Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụkpụrụ Omume Ọma Ọ̀ Na-adalata Adalata?

Ụkpụrụ Omume Ọma Ọ̀ Na-adalata Adalata?

Ụkpụrụ Omume Ọma Ọ̀ Na-adalata Adalata?

ỤFỌDỤ n’ime onyinye ndị kasịnụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ inye ụmụ ha bụ ịhụnanya a na-akparaghị ókè na ụkpụrụ omume ọma, bụ́ nke nne na nna na-etinye n’ọrụ, ọ bụghịkwa nanị ikwu ya ekwu.

Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ụkpụrụ omume ọma ndị kwesịrị ekwesị, ndụ ga-abụ nanị ike keta o rie. Ụkpụrụ omume na-eme ka ndụ nwee nzube. Ọ na-eme ka e nwee ihe ka mkpa ná ndụ. Ọ na-egosi ihe ndị a ga-eme na ihe ndị a na-agaghị eme ma na-akapị ọnụ otú a ga-esi na-akpa àgwà.

Ka o sina dị, ọtụtụ ụkpụrụ omume ndị a na-agbasobu eri oge na-agbanwe ngwa ngwa. Dị ka ihe atụ, Prọfesọ Ronald Inglehart na-ekwu na “ọha mmadụ enwewala ụkpụrụ omume nke inwe mmekọahụ bụ́ nke onye ọ bụla nweere onwe ya imeju ọchịchọ mmekọahụ ya na ikwu uche ya.” N’otu njuta echiche e mere na 1997 ná mba 16, a jụrụ ndị bi ná mba ndị ahụ ka ha kwuo ma ịmụ nwa n’alụghị di ọ̀ dị mma ma ọ bụ na ọ dịghị mma. Njụta Echiche ahụ na-egosi na: “Ndị nabatara ụdị ndụ a ndị mmadụ na-ebi n’oge a dị site na 90% ma ọ bụ karịa n’akụkụ ụfọdụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe ruo ihe na-erughị 15% na Singapore nakwa n’India.”

Ụfọdụ ndị etowo nnwere onwe ọhụrụ a nke inwe mmekọahụ. Otú ọ dị, akwụkwọ nta bụ́ The Rise of Government and the Decline of Morality, nke James A. Dorn dere, na-akpọtụ uche ná “njupụta nke ụmụ ndị a mụrụ n’alụghị di” nakwa ná “ndakpọ nke ezinulọ” dị ka “ihe àmà doro anya nke nretọ omume.”

Ụkpụrụ Omume Ndị Ọzọ Na-akawanye Njọ

Ụkpụrụ omume ndị ọzọ bụ́ ndị a gbasoworo eri ogologo oge adalatawokwa n’ụzọ pụtara ìhè. Nnyocha Maka Ụkpụrụ Omume Ụwa, bụ́ nke Prọfesọ Inglehart nọ n’isi ya, na-akọ na “ịkwanyere ịbụisi ùgwù na-ebelata ebelata” n’ala ndị mepere emepe.

Ụkpụrụ omume ọzọ dịwara kemgbe ụwa abụwo ụkpụrụ siri ike na-achịkwa otú e si arụ ọrụ. Otú ọ dị, e nwere ihe àmà na-egosi na nke a kwa na-adalata adalata. Na United States, Òtù Mba Na-ahụ Maka Achụmnta Ego Ndị Mmadụ Nwe nyochara ihe karịrị ọkara nde ndị were mmadụ n’ọrụ. “Pasent 31 nke ndị a jụrụ ajụjụ kwuru na o siri ike ịchọta ndị a ga-etinye n’ebe ndị a chọrọ ndị ọrụ, pasent 21 kwukwara na ihe a na-arụzu n’ozuzu ya adịghị mma.” Otu onye were mmadụ n’ọrụ na-ekwu, sị: “Ọ na-esiwanye ike ịhụ ndị na-abịa ọrụ n’oge ihe karịrị otu ụbọchị, n’anya doro edo.”

