Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Omenala Nke Na-ekweghị Akwụsị Akwụsị

Omenala Nke Na-ekweghị Akwụsị Akwụsị

Omenala Nke Na-ekweghị Akwụsị Akwụsị

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA FRANCE

ỤMỤAKA gburugburu ụwa na-asọpụrụ ya. N’ime otu afọ na-adịbeghị anya, post ọfịs France nataara ya akwụkwọ ozi ruru ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 800,000—karịsịa site n’aka ụmụaka nọ n’agbata afọ atọ na afọ asatọ. N’ịbụ onye nwere afụ ọnụ ọcha ruru nnọọ eru na uwe mwụda uhie nke e ji ákwà ọcha dị ajị ajị gbaa ọnụ ọnụ ya gburugburu, Fada Krismas (Santa Claus) nke na-enwe omume enyi, yiri ka ọ̀ bụ ihe kasị adọrọ mmasị n’ememe ndị a na-eme n’ụbọchị ezumike ahụ. Ị̀ pụrụ ichetụdị n’echiche na a pụrụ isu ihe oyiyi ya ọkụ? Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe mere n’ihe karịrị nnọọ afọ 50 gara aga na Dijon, France. Na December 23, 1951, e “gburu” Fada Krismas n’ihu ihe dị ka ụmụaka 250.

Gịnị bụ iwu ọ dara? Akwụkwọ akụkọ bụ́ France-Soir na-akọ na ‘e kpebiri igbu ya ná nkwado nke onye ụkọchukwu, bụ́ onye katọworo Fada Krismas dị ka onye mpụnara na onye jụrụ okwukwe,’ ma boo ya ebubo nke “ime ka Krismas ghọọ ememe ndị na-ekpere arụsị.” Nke a bụ ‘ogbugbu ihe atụ,’ ka otu ọkwa a mara kwuru. “Ụgha apụghị ime ka ụmụaka malite inwe mmetụta okpukpe, ọ bụtụghịkwa ụzọ isi zie ihe.”

Ụfọdụ ndị ụkọchukwu chere na omenala ndị metụtara Fada Krismas na-eme ka ndị mmadụ gharazie ịma ‘ihe Ọmụmụ ahụ pụtara n’ezie nye Ndị Kraịst.’ N’ezie, ná mbipụta nke March 1952 nke magazin bụ́ Les Temps Modernes (Oge Ndị A), ọkà mmụta banyere mmalite nke agbụrụ mmadụ bụ́ Claude Lévi-Strauss kpọrọ ikwenye na Fada Krismas “otu n’ime ihe kasị ike na-akpalite ikpere arụsị n’etiti ụmụ mmadụ n’oge a” ma kwuo na chọọchị ziri ezi n’ịkatọ nkwenkwe a. Lévi-Strauss kwukwara na a pụrụ isogide mmalite nke Fada Krismas ruo n’ebe eze nke Saturnalia nọ. A nọ na-eme ememe Saturnalia na Rom oge ochie malite na December 17 ruo December 24. N’izu ahụ, a na-eji akwụkwọ ndụ chọọ ụlọ dị iche iche mma, na-enyerịtakwa onyinye. Dị ka Krismas, e ji oriri na nkwari mara Saturnalia.

Ugbu a, ihe karịrị afọ 50 e susịrị ihe oyiyi Fada Krismas ọkụ, olee otú ndị Katọlik nọ na France si ele Fada Krismas anya? Onye a buuru omenala nke Saturnalia Rom gaa n’ihu bụ akụkụ nke Krismas dị nnọọ ka igosi ebe Jizọs nọ n’ihe a na-etinye nri anụ ụlọ bụkwa. Mgbe ụfọdụ, onye ụkọchukwu ga-akatọ Santa Claus dị ka onye na-anọchite anya ụdị azụmahịa bụ́ nke na-agụpụ Kraịst n’ime Krismas. Otú ọ dị, akụkụ ka ukwuu nke ahụ́ erughị ala ọ bụla a pụrụ inwe banyere mmalite Fada Krismas malitere n’aka ndị na-ekpere arụsị akwụsịwo n’ihi na ọha mmadụ anabatawo echiche nke Fada Krismas.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]

DR/© Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris