Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ga-aka Mma?

Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ga-aka Mma?

Ọ̀ Dị Mgbe Ihe Ga-aka Mma?

TAA, Òtù Ahụ Ike Ụwa na òtù ndị ọzọ ọnọdụ a na-echegbu amalitela ihe omume nke inyocha na ịchịkwa nkesa nke ọrịa. Ụlọ ọrụ dịgasị iche iche na-agbasa ihe ọmụma ma na-akwalite nnyocha ndị a na-eme iji chọpụta ọgwụ ndị ọhụrụ na ụzọ ndị ọhụrụ isi na-achịkwa ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa, a na-eme mgbalị nile a iji nagide nsogbu na-arị elu nke ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa. Ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa obodo dị iche iche pụkwara ime ihe dị ukwuu iji na-enweta ihe ọmụma ma na-echebe onwe ha. Ma, ichebe ndị mmadụ na ịchịkwa ọrịa gburugburu ụwa abụghị otu ihe.

Ọtụtụ ndị ọkachamara kweere na ọ dị oké mkpa ka ndị nile nọ gburugburu ụwa nwee nkwekọ na ntụkwasịrịta obi iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ọrịa. “Mmekọrịta na-arịwanye elu a na-enwe n’etiti ụmụ mmadụ na mba dị iche iche gburugburu ụwa na-achọ ka ụmụ mmadụ n’ebe nile hapụ ịdị na-ele nanị agbata obi, ógbè, mba, ma ọ bụ gburugburu ebe ha nọ anya dị ka ebe obibi ha,” ka onye nta akụkọ nwetara Ihe Nrite Pulitzer, bụ́ Laurie Garrett, dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Coming Plague—Newly Emerging Diseases in a World out of Balance. “Ụmụ nje, na ụmụ ahụhụ ndị na-ebu ha, adịghị asọ ókè ndị ụmụ mmadụ ji aka ha mee.” Ntiwapụ nke ọrịa n’otu mba na-eweta nchegbu ngwa ngwa, ọ bụghị nanị ná mba ndị ha na mba ahụ gbara agbata obi kamakwa gburugburu ụwa.

Ụfọdụ gọọmenti na mmadụ ụfọdụ na-anọgide na-enyo ụdị ọsọ enyemaka ọ bụla—ọbụna ihe ndị e mere iji chịkwaa ọrịa—nke ndị mba ọzọ gbatara enyo. Tụkwasị na nke a, elepụghị anya n’ihu nke ndị ọchịchị na anyaukwu nke ndị na-azụ ahịa, na-egbochikarị mgbalị nke mba nile jikọrọ aka na-eme. Ụmụ nje hà ga-emeri n’ọgụ ahụ ụmụ mmadụ na ọrịa na-alụ? Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Eugene Linden, bụ́ onye na-eche na ha ga-emeri, na-ekwu, sị: “Oge adịghịzi maka egwú ịdagharị.”

Ihe Mere A Ga-eji Nwee Olileanya

Ọganihu ndị e nweworo na nkà mmụta sayensị nakwa nkà na ụzụ enweghịdị ebe ha ruru n’ọgụ ahụ a na-alụso ọrịa. N’eziekwa, nsogbu nke ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ihe ize ndụ ndị na-eche ahụ́ ike ụmụ mmadụ ihu. Ma, e nwere ihe mere a ga-eji nwee olileanya. Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta sayensị ka na-ebido ebido ịghọta mmekọrịta dị mgbagwoju anya e nwere n’etiti ihe ndị dị ndụ, ha na-aghọta ikike ala nwere iji aka ya dozie onwe ya. Mbara ụwa anyị nwere usoro ndị sitere n’okike, bụ́ ndị pụrụ ime ka usoro ihe ndị e kere eke na-esi arụ ọrụ dịghachi otú o kwesịrị. Dị ka ihe atụ, oké ọhịa na-etopụtakarị n’ala a sụchaburu asụcha, mmekọrịta dịkwa n’etiti ụmụ nje, ụmụ ahụhụ, na ụmụ anụmanụ yiri ka ọ̀ na-akawanye mma ka oge na-aga.

Nke ka mkpa bụ na nkà dị mgbagwoju anya e nwere n’okike na-egosi na ọ dị Onye kere ha, bụ́ Chineke onye guzobere usoro ala ji arụ ọrụ site ná mmalite. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị n’onwe ha na-ekweta na a ghaghị inwe onye nwere ọgụgụ isi ka nke mmadụ elu nke kere ihe ndị dị n’ụwa. Ee, ndị na-eche echiche nke ọma apụghị ikwu n’ụzọ gara nke ọma na Chineke adịghị. Bible na-akọwa Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke, dị ka onye pụrụ ime ihe nile na onye na-ahụ n’anya. Ọ na-amasị ya nnọọ ka anyị na-enwe obi ụtọ.

Bible na-akọwakwa na n’ihi mmehie mmadụ mbụ ahụ kpachaara anya mee, ụmụ mmadụ ketara ezughị okè, ọrịa, na ọnwụ. Nke ahụ ọ̀ pụtara na anyị aghaghị ịhụju anya ruo mgbe ebighị ebi? Ee e! Nzube Chineke bụ ime ka ụwa ghọọ paradaịs, bụ́ ebe ụmụ mmadụ pụrụ isoro ihe ndị ọzọ e kere eke, ma ndị ukwu ma ndị nta, biri n’ahụ́ iru ala. Bible na-ebu amụma banyere ụwa ebe ọ na-adịghị ihe ọ bụla e kere eke, ma ọ̀ bụ nnukwu anụ ma ọ bụ obere ahụhụ, ga-abụrụ mmadụ ihe ize ndụ.—Aịsaịa 11:6-9.

N’ezie, ụmụ mmadụ ga-ekere òkè n’ime ka a nọgide na-enwe ọnọdụ ndị dị otú ahụ—n’etiti mmadụ na ibe ya nakwa na gburugburu ebe obibi. Chineke nyere mmadụ iwu “ilekọta” ụwa. (Jenesis 2:15, NW) N’ime paradaịs na-abịanụ, ụmụ mmadụ ga-arụzu ọrụ ahụ n’ụzọ zuru okè site n’iji nrubeisi na-agbaso ntụziaka nke Onye Okike ahụ n’onwe ya. N’ihi ya, anyị pụrụ ịtụ anya ụbọchị ahụ mgbe “onye obibi ya [na-agaghị] asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.