Ọnọdụ akụ̀ na ụba pụrụ ịkwalite ndalata a. Ka uru ahịa na-adalata, ndị were mmadụ n’ọrụ na-achụ ndị ọrụ ma ọ bụ na-ebelata ma ọ bụ na-akwụsị enyemaka ego ụfọdụ. Magazin bụ́ Ethics & Behavior, na-ekwu, sị: “Ndị ọrụ bụ́ ndị a na-emeso ihe n’ụzọ dị otú a nke emeghị ihe e kwuru na-amalitekwa ịkpa àgwà na-adịghị mma n’ebe ndị were ha n’ọrụ nọ. Ndị mmadụ adịghịzi etinye onwe ha n’ịrụsi ọrụ ike n’ihi na onye ọrụ nwere ike ghọọ onye na-enweghịzi ọrụ echi.”

Ebe ọzọkwa ụkpụrụ omume dalataworo n’ụzọ dị ịrịba ama bụ àgwà na nsọpụrụ. Otu nnyocha e mere n’Australia kwubiri sị: “Ihe karịrị 87.7% nke ndị e were n’ọrụ kọrọ [na] ịkpa àgwà ọjọọ n’ọfịs na-emetụta mmụọ nke ndị ọrụ.” N’otu nnyocha e mere n’ebe ndị ọkà achụmnta ego nọ na United States nọ, “pasent iri asatọ nke ndị zaghachirinụ kọrọ na e nwere mmụba nke enweghị nsọpụrụ n’achụmnta ego.” Dị ka ụlọ ọrụ mgbasa akụkọ bụ́ CNN si kwuo, “imeso ndị ahịa n’ụzọ na-adịghị mma abụwo nnọọ ihe zuru ebe nile nke na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị e nyochara kwuru na o nwere mgbe o mere ka ha si n’ụlọ ahịa pụọ n’afọ gara aga. Ọkara n’ime ha kwuru na ha na-ahụkarị ndị na-eji olu dara ụda ekwu okwu na fon a na-eji agagharị agagharị n’ụzọ na-akpasu iwe. Mmadụ isii n’ime ndị ọkwọ ụgbọala 10 e nyochara kwuru na ha na-ahụkarị ka ndị ọzọ na-eji obi ọjọọ anya ụgbọala ma ọ bụ na-anya ya ara ara.”

Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka E Ji Ndụ Mmadụ Kpọrọ Ihe?

N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị mmadụ na-ekwu na ha anakwerewo “ụkpụrụ omume ọma” ụfọdụ, ma omume ha adịghị egosipụtakarị ihe ha kwuru. Dị ka ihe atụ, Òtù Na-akwalite Omume Ọma Gburugburu Ụwa jụtara ndị nnọchiteanya sitere mba 40 echiche ha. Pasent 40 họọrọ “ịkwanyere ndụ ùgwù” dị ka otu n’ime ụkpụrụ omume ise “kasị mkpa” ná ndụ. *

Otú ọ dị, olee ihe a na-ahụ ma a bịa n’ime ya eme? N’ezie, mba ndị mepere emepe nwere ego n’ezie iji wepụ ihe ka ukwuu ná nhụjuanya nke ụmụ mmadụ. Ma akwụkwọ Carol Bellamy, bụ́ nnukwu onyeisi nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu, dere, kwuru n’afọ 1998 na nsogbu ndị na-esi n’erighị ihe na-edozi ahụ́ “so egbu ihe karịrị ọkara nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ụmụaka 12 na-erubeghị afọ ise ná mba ndị ka na-emepe emepe kwa afọ, bụ́ ọnụ ọgụgụ na-enweghị atụ kemgbe Ọnwụ Ojii kpasịrị Europe aka ọjọọ na narị afọ nke 14.” Akụkọ dị otú ahụ na-eri onye ọ bụla ji ndụ kpọrọ oké ihe ọnụ. “Ma,” ka Bellamy na-ekwu, “nsogbu zuru ụwa ọnụ nke na-esi n’erighị ihe na-edozi ahụ́ adịghị echegbucha ọha na eze, n’agbanyeghị ihe àmà dị ukwuu, nke na-arịwanye elu, bụ́ nke ndị ọkà mmụta sayensị wepụtaworo banyere ihe ize ndụ dị na ya. A na-elekwasị anya ná ndagharị nke ọnụ ngwá ahịa ụwa karịa ka a na-elekwasị ná mbibi dị ukwuu nke nsogbu na-esi n’erighị ihe na-edozi ahụ́ pụrụ ịkpata—ma ọ bụkwanụ n’abamuru dị ukwuu nke ihe oriri na-edozi ahụ́ na-eweta.”

