Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịma Aka nke Ịgwọ Ọrịa Shuga

Ihe Ịma Aka nke Ịgwọ Ọrịa Shuga

Ihe Ịma Aka nke Ịgwọ Ọrịa Shuga

“Ọ dịghị ọrịa shuga nke na-adịghị njọ. Ha nile dịcha njọ.”—Anne Daly, onye so n’Òtù Na-ahụ Maka Ọrịa Shuga n’America.

“NNYOCHA e nyochara ọbara gị gosiri na e nwere ọtụtụ ihe na-adịghị mma na ya. Ọ dị mkpa ka i nweta nlekọta ahụ́ ike ozugbo.” Okwu dọkịta ahụ wụrụ Deborah ezigbo akpata oyi n’ahụ́. “N’abalị ahụ, anọgidere m na-eche na ọ ghaghị ịbụ na ha mehiere ihe ná nnyocha ahụ,” ka ọ na-ekwu. “Ekwuru m n’ime onwe m na ọ pụghị ịbụ eziokwu na m na-arịa ọrịa.”

Dị ka ọtụtụ ndị, Deborah chere na ahụ́ siri ya ike, n’ihi ya, o leghaara mgbaàmà ndị ọ nọgidere na-enwe anya. O chere na ọ bụ ọgwụ ọkọ ọ na-aṅụ kpatara akpịrị ịkpọ nkụ ọ na-enwe mgbe nile. O chere na ọ bụ nnukwu mmiri ọ na-aṅụ kpatara o ji anyụ mamịrị mgbe mgbe. Banyere ike ọgwụgwụ ọ na-enwe—ọ̀ dịnụ nne na-arụ ọrụ nke ike na-adịghị agwụ?

Ma, ka e mesịrị, nnyocha e mere n’ọbara ya nwapụtara na ọ bụ ọrịa shuga kpatara nsogbu ahụ. O siiri Deborah ike ikweta na ihe dọkịta chọpụtara bụ eziokwu. “Ọ dịghị onye ọ bụla m gwara banyere ọrịa m,” ka ọ na-ekwu. “N’abalị, mgbe ezinụlọ m na-ehi ụra, ana m elegide anya n’ọchịchịrị ma na-ebe ákwá.” Ozugbo ụfọdụ ndị, dị ka Deborah, matara na ha na-arịa ọrịa shuga, ha na-enwe nnọọ nchegbu, gụnyere ịda mbà n’obi na

ọbụna iwe. “Anọgidere m na-ebe ákwá ma jụ ikweta na ọ bụ eziokwu,” ka Karen na-ekwu.

Ihe ndị a bụ mmeghachi omume a na-enwekarị mgbe ihe dị ka ọdachi dakwasịrị mmadụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nye ndị na-arịa ọrịa shuga nkwado, ha pụrụ ime mgbanwe iji nagide ọnọdụ ha. “Nọọsụ na-elekọta m nyeere m aka ịnagide ọnọdụ m,” ka Karen na-ekwu. “O mesiri m obi ike na ọ dịghị njọ ibe ákwá. Ngosipụta nke mmetụta uche a nyeere m aka ime mgbanwe iji nagide ọnọdụ m.”

Ihe Mere O Ji Bụrụ Ọrịa Ọjọọ

A kpọwo ọrịa shuga “mkpaghasị nke isi injin nke ndụ,” e nwekwara ezi ihe kpatara ya. Mgbe ahụ́ na-apụghị ịgbari shuga bụ́ glucose, ọtụtụ usoro ihe ndị na-arụ ọrụ n’ahụ́ pụrụ ịkwụsị ọrụ, mgbe ụfọdụ na-etinye ndụ n’ihe ize ndụ. “Ọrịa shuga adịghị egbu mmadụ kpọmkwem,” ka Dr. Harvey Katzeff na-ekwu, “ọ bụ nsogbu ndị ọ kpatara na-egbu mmadụ. Anyị bụ aka ochie n’igbochi nsogbu ndị na-esite n’ọrịa a, ma anyị adịghị emecha nke ọma n’ihe banyere ịgwọ nsogbu ndị na-esite n’ọrịa a ozugbo ha bilitere.” *

Ọ̀ dị olileanya dịịrị ndị na-arịa ọrịa shuga? Ee—ma ọ bụrụ na ha amata ókè ọrịa ahụ dịruru ná njọ ma gbasoo usoro e ji enye ha ọgwụgwọ. *

