Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrịa Ụmụ Ahụhụ Na-ekesa—Nsogbu Na-arịwanye Elu

Ọrịa Ụmụ Ahụhụ Na-ekesa—Nsogbu Na-arịwanye Elu

Ọrịa Ụmụ Ahụhụ Na-ekesa—Nsogbu Na-arịwanye Elu

OGE OTU EZINỤLỌ nọ na Latin America ji alakpu ụra eruwo. Nne ejiri ịhụnanya fụọ nwa ya nwoke ákwà ma nyiwe ya n’elu ihe ndina, wee sị ya ka chi foo. Ma n’ọchịchịrị ahụ, otu ahụhụ ojii bụ́ kissing bug nke ahụ́ ya na-egbuke egbuke, nke na-erughị sentimita atọ n’ogologo, esi n’ebe gbawara agbawa n’uko ụlọ daa. N’adịghị onye hụrụ ya, ọ dakwasị n’ihu nwatakịrị ahụ na-ehi ụra, ma jiri ọnụ ya pịrị apị dụpuo ahụ́ ya dị nro n’emeteghị ya n’ụra. Ka ahụhụ ahụ na-aṅụju ọbara afọ, ọ na-anyụpụkwa nsị nke nje juru na ya. N’etetaghị n’ụra, nwatakịrị ahụ akọọ ọkọ n’ihu, teba nsị ahụ nje dị na ya n’ọnyá ahụ.

N’ihi otu ihe a merenụ, nwatakịrị ahụ ebute ọrịa Chagas. N’ime otu izu ma ọ bụ izu abụọ, ya enwee oké ahụ́ ọkụ, ahụ́ ya azaakwa aza. Ọ bụrụ na ọ nwụghị, nje ndị ahụ pụrụ ibiri n’ime ahụ́ ya, na-emetụta obi, akwara, na ime ahụ́ ya. Ihe dị ka afọ 10 ruo afọ 20 pụrụ ịgafe n’enweghị ihe mgbaàmà. Ma, ka oge na-aga, ọ pụrụ inwe ọnyá n’eriri afọ ya, bute ọrịa n’ụbụrụ, ma nwụọ n’ikpeazụ n’ihi obi ịkwụsị ịrụ ọrụ.

Akụkọ a e chepụtara echepụta na-egosi n’ezie otú mmadụ pụrụ isi bute ọrịa Chagas. Na Latin America, ọtụtụ nde mmadụ pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ahụhụ a na-akpata ọnwụ tara.

Ihe Ndị Nwere Ọtụtụ Ụkwụ Ndị Ha na Mmadụ Na-anọ

“Ọ bụ ụmụ nje ndị anya nkịtị na-adịghị ahụ, bụ́ ndị ụmụ ahụhụ na-ebugharị, na-akpata ihe ka ọtụtụ n’ahụ́ ọkụ ndị bụ́ isi mmadụ na-enwe,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu. Ndị mmadụ na-ejikarị okwu bụ́ “ahụhụ” eme ihe ịgụnye, ọ bụghị nanị ihe ndị bụ́ ahụhụ n’ezie—ihe ndị e kere eke nwere ụkwụ isii dị ka ijiji, akpịrị, anwụnta, igwu, na ébé—kamakwa ihe ndị nwere ụkwụ asatọ dị ka akọrọ.

Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụ ahụhụ adịghị emerụ mmadụ ahụ́, ụfọdụ n’ime ha bakwara nnọọ uru. E wezụga ha, ọtụtụ n’ime akụ́kụ́ na osisi ndị ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-esi na ha enweta ihe oriri agaghị ama ifuru ma ọ bụ mịa mkpụrụ. Ụmụ ahụhụ ụfọdụ na-enye aka egweri ihe mkpofu. Ọtụtụ ụmụ ahụhụ na-eri nanị akụ́kụ́, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-eri ụmụ ahụhụ ndị ọzọ.

