Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Bible Pụrụ Isi Nyere Ndị Na-arịa Ọrịa Shuga Aka

Otú Bible Pụrụ Isi Nyere Ndị Na-arịa Ọrịa Shuga Aka

Otú Bible Pụrụ Isi Nyere Ndị Na-arịa Ọrịa Shuga Aka

NJIDE onwe onye na inwe nchekwube dị nnọọ mkpa maka ahụ́ ike na ọdịmma nke ndị na-arịa ọrịa shuga. Ma iji zụlite àgwà ndị dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka a nọgide na-enye ndị na-arịa ọrịa shuga nkwado. N’ihi ya, ndị òtù ezinụlọ na ndị enyị nke onye na-arịa ọrịa shuga ekwesịghị ịnwa ya iri nri na-adịghị mma, ikekwe na-ekwu, sị, ‘Nanị otu ugboro a agaghị egbu gị.’ “Ana m enweta ezigbo nkwado site n’aka nwunye m,” ka Harry, bụ́ onye na-arịa ọrịa obi na ọrịa shuga Ụdị nke Abụọ, na-ekwu. “Ọ dịghị edebe ihe oriri ndị m na-ekwesịghị iri n’ụlọ. Ma ụfọdụ ndị ọzọ adịghị aghọta, ha adịghịkwa ama otú nke ahụ na-esi eme ka o sie ike mgbe ụfọdụ.”

Ọ bụrụ na gị na onye na-arịa ọrịa shuga na-akpachi anya, buru ụkpụrụ abụọ ndị a mara mma dị na Bible n’uche: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ,” nakwa “Ịhụnanya . . . adịghị achọ ọdịmma nke ya.”—1 Ndị Kọrint 10:24; 13:4, 5.

Ọ dị mkpa ka ndị nile nwere mmasị n’ahụ́ ike ha—ma hà na-arịa ọrịa shuga ma ọ bụ na ha adịghị arịa ya—na-enwe njide onwe onye n’ihe banyere ihe oriri. Bible na-enye aka n’akụkụ a, n’ihi na ọ na-egosipụta mkpa ọ dị onye ọ bụla n’ime anyị inwe njide onwe onye. Ì kpebiwo ịzụlite àgwà a ná ndụ gị? (Ndị Galeshia 5:22, 23) A pụrụ inwetakwu enyemaka site n’ihe nlereanya ndị dị na Bible, dị ka Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi. “O nwere ogwu n’anụ ahụ́, bụ́ nke na-ekweghị ala ala,” ka otu onye na-arịa ọrịa shuga na-ekwu, “ma o jikwara ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu. Apụkwara m ime otú ahụ!”

Ee, Pọl nakweere ihe ọ na-apụghị ịgbanwe ma nwee nnọọ ihe ịga nke ọma dị ka onye ozi ala ọzọ. (2 Ndị Kọrint 12:7-9) Dustin, bụ́ onye dị afọ 18, kpuru ìsì site n’ọmụmụ, ọ malitekwara ịrịa ọrịa shuga kemgbe ọ dị afọ 12. Ọ na-ede, sị: “Amaara m na ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ụwa a nke ihe nile zuuru. Ana m atụ anya oge m na-agaghị arịa ọrịa shuga n’ụwa ọhụrụ Chineke. Nye m, ọ bụ nnọọ ihe na-adịru nwa oge. Ọ pụrụ ịdịru ogologo oge karịa azụ̀zụ̀ ma ọ bụ ahụ́ ọkụ, ma e mesịa ọ ga-akwụsị.”

Ihe Dustin bu n’obi mgbe o kwuru okwu ahụ bụ olileanya dabeere na Bible maka inwe ahụ́ ike zuru okè n’ụwa paradaịs n’okpuru Alaeze Chineke. (Mkpughe 21:3, 4) Okwu Chineke na-ekwe nkwa na n’okpuru ọchịchị Chineke dị otú ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24; Matiu 6:9, 10) Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere nkwa a dabeere na Bible? Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu, ma ọ bụ detara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ n’adres nke kwesịrị ekwesị dị na peeji nke 5.

[Foto dị na peeji nke 12]

Njide onwe onye na nchekwube dịcha mkpa