Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụmọdụ Bụ́ Ịgba Maka Ndị Na-eto Eto

Ndụmọdụ Bụ́ Ịgba Maka Ndị Na-eto Eto

Ndụmọdụ Bụ́ Ịgba Maka Ndị Na-eto Eto

Ka Bill, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nọ na-enyefe ndị mmadụ magazin na nso otu ụlọikpe dị na California, U.S.A., otu nwoke bịakwutere ya ma rịọ ka ya hụ magazin Teta! nile Bill chị. Bill na-akọ, sị: “Tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị enyewo m magazin ụfọdụ metụworo ochie, n’ihi ya, egosiri m ya ọtụtụ magazin dịgasị iche iche.

“Nwoke ahụ mere ngwa ngwa họgasịa magazin ndị ahụ ma chịkọta ndị ọ na-agụbeghị. Ọ jụrụ m ma ya nwere ike iwere magazin ndị ahụ ọ chịkọtara. Ọ kọwara onwe ya dị ka onye ọrụ nke ụlọikpe obodo ahụ ma kwuo na ọ bụ ya na-ahụ maka inye ndị na-eto eto nwere nsogbu, ndụmọdụ. Ọ kọwara na ya na-anata Teta! iji were ígwè photocopier bipụtaghachi isiokwu ‘Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị.’ Ọ na-etinyezi isiokwu ndị ahụ na faịlụ dị ka ihe ha na-ekwu si dị, ma debe ha nso ebe ọ ga-ewere ha nye ndị na-eto eto ọ na-enye ndụmọdụ. Nwoke ahụ kwuru, sị: ‘Isiokwu ndị ha na-atụle bụ nsogbu ndị ndị na-eto eto na-enwe taa.’ Ọ jara Ndịàmà Jehova mma maka ibipụta ezi ihe ọmụma ndị dị otú ahụ iji nyere ndị na-eto eto aka. O kwukwara na ya ga na-atụ anya m n’izu ndị na-abịanụ iji nweta magazin Teta! ndị ọhụrụ ọ bụla m pụrụ iweta.”

Ọtụtụ n’ime ihe ọmụma ndị a na-ebipụta n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị” dị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a dị peeji 320, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.