Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Bụrụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?

N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Bụrụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Bụrụ Nwa E Kuchiri Ekuchi?

“O yiri mmadụ inwe nkwarụ ná ndụ ya nile. Ọ bụ ọrịa obi nke a na-apụghị ịgwọta agwọta.”—Robert.

Ọ BỤ otú ahụ ka otu nwoke, nke e nyefere onye ọzọ ikuchi mgbe a mụrụ ya, si kọwaa ndụ ya. Ọ na-aga n’ihu ikwu, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị ná ndụ gị, ị ga na-enwe ọchịchọ siri ike inweta azịza nye ajụjụ ndị dị ka, Olee ndị n’ezie bụ ndị ezinụlọ m? Olee ebe ha bi? Gịnị mere ha ji gbahapụ m?”

Chantial, bụ́ onye e kuchiri nna ya ekuchi, na-akwa arịrị na ya amaghị ndị nne na nna ochie ya bụ. Ọ na-ekwu, sị: “M na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a ghọgburu aghọgbu, n’ihi ịbụ onye na-adịghị eso ụmụnne papa m ndị nwoke na ndị nke nwanyị nakwa ụmụ ha na-akpakọrịta.” Ọ bụghị ụmụaka nile e kuchiri ekuchi na-enwe mmetụta dị otú a. Ma, ụfọdụ na-enwe. N’ihi gịnị?

Ihe Na-akpasu Iwe

Nwatakịrị ịmata na e kewapụwo ya n’ebe ezinụlọ mụrụ ya nọ pụrụ ime nnọọ ka o nwee oké mkpasasị uche. Catrina, bụ́ onye e kuchiri mgbe ọ dị nnọọ obere, na-ekwu, sị: “Enwere m nsogbu nke iwe iwe n’ihi na aghọtaghị m ihe mere nne mụrụ m ji nyefee m onye ọzọ. Echere m na nne m gbahapụrụ m n’ihi na m jọrọ njọ ma bụrụ onye a na-apụghị ịhụ n’anya. A sị nnọọ na ọ ga-enye m ohere, amaara m na m pụrụ ime ihe ga-eme ka o jiri m mee ọnụ. Mgbe ọ bụla m chetara nne mụrụ m, iwe m na-adị ọkụ karị.”

Catrina na nne na nna kuchiri ya nwekwara nnukwu nsogbu n’otu aka ahụ. “Echere m na ọ bụ nne na nna kuchiri m kpọpụrụ m n’aka nne mụrụ m,” ka ọ na-ekwu. “N’ihi ya ewesoro m ha iwe.” Ee, mgbe ụfọdụ, iwe na-abụ mmeghachi omume mmadụ na-enwe n’ihi ịbụ onye e nyefere onye ọzọ ka o kuchie.

Iwe dị otú ahụ pụrụ ịdị ize ndụ. Mgbe ụfọdụ, dị ka ahụmahụ Catrina na-egosi, ị pụrụ igosipụta iwe gị n’ụzọ ndị na-ezighị ezi ma ọ bụ iwesa ndị ị na-ekwesịghị iwesa iwe, iwe. Bible na-adụ ọdụ , sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma.” (Abụ Ọma 37:8) Olee otú nke ahụ ga-esi kwe omume? Okwu Chineke na-ekwukwa, sị: “[Nghọta] mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) Ịghọta ọnọdụ gị pụrụ inye aka mee ka iwe gị belata. N’ụzọ dị aṅaa?

Ịgbazi Echiche Na-ezighị Ezi

Ịghọta ọnọdụ gị pụrụ inyere gị aka inyocha ihe ụfọdụ ndị i bu n’uche, bụ́ ndị na-akpasu gị iwe. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e kuchiri gị ekuchi, ị̀ na-eche na ọ ghaghị ịbụ na ndị mụrụ gị nyefere gị ka e kuchie gị n’ihi na ọ dị ihe na-adịghị mma banyere gị? Catrina chere otú ahụ. Ma, ọ̀ bụ nke ahụ na-akpata ya mgbe nile? Ma eleghị anya, ọ gaghị ekwe mee ịchọpụta ihe kpaliri ndị mụrụ gị ime otú ahụ, ma e nwere ezi ihe ndị mere i kwesịrị iji zere echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ. Ma, n’ihi gịnị ka ndị mụrụ ụmụ na-ejikarị enyefe ụmụ ha maka nkuchi? Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ n’ihi na ha chere na ọ dịghị ihe ọzọ ha pụrụ ime.

