Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe E Ji Oge Ịbụ Nwata Kpọrọ Ihe

Mgbe E Ji Oge Ịbụ Nwata Kpọrọ Ihe

Mgbe E Ji Oge Ịbụ Nwata Kpọrọ Ihe

NWATAKỊRỊ ịnụ ụtọ oge ọ bụ nwata na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ọzụzụ dị mma nke nne na nna ya. Ma gịnị ka nne na nna ịzụ ụmụ ha nke ọma gụnyere? Ikekwe, ị nụtụwo okwu ndụmọdụ banyere nke a. Wepụta oge iji soro ụmụ gị nọrịa. Na-ege ha ntị. Na-enye ha nduzi rijuru afọ. Na-egosi ha mmetụta, na-ekere òkè n’ọṅụ nakwa n’iru újú ha. Bụrụ ezi enyi ha n’agbahapụghị ikike i nwere dị ka nne ma ọ bụ nna. N’ezie, ụkpụrụ ndị ahụ a na-atụkarị n’aro ga-enyere nne na nna aka ịrụ ọrụ ha nke ọma. Ma e nwere ihe bụ́ isi ma dị mkpa karị bụ́ nke na-aghaghị ibute ụzọ.

Ọtụtụ nde ndị nne na nna gburugburu ụwa achọpụtawo na ịgbaso ụkpụrụ Bible bụ isi ihe na-eme ka a zụọ ụmụ nke ọma. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ Onye amamihe ahụ nke chepụtara ihe e dere na Bible, bụ́ Jehova Chineke, guzobere ndokwa ezinụlọ. (Jenesis 1:27, 28; 2:18-24; Ndị Efesọs 3:15) Ya mere, dị ka o kwesịrị ịdị, Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ bụ ebe kasị mma ilega anya maka nduzi banyere ịzụ ụmụ. Otú ọ dị, olee otú akwụkwọ meworo ochie dị ka Bible pụrụ isi nye ihe ọmụma banyere ihe a na-eme n’oge a nke ịmanye ụmụaka iji ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka? Ka anyị tụlee ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ndị metụtara nke a.

“Dị Ka Ijeụkwụ nke Ụmụ M Si Dị”

Jekọb, nwa Aịzik, bụ nna nke ihe karịrị ụmụ 12. Bible dekọrọ okwu amamihe ya banyere njem ezinụlọ ya mere: “Ụmụ m adịghị ike . . . Ka onyenwe m [Ịsọ, nwanne Jekọb nke tọrọ ya] gabiga n’ihu ohu ya: ma mụ onwe m, ka m na-edu ha nwayọọ nwayọọ . . . dị ka ijeụkwụ nke ụmụ m si dị.”—Jenesis 33:13, 14.

Jekọb maara na ụmụ ya apụghị ime ihe dị ka ndị tozuworo okè. Ha “adịghị ike”—ha dị obere, dị peke peke, ma nwee mkpa karịa ndị toworo eto. Kama ịmanye ụmụ ya ime njem dị ka ijeụkwụ ya si dị, o selatara ụkwụ ya iji kwekọọ na nke ha. N’ụzọ dị otú a, o ṅomiri amamihe nke Chineke na-egosipụta n’ebe ụmụ ya bụ́ mmadụ nọ. Nna anyị maara ebe ike anyị ruru. Ọ dịghị achọ ihe n’aka anyị karịa ka o kwesịrị.—Abụ Ọma 103:13, 14.

Ọbụna ụmụ anụmanụ ụfọdụ na-egosipụta amamihe dị otú ahụ, n’ihi na Chineke mere ka ha nwee “amamihe . . . e kenyere ekenye n’ime ha.” (Ilu 30:24, NW) Dị ka ihe atụ, ndị ọkà mmụta ihe ndị si n’okike achọpụtawo na ìgwè enyí dum na-eselata ụkwụ iji mee ka ijeụkwụ ha kwekọọ na nke nwa enyí nọ n’etiti ha, jiri nwayọọ nwayọọ na-eje ruo mgbe obere enyí ahụ ga-enwe ike isoro ha jesiwa ije ike.

Ụfọdụ ndị n’etiti ọha mmadụ elegharawo amamihe Chineke anya. Ma ọ bụghị iwu na ị ga-eso ha. Buru n’uche na nwa gị “adịghị ike”—o nweghị ike iburu ibu arọ na ibu ọrụ dịịrị onye toworo eto. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ bụ́ onye nwere nsogbu ụfọdụ ma nwee ọchịchọ ịkọrọ nwa gị ihe nzuzo gị, guzogide ọchịchọ ahụ. Kama nke ahụ, chọọ enyi gị tozuworo okè bụ́ onye pụrụ inyere gị aka ime ihe maka nsogbu ahụ n’ụzọ dị irè—ọ ga-akasị mma ma ọ bụrụ onye ga-enyere gị aka itinye ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Bible nyere n’ọrụ.—Ilu 17:17.