Ihe Oriri na Mmega Ahụ́

Ọ bụ ezie na a pụghị igbochi ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ egbochi, ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ banyere ihe mmadụ ketara n’ọmụmụ bụ́ nke ga-eme ka ọ rịa ya, ha na-agbalịkwa ịchọta ụzọ ndị ha pụrụ isi gbochie mwakpo usoro ahụ́ na-eji alụso ọrịa ọgụ na-awakpo mkpụrụ ndụ ndị na-emepụta insulin. (Lee igbe bụ́ “Òkè Shuga Bụ́ Glucose Na-ekere,” na peeji nke 8.) “Ọnọdụ onye na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ adịkebeghị njọ,” ka akwụkwọ bụ́ Diabetes—Caring for Your Emotions as Well as Your Health, na-ekwu. “Ọtụtụ n’ime ndị ọdịdị mkpụrụ ndụ ihe nketa ha pụrụ ime ka ha rịa ọrịa ahụ na-ezere mgbaàmà ọ bụla na-egosi na ha na-arịa ọrịa ahụ nanị site n’iri nri na-edozi ahụ́ na imega ahụ́ mgbe nile, si otú a na-enwe ahụ́ ike ma na-eme ka ịdị arọ ha dịrị n’ókè kwesịrị ekwesị.” *

N’imesi abamuru nke mmega ahụ́ ike, magazin bụ́ Journal of the American Medical Association kọrọ banyere nnyocha e mere n’ebe ọtụtụ ndị inyom nọ. Nnyocha ahụ gosiri na “inwe mmega ahụ́ ruo nwa oge na-amụba ojiji [mkpụrụ ndụ nke ahụ́] na-eji glucose eme ihe site n’enyemaka nke ọgwụ insulin ruo ihe karịrị awa 24.” N’ihi ya, akụkọ ahụ kwubiri na “e jikọtara ma ịga ije ma ime ihe siri ike na mbelata dị ukwuu nke ohere ụmụ nwanyị nwere ịrịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ.” Ndị nnyocha ahụ na-atụ aro ka a na-emega ahụ́ ruo n’ókè dị mma ma ọ dịkarịa ala minit 30 n’ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị ndị dị n’izu ma ọ bụkwanụ n’ụbọchị nile n’izu. Nke ahụ pụrụ ịgụnye ihe dị mfe dị ka ịga ije, bụ́ nke akwụkwọ bụ́ American Diabetes Association Complete Guide to Diabetes na-ekwu na ọ “pụrụ ịbụ mmega ahụ́ nke kasị mma, kasị bụrụ nke na-adịghị ize ndụ, na nke kasị bụrụ nke na-adịghị efu ego.”

Otú ọ dị, ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ́ ike kwesịrị ileba anya ná mmega ahụ́ nke ndị na-arịa ọrịa shuga. Otu ihe mere ha ga-eji mee otú ahụ bụ na ọrịa shuga pụrụ imebi usoro akwara, si otú ahụ na-emetụta nrugharị nke ọbara na ahụ́ inwe mmetụta. N’ihi ya, e nwere ike mmadụ agaghị ama mgbe ihe chihịatụrụ ya ụkwụ, nje abanye ya, ọ ghọọkwa ọnyá—nsogbu dị njọ nke pụrụ ime ka e bepụ ụkwụ mmadụ ma ọ bụrụ na a gwọghị ya ozugbo. *

Ka o sina dị, usoro mmega ahụ́ pụrụ inyere mmadụ aka ịchịkwa ọrịa shuga. “Ka ndị ọkachamara na-amụkwu banyere abamuru ndị dị n’inwe mmega ahụ́ mgbe nile,” ka akwụkwọ bụ́ ADA Complete Guide na-ekwu, “otú ahụ ka ha na-enwetakwu ihe àmà na-egosi na ọ bara uru.”