Tụlee ihe banyere Mozis. Akụkọ Bible dị n’Ọpụpụ isi 2 na-agwa anyị na mgbe Fero Ijipt nyere iwu ka e gbusịa ụmụ ọhụrụ bụ́ ndị Izrel, Jokebed zoro nwa ọhụrụ ya, bụ́ Mozis, ruo ọnwa atọ. N’ikpeazụ, ọ pụghịzi izo ya ezo, ma ọ gaghị anọli hụ ka e gburu nwa ya. N’ihi ya, mgbe ‘ọ na-apụghịkwa izobe ya ọzọ, o wuuru ya ụgbọ papaịrọs, werekwa bitumen na pitch tee ya; wee tinye nwa ahụ n’ime ya, tinye ya n’etiti amị n’ụsọ osimiri Naịl.’—Ọpụpụ 2:3.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na isi otú a gbahapụ nwa ya siiri ya nnọọ ike ime. Ma oleenụ ihe ọzọ ọ pụrụ ime? Ịhụnanya o nwere n’ebe nwa ya nọ kpaliri ya ime ihe o chere kasị mma maka nwa ya. Ọ dị mma ịmara na nwa ya nwanyị kwụdebere ebe ahụ na-eche ya nche ruo mgbe ọ hụrụ na e kurula nwanne ya nwoke, n’enweghị ihe ọ bụla mere ya. Ma eleghị anya, ọ bụ nne ya nke na-echegbu onwe ya, gwara ya mee otú ahụ.

Otú ọ dị, ọ bụghị nkuchi nile ka ọnọdụ ndị chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa otú ahụ na-akpatacha, ma ihe ndị a na-ebu n’obi eme ya na-eyikarị ibe ha. Robert na-ekwu, sị: “Nne m tụtara ime m n’alụghị di. Ịzụlite m gaara abụrụ ezinụlọ nne m oké ibu arọ, ebe ọ bụ na e nwere ụmụaka ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ahụ. Ọ ghaghị icheworị na ọ ga-akara m mma ma e nyefee m maka nkuchi.”

N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe mere e ji akpọnye ụmụaka ezinụlọ ndị ọzọ ka ha zụlite ha. Ma, dị ka ihe atụ ndị a na-egosi, ọ dịghị abụkarị n’ihi na nne kpọrọ nwa ọhụrụ ya asị ma ọ bụ na ọ hụrụ ihe na-adịghị mma n’ahụ́ ya. N’ọtụtụ ọnọdụ, nne ahụ na-eji ezi obi eche na ọ ga-akara nwa ahụ mma ma a zụlite ya n’ezinụlọ ọzọ.

Abamuru nke Ịbụ Onye A Hụrụ n’Anya

Inweta nghọta pụrụ inyekwuru gị aka mgbe i chere ihe mere e ji kuchie gị. Tụlee ihe atụ Mozis ọzọ. Ka oge na-aga, “ada Fero kutere ya ma zụlite ya dị ka nwa ya nwoke.” (Ọrụ 7:21) Gịnị kpaliri ada Fero ichebe nwatakịrị ọ maara so n’otu n’ime ndị Hibru a mara ikpe ọnwụ? ‘Nwata nwoke ahụ nọ na-akwa ákwá,’ ka Bible na-ekwu. “O wee nwee ọmịiko n’ahụ́ ya.” (Ọpụpụ 2:6) Ee, nkuchi e kuchiri Mozis abụghị n’ihi na a kpọrọ ya asị ma ọ bụ n’ihi na a jụrụ ya ajụ, kama ọ bụ n’ihi na a hụrụ ya n’anya.

Ọtụtụ ụmụaka e kuchiri ekuchi na-abịa ghọta na ndị mụrụ ha agbahapụghị ha nnọọ—ọ bụ ezie na a na-ahụkarị nke ahụ n’ụbọchị ndị a—kama na ha nyefere ha n’aka ụlọ ọrụ nke ga-ahụ na e lekọtara ha anya nke ọma. Nkuchi e mesịrị kuchie ha bụ n’ihi na ọ dị onye hụrụ ha n’anya ruo n’ókè nke ilekọta ha. À pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere gị? Ilekwasị anya n’ịhụnanya e gosiworo gị na iji ya kpọrọ ihe pụrụ inye aka mee ka ihe mgbu ọ pụrụ ịbụ na ị na-enwe belata.