N’otú aka ahụ, ekwela ka ndụ nwa gị bụrụ nnọọ nke jupụtara ná nsogbu, nke e ji ozi gbaa gburugburu, nke a kapịrị nnọọ ihe nile ọnụ na ya, nke na ụtọ nile a na-anụ ná ndụ ntorobịa ga-emi ala. Setịpụrụ nwa gị ijeụkwụ ya na ya hà, ọ bụghị nke iji ìsì na-agbaso ijeụkwụ nke ụwa nke oge a. Bible na-enye ndụmọdụ n’ụzọ amamihe, sị: “Ekwela ka ụwa nke gbara gị gburugburu kpụzie gị otú o si chọọ.”—Ndị Rom 12:2, Phillips.

“Ihe Ọ Bụla Nwere Oge”

Ụkpụrụ Bible ọzọ nke amamihe dị na ya na-ekwu, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe.” N’ezie, e nwere oge maka ọrụ. Ụmụaka nwere ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ—gụnyere ọrụ ụlọ akwụkwọ, ozi ndị dị n’ụlọ, na ihe ime mmụọ. Otú ọ dị, akụkụ Bible ahụ na-ekwukwa na e nwekwara “mgbe ịchị ọchị” na “mgbe ite egwú.”—Eklisiastis 3:1, 4.

Ụmụaka nwere mkpa pụrụ iche maka igwuri egwu, ịchị ọchị, igosipụta ume ntorobịa ha n’ụzọ nke enweghị nnọọ nchekasị ọ bụla. Ọ bụrụ na oge nile ha mụ anya bụ nke e ji ihe omume ụlọ akwụkwọ, na ihe omume ndị a na-eme mgbe a gbasara akwụkwọ, na ibu ọrụ ndị ọzọ siri ike mejupụta, mgbe ahụ, a gaghị egbo mkpa ha nwere igwuri egwu. Nke ahụ, n’aka nke ya, pụrụ ịkpasu ha iwe, ọbụnakwa mee ka ha daa mbà n’obi.—Ndị Kọlọsi 3:21.

Tụlee otú a pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible ahụ n’ọrụ n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na ihe nile nwere oge, nke ahụ ọ́ dịghị egosi na oge ịbụ nwata bụ oge nwata kwesịrị iji bie ndụ dị ka nwata? Ma eleghị anya, ị ga-aza ee, ma ụmụ gị nwere ike ghara ikwenye mgbe nile. Mgbe mgbe, ụmụaka ndị nwoke na ndị nwanyị na-achọkarị ime ihe ha hụrụ ndị toworo eto na-eme. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịkpali ụmụaka nwanyị iji ejiji dị ka à ga-asị na ha bụ ndị inyom toworo eto. Mmalite nke mgbanwe ndị a na-enwe n’ahụ́ nwa agbọghọ na-etopụta etopụta pụrụ ịmụba nrụgide ha na-enwe ime ka o yie ka ha emeela okenye karị.

Ndị nne na nna maara ihe na-ahụ ihe ize ndụ dị n’ọchịchọ dị otú ahụ. Mkpọsa ngwá ahịa na ihe ngosi ụfọdụ n’ụwa a rụrụ arụ na-eme ka ụmụaka yie ndị maara nke a na-akọ n’ụzọ mmekọahụ na ndị tozuworo okè. Ụmụaka na-ejiwanyezi ihe otite, ọla, na ụdị uwe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ eme ihe. Ma ọ̀ baranụ uru ime ka ụmụaka na-adọrọkwu anya ndị rụrụ arụ bụ́ ndị na-achọdịịrị imegbu ha n’ụzọ mmekọahụ? Site n’inyere ụmụaka aka iji ejiji n’ụzọ kwekọrọ n’afọ ndụ ha, ndị nne na nna na-etinye ụkpụrụ Bible ọzọ n’ọrụ: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.”—Ilu 27:12.

Ihe atụ ọzọ: Ikwe ka egwuregwu ghọọ ihe kasị mkpa nye nwatakịrị pụrụ iduga ya n’ibi ndụ a na-ahazighị ahazi, nke ihe ọ bụla na-enweghịzi oge e ji eme ya. Bible na-adụ ọdụ n’ụzọ amamihe, sị: “Ọzụzụ nke ahụ́ bara uru nke nta; ma nsọpụrụ Chineke bara uru maka ihe nile, ebe o nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.”—1 Timoti 4:8.

