Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Dị Oké Mkpa ná Ndụ—Mmiri

Ihe Dị Oké Mkpa ná Ndụ—Mmiri

Ihe Dị Oké Mkpa ná Ndụ—Mmiri

JIZỌS gwara otu nwanyị Sameria nke na-esere mmiri n’otu olulu mmiri banyere isi iyi nke mmiri na-asụpụta asụpụta inye ndụ ebighị ebi. (Jọn 4:14) Ọ bụ ezie na mmiri o zoro aka na ya bụ mmiri ihe atụ, n’ụzọ nkịtị, mmiri dị oké mkpa ná ndụ, ọ bụ nanị ikuku oxygen dị mkpa karịa ya. Mmadụ pụrụ ịdị ndụ ruo ọtụtụ izu n’erighị nri ma ọ pụrụ ịdị ndụ ruo nanị ụbọchị ise n’aṅụghị mmiri!

Ọ bụ mmiri mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke ịdị arọ ahụ́ anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ mmiri mejupụtara pasent 75 ruo 85 nke ụbụrụ anyị, ọ bụkwa mmiri mejupụtara pasent 70 nke uru ahụ́ anyị. Tụkwasị n’ihe ndị ọzọ, mmiri na-enyere ahụ́ anyị aka ịgbari na ịmịkọrọ ihe oriri, na-ebugara mkpụrụ ndụ ihe ndị na-edozi ahụ́. Ọ na-ewepụ ihe ndị bụ́ nsí na ihe ndị ọzọ ahụ́ na-achọghị, na-eme ka nkwonkwo na eriri afọ ghara ịkpọ nkụ, na-achịkwakwa ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke ahụ́. Ma ị̀ maara na ịṅụ mmiri otú kwesịrị ekwesị na-enyekwa aka n’ime ka mmadụ felata?

Ṅụọ Mmiri Iji Felata

Nke mbụ, mmiri enweghị calorie, o nweghị abụba, o nweghịkwa cholestrol, soldium dị na ya dịkwa ntakịrị. Nke abụọ, ọ na-ebelata agụụ. Nke atọ, mmiri na-enyere ahụ́ aka ịgbari abụba ndị o chekwara. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe akụrụ na-enweghị mmiri otú o kwesịrị, ha apụghị ịrụ ọrụ nke ọma. Imeju na-eweghara ụfọdụ n’ime ọrụ ha, ma ime otú ahụ na-ebelata ikike o nwere ịgbari abụba nke ọma. N’ihi ya, abụba ahụ na-adịgide n’ime ahụ́, mgbe ahụ ị na-ebukwu ibu. N’ihi ya, dị ka Dr. Donald Robertson nke na-arụ ọrụ na Southwest Bariatric Nutrition Center dị na Scottsdale, Arizona, U.S.A., na-ekwu, “ịṅụ mmiri nke ọma bụ ụzọ dị mkpa isi felata. Ọ bụrụ na ndị na-agbalị ifelata adịghị aṅụ mmiri nke ọma, ahụ́ ha apụghị ịgbari abụba nke ọma.”

N’eziokwu, mmiri ịdọrọ n’ahụ́ na-emekarị ka mmadụ bukwuo ibu. N’ihi ya, ndị mmiri na-adọrọkarị n’ahụ́ ha na-eche na ọgwụ ya bụ ibelata mmiri ha na-aṅụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe ahụ ha na-achọ izere na-eme. Mgbe mmiri kọrọ mmadụ n’ahụ́, ọ na-agbalị ijigide mmiri ọ bụla dị adị site n’ichekwa ya n’ebe ndị dị ka n’ụkwụ, n’aka, na n’ogwe ụkwụ ya. Ya mere, ndị ọkachamara n’ihe banyere nri na-atụ aro ka anyị na-enye ahụ́ anyị ihe dị ya mkpa—mmiri zuru ezu. Chetakwa na ka ị na-erikwu nnu, otú ahụ ka mmiri ga na-adọrọkwu gị n’ahụ́ iji gwagbuo ya.

Nye Ahụ́ Gị Mmiri

Kwa ụbọchị, ná nkezi, ihe dị ka lita mmiri abụọ na-esi n’akpụkpọ ahụ́, akpa ume, eriri afọ, na akụrụ apụ. Ihe dị ka ọkara otu lita mmiri na-apụ anyị n’ahụ́ nanị site n’iku ume. Ọ bụrụ na e dochighị mmiri a, mmiri ga-agwụ anyị n’ahụ́. Ụfọdụ ihe mgbaàmà nke mmiri ịgwụ n’ahụ́ bụ isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ, ahụ mgbu, mamịrị na-eji oji, edilighị okpomọkụ, asọ mmiri ịtakọrọ n’ọnụ na anya mmiri ịgwụ n’anya.

Ya mere, mmiri ha aṅaa ka anyị kwesịrị ịdị na-aṅụ? Dr. Howard Flaks, bụ́ ọkachamara n’ibu oké ibu, na-ekwu, sị: “Ọ dịkarịa ala, onye ahụ́ siri ike kwesịrị ịṅụ lita abụọ ma ọ bụ lita abụọ na ọkara kwa ụbọchị. Ọ dị mkpa ka ị na-aṅụ karịa otú ahụ ma ọ bụrụ na ị na-enwe mmega ahụ́ nke ukwuu ma ọ bụ biri n’ebe e nwere ihu ígwé na-ekpo ọkụ. Ndị bubigara ibu ókè kwesịkwara ịdị na-aṅụkwu otu iko mmiri maka kilogram iri ọ bụla ha ji gafee otú ha kwesịrị ịha n’ịdị arọ.” Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-ekwu ugbu a na ịdị na-aṅụ mmiri mgbe akpịrị na-akpọ gị nkụ ezuola, n’agbanyeghị na ọ bụrụ na akpịrị akpọọ gị nkụ, ọ pụrụ ịbụ na mmiri agwụtụla gị n’ahụ́.

À pụrụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ kama ịṅụ mmiri? Ọ bụ ezie na ihe ọṅụṅụ ndị e si ná mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri nweta, bụ́ ndị a gwara mmiri, dị mma, ha nwere calorie. Ọzọkwa, ihe ọṅụṅụ ndị nwere shuga na mmiri ara ehi hie nne na-eme ka ahụ́ na-achọkwu mmiri, ebe ọ bụ na mmiri dị mkpa iji gbarie ha. Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na ndị nwere caffeine dị ka kọfị na tii na-eme ka mmadụ na-anyụtụkwu mamịrị karị, na-eme ka ọ dị mkpa ka mmadụ na-aṅụkwu mmiri iji ṅụchie nke ọ na-anyụpụ. Ọ dịghị nnọọ ihe a pụrụ iji dochie anya ihe ahụ dị oké mkpa, mmiri. Ya mere, gịnị ma ị ṅụọ otu iko mmiri ugbu a?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

Aro Ndị Ga-eme Ka Ị Na-aṅụ Mmiri Karị

● Na-ebu karama mmiri.

● Ṅụọ otu iko mgbe ọ bụla ị na-eri nri.

● Ṅụọ mmiri tupu i nwee mmega ahụ́, n’oge ị na-enwe mmega ahụ́, na mgbe i nwesịrị mmega ahụ́.

● Mgbe ị na-ezurutụ ike n’ọrụ, ṅụọ mmiri kama ịṅụ kọfị.

● Iji mee ka mmiri pọmpụ dị ụtọ karị, tinye ya mmiri oroma lemon ma ọ bụ zaa ya azaa.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Photo: www.comstock.com