N’ezie, e nwere ụmụ ahụhụ ndị na-akpasu ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ iwe n’ihi otú ọtịta ha si afụ ụfụ ma ọ bụ nanị n’ihi otú ha si jupụta ebe nile. Ụfọdụ na-ebibikwa ihe ndị a kụrụ akụ. Otú ọ dị, nke ka njọ bụ ụmụ ahụhụ ndị na-ekesa ọrịa na ọnwụ. Ọrịa ndị ụmụ ahụhụ kesara “kpatara ọrịa na ọnwụ nke ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu na narị afọ nke 17 ruo ná mmalite nke narị afọ nke 20 karịa ma a gụkọta nke ihe ndị ọzọ nile kpatara n’afọ ndị ahụ,” ka Duane Gubler nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States na-ekwu.

Ka ọ dị ugbu a, ihe dị ka 1 onye n’ime mmadụ 6 ọ bụla bu ọrịa sitere n’ụmụ ahụhụ. E wezụga ịkpatara ụmụ mmadụ nhụjuanya, ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa na-eweta ibu arọ n’ụzọ ego, karịsịa ná mba ndị ka na-emepe emependị na-enweghị ego iji chịkwaa ha. Ọbụna otu ntiwapụ pụrụ ifu ihe dị ukwuu. E kwuru na otu n’ime ihe ndị dị otú ahụ nke mere n’ebe ọdịda anyanwụ India na 1994 tara nnukwu ego n’akpa ego nke mba ahụ nakwa na nke ụwa nile. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, mba ndị kasị daa ogbenye n’ụwa apụghị inwe ọganihụ n’ụzọ akụ̀ na ụba ruo mgbe a chịkwara nsogbu ahụ́ ike ndị dị otú ahụ.

Ụzọ Ụmụ Ahụhụ Si Ebunye Anyị Ọrịa

Ụmụ ahụhụ na-ekesa ọrịa n’ụzọ abụọ bụ́ isi. Nke mbụ bụ site n’ibu nje ndị na-akpata ọrịa n’elu ahụ́ ha. Dị nnọọ ka ụmụ mmadụ pụrụ iji akpụkpọ ụkwụ ha zọba unyi n’ụlọ, “ijiji pụrụ ibu imerime nje ndị anya nkịtị na-adịghị ahụ n’ụkwụ ha, bụ́ ndị pụrụ ịkpata ọrịa ma ha buo ibu otú kwesịrịnụ,” ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-ekwu. Dị ka ihe atụ, ijiji pụrụ ibute unyi site na nsị, ma bufeere anyị ya mgbe ha bekwasịrị n’elu nri ma ọ bụ n’ihe ọṅụṅụ anyị. Ọ bụ n’ụzọ dị otú a ka ụmụ mmadụ si ebute nrịanrịa ndị na-akpa mmadụ aka ọjọọ ma na-akpata ọnwụ dị ka ịba ahụ́ ọkụ, ọnyụnyụ ọbara, na ọbụna ọgbụgbọ na ọnyụnyụ. Ijiji na-enyekwa aka n’ikesa ọrịa anya bụ́ trachoma—ihe bụ́ isi na-akpata ikpu ìsì n’ụwa. Ọrịa anya bụ́ trachoma pụrụ ime ka mmadụ kpuo ìsì site n’ichihịa akụkụ anya bụ́ cornea—akụkụ anya ahụ dị ka wọtapruf nke gebichiri elu anya tupu e ruo ná mkpụrụ anya. Gburugburu ụwa, ihe dị ka mmadụ 500,000,000 na-arịa ọrịa a.