Ekwela ka ụmụ gị nakwere echiche ahụ bụ́ na “ọ dịghị ihe dị mkpa karịa inwe mmeri.” Ọtụtụ ndị nne na nna na-eme ka egwuregwu gharazie ịdị ụtọ site n’ịrụgide ụmụ ha ịdị na-asọ mpi gabiga ókè, imeri n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu. N’ihi ya, a na-eduba ụmụaka ụfọdụ n’ịghọ aghụghọ ma ọ bụ ọbụna n’imerụ ndị ọzọ na-eme egwuregwu ahụ́ iji merie. N’ezie, mmeri erughị ifu ihe dị otú ahụ!

Ịmụta Njide Onwe Onye

Ọ na-esikarịrị ụmụaka ike ịmụta na ihe nile nwere oge. Ọ dịghị adịrị ha mfe iji ndidi chere mgbe ihe dị ha mkpa. Iji mee ka ihe ka njọ, ọha mmadụ yiri ka ha na-achọsi ike imejụ ọchịchọ ha n’egbughị oge. Ụlọ ọrụ ndị na-egosi ihe ntụrụndụ na-ezipụkarị ozi bụ́, “Nweta ihe ị chọrọ inweta ozugbo ozugbo!”

Ekwenyela ná mmetụta ndị dị otú ahụ site n’ịzụtọ na imebi ụmụ gị. “Inwe ikike nke ịmata na ọ na-ewekarị oge na mgbalị dị ukwuu tupu e nwee ihe ịga nke ọma bụ akụkụ dị mkpa nke amamihe n’ịchịkwa mmetụta uche,” ka akwụkwọ bụ́ The Child and the Machine na-ekwu. “Ọzụzụ onwe onye na inwe nkwekọ n’etiti ọha na eze na-arụ ọrụ dị ka ihe ngwọta maka ime ihe ike na-arịwanye elu bụ́ ndị na-ewere ọnọdụ n’etiti ụmụaka ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’èzí.” Bible nwere ụkpụrụ a na-enye aka: “Onye zụtọworo ohu ya site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu ahụ ga-aghọkwa [onye na-enweghị ekele, NW].” (Ilu 29:21) Ọ bụ ezie na amaokwu ahụ metụtara, n’ụzọ bụ́ isi, nchịkwa nke ndị ohu na-eto eto, ọtụtụ ndị nne na nna achọpụtawo na ụkpụrụ ahụ na-abara ụmụ ha uru nke ukwuu.

N’ime mkpa ndị ụmụaka nwere, inweta ihe Bible na-akpọ ‘ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova’ nọ n’ọkwá mbụ. (Ndị Efesọs 6:4) Ịdọ aka ná ntị n’ụzọ ịhụnanya na-enyere ụmụaka aka ịzụlite àgwà ndị dị ka njide onwe onye na ndidi. Àgwà ndị a ga-enyere ha aka inweta obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ ha nile.

Mgbe Egwu Nile A Na-eyi Oge Ịbụ Nwata Ga-akwụsị

Otú ọ dị, ị pụrụ iche, sị, ‘Ọ̀ bụ n’ezie uche Chineke nke ịhụnanya ahụ nke maara ihe bụ́ onye nyere ụkpụrụ ndị a na-enye aka site n’ike mmụọ nsọ ka ụwa anyị dị otú a ọ dị? Ọ̀ bụ nzube ya ka ụmụaka na-etolite n’ụwa nke dị ize ndụ karịa ka ọ bụ ebe a na-enye ọzụzụ?’ Ị pụrụ inweta nkasi obi ịmata na Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jizọs, nwere ịhụnanya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ, gụnyere ụmụaka ndị nọ n’afọ ndụ nile. N’oge na-adịghị anya, ha ga-ekpochapụ ajọ mmadụ nile n’ụwa.—Abụ Ọma 37:10, 11.

Ọ̀ ga-amasị gị ịhụperetụ otú oge udo na nke obi ụtọ ahụ ga-adị? See nnọọ onyinyo ihe na-emenụ n’ebe a, dị ka a kọwara ya n’ụzọ magburu onwe ya n’ime Bible: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha.” (Aịsaịa 11:6) N’ụwa ebe a na-eji nnọọ obi ọjọọ emebi oge nke ịbụ nwata ma ọ bụ jiri obi ịta mmiri mee ka ụmụaka jiri ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka, lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na Chineke na-ekwe ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’elu ala nkwa maka ọdịnihu magburu onwe ya! N’ụzọ doro anya, ọ bụghị uche Onye Okike ka oge ịbụ nwata bụrụ nke a na-ejighị bie ndụ dị ka nwata ma ọ bụ nke e mere ka ọ gafere ọsọ ọsọ—ọ chọrọ ka ọ bụrụ nanị nke na-enye afọ ojuju na nke e ji kpọrọ ihe.

[Foto dị na peeji nke 18]

Kama iji nsogbu gị bogbuo nwa gị, kọọrọ onye ọzọ toworo eto izu nzuzo gị

[Foto dị na peeji nke 18, 19]

Ụmụaka nwere mkpa igwuri egwu