Iji Ọgwụ Insulin Agwọ Ya

E wezụga iri nri na-edozi ahụ́ na ịgbaso usoro mmega ahụ́, ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa shuga aghaghị ịchọpụtakwa ókè ha nweruru shuga bụ́ glucose n’ahụ́ ha ma na-agba ọgwụ insulin ọtụtụ ugboro n’ụbọchị. N’ihi ịbụ ndị nwere ahụ́ ike ka mma site n’iri ihe na-edozi ahụ́ nakwa n’ịgbaso usoro mmega ahụ́ dị mma, ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ enwewo ike ịkwụsị ịgba ọgwụ insulin, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ruo oge ụfọdụ. * Karen, bụ́ onye na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ, chọpụtara na mmega ahụ́ na-eme ka ọgwụ insulin ọ na-agba rụọ ọrụ nke ọma karị. N’ihi ya, o nwewo ike ibelata insulin ahụ́ ya chọrọ kwa ụbọchị ruo pasent 20.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ahụ́ onye na-arịa ọrịa shuga chọrọ ọgwụ insulin, ọ dịghị ihe mere ọ ga-eji nwee nkụda mmụọ. “Ịmalite ịgba ọgwụ insulin apụtaghị na ị bụ onye na-abaghị n’ihe,” ka Mary Ann, bụ́ nọọsụ gọọmenti nyere ikike, nke na-elekọta ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa shuga na-ekwu. “N’agbanyeghị ụdị ọrịa shuga nke ị na-arịa, ọ bụrụ na ị chịkwaa ọ̀tụ̀tù shuga dị n’ọbara gị, ị ga-ebelata nsogbu ahụ́ ike ndị ọzọ ị ga-enwe n’ọdịnihu.” N’eziokwu, nnyocha e mere na nso nso a na-egosi na ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ, bụ́ ndị chịkwara nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara ha “belatara nnọọ ihe ize ndụ nke ịbụ ndị nwere ọrịa anya, ọrịa akụrụ, nakwa ọrịa akwara bụ́ ndị ọrịa shuga na-akpata.” Dị ka ihe atụ, ha belatara ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa anya ruo pasent 76! Ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ, bụ́ ndị na-achịkwa nnọọ ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara ha na-enwetakwa otu abamuru ahụ.

Iji mee ka ọ dịkwuo mfe iji ọgwụ insulin gwọọ ọrịa nakwa ime ka ọ ghara ịkpatacha mmetụta ndị na-adịghị mma, ndụdụ—bụ́ ngwá ọrụ a kasị eji eme ihe—na-enwe obere ntụtụ na-adịchaghị afụ ụfụ. “Nke mbụ a gbara mmadụ na-akasị afụ ụfụ,” ka Mary Ann na-ekwu. “Mgbe nke ahụ gasịrị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọrịa na-ekwu na ha adịchaghịzi anụ ụfụ ya.” Ụzọ ndị ọzọ e si agba ọgwụ insulin na-agụnye ngwá ndị na-eji aka ha adụnye ntụtụ n’ahụ́ mmadụ n’ụzọ ọ na-agaghị afụ onye ahụ ụfụ, ngwá ndị na-esite n’akpụkpọ ahụ́ agbaba ọgwụ insulin n’ahụ́ mmadụ site n’ịgbapụ ya ka mgbọ égbè nakwa obere tuubu ndị e ji agba ọgwụ bụ́ ndị a na-etinye n’ahụ́ mmadụ ruo ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ. Ígwè na-agbanye ọgwụ insulin n’ahụ́, bụ́ nke fọrọ nke nta ka ọ hà ka ígwè ozi pager, abụwo nke ọtụtụ ndị na-eji eme ihe n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ígwè ọrụ a a rụnyere ihe na-achịkwa usoro ịrụ ọrụ ya na-anọgide na-esi na tuubu agbanye ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụ insulin ahụ́ chọrọ kwa ụbọchị, na-eme ka ọgwụ insulin a na-agbanye n’ahụ́ bụrụ nke a kapịrị ọnụ nakwa nke a gbanyere n’ụzọ dị mfe karị.

Nọgide Na-enweta Ihe Ọmụma

Ọbụna mgbe a tụlesịrị ihe nile, ọ dịghị otu usoro ọgwụgwọ e nwere maka ọrịa shuga nile. Mgbe a na-atụle ụdị ọgwụgwọ a ga-ahọrọ, onye ọ bụla aghaghị ịtụle ọtụtụ ihe iji mee mkpebi onwe ya. “Ọ bụrụgodị na ìgwè ndị ọrụ ahụ́ ike na-elekọta gị,” ka Mary Ann na-ekwu, “ọ bụ gị ga-ekpebi ụdị ọgwụgwọ ị chọrọ.” N’eziokwu, akwụkwọ bụ́ Diabetes Care na-ekwu, sị: “A pụrụ ile inye mmadụ ọgwụgwọ maka ọrịa shuga n’enyeghị ya ihe ọmụma zuru ezu banyere ụzọ ọ ga-esi na-achịkwa ya anya dị ka nlekọta na-adịchaghị otú o kwesịrị na nke megidere ụkpụrụ nlekọta ahụ́ ike.”

