ruru ahụekere 40 pụrụ ịdị n’otu úkwù ahụekere.
Ahụekere na-eme nke ọma n’ebe na-ekpo ọkụ nke anyanwụ na-acha nke ọma, bụ́ nke mmiri na-adịghị ezokarị na ya. Oge ọ na-ewe tupu a bọọ ya na-adịgasị iche iche, site ụbọchị 120 ruo ụbọchị 160, na-adabere n’ụdị ahụekere a kụrụ nakwa n’ọnọdụ ihu igwe. Iji bọọ ahụekere, ndị ọrụ ugbo aghaghị ifopụta úkwù ahụekere ahụ nile, tụgharịa ha, ma hapụ ha ka ha kọọ ka e wee nwee ike ichekwa ha ka ha ghara imebi. Taa, ọtụtụ ndị na-akọ ahụekere na-eji ígwè ọrụ ọgbara ọhụrụ eme ihe, bụ́ nke na-enyere ha aka ifopụta mkpọrọgwụ ya, kụchapụsịa ájá dị na ya, ma tụgharịa ha n’otu oge ahụ.
Ọtụtụ Ihe A Na-eji Ahụekere Eme
Ahụekere na-enye ọtụtụ ihe n’ahụ́. Ahụekere nwere fiber nke ukwuu, o nwekwara ụdị vitamin 13 na ụdị mineral 26, ndị ọtụtụ n’ime ha na-adịghị n’ihe oriri ndị a na-eri n’oge a. “Ahụekere nwere protein, mineral, na vitamin karịa imeju ehi ya na ya hà n’ịdị arọ,” ka The Encyclopædia Britannica na-ekwu. Ma, ndị na-achọghị ibu ibu ma ọ bụ ndị chọrọ ifelata kwesịrị ịkpachara anya! Ahụekere na-enyekwa “abụba karịa ihe e ji mmiri ara ehi mee,” nweekwa “nri na-enye ume (calorie) karịa shuga.”
A na-eji ahụekere esi nri mba dị iche iche. Ụtọ ya pụrụ iche adịghịkwa esi ike nchọpụta. “Ụtọ ahụekere na-apụta nnọọ ná nri ma pụọ iche nke na nri ọ bụla e tinyere ahụekere na-enwe ụtọ ya,” ka onye na-ede akwụkwọ banyere isi nri, bụ́ Anya von Bremzen, na-ekwu. “N’ihi ya, ofe ahụekere Indonesia, ofe Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ofe China, stuu ndị Peru, na bred a nyara ahụekere a kwọrọ akwọ, na-enwe otu ụtọ.”
Ahụekere bụkwa ihe e ji eme mgbadume bụ́ nke kasị amasị ndị mmadụ gburugburu ụwa. Dị ka ihe atụ, n’India, a na-agwakọta ahụekere na ihe ndị ọzọ na-adị ná mkpo a na-agbawa agbawa, bụ́ ndị a mịkpọrọ amịkpọ ma ree ha n’okporo ámá dị ka mgbadume. N’ụzọ na-akpali mmasị, a kọrọ na ‘otu dọkịta nọ na St. Louis [U.S.A.] jiri ahụekere a kwọrọ akwọ, nke a na-anya na bred, bụ́ nke na-ewu ewu ná mba ụfọdụ, mepụta ihe e ji akwalite ahụ́ ike ndị agadi n’ihe dị ka n’afọ 1890,’ ka akwụkwọ bụ́ The Great American Peanut, kwuru.
Ọ bụghị nanị na a na-ata ahụekere ata, a na-ejikwa ya eme ọtụtụ ihe ndị ọzọ. N’Eshia nile, ahụekere bụ ihe bụ́ isi a na-eji emepụta mmanụ e ji esi nri. A pụrụ iji mmanụ ahụekere dị ezigbo ọkụ sie nri, ụtọ nke ihe ndị e ji ya sie adịghịkwa abanye na ya.
Na Brazil, a na-eji avụrịvụ ahụekere emere nri anụmanụ. A na-ejikwa ahụekere emepụta ọtụtụ ihe ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị.—Lee n’elu.
