Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nwatakịrị Na-ebighị Ndụ Dị Ka Nwata

Mgbe Nwatakịrị Na-ebighị Ndụ Dị Ka Nwata

Mgbe Nwatakịrị Na-ebighị Ndụ Dị Ka Nwata

“Ibi ndụ dị ka nwata bụ ihe bụ́ isi ruuru ụmụaka.”—Akwụkwọ bụ́ “The Hurried Child.” (Nwatakịrị E Mere Ka O Jiri Ọsọ Gafere Ohere nke Ibi Ndụ Dị Ka Nwata).

MA ELEGHỊ anya, ị ga-ekweta na ụmụaka nile kwesịrị ibi nnọọ ndụ n’enweghị nchekasị na nrụgide. Ka o sina dị, ọ bụ eziokwu dị mwute nke a na-apụghị ịgbagha agbagha ná ndụ na nye ọtụtụ ụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị, oge ịbụ nwata dị otú ahụ bụ ihe aka na-adịghị eru. Cheedị echiche banyere ọtụtụ puku, ma eleghị anya ọtụtụ nde, atụmanya ụmụaka na-enwe bụ́ ndị na-adakpọ mgbe agha metụtara ha. Cheekwa echiche banyere ụmụaka nile a na-ebibi ndụ ha n’ihi ịgba ohu ma ọ bụ mmetọ.

Nye ihe ka ọtụtụ n’ime anyị, o siri ike ichetụ n’echiche otú ọ na-adị nwatakịrị mgbe a manyere ya ibi n’okporo ámá n’ihi ịbụ onye ndụ ya yiri ka ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ n’ụlọ karịa n’okporo ámá. Kpọmkwem n’oge ọ dị ha mkpa inweta ịhụnanya na nchebe nile ha pụrụ inweta, ụmụaka dị otú ahụ aghaghị ịmụta ịwa nnọọ anya n’okporo ámá iji nwee ike izere ajọ mmadụ ndị ga-achọ irigbu ha. Mgbe mgbe, oge nke ịbụ nwata n’onwe ya na-abụ nke oge anyị a jupụtara ná nsogbu na-emetụta n’ụzọ dị njọ.

“Ọ Dị M Ka M Bụrụ Nwata Ọzọ”

Carmen, bụ́ onye dị afọ 22, gbara mbọ nke ukwuu n’oge ọ bụ nwata. * A manyere ya na nwanne ya nwanyị ibi n’okporo ámá iji gbanahụ mmetọ nke nna ha na-emetọ ha na nleghara anya nke nne ha na-eleghara ha. N’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị na-adị n’ibi ndụ n’ụzọ dị otú a, ụmụ agbọghọ abụọ ahụ gbalịrị izere ọnyà ụfọdụ na-amata nnọọ ọtụtụ ndị na-eto eto si n’ụlọ gbapụ.

N’agbanyeghị nke ahụ, Carmen na-enwe oké mwute n’ihi ụdị ndụ o biri mgbe ọ bụ nwata, n’ihi na ọ pụghị icheta n’ezie mgbe o biri ndụ dị ka nwata. “Esi m na nwa ọhụrụ mafere gaa n’afọ 22 n’enweghị ihe ọ bụla dị n’agbata ha,” ka ọ na-akwa n’arịrị. “Alụọla m di ugbu a ma mụta nwa, ma ọ ka na-agụsi m agụụ ike ime ihe ụmụaka nwanyị na-eme, dị ka iji nwa bebi na-egwuri egwu. Ọ na-agụ m agụụ ịbụ onye nne na nna ya na-egosi ịhụnanya ma na-amakụ. Ọ dị m ka m bụrụ nwata ọzọ.”

E nwere ọtụtụ ụmụaka ndị na-ahụju anya dị ka Carmen na nwanne ya nwanyị hụjuru. Ha bi n’okporo ámá, bụrụ ndị a na-ekweghị ka ha bie ndụ dị ka ụmụaka kwesịrị ibi. Ọtụtụ n’ime ha na-etinye aka na mpụ iji kpara afọ ha. Akụkọ ụwa na ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị a na-enweta na-egosi n’ụzọ dị ịtụnanya na ụmụaka etinyewala aka na mpụ n’oge ha dị nnọọ obere. Ihe na-eme ka nsogbu ahụ ka njọ bụ nsogbu ọzọ: Ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-amụ ụmụ mgbe ha ka nọ n’afọ iri na ụma—n’ezie, mgbe ha onwe ha ka bụ ụmụaka.

Nsogbu Ọha na Eze Bụ́ nke Na-apụtachaghị Ìhè

Ọ bụghị ihe ijuanya na ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ụmụaka na-abụ ndị a na-akpọnye ndị ọzọ ka ha zụọ. Otu uche akwụkwọ akụkọ Weekend Australian bipụtara, kọrọ, sị: “Anyị amalitewo inwe nsogbu n’usoro nke ndị ọzọ ịzụ ụmụ, ma anyị amaghịdị. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụaka si n’ezinụlọ tisara etisa na-abụ ndị a na-eleghara anya.” Akwụkwọ akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Ụfọdụ ụmụaka, bụ́ ndị ndị ọzọ na-azụ, na-anọcha ọtụtụ ọnwa, ọbụna ọtụtụ afọ, n’ahụghị ndị ọrụ ebere na-eleba anya n’okwu metụtara ha, ebe ndị ọzọ na-abụ ndị a na-akpọgharị site n’aka otu onye nlekọta gaa n’ọzọ, n’enyeghị ha ebe obibi na-adịgide adịgide.”

Otu a kọrọ akụkọ ya bụ nke metụtara otu nwata nwanyị dị afọ 13 bụ́ onye a kpọfere n’ezinụlọ 97 n’ime afọ atọ—ọ nọrọ nanị otu abalị n’ezinụlọ ụfọdụ. Ọ na-echeta ugbu a mmetụta siri ike nke ịbụ onye a jụrụ ajụ bụ́ nke ọ nọ na-enwe. N’ebe ọtụtụ ụmụaka ndị dị ka ya nọ, bụ́ ndị a kpọnyere ndị ọzọ ka ha zụọ, ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka kwesịrị ibi efunahụwo ha.

Ka a sịkwa ihe mere ndị ọkachamara taa ji ekwu banyere ọdachi na-arị elu na-esite n’ụmụaka ịghara ibi ndụ dị ka ụmụaka kwesịrị ibi. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị pụrụ ile ọnọdụ ndị a dị mwute anya ma gụọ onwe gị dị ka onye nwere ihe ndabara ọma n’ịbụ onye nwere ike inye ụmụ gị ebe obibi na ihe ndị dị mkpa ná ndụ. Ma e nwere ihe ize ndụ ọzọ dịnụ. N’ụwa taa, ọ naghị abụcha mgbe nile ka ụmụaka na-adịghị ebi ndụ dị ka ụmụaka. Mgbe ụfọdụ, ha na-abụ ndị e mere ka ha jiri ọsọ gafere ohere nke ibi ndụ dị ka ụmụaka. N’ụzọ dị aṅaa, mmetụta ndị dịkwa aṅaa ka ọ na-enwe?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 A gbanwewo aha ya.