Ka ndị na-arịa ọrịa shuga na-amụtakwu banyere ọrịa ha na-arịa, otú ahụ ka ha ga-abụkwu ndị dị njikere ilekọta ahụ́ ike ha ma mụbaa olileanya ha nwere ịdị ogologo ndụ karị na inwe ahụ́ ike ka mma. Otú ọ dị, mmụta dị irè na-achọ ndidi. Akwụkwọ bụ́ Diabetes—Caring for Your Emotions as Well as Your Health na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na ị nwaa ịmata ihe nile n’otu oge, o yikarịrị ka ị ga-enwe mgbagwoju anya ma ghara iji ihe ọmụma ahụ mee ihe n’ụzọ dị irè. E wezụga nke ahụ, ihe ka ukwuu n’ihe ọmụma ndị kasị baa uru, bụ́ ndị ọ ga-adị mkpa ka i nweta, adịghị n’akwụkwọ. Ihe ị ga-amụta bụ . . . otú ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara gị si agbanwe mgbe ị gbanwere ihe omume. A pụrụ ịmụta nke a nanị mgbe oge ụfọdụ gasịrị, site n’ime ọtụtụ nnwale.”

Dị ka ihe atụ, site n’iji nlezianya mee nnyocha, ị ga-amata otú ahụ́ gị na-esi emeghachi omume mgbe i nwere nrụgide, bụ́ nke pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara gị rịa elu. “Arịawo m ọrịa shuga ruo afọ 50,” ka Ken na-ekwu, “amakwaara m otú ahụ́ m na-esi emeghachi omume!” Ichebara otú ahụ́ ya na-esi emeghachi omume echiche abaworo Ken uru, n’ihi na Ken ka na-arụ ọrụ oge nile ruo ugbu a—n’agbanyeghị na ọ gafeela afọ 70!

Mkpa Nkwado Ezinụlọ Dị

Ihe a na-agaghị eleghara anya n’ịgwọ ọrịa shuga bụ nkwado nke ezinụlọ. N’eziokwu, otu akwụkwọ na-ekwu na “ọdịdị nke ndụ ezinụlọ n’ozuzu ya, bụ ma eleghị anya isi ihe na-enye aka” n’ịchịkwa ọrịa shuga na-arịa ụmụaka na ndị ntorobịa.

Ọ bara uru ma ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ amụọ ihe banyere ọrịa shuga, ọbụna na-eme otu onye soro onye ahụ na-arịa ọrịa shuga gaa hụsịa dọkịta onye ọzọ esoro ya gaa oge ọzọ. Ihe ọmụma banyere ya ga-enyere ha aka inye nkwado, ịmata mgbaàmà ndị dị mkpa, na ịma ụzọ ha ga-esi meghachi omume. Ted, bụ́ onye nwunye ya na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ kemgbe ọ dị afọ anọ, na-ekwu, sị: “Apụrụ m ịmata mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara Barbara gbadara ala nke ukwuu. Ọ na-agbachi nkịtị mgbe a nọ n’etiti mkparịta ụka. Ọsụsọ na-agba ya nke ukwuu, ọ na-amalitekwa iwe iwe na-enweghị isi. Ụzọ ọ na-esikwa emeghachi omume n’ihe na-ebelata.”

N’otu aka ahụ, mgbe Catherine, bụ́ nwunye Ken, hụrụ ka Ken na-amalite ịta ahụ́ na ịnọ oké jụụ, mgbe ọ hụkwara na ọnọdụ uche ya agbanweela, ọ na-ajụ ya ajụjụ dị mfe. Ọ bụrụ na azịza Ken egosi na o nweela mgbagwoju anya, Catherine na-amata na oge eruola mgbe ọ ga-eweghara ibu ọrụ nke ime mkpebi ma mee ihe ngwa ngwa iji dozie ọnọdụ ahụ. Ma Ken ma Barbara na-enwe nnọọ obi ekele maka inwe ndị òtù ọlụlụ maara nke a na-akọ bụ́ ndị ha hụrụ n’anya ma tụkwasị obi kpam kpam. *