Kpacharanụ Anya—Ndị Ahụ́ Ha Na-asọ Ahụekere!
A pụrụ idebe ahụekere ruo ogologo oge n’etinyeghị ya na friji. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ka a kpachara anya. Ahụekere mara ebu na-enwe aflatoxin, bụ́ ihe na-akpata nnọọ ọrịa cancer. Ọzọkwa, ahụ́ ụfọdụ ndị na-asọ ahụekere. Ahụ́ mmadụ ịsọ ya “pụrụ ịkpata mgbaàmà ndị na-esite n’imi ọrịrị na ọkọ ruo ná mmetụta dị oké njọ nke pụrụ itinye ndụ n’ihe ize ndụ,” ka magazin bụ́ Prevention na-ekwu. Ọtụtụ nnyocha e mere egosiwo na ahụ́ nke ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụaka na-asọ ahụekere.
Ọ bụrụ na nne na nna nwatakịrị na-arịa ụkwara ume ọkụ, imi nsụchi, ma ọ bụ nwee ụ́gwọ̀, ohere e nwere na ahụ́ nwatakịrị ahụ ga na-asọ ahụekere ga-adị ukwuu karị, ka Prevention na-ekwu.
Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụ ọhụrụ ndị ahụ́ nne ha nọworo na-asọ ihe eri ogologo oge gara aga nakwa ụmụ ọhụrụ ndị ahụ́ ha na-asọ mmiri ara n’ime afọ mbụ ha. “Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ezinụlọ ndị a ịghara inye ụmụaka ahụekere a kwọrọ akwọ ruo mgbe ha ruru ma ọ dịkarịa ala afọ atọ,” ka Dr. Hugh Sampson, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọrịa ụmụaka n’Ụlọ Ọrụ Ahụ́ Ike nke Mahadum Johns Hopkins, nke dị na U.S.A., na-ekwu.
Ma ahụekere ọ̀ na-amasị gị ma ọ bụ na ọ dịghị amasị gị, ikekwe ntụle a a tụlere ọtụtụ ihe a na-eji ya eme emewo ka i jiri mkpụrụ ákụ́kụ́ a, nke a maara ebe nile, kpọrọ ihe karị.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]
Ahụekere Pụrụ Iso n’Ihe Ndị E Ji Mepụta Ọtụtụ Ihe Ndị E Ji Eme Ihe Kwa Ụbọchị
• Bọọdụ e ji akụ ahụ́ ụlọ
• Ihe e ji akwa ọkụ
• Ihe e ji amịkọrọ mamịrị na nsị nwamba
• Akwụkwọ
• Ihe a na-ete n’ọnyá
• Ihe e ji ete ígwè ka ọ na-egbuke egbuke
• Ihe e ji asa ihe ka ọ chaa ezigbo ọcha
• Ink
• Griiz a na-ete n’ígwè
• Mmanụ e ji akpụ afụ ọnụ
• Mmanụ ihu
• Ncha
• Ihe e ji ekpuchi ala ụlọ
• Rọba
• Ihe ntecha
• Ágbá
• Bọmbụ
• Ihe e ji asa ntutu isi
• Ọgwụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: Akwụkwọ bụ́ The Great American Peanut
[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 28]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Akwụkwọ ahụekere
Akụkụ na-amịpụta ahụekere
Elu ala |
Mkpọrọgwụ ahụekere Ahụekere
[Ebe E Si Nweta Foto]
The Peanut Farmer magazine
[Foto dị na peeji nke 28]
Ihe ncheta nke George Washington Carver
[Foto dị na peeji nke 29]
United States
[Foto dị na peeji nke 29]
Africa
[Foto dị na peeji nke 29]
Eshia
[Ebe E Si Nweta Foto]
FAO photo/R. Faidutti
[Foto dị na peeji nke 29]
Ụfọdụ n’ime ụdị mgbadume dị iche iche e ji ahụekere mee
[Foto dị na peeji nke 30]
Ahụekere a kwọrọ akwọ bụ ihe oriri a ma ama n’ala ụfọdụ