A na-echekwa na ọchịcha, bụ́ nke na-amụba n’ebe e nwere unyi, na-ebu nje ndị pụrụ ịkpata ọrịa n’elu ahụ́ ha. Tụkwasị na nke a, ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụ ahụ́ mmadụ ịsọ ọchịcha kpatara e ji nwee ịrị elu gabigara ókè nke ụkwara ume ọkụ na nso nso a, karịsịa n’etiti ụmụaka. Dị ka ihe atụ, jiri anya nke uche gị hụ Ashley, nwa agbọghọ dị afọ 15, bụ́ onye nweworo ihe isi ike n’iku ume ruo ọtụtụ abalị n’ihi ụkwara ume ọkụ ya. Ka onye dọkịta ya jikeere ige ntị otú akpa ume ya si eme umere, otu ọchịcha si n’uwe Ashley dapụta ma gbafee n’elu oche ahụ ndị a na-ele ahụ́ na-edina.

Ọrịa Ndị Dị n’Ime

Mgbe ụmụ ahụhụ nwere nje virus, nje bacteria, ma ọ bụ nje ndị ọzọ n’ime ahụ́ ha, ha pụrụ ikesa ọrịa n’ụzọ ọzọ—site n’ibunye ha ndị mmadụ site n’ịta ha ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. Ọ bụ nanị pasent dị nta nke ụmụ ahụhụ na-esi otú a ebunye ụmụ mmadụ ọrịa. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na e nwere ihe karịrị ụdị anwụnta puku abụọ, ọ bụ nanị ndị nọ n’ìgwè Anopheles na-ebunye mmadụ ịba—ọrịa na-efe efe nke kasị egbu mmadụ n’ụwa (ma e wezụga ụkwara nta).

Otú ọ dị, anwụnta ndị ọzọ na-ekesa ọtụtụ ọrịa dịgasị iche iche. Òtù WHO na-akọ, sị: “N’ime ụmụ ahụhụ nile na-ekesa ọrịa, ọ bụ anwụnta kasị dị ize ndụ, ọ na-ekesa ịba, ọrịa dengue na ịba anya odo, bụ́ ndị na-egbu ọtụtụ nde mmadụ ma na-akpatara ọtụtụ narị nde mmadụ ọrịa kwa afọ.” Ọ dịkarịa ala, pasent 40 nke ndị bi n’ụwa nọ n’ihe ize ndụ nke ịrịa ịba, ihe dịkwa ka pasent 40 nọkwa n’ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa dengue. N’ọtụtụ ebe, mmadụ pụrụ ibutecha ha abụọ.

N’ezie, ọ bụghị nanị anwụnta bụ ahụhụ na-ebu ọrịa n’ime ahụ́ ha. Odudu na-ebunye ndị mmadụ nje na-akpata ọrịa oro ụra, bụ́ nke na-emekpa ọtụtụ narị puku mmadụ ahụ́, na-amanyekwa ndị nile nọ n’obodo ịgbahapụ ubi ha na-eme nri. Site n’ibufe nje na-akpata ìsì anya ọcha, ijiji ojii emewo ka ihe dị ka mmadụ 400,000 nọ n’Africa kpuo ìsì. Ntanta pụrụ ibu nje na-akpata ọrịa leishmaniasis, bụ́ ìgwè ọrịa ndị na-anapụ mmadụ ike, na-akwarụ mmadụ, na-egbukarị egbu, bụ́ nke na-emekpa ọtụtụ nde mmadụ nọ n’afọ ndụ nile ahụ́ ka ọ dị ugbu a, n’ụwa nile. Akpịrị bụ́ flea, bụ́ nke a pụrụ ịhụ ebe nile pụrụ ibu okpo bụ́ tapeworn, ọrịa okpomọkụ nke ụbụrụ, ọrịa tularemia, na ọbụna ọrịa plague—nke a na-ejikọtakarị ya na Ọnwụ Ojii ahụ bụ́ nke, n’ime nanị afọ isii, kpochapụrụ ihe ruru ma ọ bụ ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi na Europe Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya.