Ndị òtù ezinụlọ nwere ịhụnanya kwesịrị ịgbalị ịdị na-enye nkwado, na-egosi obiọma, ma na-enwe ndidi—àgwà ndị pụrụ inyere onye na-arịa ọrịa aka iche ihe ịma aka ndị a na-enwe ná ndụ ihu nakwa ndị pụrụ ọbụna ime ka ọrịa ya belata. Di Karen mesighachiri ya obi ike na ya hụrụ ya n’anya, bụ́ nke nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ya. Karen na-akọ, sị: “Nigel gwara m, sị, ‘Ọ dị ndị mmadụ mkpa iri nri na ịṅụ mmiri iji dịgide ndụ, dị nnọọ ka ihe oriri na mmiri dị gị mkpa—nakwa obere ọgwụ insulin.’ Okwu ọma ndị a, bụ́kwa ndị bara uru, bụ nnọọ ihe ahụ́ m chọrọ.”

Ọ dịkwa mkpa ka ndị ezinụlọ na ndị enyi ghọta na ka ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara na-arị elu ma na-arịda, ọrịa shuga pụrụ imetụta ọnọdụ uche mmadụ. “Mgbe m nwere ịda mbà n’obi n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara m,” ka otu nwanyị na-ekwu, “M na-anọrọ nnọọ nwayọọ, jụọ nnọọ oyi, na-ewe iwe ọsọ ọsọ, na-enwekwa nkụda mmụọ. Mgbe ahụ, ọ na-ewute m nke ukwuu na m kpara nnọọ àgwà ụmụaka. Ma ọ na-enye aka mgbe m matara na ndị ọzọ ghọtara ihe mere m ji enwe mmetụta ndị a—bụ́ ndị m na-agbalị ịchịkwa.”

A pụrụ ịchịkwa ọrịa shuga n’ụzọ gara nke ọma, karịsịa ma ọ bụrụ na onye na-arịa ya enwee ndị enyi na ndị òtù ezinụlọ na-akwado ya. Ụkpụrụ Bible dị iche iche pụkwara inye aka. N’ụzọ dị aṅaa?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Nsogbu ndị ahụ gụnyere ọrịa obi, ọrịa strok, arụzighị ọrụ nke akụrụ, ọrịa akwara ụkwụ na aka, na mbibi nke akwara ozi. Ụkwụ inweta ọbara dị nta pụrụ ịkpata ọnyá, bụ́ nke, n’ọnọdụ ndị dị oké njọ, na-achọ ka e bepụ ụkwụ nke nwere nsogbu ahụ. Ọrịa shuga bụkwa ihe kasị akpata ikpu ìsì n’etiti ndị toworo eto.

^ par. 10 Teta! adịghị akwalite otu usoro ọgwụgwọ kpọmkwem. Ndị chere na ha na-arịa ọrịa shuga kwesịrị ịga hụ dọkịta nwere ahụmahụ n’igbochi nakwa n’ịgwọ ọrịa ahụ.

^ par. 12 Ndị nwere abụba gabigara ókè n’afọ yiri ka ha ga-anọ n’ihe ize ndụ karịa ndị nwere abụba n’úkwù.

^ par. 14 Ndị na-ese siga na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ ọbụna karị, n’ihi na ise siga ha na-emebi obi ha na usoro ọbara ji erugharị n’ahụ́ ha, ọ na-asụchikwa ime akwara. Otu akwụkwọ na-ekwu na pasent 95 nke ndị e bepụrụ ụkwụ ha n’ihi ọrịa shuga bụ ndị na-ese siga.

^ par. 17 Ịṅụ ọgwụ nyeere ụfọdụ n’ime ndị a aka. Nke a na-agụnye ọgwụ ndị na-akpali anyịnya imepụtakwu insulin, ọgwụ ndị ọzọ na-ebelata ịrị elu nke ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara, ndị ọzọkwa bụ ndị na-ebelata ókè ahụ́ ji ajụ insulin. (Ndị dọkịta adịghị atụkebe aro ka ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ na-aṅụ ọgwụ aṅụ.) Ka ọ dịgodị, a pụghị ịṅụ insulin aṅụ, n’ihi na usoro mgbari nri na-agbari protein a tupu ọ banye n’ọbara. Ma iji insulin agwọ ya ma ịṅụ ọgwụ aṅụ adịghị nke na-eme ka mmega ahụ́ na nri na-edozi ahụ́ gharazie ịdị mkpa.