Ọzọkwa, ndị ọzọ, ma e wezụga ezinụlọ kuchiri gị pụkwara igosi gị ịhụnanya. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ị pụrụ inweta uru ndị na-abịa site n’inwe ọtụtụ nne, nna, ụmụnne ndị nwanyị, na ụmụnne ndị nwoke ime mmụọ bụ́ ndị hụrụ gị n’anya. (Mak 10:29-30) Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ ‘ịdị ka ebe izonahụ ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.’ (Aịsaịa 32:2) Alala azụ ịchọpụta Ndị Kraịst ibe gị bụ́ ndị tozuru okè ma kọọrọ ha obi gị. Mee ka ha mara otú obi dị gị.

Robert na-eche na ọ dị mkpa ịzụlite nkekọ siri ike n’ọgbakọ Ndị Kraịst. “M ka na-enwe mmetụta nke abaghị n’ihe,” ka ọ na-ekweta. “Otú ọ dị, ịhụnanya nke ezinụlọ ime mmụọ m na-enye aka eme ka o belata nnọọ.”

Ị Pụrụ Inwe Ihe Ịga nke Ọma

Ya mere, guzogide echiche hiere ụzọ na nke na-ezighị ezi. Nke ahụ na-agụnye iche na e nwere ike ị gaghị enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ n’ihi na e kuchiri gị ekuchi. Echiche ndị na-ezighị ezi dị otú ahụ pụrụ ime ka i nwee nnọọ nkụda mmụọ! (Ilu 24:10) E wezụga nke ahụ, ha abụghị eziokwu.

Chetakwa, Mozis jiri ohere ndị o nwere mee ihe bara uru. Bible na-ekwu, sị: “N’ihi ya a kụziiri Mozis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt. N’eziokwu, ọ dị ike n’okwu na n’omume.” (Ọrụ 7:22) Nke kasị mkpa, Mozis naara ntụziaka ime mmụọ—ruo n’ókè nke na Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, dị adị n’ezie nye ya. (Ndị Hibru 11:27) Ò nwere ihe ịga nke ọma ná ndụ?

Mozis mesịrị ghọọ onye ndú nke mba dị ike nke nwere ma eleghị anya nde mmadụ atọ ma ọ bụ karịa. Ọ ghọrọ onye amụma, onyeikpe, ọchịagha, ọkọ akụkọ ihe mere eme, onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, na onye dere akwụkwọ ise mbụ nke Bible. Ọzọkwa, a na-ekwu na ọ bụ ya dere akwụkwọ Job nakwa Abụ Ọma nke 90. Ee, Mozis nwere nnọọ ihe ịga nke ọma ná ndụ. Ọtụtụ ụmụaka e kuchiri ekuchi na-enwe ihe ịga nke ọma otú ahụ, ị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma.

Robert zụlitere ụmụ abụọ n’ụzọ gara nke ọma, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka okenye n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ileghachi anya azụ n’afọ ndị ọ nọrọ dị ka nwa e kuchiri ekuchi, ọ na-ekwu, sị: “Amụtawo m ịghara ịdị na-echegbu onwe m banyere ihe m na-apụghị idozi kama ịdị na-enwe ekele maka ngọzi ndị m nwere.”

Ọ bụrụ na ọ bụ onye ọzọ kpọghaara gị na-azụ ugbu a, ma ọ bụkwanụ ị bụrụ onye otu ezinụlọ kuchiri, ị pụrụ ịdị na-enwe echiche ndị na-ezighị ezi mgbe ụfọdụ. Kama ichewa ha, gbalịa ịdị na-eche ihe ndị ziri ezi. Ndị Filipaị 4:8, 9 na-ekwe nkwa na ‘Chineke nke udo ga-anọnyere gị’ ma ọ bụrụ na ị ‘nọgide na-atụle’ ihe ndị na-atọ Chineke ụtọ. Otú ọ dị, olee ụfọdụ ihe ndị ọzọ bara uru ị pụrụ ime iji nwee ihe ịga nke ọma ka ị na-ebi n’ezinụlọ kuchiri gị? Isiokwu na-abịa n’ihu n’usoro isiokwu a ga-aza ajụjụ ahụ.

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Ịbụ onye e kuchiri ekuchi bụ ihe àmà na-egosi na ọ dị onye hụrụ gị n’anya ruo n’ókè nke ịkpọbata gị ma na-elekọta gị