Igwu na akọrọ pụrụ ibufe mmadụ ụdị dị iche iche nke ịba ahụ́ ọkụ, tinyere ọrịa ndị ọzọ. Akọrọ ndị dị n’ala ndị nwere ọnọdụ ihu igwe dị mma gburugburu ụwa pụrụ ibu ọrịa Lyme nke pụrụ ịnapụ onye na-arịa ya ike—ọrịa ụmụ ahụhụ kasị ebunye ndị mmadụ na United States nakwa na Europe. Otu nnyocha e mere na Sweden na-ekpughe na nnụnụ ndị si n’otu mba na-aga n’ọzọ pụrụ isite n’otu ebe buru akọrọ gaa ọtụtụ puku kilomita, ikekwe na-ekesa ọrịa ndị ha bu n’ógbè ndị ọzọ. Akwụkwọ Britannica na-ekwu, sị: “Akọrọ karịrị ụmụ ahụhụ ndị ọzọ nile (ma e wezụga anwụnta) n’ọnụ ọgụgụ ọrịa ndị ha na-ebunye ụmụ mmadụ.” N’ezie, otu akọrọ pụrụ ibu ihe ruru nje atọ dịgasị iche bụ́ ndị na-akpata ọrịa, ọ pụkwara ibufe ha nile n’ahụ́ mmadụ nanị otu ugboro ọ tara onye ahụ!

“Ezumike” Pụọ n’Ọrịa

Ọ bụ nanị n’oge na-adịbeghị oké anya bụ́ 1877 ka ndị ọkà mmụta sayensị nwapụtara na ụmụ ahụhụ na-ekesa ọrịa. Kemgbe ahụ, e mewo mkpọsa ndị sara mbara iji chịkwaa ma ọ bụ kpochapụ ụmụ ahụhụ ndị na-ebu ọrịa. Na 1939, e mere ka ọgwụ DDT e ji egbu ụmụ ahụhụ sonye n’ime ngwá ọgụ ndị e ji alụ ọgụ ahụ, ka ọ na-erulekwa afọ ndị 1960, e leghịzi ọrịa ndị ụmụ ahụhụ na-ekesa anya dị ka ihe bụ́ isi na-etinye ahụ́ ike ọha mmadụ n’ihe ize ndụ ná mba ndị na-adịghị n’Africa. Kama ilekwasị anya n’ịchịkwa ụmụ ahụhụ ndị na-ekesa ọrịa, e lekwasịziri anya n’iji ọgwụ agwọ ọnọdụ ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa, mmasị e nwere n’ịmụ banyere ụmụ ahụhụ na ebe obibi ha belatakwara. A nọkwa na-emepụta ọgwụ ndị ọhụrụ, ọ bịakwara yie ka ndị ọkà mmụta sayensị hà pụrụ ịchọta “ọgwụ bụ́ ịgba” maka nrịanrịa ọ bụla. Ụwa nọ ‘n’ezumike’ pụọ n’ọrịa ndị na-efe efe. Ma oge ezumike ahụ ga-agwụnụ agwụ. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe mere ọ ga-eji gwụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Taa, 1 onye n’ime mmadụ 6 ọ bụla na-arịa ọrịa ahụhụ bunyere ya

[Foto dị na peeji nke 13]

Ahụhụ “kissing bug”

[Foto dị na peeji nke 14]

Ijiji na-ebu ihe ndị na-akpata ọrịa n’ụkwụ ha

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Ọtụtụ ụmụ ahụhụ na-ebu ọrịa n’ime ahụ́ ha

Ijiji ojii na-ebu ọrịa ìsì anya ọcha

Anwụnta na-ebu ịba, ọrịa “dengue,” na ịba anya odo

Igwu pụrụ ibufe mmadụ oké ịba ahụ́ ọkụ

Akpịrị bụ́ “flea” na-ebu ọrịa ọkpọmọkụ ụbụrụ na ọrịa ndị ọzọ

Odudu na-ekesa ọrịa oro ụra

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

WHO/TDR/LSTM

CDC/James D. Gathany

CDC/Dr. Dennis D. Juranek

CDC/Janice Carr

WHO/TDR/Fisher

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]

Clemson University - USDA Cooperative Extension Slide Series, www.insectimages.org