^ par. 27 Ndị ọrụ ahụ́ ike na-atụ aro ka ndị na-arịa ọrịa shuga na-eji kaadị e ji amata ha mgbe nile ma na-agba ọla e ji amata ha. Mgbe ihe siri ike, ihe ndị a pụrụ ịzọpụta ndụ. Dị ka ihe atụ, a pụrụ iche n’ụzọ hiere ụzọ na mmetụta e nwere n’ihi ịdị ala nke ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara bụ ọrịa ọzọ ma ọ bụ ọbụna nke nsogbu sitere n’ịṅubiga mmanya ókè kpatara.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

Ọ̀ Na-arịakwu Ndị Na-eto Eto?

Ọrịa shuga “na-aghọzi ọrịa ndị na-eto eto,” ka Dr. Arthur Rubenstein, bụ́ onyeisi ndị ọkà mmụta mmiri ọgwụ ahụ́ nakwa onyeisi Ụlọ Akwụkwọ Nkà Ọgwụ Mount Sinai nke New York, na-ekwu. Nkezi afọ ndụ mgbe ọrịa shuga na-amalite na-adalata adalata n’ezie. “Afọ iri gara aga, anyị na-akụziri ụmụ akwụkwọ na-amụ banyere nkà ọgwụ na ndị na-erubeghị afọ 40 adịghị arịa ọrịa a,” ka ọkachamara n’ihe banyere ọrịa shuga bụ́ Dr. Robin S. Goland na-ekwu banyere ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ. “Ugbu a ndị na-erubeghị afọ 10 na-arịa ya.”

N’ihi gịnị ka ọnụ ọgụgụ ndị ntorobịa na-arịa ọrịa shuga ji na-arị elu? Mgbe ụfọdụ ọ na-esite n’ọbara. Ma otú mmadụ hà n’ibu na gburugburu ebe obibi pụkwara iso kpata ya. Ọnụ ọgụgụ ụmụaka bubigara ibu ókè amụbawo okpukpu abụọ n’ime iri afọ abụọ gara aga. Gịnị kpatara nke a? “E nwewo ọtụtụ mgbanwe n’otú e si eri nri nakwa n’otú e si emega ahụ́ n’ime ihe karịrị afọ 20 gara aga,” ka Dr. William Dietz nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa nke United States, na-ekwu. “Ha na-agụnye iri nri n’ụlọ nri karị; nhapụ a na-ahapụwanye iri nri ụtụtụ; ọṅụṅụ a na-aṅụwanye mmanya ọtọ bịrịbịrị na oriri a na-eriwanye nri onye ọ dị ngwa ngwa; mbelata nke [mmụta mmega ahụ́] n’ụlọ akwụkwọ; na mmechi e mechiri oge nkwụsịtụ n’ụlọ akwụkwọ.”

A pụghị ịgwọtacha ọrịa shuga. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgbaso ndụmọdụ nke otu onye nọ n’afọ iri na ụma nke na-arịa ọrịa shuga nyere, bụ́ onye kwuru n’ụzọ dị mfe, sị: “Zere nri ratụ ratụ ma nọgide na-enwe ahụ́ ike.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8, 9]

Òkè Shuga Bụ́ Glucose Na-ekere

Shuga bụ́ glucose na-enye ọtụtụ ijeri mkpụrụ ndụ dị n’ahụ́ ike. Otú ọ dị, iji banye ná mkpụrụ ndụ ndị ahụ, ọ chọrọ “mkpịsị ugodi”—insulin, bụ́ mmiri ọgwụ ahụ́ nke anyịnya na-ewepụta. Ahụ́ onye na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ adịtụghị emepụta insulin. Ahụ́ onye na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ na-emepụtakarị insulin n’ụzọ na-ezughị ezu. * Ọzọkwa, mkpụrụ ndụ onye ahụ adịghị ekwe ka insulin bata—nsogbu a na-akpọ ahụ́ ịjụ insulin. Ihe na-esicha n’ụdị abụọ ahụ nke ọrịa shuga apụta bụ otu ihe: mkpụrụ ndụ ndị agụụ ji na ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké elu ma ọ bụ oké ala nke shuga dị n’ọbara.