Echiche gbagọrọ agbagọ, bụ́ nke na-eju nnọọ anya, nke e nwere banyere ndụ na-apụta ìhè n’etiti ndị ọrụ ahụ́ ike. Ná mmalite afọ ndị 1970 ka gara aga, ọ na-afọ nke nta ka nwa a mụrụ mgbe ọ nọsịrị nanị izu 23 n’ime afọ ghara inwe ohere ọ bụla nke ịdị ndụ. Taa, ikekwe ihe ruru pasent 40 nke ụmụ ọhụrụ dị otú ahụ a mụkworo amụkwo pụrụ ịdịgide ndụ. N’ihi nke a, leenụ ka o si bụrụ ihe ijuanya na kwa afọ a na-esikwopụ afọ ime dị nde 40 ruo nde 60! Ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka ndị a a na-esikwopụ bụ ndị ụmụ ọhụrụ a mụkworo amụkwo bụ́ ndị ndị dọkịta na-agbalị ịzọ ndụ ha ji nanị izu ole na ole tọọ! Ihe a e kwuru n’elu ọ́ dịghị egosi na e nwere nnukwute mgbagwoju anya n’ihe banyere omume ọma?

Ọ Dị Mkpa—Ihe Nduzi Omume

Mgbe a jụrụ ndị mmadụ, sị, “Gịnị bụ ihe ikpeazụ kasị mkpa ná ndụ?” ihe ka ọtụtụ ná ndị òtù Njụta Echiche ahụ jụrụ ajụjụ ahụ họọrọ “ikwesị ntụkwasị obi nye okpukpe m” dị ka otu n’ime ihe abụọ na-adịchaghị mkpa. Ọ bụghịzi ihe ijuanya na ọnụ ọgụgụ ndị na-aga chọọchị anọgidewo na-ebelata. Prọfesọ Inglehart na-enye echiche na ọganihu nke mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa “emewo ka e nwee mmetụta a na-enwetụbeghị mbụ nke ịnọ ná nchebe” nakwa na “nke a ebelatawo mkpa a na-enwe maka mmesighachi obi ike bụ́ nke a nọworo na-enweta site n’okpukpe kemgbe ụwa.”

Mbelata nke obi ike e nwere ná njikọ okpukpe na ndalata nke obi ike e nwere na Bible na-agakọ. N’otu nnyocha e mere ndị mmadụ ná mba nile, a jụrụ ndị mmadụ onye ma ọ bụ ihe ha na-adabere n’ebe ọ nọ n’ihe banyere ịmata omume ziri ezi. Ọnụ ọgụgụ buru ibu hotara ahụmahụ onwe onye. “E debere nnọọ Okwu Chineke n’ọnọdụ nke abụọ,” ka akụkọ a kọrọ mgbe e mesịrị nnyocha ahụ na-egosi.

Ka a sịkwa ihe mere ụkpụrụ omume ji na-agbanwe n’ụzọ ka njọ! Enweghị ihe nduzi nke omume, ya na ojiji a na-ejiwanye ihe onwunwe na ime ihe masịrị onwe onye akpọrọ ihe, emewo ka e nwee ọnọdụ nke anyaukwu na enweghị mmasị n’ebe mmetụta nke ndị ọzọ dị. Olee ihe ndị dị mkpa a tụfuworo n’ihi mgbanwe ndị a?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ihe karịrị afọ 50 gara aga, òtù Mba Ndị Dị n’Otu nakweere Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ. Akụkụ nke Mbụ nke Nkwupụta ahụ na-ekwu, sị: “Ihe nile bụ́ mmadụ nweere onwe ha site n’ọmụmụ, harakwa nhata n’ùgwù na n’ihe ndị ruuru ha.”

[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]

Ntisa ezinụlọ, àgwà ọrụ na-adịghị mma, na àgwà ọjọọ bụ ihe ndị e ji mara ụkpụrụ omume na-adalata adalata taa

[Foto dị na peeji nke 6]

Kwa afọ, a na-esikwopụ ọtụtụ nde ụmụ ọhụrụ e bu n’afọ, bụ́ ndị nwa a mụkworo amụkwo ji nanị izu ole na ole tọọ