Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Aghaghị M Ịmatakwu Ihe’

‘Aghaghị M Ịmatakwu Ihe’

‘Aghaghị M Ịmatakwu Ihe’

N’AFỌ gara aga, otu nwanyị dere, sị: “Ụnyaahụ, enwetara m site na post ọfịs broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? nke m rịọrọ ka e zitere m.” Ọ kọwara na ya nwetaburu ebe abụọ e mere mkpọsa banyere broshuọ ahụ. “Anọ m na-atụsi anya ya ike n’ihi na mgbe m gụsịrị mkpọsa ndị ahụ e mere banyere ya, amaara m na aghaghị m ịmatakwu maka ya,” ka o kwuru. “Mgbe m nwetara broshuọ ahụ, amalitere m ịgụ ya ozugbo o kwere m mee. Ezi uche dị n’ihe nile unu kwuru na broshuọ unu, ha sikwa na Bible.”

O kwubiri, sị: “Ọ dị m ọkụ n’ahụ́ itinye ihe m gụtaworo n’ọrụ.”

Anyị kwenyere na gị onwe gị kwa ga-erite uru n’ịgụ broshuọ ahụ dị peeji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? E wezụga ihe ọmụmụ na-adọrọ mmasị dị n’ime ya nke bụ́ “Ònye Bụ Jisọs Kraịst?” ị ga-ahụ ihe ọmụmụ ndị ọzọ, gụnyere “Ònye Bụ Chineke?,” “Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?,” nakwa “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?” Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.