N’ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ, usoro ahụ́ mmadụ na-eji alụso ọrịa ọgụ na-awakpo mkpụrụ ndụ ndị na-emepụta insulin n’anyịnya. N’ihi ya, ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ bụ ọrịa nke usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ na-akpata. Ihe ndị pụrụ ịkpali usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ na-agụnye nje, mmiri ọgwụ ndị nwere nsí, na ọgwụ ụfọdụ. Mkpụrụ ndụ ihe nketa pụkwara iso kpata ya, n’ihi na ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ na-arịakarị ezinụlọ ụfọdụ, a na-ahụkarịkwa ya n’etiti ndị ọcha.

A bịa n’ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ, mkpụrụ ndụ ihe nketa na-ekere òkè ọbụna karị, ma ọ bụ ndị na-abụghị ndị ọcha na-arịakarị ya. Ndị mbụ biri n’Australia na ndị American Indian so ná ndị ọ kasị emetụta, ndị American Indian bụkwa ndị kasị arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ n’ụwa. Ndị nnyocha na-amụ banyere njikọ dị n’etiti mkpụrụ ndụ ihe nketa na ibu oké ibu, nakwa otú o si eyi ka inwe abụba hie nne ọ̀ na-emekwu ka ahụ́ ụfọdụ ndị na-ajụ insulin. * N’adịghị ka ọrịa shuga Ụdị nke Mbụ, ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ na-arịakarị ndị gafeworo afọ 40.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 45 Ihe dị ka pasent 90 nke ndị na-arịa ọrịa shuga na-arịa Ụdị nke Abụọ ya. N’oge mbụ, a na-akpọ ya ọrịa shuga nke “na-achọghị insulin” ma ọ bụ ọrịa shuga nke “na-amalite mgbe mmadụ tozuru etozu.” Otú ọ dị, aha ndị a akọwaghị ya kpọmkwem n’ihi na ahụ́ nke ihe ruru pasent 40 nke ndị na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ na-achọ insulin. Ọzọkwa, a na-achọpụta na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị na-eto eto—ndị ụfọdụ ha na-erubedịghị ọbụna afọ iri na ụma—na-arịa ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ.

^ par. 47 A na-elekarị mmadụ anya dị ka onye bubigara ibu ókè ma ọ bụrụ na ịdị arọ ya ji pasent 20 ma ọ bụ karị gafee otú o kwesịrị.

[Foto]

Irighiri shuga bụ́ glucose

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke: Pacific Northwest National Laboratory

[Igbe dị na peeji nke 9]

Òkè Anyịnya Na-ekere

N’ịbụ nke fọrọ obere ka ọ haruo ka unere, anyịnya na-adị n’azụ afọ. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Unofficial Guide to Living With Diabetes si kwuo, “anyịnya, nke na-enweghị ọrịa, na-arụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị iji hụ na ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara dịziri adịzi, na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara dịrị otú kwesịrịnụ site n’iwepụta ọ̀tụ̀tụ̀ insulin kwesịrị ekwesị mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ shuga bụ́ glucose na-arị elu ma na-adalata n’ụbọchị dum.” Ọ bụ mkpụrụ ndụ bụ́ beta ndị dị n’anyịnya na-emepụta mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ insulin.

Mgbe mkpụrụ ndụ bụ́ beta na-emepụtaghị mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ insulin zuru ezu, glucose na-ejubiga ókè n’ọbara. Ọnọdụ nke ọzọ bụ oké ịdị ala nke ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara. Imeju, ya na anyịnya, na-ejikọ aka achịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ shuga dị n’ọbara site n’ichekwa glucose mapụtara amapụta n’ụdị a na-akpọ glycogen. Mgbe anyịnya nyere imeju ihe àmà, imeju na-emegharị glycogen ịghọ glucose nke ahụ́ ga-eji mee ihe.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]

Òkè Shuga Na-ekere

Ọtụtụ ndị na-eche n’ụzọ na-ezighị ezi na iribiga shuga ókè na-akpata ọrịa shuga. Ihe àmà e nwetara site n’aka ndị na-amụ banyere ọgwụ na-egosi na ibu ibu—n’agbanyeghị ókè mmadụ na-eriru shuga—na-amụba ohere ndị mkpụrụ ndụ ihe nketa ha pụrụ ime ka ha rịa ọrịa shuga nwere ike ịrịa ya. Ma, iribiga shuga ókè adịghị mma, ebe ọ bụ na ọ dịghị ezigbo ihe ọ na-enye n’ahụ́, ọ na-akpatakwa ibu oké ibu.

