Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọchịchị Nke Ga-akwado Ụkpụrụ Chineke

Ọchịchị Nke Ga-akwado Ụkpụrụ Chineke

Ọchịchị Nke Ga-akwado Ụkpụrụ Chineke

CHEEDỊ banyere ụwa nke nwere nanị otu ọchịchị nke na-achị ndị si n’agbụrụ nakwa n’asụsụ nile. Cheedị banyere ọchịchị a maara nke ọma maka ichebe ụkpụrụ omume ndị kasị elu nakwa maka ikpochapụ agha, ịkpọasị, mpụ, ịda ogbenye, mmetọ, ọrịa, na ọbụna ọnwụ!

‘Nke ahụ magburu onwe ya, ma ọ pụghị ikwe omume,’ ka ị pụrụ ikwu. Ee e, ọ bụghị ihe na-apụghị ikwe omume. N’eziokwu, ọ bụ ihe e ji n’aka. Jizọs Kraịst kwere nkwa na a ga-enwe ọchịchị dị otú ahụ. Ọ kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere maka ya: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.’”—Matiu 6:9, 10.

Ikekwe ị maara ihe e kwuru n’ekpere ahụ, n’ihi na ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile maara ya ma ọ bụ anụwo banyere ya. Ma ì chetụwo echiche nke ọma banyere ihe okwu ahụ pụtara n’ezie? Rịba àmà na e jikọtara Alaeze ahụ na ime uche Chineke n’ụwa. Gịnịzi bụ Alaeze Chineke? Gịnịkwa bụ uche Chineke maka ụwa anyị?

Ihe Alaeze Chineke Bụ

Otu nkọwa e nyere alaeze bụ ọchịchị nke eze bụ onyeisi ya. Alaeze Chineke bụ ụzọ Jehova Chineke si egosipụta ọbụbụeze eluigwe na ala ya. Ọ bụ ọchịchị eze nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọ n’isi ya. N’ihe banyere uche Chineke maka ụwa, e kwuru ya n’ụzọ dị mfe ma doo anya n’Abụ Ọma 37:10, 11: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”

Ya mere, ọ bụrụ na ị na-enwe ndakpọ olileanya n’ihi ụkpụrụ omume nke ụwa a na-eretọ eretọ, nwee obi ike. Bible na-ekwe nkwa na n’oge na-adịghị anya, ọnọdụ na ụkpụrụ omume ndị dị n’ụwa ga-agbanwe n’ụzọ dị egwu. Nkwa ahụ bụ́ na Alaeze Chineke ga-achị ụwa n’oge na-adịghị anya iji hụ na a gbasoro ụkpụrụ Chineke bụ ihe ndabere e ji n’aka iji nwee olileanya.

Ịmụta ịtụkwasị nkwa nile nke Chineke kwere banyere Alaeze obi pụrụ ime ka anyị nwekwuo mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Cheedị banyere ụkpụrụ omume ndị e jikọtara ha na ọchịchị nke Alaeze ahụ: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:8, 9) Lee nkwa magburu onwe ya maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke a bụ!

N’amụma e buru banyere Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, Abụ Ọma 72:12-14 na-ekwu, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”

Ụkpụrụ Omume nke Bible

Tụlee ụfọdụ n’ime ụkpụrụ omume ndị Bible na-akwado: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa nke ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Nke ọzọ bụ: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala [ná] nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.”—Ilu 3:5, 6.

Bible na-ezikwa na anyị nile ga-aza ajụjụ maka ụkpụrụ omume ndị anyị họọrọ ịgbaso. Tụlee Eklisiastis 11:9: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ, ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ, jeekwa ije n’ụzọ nile nke obi gị, na n’ọhụhụ ụzọ nke anya gị abụọ; ma mara na n’ihi ihe ndị a nile Chineke ga-eme ka ị baa n’ikpe.” E kwuru kpọmkwem na anyị ga-aza ajụjụ banyere omume anyị n’Ilu 2:21, 22: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”

N’ihi olileanya a na-agba ume e nwere maka ọchịchị ezi omume, lee ka o si baa uru isoro Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya! Isoro ndị ọzọ, bụ́ ndị chọrọ ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị, na-akpakọrịta ga-enyere anyị aka ibi ndụ n’ụzọ ga-eme ka anyị hụ ọchịchị nke Alaeze ya dị ebube na mkpụrụ nke ụkpụrụ omume magburu onwe ya ọ ga-akwalite.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ndị dị umeala n’obi “ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—ABỤ ỌMA 37:11.