Echiche ọzọ na-ezighị ezi e nwere bụ na agụụ shuga na-agụkarị ndị na-arịa ọrịa shuga. Otú ọ dị, n’ezie, agụụ ihe ndị na-atọ ụtọ na-agụ ha otú ahụ ọ na-esi agụ ihe ka ọtụtụ ná ndị ọzọ. Ọ bụrụ na a chịkwaghị ọrịa shuga, ọ pụrụ ịkpata agụụ—ma ọ bụchaghị agụụ shuga. Ndị na-arịa ọrịa shuga pụrụ iri ihe ndị na-atọ bịrịbịrị, ma ha aghaghị iburu n’uche ọ̀tụ̀tụ̀ shuga ha kwesịrị iri n’oge ha na-akwadebe ihe oriri nile ha.

Nnyocha ndị e mere na nso nso a egosiwo na ihe oriri nwere fructose nke ukwuushuga na-adị ná mkpụrụ osisi nakwa n’akwụkwọ nri—pụrụ iso kpata ahụ́ ịjụ ịnabata insulin, ọ pụkwara ọbụna ịkpatara ụmụ anụmanụ ọrịa shuga, n’agbanyeghị ókè ha hà n’ibu.

[Ihe Osise/Foto ndị dị na peeji 8, 9]

Ọrịa Shuga A Kọwara n’Ụzọ Dị Mfe

ANYỊNYA

↓ ↓ ↓

Onye Ji Ahụ́ Ọrịa Shuga Ụdị Ọrịa Shuga Ụdị

nke Mbụ nke Abụọ

Mgbe mmadụ risịrị Usoro ahụ́ ji alụso N’ọnọdụ ka ukwuu,

nri, anyịnya ọrịa ọgụ na-awakpo anyịnya na-emepụta

na-emeghachi omume mkpụrụ ndụ ndị dị insulin ruo

n’ihi mmụba nke n’anyịnya bụ́ ndị n’ókè ụfọdụ

ọ̀tụ̀tụ̀ shuga bụ́ na-emepụta insulin.

glucose dị n’ọbara, N’ihi ya, ahụ́ adịghị

na-ewepụta ọ̀tụ̀tụ̀ emepụta insulin

kwesịrị ekwesị nke

mmiri ọgwụ ahụ́

bụ́ insulin

↓ ↓ ↓

Ụmụ irighiri E wezụga enyemaka nke Ọ bụrụ na ihe ndị

insulin na-arapara insulin, ụmụ irighiri na-anabata insulin

n’ahụ́ ihe ndị shuga bụ́ glucose adịchaghị anabata

na-anabata ya bụ́ apụghị ịbanye n’ime ya, a gaghị akpali

ndị dị ná mkpụrụ mkpụrụ ndụ ihe dị mkpa bụ́ nke

ndụ ndị dị n’uru na-amịkọrọ shuga bụ́

ahụ́ na mkpụrụ ndụ glucose dị n’ọbara

ndị ọzọ. Nke a, ịmalite ọrụ

n’aka nke ya,

na-akpali usoro

na-eme ka ụmụ

irighiri shuga bụ́

glucose banye n’ime

mkpụrụ ndụ ndị dị

n’uru ahụ́

↓ ↓ ↓

Mkpụrụ ndụ ndị dị Shuga bụ́ glucose na-ejupụta

n’uru ahụ́ na-amịkọrọ n’ọbara, na-akpaghasị

shuga bụ́ glucose ma usoro ndị dị mkpa ma

gbarie ha. N’ihi ya, na-emebi okpo akwara

ọ̀tụ̀tụ̀ shuga bụ́ glucose

dị n’ọbara na-adịghachi

otú o kwesịrị

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Mkpụrụ ndụ

Ihe na-anabata insulin

Ihe na-amịkọrọ shuga

Mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ insulin

Etiti mkpụrụ ndụ

Shuga bụ́ glucose

[Ihe Osise]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

OKPO ỌBARA

Mkpụrụ ndụ ọbara uhie

Shuga bụ́ glucose

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mmadụ: The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

[Foto dị na peeji nke 7]

Ihe oriri kwesịrị ekwesị dị mkpa maka ndị na-arịa ọrịa shuga

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ndị na-arịa ọrịa shuga pụrụ ime ihe dị iche iche a na-eme ná ndụ